Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara—“Ụzọ Bụ́ Isi E Sizi Agwọ Ọrịa”

Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara—“Ụzọ Bụ́ Isi E Sizi Agwọ Ọrịa”

Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara—“Ụzọ Bụ́ Isi E Sizi Agwọ Ọrịa”

N’OKPURU isiokwu bụ́ “Ịwa Ahụ ‘n’Ejighị Ọbara,’” magazin bụ́ Maclean na-akọ na ndị dọkịta nọ na Canada anọwo “na-ewepụta usoro ndị ọhụrụ bụ́ ndị meworo ka ihe a kpọrọ ịwa ahụ n’ejighị ọbara bụrụ ụzọ bụ́ isi e sizi agwọ ọrịa kemgbe ihe karịrị afọ ise gara aga.” Brian Muirhead, bụ́ dibịa nkụnwụ ahụ n’Ụlọ Ọrụ Nkà Mmụta Ahụ Ike dị na Winnipeg, bụ otu onye n’ime ha. Gịnị kpaliri ya ịchọ usoro ọzọ e si agwọ ọrịa n’ejighị ọbara?

Na 1986, Dr. Muirhead nakweere ihe ịma aka nke ịwa otu agadi nwoke dị afọ 70 nke nwere ọnyá afọ na-agba ọbara ahụ, bụ́ onye rịọrọ ka e nye ya ọgwụgwọ nke na-achọghị mmịnye ọbara n’ihi nkwenkwe ya dabeere na Bible dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. (Ọrụ 15:28, 29) Dr. Muirhead “jiziri usoro a na-adịghị ejikebe eme ihe bụ́ ịgbanye saline solution n’ahụ onye ọrịa ahụ iji mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ nọgide na-adị elu,” ka Maclean na-akọ. “Usoro ahụ nwere ihe ịga nke ọma, o mekwara ka nkwenye na-esiwanye ike nke Muirhead kwenyere na ‘anyị na-amịnye nnọọ ọbara gabiga ókè,’ sikwuo ike. ‘Echere m na oge eruwo ka anyị leba anya n’usoro ndị ọzọ.’”

Ọ bụ “ma nchegbu e nwere maka inweta ọbara n’afọ ofufo n’ọdịnihu—ma egwu nke ọtụtụ ndị ọrịa nwere na ha ga-ebute nje ndị na-akpata ọrịa site ná mmịnye ọbara, kpaliri” ọchịchọ a na-achọ usoro ịwa ahụ n’ejighị ọbara. N’ihi nchọpụta nke ndị dọkịta na-achọpụta ihe ọhụrụ mere, ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova kamakwa ọtụtụ ndị ọzọ eritewo uru. “E wezụga iwepụ mkpa nke mmịnye ọbara n’ọtụtụ ọnọdụ, ịwa ahụ n’ejighị ọbara na-ebelata ihe ize ndụ—otú ọ sọrọ ya dịruo ná nta—nke ibute ọrịa site n’ọbara ndị nje dị,” ka Maclean na-ekwu. Ma ọbụna ọbara nke “dị ọcha” pụrụ inwe ihe ize ndụ nke ịkpata ọrịa site n’ibelata ruo nwa oge ikike ahụ onye ọrịa nwere ịlụso ọrịa ọgụ.

Gịnị kpatara nkwenkwe a siri ike nke Ndịàmà Jehova n’ihe banyere usoro ọzọ e si agwọ ọrịa n’ejighị ọbara? Ọ pụrụ ịmasị gị ịgụ broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ iso gị kerịta ya.