Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ E Si Achọta Ezi Obi Ụtọ

Ụzọ E Si Achọta Ezi Obi Ụtọ

Ụzọ E Si Achọta Ezi Obi Ụtọ

ONYE ndú okpukpe Buddha, bụ́ Dalai Lama, kwuru, sị: “Ekweere m na nzube anyị ji adị ndụ kpọmkwem bụ iji chọọ obi ụtọ.” Ọ kọwaziri na ya kweere na a pụrụ inweta obi ụtọ site n’ịzụ uche na obi azụ. “Uche,” ka o kwuru, “bụ ngwá ọrụ nile bụ́ isi dị anyị mkpa iji nweta obi ụtọ zuru ezu.” Ọ dịghị mkpa ikwere na Chineke, ka o chere. *

N’ụzọ dị iche, tụlee ihe banyere Jisọs, bụ́ onye nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ bụ́kwa onye ozizi ya metụtaworo ọtụtụ narị nde mmadụ eri ọtụtụ narị afọ. Jisọs nwere mmasị n’obi ụtọ ụmụ mmadụ. N’Ozizi Elu Ugwu ya a maara nke ọma, o ji okwu obi ụtọ itoolu malite—okwu itoolu ndị ji: “Obi ụtọ na-adịrị . . . ,” malite. (Matiu 5:1-12, NW) N’otu ozizi ahụ, ọ kụziiri ndị na-ege ya ntị inyocha, ịzụ, na ime ka uche na obi ha dị ọcha—na-eji echiche udo, nke dị ọcha, na nke ịhụnanya edochi echiche ihe ike, nke rụru arụ, na nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. (Matiu 5:21, 22, 27, 28; 6:19-21) Dị ka otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya mesịrị gbaa ume, anyị kwesịrị ‘ịgụkọ’ ihe ndị ‘bụ́ eziokwu, ihe ndị kwesịrị nsọpụrụ, ihe ndị ziri ezi, ihe ndị dị ọcha, ihe ndị kwesịrị ịhụnanya, ihe ndị e kwuru nke ọma, ịdị mma, na otuto.’—Ndị Filipaị 4:8.

Jisọs maara na ezi obi ụtọ na-agụnye iso ndị ọzọ na-akpakọrịta. Anyị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa nke iso ndị ọzọ na-akpakọrịta, ya mere anyị apụghị inwe obi ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na anyị na-ekewapụ onwe anyị iche ma ọ bụ ma ọ bụrụ na anyị na ndị nọ anyị gburugburu na-ese okwu mgbe nile. Anyị pụrụ inwe obi ụtọ nanị ma ọ bụrụ na anyị nwere mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya nakwa ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ihe dị oké mkpa n’ịhụnanya dị otú ahụ Jisọs kụziri bụ mmekọrịta anyị na Chineke. N’ebe a karịsịa, ozizi Jisọs dị iche n’ebe nke Dalai Lama dị, n’ihi na Jisọs kụziri na ụmụ mmadụ apụghị inwe ezi obi ụtọ n’adabereghị na Chineke. Maka gịnị?—Matiu 4:4; 22:37-39.

Chee Banyere Mkpa Ime Mmụọ Gị

Otu n’ime okwu obi ụtọ ndị ahụ bụ: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) Gịnị mere Jisọs ji kwuo nke a? Ọ bụ n’ihi na, n’adịghị ka ụmụ anụmanụ, anyị nwere mkpa ime mmụọ. Ebe ọ bụ na e kere anyị n’onyinyo Chineke, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, anyị pụrụ ịzụlite àgwà Chineke ndị dị ka ịhụnanya, ikpe ziri ezi, ebere, na amamihe. (Jenesis 1:27; Maịka 6:8; 1 Jọn 4:8) Mkpa ime mmụọ anyị gụnyere mkpa nke inwe nzube ná ndụ anyị.

Olee otú anyị pụrụ isi gboo mkpa ime mmụọ dị otú ahụ? Ọ bụghị site ná ntụgharị uche a na-eme site n’ikwughachi ihe e bu n’isi ugboro ugboro ma ọ bụ ime nnyocha onwe onye nkịtị. Kama nke ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) Rịba ama na Jisọs sịrị na “okwu nile ọ bụla” dị mkpa ná ndụ anyị na-esite n’ọnụ Chineke. E nwere ajụjụ ụfọdụ ọ bụ nanị Chineke pụrụ inyere anyị aka ịza. Nghọta ahụ kwesịrị oge a karịsịa, n’ihi mmụba nke echiche ndị e nwere banyere nzube nke ndụ na ụzọ na-eduga n’inwe obi ụtọ. Ụlọ ahịa na-ere akwụkwọ na-eji otu akụkụ dum nke ụlọ ahịa ha akpọsa akwụkwọ ndị na-ekwe ndị na-agụ ha nkwa ahụ ike, akụ̀ na ụba, na obi ụtọ. E mepụtawo ógbè Internet ndị na-ekwu kpọmkwem banyere obi ụtọ.

Ka o sina dị, echiche ụmụ mmadụ n’akụkụ ndị a na-ehiekarị ụzọ. Ọ na-emekarị ka e nwee ọchịchọ nke onwe onye nanị ma ọ bụ mpako. Ọ na-adabere n’ihe ọmụma na ahụmahụ ndị a kpaara ókè, mgbe mgbe kwa ọ na-adabere ná nchepụta ụgha. Dị ka ihe atụ, ihe a na-ahụkarị n’etiti ndị na-ede akwụkwọ enyemaka onwe onye bụ ime ka echiche ha dabere ná nchepụta echiche nke “nkà mmụta nke ịdabere n’evolushọn na-amụ banyere uche na akparamàgwà,” bụ́ nke na-azọrọ na mmetụta uche mmadụ gbanyere mkpọrọgwụ n’echiche e nwere na anyị si n’anụmanụ pụta. Nke bụ́ eziokwu bụ, mgbalị ọ bụla e mere ịchọta obi ụtọ nke dabeere ná nchepụta nke na-eleghara òkè Onye Okike anyị na-ekere anya apụghị ịbụ nke ziri ezi, ọ ga-emechakwa duga ná ndakpọ olileanya. Otu onye amụma oge ochie kwuru, sị: “Ihere emewo ndị maara ihe, . . . lee, okwu Jehova ka ha jụworo; ọ̀ bụkwa aha amamihe gịnị ka ha nwere?”—Jeremaịa 8:9.

Jehova Chineke maara ọdịdị anyị na ihe ga-eme anyị obi ụtọ n’ezie. Ọ maara ihe mere o ji dewe mmadụ n’ụwa na ihe ọdịnihu ga-abụ, ọ na-enyekwa anyị ihe ọmụma ahụ n’ime Bible. Ihe ọ na-ekpughe n’akwụkwọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ na-eme ka ndị nwere obi ziri ezi meghachi omume n’ụzọ dị mma ma na-akpali obi ụtọ. (Luk 10:21; Jọn 8:32) Ọ bụ otú a ka ọ dị n’ebe mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ. Ha nwere nkụda mmụọ mgbe ọ nwụsịrị. Ma mgbe ha nụsịrị n’ọnụ Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie n’onwe ya banyere òkè ọ na-ekere ná nzube Chineke maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ, ha kwuru, sị: “Obi anyị [ó kpoghị] ọkụ n’ime anyị, mgbe Ọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, mgbe Ọ na-emeghere anyị ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ?”—Luk 24:32.

Ọṅụ dị otú ahụ na-amụba mgbe anyị kwere ka eziokwu Bible na-eduzi ndụ anyị. N’akụkụ a, a pụrụ iji obi ụtọ tụnyere eke na ogwurugwu. Ọ na-apụta mgbe ọnọdụ dị mma, ma ọ na-apụtakwu ìhè—ọbụna na-agba abụọ—mgbe ọnọdụ dị nnọọ mma. Ka anyị lezie ihe atụ ole na ole nke otú itinye ozizi Bible n’ọrụ pụrụ isi mee ka e nwekwuo obi ụtọ.

Mee Ka Ndụ Gị Dị Mfe

Nke mbụ, lee ndụmọdụ Jisọs banyere akụ̀ na ụba. Mgbe ọ dụsịrị ọdụ megide ime ka nchụso akụ̀ na ụba bụrụ isi ihe ná ndụ, o kwuru okwu na-akpali mmasị. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anya gị elee otu ebe, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ìhè.” (Matiu 6:19-22) N’ụzọ bụ́ isi, ọ sịrị na ọ bụrụ na anyị ejiri anyaukwu chụsoo akụ̀ na ụba, inwe ikike, ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ ndị mmadụ na-esetịpụrụ onwe ha, anyị agaghị enweta ihe ndị ka mkpa. E kwuwerị, dị ka Jisọs kwuru n’oge ọzọ, “ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Ọ bụrụ na anyị ebute ihe ndị dị mkpa n’ezie ụzọ, dị ka mmekọrịta anyị na Chineke, nchegbu ezinụlọ, na ihe ndị ọzọ yiri ha, mgbe ahụ “anya” anyị ‘ga na-ele otu ebe,’ n’eleghị aghara aghara.

Ghọta na Jisọs anọghị na-akwado ịta onwe onye ahụhụ ma ọ bụ ịnapụ onwe onye ihe n’ụzọ gabigara ókè. E kwuwerị, Jisọs n’onwe ya abụghị onye na-ata onwe ya ahụhụ. (Matiu 11:19; Jọn 2:1-11) Kama nke ahụ, ọ kụziri na oké ihe na-efunahụ ndị na-ele ndụ anya dị ka ohere nkịtị iji kpakọba akụ̀ na ụba.

N’ikwu okwu banyere ụfọdụ ndị ghọrọ aka ji akụ̀ n’oge ha na-akatabeghị ahụ, otu onye ọkà n’ịgwọ ọrịa mmetụta uche nọ na San Francisco, U.S.A., kwuru na nye ha, ego bụ “mkpọrọgwụ nke nchekasị na mgbagwoju anya.” Ọ gbakwụnyere na ndị a “na-azụ ụlọ abụọ ma ọ bụ atọ, otu ụgbọala, na-emefu ego n’ihe dị iche iche. Mgbe nke ahụ na-emeghịkwara ha ya [ya bụ, na-emeghị ha obi ụtọ], ha na-enwe nkụda mmụọ, tọgbọrọ chakoo, n’amaghịkwa ihe ha ga-eji ndụ ha mee.” N’ụzọ dị iche, ndị na-aṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs nke ibi ndụ ka mfe n’ụzọ ihe onwunwe, inyekwa ohere maka ihe ime mmụọ, yikarịrị nnọọ ka ha ga-achọta ezi obi ụtọ.

Tom, bụ́ onye na-ewu ihe owuwu na Hawaii, wepụtara onwe ya n’afọ ofufo iji wuo ebe ofufe n’àgwàetiti ndị dị na Pacific bụ́ ebe ndị mmadụ nwere ihe dị nta n’ụzọ ihe onwunwe. Tom rịbara otu ihe ama banyere ndị a nwere obi umeala. O kwuru, sị: “Ụmụnna m ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst nọ n’àgwàetiti ndị a nwere obi ụtọ n’ezie. Ha nyeere m aka ịhụ nke ọma na ego na ihe onwunwe abụghị ihe ndị na-eduga n’obi ụtọ.” O kirikwara ndị ọrụ afọ ofufo ahụ so ya rụọ ọrụ n’àgwàetiti ndị ahụ ma hụ otú ha si nwee afọ ojuju. “Ha pụrụ ịkpatawo nnukwu ego,” ka Tom kwuru. “Ma ha họọrọ ibute ihe ime mmụọ ụzọ ma na-ebi ndụ dị mfe.” N’ịbụ onye ihe nlereanya ndị a kpaliri, Tom mere ka ndụ ya ka mfe ka o wee nwee ike iwepụtakwu oge iji soro ezinụlọ ya nọkọọ na itinyekwu oge ná nchụso ime mmụọ—nzọụkwụ ọ na-akwabeghị ụta banyere ya.

Obi Ụtọ na Ùgwù Onwe Onye

Mmetụta nke inwe ùgwù onwe onye dị mkpa maka inwe obi ụtọ. N’ihi ezughị okè mmadụ na adịghị ike ndị ọ na-akpata, ụfọdụ ndị nwere echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha, nyekwa ọtụtụ ndị, mmetụta ndị dị otú ahụ malitererịị n’oge ha bụ ụmụntakịrị. Ọ pụrụ isi ike iwepụ mmetụta ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, ma a pụrụ ime ya. Ihe ngwọta ya dị n’itinye Okwu Chineke n’ọrụ.

Bible na-akọwa mmetụta Onye Okike na-enwe n’ebe anyị nọ. Ọ̀ bụ na echiche ya adịghị mkpa karịa nke mmadụ ọ bụla—ọbụna nke anyị onwe anyị? Dị ka ịhụnanya n’onwe ya, Chineke na-ele anyị anya n’enweghị ajọ mbunobi ma ọ bụ echiche ọjọọ. Ọ na-ahụ anyị na-adabere n’ihe anyị bụ, nakwa n’ihe anyị pụrụ ịbụ. (1 Samuel 16:7; 1 Jọn 4:8) N’ezie, ọ na-ele ndị na-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ anya dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa, ee, ndị a na-achọsi ike, ihe ọ sọrọ ezughị okè ha ya bụrụ.—Daniel 9:23; Hagaị 2:7.

N’ezie, Chineke adịghị eleghara adịghị ike anyị na mmehie ọ bụla anyị na-eme anya. Ọ na-atụ anya ka anyị gbalịsie ike ime ihe ziri ezi, ọ na-akwadokwa anyị mgbe anyị na-eme otú ahụ. (Luk 13:24) Ma, Bible na-ekwu, sị: “Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya.” Ọ na-ekwukwa, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị, ka e wee tụọ egwu Gị.”—Abụ Ọma 103:13; 130:3, 4.

Ya mere mụta ile onwe gị anya dị ka Chineke si ele gị. Ịmara na ọ na-ele ndị hụrụ ya n’anya anya dị ka ndị a na-achọsi ike nakwa na o nwere obi ike n’ebe ha nọ—n’agbanyeghị na ha pụrụ ile onwe ha anya dị ka ndị na-erughị eru—pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ime ka mmadụ na-enwekwu obi ụtọ.—1 Jọn 3:19, 20.

Olileanya—Ihe Dị Oké Mkpa Na-eduga n’Obi Ụtọ

Otu echiche a kwalitere na nso nso a bụ́ nke a kpọrọ nkà mmụta uche na akparamàgwà e ji n’aka na-ekwu na nchekwube, bụ́ nke a zụlitere site n’iche echiche ziri ezi na site n’ilekwasị anya n’ikike onwe onye mmadụ, pụrụ iduga n’inwe obi ụtọ. Ọ bụ mmadụ ole na ole ga-agọpụ na iji nchekwube na-ele ndụ na ọdịnihu anya na-etinye ihe n’obi ụtọ anyị. Otú ọ dị, nchekwube dị otú ahụ aghaghị ịdabere n’ihe ndị bụ́ eziokwu, ọ bụghị nnọọ ná nrọ efu. E wezụga nke ahụ, ọ dịghị ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla nke inwe nchekwube ma ọ bụ iche echiche ziri ezi ga-ewepụ agha, agụụ, ọrịa, mmetọ, ịka nká, ma ọ bụ ọnwụ—ihe ndị na-anapụ ọtụtụ ndị obi ụtọ ha. Ka o sina dị, nchekwube nwere ọnọdụ ya.

N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible ejighị okwu ahụ bụ́ nchekwube mee ihe; o ji okwu ka ike mee ihe—olileanya. Vine’s Complete Expository Dictionary na-akọwa “olileanya” dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible dị ka “atụmanya bara uru na nke obi ike, . . . iji obi ụtọ na-atụ anya ihe ọma.” N’ụzọ Bible si jiri ya mee ihe, olileanya karịrị iji nchekwube ele ọnọdụ anya. Ọ na-ezokwa aka n’ihe olileanya mmadụ dịkwasịrị na ya. (Ndị Efesọs 4:4; 1 Pita 1:3) Dị ka ihe atụ, olileanya ndị Kraịst bụ na a ga-ewepụ ihe nile na-ekwesịghị ekwesị a kpọtụrụ aha na paragraf bu ụzọ n’isi nso. (Abụ Ọma 37:9-11, 29) Ma, ọ gụnyere ihe ndị ọzọ.

Ndị Kraịst na-elepụ anya gaa n’oge ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-enweta ndụ zuru okè n’ụwa paradaịs. (Luk 23:42, 43) N’ịkọwakwu olileanya ahụ, Mkpughe 21:3, 4 na-ekwu, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo.”

Onye ọ bụla nke na-atụ anya inwe ọdịnihu dị otú ahụ nwere ihe nile mere ọ ga-eji nwee obi ụtọ, ọbụna ma ọ bụrụ na ọnọdụ ọ nọ na ya ugbu a adịghị mma dị ka ọ chọrọ. (Jemes 1:12) Ya mere gịnị ma i nyochaa Bible ma chọpụta ihe mere ị pụrụ iji kwere ya. Mee ka olileanya gị sikwuo ike site n’itinye oge kwa ụbọchị n’ịgụ Bible. Ime otú ahụ ga-eme ka ị baa ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ, nyere gị aka izere ihe ndị na-anapụ ndị mmadụ obi ụtọ, ma mee ka i nwewa afọ ojuju. Ee, isi ihe kasịnụ na-eduga n’inwe obi ụtọ bụ ime uche Chineke. (Eklisiastis 12:13) Ndụ ọ bụla dabeere n’irube isi n’iwu Bible bụ ndụ obi ụtọ, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “[Obi ụtọ] na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya.”—Luk 11:28.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Nye onye Buddha, ikwere na Chineke bụ ihe na-adịghị mkpa.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

A pụghị ịchọta obi ụtọ site n’ịkpakọba akụ̀ na ụba, ikewapụ onwe onye iche, ma ọ bụ ịtụkwasị obi n’ihe ọmụma a kpaara ókè nke mmadụ

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndụ dabeere n’irube isi n’Okwu Chineke bụ ndụ obi ụtọ

[Foto dị na peeji nke 7]

Olileanya ndị Kraịst na-eme mmadụ obi ụtọ