Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Kwagidere M n’Ụbọchị M Nile

Jehova Kwagidere M n’Ụbọchị M Nile

Akụkọ Ndụ

Jehova Kwagidere M n’Ụbọchị M Nile

DỊ KA FORREST LEE SI KỌỌ

Ndị uwe ojii ka jichisịrị nnọọ ígwè gramophone anyị na akwụkwọ anyị e ji amụ Bible. Agha Ụwa nke Abụọ nyere ndị mmegide ihe mgbakwasị ụkwụ ime ka onye ọchịchị ọhụrụ nke Canada kwenye ịmachibido ọrụ Ndịàmà Jehova iwu. Nke a mere na July 4, 1940.

N’ADAGHỊ mbà n’ihi ihe meworonụ, anyị nwetakwuru akwụkwọ site n’ebe e debere ya ma nọgide n’ime nkwusa anyị. M ga-echeta mgbe nile okwu papa m kwuru mgbe ahụ, sị: “Anyị adịghị akwụsị n’ụzọ dị mfe otú ahụ. Jehova enyewo anyị iwu ime nkwusa.” N’oge ahụ, abụ m onye gbasiri ike nke dị afọ iri. Ma ọbụna taa, mkpebi siri ike nke papa m na ịnụ ọkụ n’obi ya maka ozi ahụ ka bụ ihe ncheta mgbe nile nke otú Chineke anyị, bụ́ Jehova, na-esi akwagide ndị ya na-eguzosi ike n’ihe.

N’oge ọzọ ndị uwe ojii kwụsịrị anyị, ọ bụghị nanị na ha weere akwụkwọ anyị kama ha kpọjekwara papa m n’ụlọ nga, na-ahapụ nanị mama m na ụmụ anọ. Nke ahụ mere na September 1940 na Saskatchewan. N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, a chụpụrụ m n’ụlọ akwụkwọ n’ihi ịgbaso akọ na uche m e ji Bible zụọ nakwa n’ihi ekeleghị ọkọlọtọ ma ọ bụ kwee ukwe e ji eto mba. Ịga n’ihu n’agụmakwụkwọ m site ná nderịta akwụkwọ mere ka m nwee usoro ihe omume a pụrụ ịgbanwe agbanwe, ekekwaara m òkè zuru ezu karị n’ọrụ nkwusa.

Na 1948, a kpọrọ òkù ka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, kwaga n’ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ nke Canada. Ya mere ejere m ịsụ ụzọ na Halifax, Nova Scotia, nakwa na Cape Wolfe, n’Àgwàetiti Prince Edward. N’afọ na-esonụ, anakweere m ọkpụkpọ òkù nke ịrụ ọrụ ruo izu abụọ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Toronto. Izu abụọ ndị ahụ gbatịrị ruo afọ isii nke ije ozi na-akwụghachi ụgwọ. N’ikpeazụ, ezutere m Myrna, bụ́ onye mụ na ya nwekọrọ ịhụnanya maka Jehova, anyị lụkwara na December 1955. Anyị jere biri na Milton, Ontario, n’oge na-adịghịkwa anya, e guzobere ọgbakọ ọhụrụ n’ebe ahụ. Okpukpu nke ime ala nke ebe obibi anyị ghọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ọchịchọ Ịmụbawanye Ozi Anyị

N’afọ ndị sochirinụ, anyị mụrụ ụmụ isii ná nsochi dịtụ ngwa. Ada anyị bụ́ Miriam bụ nke mbụ. Anyị mụziri Charmaine, Mark, Annette, Grant, na n’ikpeazụ Glen. M na-alọtakarị ọrụ wee hụ ka ụmụ anyị nọdụrụ n’ala gburugburu usekwu, ka Myrna na-agụrụ ha Bible, na-akọwara ha ihe ndekọ Bible, na-akụnyekwa n’ime obi ha ezi ịhụnanya maka Jehova. N’ihi nkwado ịhụnanya ya, ụmụ anyị nile nwetara ihe ọmụma kwesịrị ekwesị nke Bible mgbe ha bụ nwata.

Ịnụ ọkụ n’obi nna m nwere maka ozi ahụ enwewo mmetụta na-adịgide adịgide n’uche m nakwa n’obi m. (Ilu 22:6) N’ihi ya, na 1968, mgbe a kpọrọ ezinụlọ Ndịàmà Jehova òkù ịkwaga n’Ebe Etiti nakwa n’Ebe Ndịda Kọntinent America iji nye aka n’ọrụ nkwusa, ọ gụrụ ezinụlọ anyị agụụ ịza òkù ahụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, ụmụ anyị dị malite n’afọ 5 ruo 13, ọ dịghịkwa onye n’ime anyị maara asụsụ Spanish. N’ịgbaso ntụziaka e nyere, emere m njem gaa mba dị iche iche iji chọpụta otú ọnọdụ obibi ndụ dị na ha. Mgbe m lọtasịrị, anyị ji ekpere tụlee nhọrọ anyị dị ka ezinụlọ ma kpebie ịkwaga Nicaragua.

Ije Ozi na Nicaragua

Ka ọ na-erule October 1970, anyị nọzi n’ebe obibi ọhụrụ anyị, n’ime izu atọ kwa, e kenyere m obere ihe omume ná nzukọ ọgbakọ. M jisiri ike mechaa ihe omume m n’asụsụ Spanish m na-amachaghị asụ ma mechie site n’ịkpọ ọgbakọ ahụ dum òkù ịbịa n’ebe obibi anyị na Saturday n’elekere 9:30 nke ụtụtụ maka cerveza. M bu n’obi ikwu servicio, bụ́ okwu e ji eme ihe maka ozi ubi, ma n’ezie, ihe m mere bụ ịkpọ onye ọ bụla òkù ịbịa ṅụọ biya. Ịmụ asụsụ ahụ bụ ihe ịma aka n’ezie!

Na mbụ, edere m ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ n’ọbụ aka m ma mụgharịa ya mgbe m na-aga n’ọnụ ụzọ. M na-ekwu, sị: “Ihe ya na akwụkwọ a so bụ ọmụmụ Bible ebe obibi a na-eduzi n’efu.” Otu onye nke natara akwụkwọ ahụ mesịrị kwuo na ya aghaghị ịbịa nzukọ anyị iji chọpụta ihe m nọ na-agbalị ịgwa ya. Nwoke a ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Lee ka o si pụta ìhè na ọ bụ Chineke na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu ahụ too n’obi ndị dị umeala, ọbụna dị ka Pọl onyeozi kwetara!—1 Ndị Kọrint 3:7.

Mgbe anyị nọsịrị ihe dị ka afọ abụọ n’isi obodo bụ́ Managua, a gwara anyị ka anyị kwaga n’akụkụ ndịda Nicaragua. N’ebe ahụ, anyị so ọgbakọ dị na Rivas rụkọọ ọrụ gụnyekwara ìgwè ndị nwere mmasị bụ́ ndị nọ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Pedro Peña, bụ́ Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke meworo okenye karị, sonyeere m mgbe anyị letara ìgwè ndị a. Otu n’ime ha dị n’àgwàetiti nke nwere ugwu mgbawa bụ́ nke dị n’Ọdọ Mmiri Nicaragua, bụ́ ebe e nwere nanị otu ezinụlọ nke Ndịàmà Jehova.

N’agbanyeghị na ezinụlọ a nwere ihe onwunwe dị nnọọ nta, ha mere oké mgbalị iji gosi ekele maka nleta anyị. N’uhuruchi anyị bịarutere, nri dị adị na-eche anyị. Anyị nọrọ otu izu, ọtụtụ n’ime ndị anyị hụrụ n’anya nọkwa n’ebe ahụ, bụ́ ndị nwere mmasị na Bible, sooro anyị kerịta nri ha. Obi tọrọ anyị nnọọ ụtọ inwe 101 mmadụ bụ́ ndị bịara gere okwu ihu ọha sitere na Bible e kwuru na Sunday.

Echere m na e gosipụtara ike nkwado Jehova mgbe, n’oge ọzọ, anyị na-aga ileta otu ìgwè ndị nwere mmasị n’ugwu ndị dị nso n’ókèala Costa Rica. N’ụbọchị ahụ anyị ga-aga, Pedro bịara ịkpọrọ m, ma edina m n’àkwà n’ihi ịba. “Pedro, apụghị m ije,” ka m kwuru. N’ịtụkwasị aka ya n’egedege ihu m, ọ zaghachiri, sị: “I nwere oké ahụ ọkụ, ma ọ dị mkpa ka ị bịa! Ụmụnna na-eche anyị.” O kpeziri otu n’ime ekpere ndị kasị site n’ala ala obi m nụtụworo.

Mgbe e mesịrị, m kwuru, sị: “Jee were fresco (ihe ọṅụṅụ mkpụrụ osisi) ị ga-aṅụ. M ga-adị njikere n’ihe dị ka minit iri.” Ezinụlọ abụọ nke Ndịàmà bi n’ógbè ahụ anyị letara, ha lekọtakwara anyị n’ụzọ magburu onwe ya. N’echi ya, anyị so ha jee ime nkwusa, ọ bụ ezie na ike ka gwụrụ m n’ihi ahụ ọkụ. Lee ihe na-ewusi ike ọ bụ ịhụ ka ihe karịrị otu narị mmadụ bịara nzukọ anyị na Sunday!

Ịkwapụ Ọzọ

Na 1975, a mụrụ nwa anyị nke asaa, bụ́ Vaughn. N’afọ na-esonụ, ọ bịara dị mkpa ka anyị laghachi Canada n’ihi ihe ndị metụtara ego. Ịhapụ Nicaragua adịghị mfe n’ihi na n’ezie anyị enwewo mmetụta nke ike nkwado Jehova n’oge anyị nọ n’ebe ahụ. Ka ọ na-erule mgbe anyị kwapụrụ, ihe karịrị mmadụ 500 n’ókèala ọgbakọ anyị na-abịa nzukọ.

Tupu oge ahụ, mgbe a họpụtara mụ na ada anyị bụ́ Miriam dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Nicaragua, Miriam jụrụ m, sị: “Papa, ọ bụrụ na e nwee mgbe ị na-aghaghị ịlaghachi Canada, ị̀ ga-ekwe ka m nọrọ ebe a?” Ebughị m n’obi ịkwapụ mgbe ọ bụla, n’ihi ya m kwuru, sị: “Ee, m ga-ekwe!” Ya mere, mgbe anyị kwapụrụ, Miriam nọgidere iji gaa n’ihu n’ozi oge nile ya. Mgbe e mesịrị, ọ lụrụ Andrew Reed. Na 1984, ha jere klas nke 77 nke Gilead, bụ́ ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke dị mgbe ahụ na Brooklyn, New York. Miriam so di ya na-eje ozi ugbu a na Dominican Republic, na-emezu ọchịchọ ọmarịcha ndị ozi ala ọzọ nọ na Nicaragua kụnyere n’ime ya.

Ka ọ dịgodị, okwu papa m bụ́, “anyị adịghị akwụsị n’ụzọ dị mfe otú ahụ,” ka na-anụ m ọkụ n’obi. Ya mere ka ọ na-erule 1981, mgbe anyị chekwaworo ego zuru ezu iji laghachi Etiti Kọntinent America, anyị kwapụrụ ọzọ, na nke ugbu a jee Costa Rica. Mgbe anyị na-eje ozi n’ebe ahụ, a kpọrọ anyị òkù inye aka n’owuwu nke alaka ọhụrụ ha. Otú ọ dị, na 1985, nwa anyị nwoke bụ́ Grant chọrọ nlekọta ahụ ike, n’ihi ya anyị laghachiri Canada. Glen nọgidere na Costa Rica iji rụọ ọrụ n’ọrụ ihe owuwu nke alaka ahụ, ebe Annette na Charmaine jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị bụ́ ndị hapụrụ Costa Rica arọtụghị ná nrọ na anyị agaghị alaghachi.

Ịnagide Ahụhụ

Na September 17, 1993, chi bọrọ gbaa, anwụ ana-achakwa. Mụ na ọkpara anyị bụ́ Mark nọ na-amachite elu ụlọ. Anyị rụkọrọ ọrụ ọnụ, na-ekwurịta banyere ihe ime mmụọ, dị ka anyị na-eme mgbe nile. N’ụzọ ụfọdụ, azọhiere m ụkwụ ma si n’elu ụlọ ahụ daa. Mgbe m nwetaghachiri onwe m, nanị ihe m pụrụ ịhụ bụ ìhè na-enwu zaa nakwa ndị mmadụ yi uwe ọcha. Ọ bụ n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede nke ụlọ ọgwụ.

N’ihi ihe Bible kwuru, mmeghachi omume mbụ m bụ: “Achọghị m ọbara, achọghị m ọbara!” (Ọrụ 15:28, 29) Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịnụ ka Charmaine kwuru, sị: “Nsogbu adịghị, papa. Anyị nile nọ ebe a.” Emesịrị m mata na ndị dọkịta hụrụ akwụkwọ nlekọta ahụ ike m, ọ dịtụghịkwa mgbe e kwutere okwu iji ọbara mee ihe. Olu m agbajiwo, apụghịkwa m imegharị ahụ ma ọlị, enweghịdị m ike iku ume n’onwe m.

N’ịbụ onye na-apụghị ịgagharị agagharị, ọ dị m mkpa ịbụ onye Jehova kwagidere karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ahụ a wara m iji tinye tub na-enye aka n’iku ume, mechiri ebe ikuku si abanye n’akwara ụda olu m. Apụghị m ikwu okwu. Ndị mmadụ aghaghị ile anya n’egbugbere ọnụ m iji ghọta ihe m na-agbalị ikwu.

Ụgwọ a ga-akwụ rịrị elu ngwa ngwa. Ebe nwunye m na ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ m nọ n’ozi oge nile, atụgharịrị m uche ma ọ̀ ga-adị ha mkpa ịhapụ ozi a iji kwụọ ụgwọ ndị a. Otú ọ dị, Mark nwetara ọrụ bụ́ nke, n’ime nanị ọnwa atọ, nyere aka n’ịkwụ ihe dị ukwuu n’ime ụgwọ a. N’ihi ya, ha nile nọgidere n’ozi oge nile ma e wezụga mụ na nwunye m.

Ọtụtụ narị kaadị ozi ekele na akwụkwọ ozi ndị sitere ná mba isii dị iche iche jupụtara n’ahụ ájá nke ọnụ ụlọ m n’ụlọ ọgwụ. N’ezie, Jehova nọ na-akwagide m. Ọgbakọ nyekwaara ezinụlọ m aka site n’iwetara ha nri n’oge ụfọdụ n’ime ọnwa ise na ọkara m nọrọ ná ngalaba na-elekọta ndị ọrịa ha siri ike. Kwa ụbọchị, otu onye Kraịst bụ́ okenye na-eso m nọrọ n’ehihie, na-agụrụ m Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible, tinyere ịkọ ahụmahụ ndị na-agba ume. Mmadụ abụọ n’ime ndị ezinụlọ m na-eso m akwadebe maka nzukọ ọ bụla nke ọgbakọ, n’ihi ya ọ dịtụghị mgbe nri ime mmụọ dị oké mkpa funahụrụ m.

Mgbe m ka nọ n’ụlọ ọgwụ, e meere m ndokwa ịga usoro ihe omume ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Ndị ọrụ ụlọ ọgwụ haziri ka otu nọọsụ ruru eru na otu ọkà n’ihe metụtara iku ume sonyere m ogologo ụbọchị ahụ dum. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ iso ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst nọkọọ ọzọ! Agatụghị m echefu ịhụ ka ọtụtụ narị mmadụ kwụ n’ahịrị na-echere ka o ruoro ha ikele m.

Ịnọgide Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe

N’ihe dị ka otu afọ mgbe ihe mberede ahụ gasịrị, m sooro ezinụlọ m laghachi n’ebe obibi anyị, ọ bụ ezie na m ka chọrọ nlekọta onye nọọsụ n’esepụghị aka. Otu ụgbọala a rụrụ n’ụzọ pụrụ iche na-enyere m aka ije nzukọ, bụ́ nke m na-adịghị ahapụkebe. Otú ọ dị, aghaghị m ikweta na ọ na-achọ mkpebi siri ike iji jee. Kemgbe m lọtara, enwewo m ike jee mgbakọ distrikti nile.

N’ikpeazụ, na February 1997, enwetaghachiri m ike ikwu okwu ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè. Ụfọdụ n’ime ndị nọọsụ ahụ na-eji ekele ege ntị ka m na-eso ha ekerịta olileanya m dabeere na Bible. Otu nọọsụ agụworo m akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom n’ozuzu ya, tinyere akwụkwọ ndị ọzọ Watch Tower bipụtara. Ana m edere ndị mmadụ akwụkwọ ozi site n’iji osisi na-apị kọmputa. Ọ bụ ezie na iji kọmputa ede ihe n’ụzọ dị otú a na-agwụ nnọọ ike, ọ bụ ihe na-akwụghachi ụgwọ ịnọgide na-ekere òkè n’ozi.

Ana m enwe oké ihe mgbu n’akwara ozi m. Ma ọ na-adị ka mgbe m na-eso ndị ọzọ ekerịta eziokwu Bible ma ọ bụ na-ege ntị ka a na-agụrụ m ya, ana m enweretụ onwe m. Mgbe ụfọdụ, ana m eso nwunye m, onye na-enye nkwado, na-agba àmà okporo ámá, ọ na-akọwara m okwu mgbe enyemaka dị mụ mkpa. Ọtụtụ mgbe, enwewo m ike ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka. Ije ozi dị ka onye Kraịst bụ́ okenye na-enye m ọṅụ, karịsịa mgbe ụmụnna na-abịakwute m ná nzukọ ma ọ bụ leta m n’ebe obibi m, m nweekwa ike inyere ha aka ma gbaa ha ume.

Aghaghị m ikweta na ọ na-adị mfe ịda mbà n’obi. Ya mere, mgbe ọ bụla m nwere nkụda mmụọ, ana m ekpe ekpere ozugbo ka m wee nwee ọṅụ. Ehihie na abalị ana m ekpe ekpere ka Jehova nọgide na-akwagide m. Akwụkwọ ozi mmadụ ziteere m ma ọ bụ nleta o mere na-emekarị ka m nwee obi ụtọ. Ịgụ magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! na-eme ka echiche na-ewuli elu jupụta n’uche m. Ndị nọọsụ dị iche iche na-agụrụ m magazin ndị a mgbe ụfọdụ. Kemgbe m nwesịrị ihe mberede ahụ, egewo m ruo ugboro asaa ka e ji teepu gụchapụ Bible n’ozuzu ya. Ndị a so n’ụzọ dị iche iche Jehova siworo kwagide m.—Abụ Ọma 41:3.

Mgbanwe ọnọdụ m gbanwere enyewo m oge dị ukwuu ịtụgharị uche n’otú Onye Nkụzi Ukwu anyị, bụ́ Jehova, si akụziri anyị ihe maka ịdị ndụ. Ọ na-enye anyị ezi ihe ọmụma banyere uche ya na nzube ya, ozi nke nwere nzube, ndụmọdụ banyere isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ, na nghọta iji mara ihe anyị ga-eme n’oge ahụhụ. Jehova ejiriwo ezigbo nwunye kwesịrị ntụkwasị obi gọzie m. Ụmụ m kwa ejiriwo iguzosi ike n’ihe nọgide n’akụkụ m, ọ bụkwa ihe na-enye m ọṅụ na ha nile ekerewo òkè n’ozi oge nile. N’ezie, na March 11, 2000, nwa anyị nwoke bụ́ Mark na nwunye ya bụ́ Allyson, gụsịrị akwụkwọ na klas nke 108 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, e kenyekwara ha ije Nicaragua. Mụ na nwunye m jere ihe omume ngụsị akwụkwọ ha. Apụrụ m ikwu n’eziokwu na ahụhụ agbanwewo ndụ m ma ọ bụghị obi m.—Abụ Ọma 127:3, 4.

Ana m ekele Jehova n’ihi amamihe o nyeworo m iji mee ka m nwee ike inyefe ezinụlọ m ihe nketa ime mmụọ m natara. Ọ na-ewusi m ike, na-agbakwa m ume ịhụ ka ụmụ m na-ejere Onye Okike ha ozi, na-enwe àgwà yiri nke nna m, bụ́ onye kwuru, sị: “Anyị adịghị akwụsị n’ụzọ dị mfe otú ahụ. Jehova nyere anyị iwu ime nkwusa.” N’ezie, Jehova akwagidewo mụ na ezinụlọ m n’ụbọchị anyị nile.

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na papa m, ụmụnne m ndị nwoke, na nwanne m nwanyị, na nso ụgbọala anyị nke anyị ji mere ụlọ, nke e ji mee ihe n’oge ndị anyị sụrụ ụzọ. Anọ m n’aka nri

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m, bụ́ Myrna

[Foto dị na peeji nke 26]

Foto ezinụlọ anyị sere na nso nso a

[Foto dị na peeji nke 27]

M ka na-eji akwụkwọ ozi agba àmà