Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè

Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè

Nṅụrị Ọṅụ Nye Ndị Na-aga Ije n’Ìhè

“Bịanụ, ka anyị jegharịa n’ìhè Jehova.”—AỊSAỊA 2:5.

1, 2. (a) Olee otú ìhè dịruru ná mkpa? (b) Gịnị mere ịdọ aka ná ntị ahụ bụ́ na ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa ji bụrụ nke dị oké mkpa?

JEHOVA bụ Isi Iyi nke ìhè. Bible na-akpọ ya “Onye na-enye anyanwụ ka ọ bụrụ ìhè n’ehihie, na ụkpụrụ nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha bụrụ ìhè n’abalị.” (Jeremaịa 31:35; Abụ Ọma 8:3) Ọ bụ Onye kere anyanwụ anyị, nke bụ́, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, nnukwu ite ọkụ nuklia na-ewepụta ike dị nnọọ ukwuu na mbara igwe, nke ụfọdụ n’ime ya dị n’ụdị ìhè na okpomọkụ. Ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ nta nke ike ahụ bụ́ nke na-erute anyị dị ka ìhè anyanwụ na-akwado ndụ n’ụwa a. E wezụga ìhè anyanwụ, anyị agaghị adị. Ụwa gaara abụ mbara ala nke ndụ na-adịghị na ya.

2 N’iburu nke ahụ n’uche, anyị pụrụ ịghọta ịdị mkpa nke otu ọnọdụ Aịsaịa onye amụma kọwara. O kwuru, sị: “Lee! ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) Otú ọ dị, nke a adịghị ezo aka n’ọchịchịrị n’ụzọ nkịtị. Ihe Aịsaịa bu n’uche abụghị na otu ụbọchị, anyanwụ, ọnwa, na kpakpando ga-akwụsị inye ìhè. (Abụ Ọma 89:36, 37; 136:7-9) Kama nke ahụ, ọ nọ na-ekwu banyere ọchịchịrị ime mmụọ. Ma, ọchịchịrị ime mmụọ na-akpata ọnwụ. N’ikpeazụ, anyị apụghị ịdị ndụ ma ìhè ime mmụọ adịghị, dị nnọọ ka anyị na-apụghị ịdị ndụ ma ìhè nkịtị adịghị.—Luk 1:79.

3. N’iburu okwu Aịsaịa n’uche, gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị ime?

3 N’ihi nke a, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịbasi ama ike na, n’agbanyeghị na okwu Aịsaịa mezuru n’ahụ Juda oge ochie, ha na-enwe mmezu ka ukwuu taa. Ee, n’oge anyị, ọchịchịrị ime mmụọ ekpuchiwo ụwa. N’ọnọdụ dị otú ahụ dị ize ndụ, ìhè ime mmụọ kasị dị mkpa. Ọ bụ ya mere ndị Kraịst ji eme nke ọma n’ịṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs, bụ́: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ.” (Matiu 5:16) Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ime ka ìhè nwuoro ndị dị umeala n’obi, si otú a na-enye ha ohere inweta ndụ.—Jọn 8:12.

Oge Ndị Gbara Ọchịchịrị n’Israel

4. Olee oge mbụ e mezuru okwu amụma Aịsaịa, ma ọnọdụ dị aṅaa ka e nwererịị n’oge Aịsaịa?

4 Oge mbụ e mezuru okwu Aịsaịa banyere ọchịchịrị ikpuchi ụwa bụ mgbe Juda tọgbọọrọ n’efu, e meekwa ka ndị ya jee biri na Babilọn. Otú ọ dị, ọbụna tupu mgbe ahụ, n’oge Aịsaịa n’onwe ya, ọchịchịrị ime mmụọ ekpuchiworị ihe ka ọtụtụ ná mba ahụ, nke bụ́ ihe kpaliri ya ịgba ụmụ amaala ibe ya ume, sị: “Ụlọ Jekọb, bịanụ, ka anyị jegharịa n’ìhè Jehova”!—Aịsaịa 2:5; 5:20.

5, 6. Olee ihe ndị tụnyere ụtụ n’ọchịchịrị ahụ e nwere n’oge Aịsaịa?

5 Aịsaịa buru amụma na Juda “n’ụbọchị Ụzaịa na Jotam na Ehaz na Hezekaịa, bụ́ ndị eze Juda.” (Aịsaịa 1:1) Ọ bụ oge nsogbu nke ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihu abụọ nke okpukpe, nrụrụ aka n’ikpe, na imegbu ndị ogbenye. Ọbụna n’oge ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Jotam, na-achị, a pụrụ ịhụ ebe ịchụàjà nke chi ụgha dị iche iche n’elu ọtụtụ ugwu. Mgbe ndị eze na-ekwesịghị ntụkwasị obi chịrị, ọnọdụ ahụ dịrị njọ karị. Dị ka ihe atụ, ajọ Eze Ehaz garuru n’ókè nke iji nwa ya chụọrọ chi bụ́ Mọlek àjà ememe okpukpe. Nke ahụ bụ ọchịchịrị n’ezie!—2 Ndị Eze 15:32-34; 16:2-4.

6 Ọnọdụ metụtara mba ndị ọzọ gbakwara ọchịchịrị. Moab, Edọm, na Filistia nọcha n’ụzọ na-eyi egwu n’ókèala Juda. Alaeze ebe ugwu nke Israel, n’agbanyeghị na ha bụ ụmụnne, mere ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye iro. A gamikwuo n’ebe ugwu, Siria yiri udo Juda egwu. Nke dị ize ndụ ọbụna karị bụ Asiria dị obi ọjọọ, nke nọ mgbe nile na-achọgharị ohere ndị ọ ga-eji eme ka ike ya sakwuo mbara. N’oge Aịsaịa buru amụma, Asiria meriri mba Israel, ọ fọkwara nke nta ka o bibie Juda. N’otu oge, Asiria meriri obodo nile e wusiri ike na Juda ma e wezụga Jerusalem.—Aịsaịa 1:7, 8; 36:1.

7. Olee ụzọ Israel na Juda họọrọ, oleekwa otú Jehova si meghachi omume?

7 Ọdachi ndị dị otú ahụ dakwasịrị ndị ha na Chineke gbara ndụ n’ihi na Israel na Juda eguzosighị ike n’ihe nye ya. Dị ka ndị ahụ e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Ilu, ha nọ “na-ahapụ okporo ụzọ nile nke izi ezi, ka ha wee jee ije n’ụzọ nile nke ọchịchịrị.” (Ilu 2:13) Ma, ọ bụ ezie na Jehova wesoro ndị ya iwe, ọ gbahapụghị ha kpam kpam. Kama nke ahụ, ọ kpọlitere Aịsaịa na ndị amụma ndị ọzọ ka ha nye onye ọ bụla nọ ná mba ahụ nke ka chọrọ iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, ìhè ime mmụọ. Ìhè ndị amụma a nyere dị oké ọnụ ahịa n’ezie. Ọ na-enye ndụ.

Oge Ọchịchịrị Taa

8, 9. Olee ihe ndị na-atụnye ụtụ n’ọchịchịrị ụwa nọ na ya taa?

8 Ọnọdụ dị n’oge Aịsaịa yiri nnọọ nke dị taa. N’oge anyị, ndị ndú bụ́ mmadụ agbakụtawo Jehova na Eze o mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, azụ. (Abụ Ọma 2:2, 3) Ndị ndú okpukpe Krisendọm aghọgbuwo ìgwè atụrụ ha. Ndị ndú dị otú ahụ na-azọrọ na ha na-ejere Chineke ozi, ma n’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-akwalite chi dị iche iche nke ụwa a—ịhụ mba n’anya, agha, akụ̀ na ụba, na ndị a ma ama—e kwuwebeghị banyere izi ozizi ndị ọgọ mmụọ.

9 Site n’otu ebe ruo ebe ọzọ, okpukpe dị iche iche nke Krisendọm ekerewo òkè n’agha nakwa n’esemokwu obodo ndị a nọ na ha egbuchapụ agbụrụ dị iche iche ma na-eme ihe ndị ọzọ na-eyi egwu. Ọzọkwa, kama ịkwalite ụkpụrụ omume ọma dabeere na Bible, ọtụtụ chọọchị na-eleghara omume rụrụ arụ ndị dị ka ịkwa iko na ndina ụdị onwe anya ma ọ bụ na-akwadosi ha ike. N’ihi ịjụ ụkpụrụ Bible n’ụzọ dị otú ahụ, ìgwè atụrụ Krisendọm yiri ndị ahụ ọbụ abụ oge ochie ahụ kwuru banyere ha, sị: “Ha amaghị, ha aghọtaghịkwa; n’ọchịchịrị ka ha na-ejegharị.” (Abụ Ọma 82:5) N’ezie, dị ka Juda oge ochie, Krisendọm nọ n’oké ọchịchịrị.—Mkpughe 8:12.

10. Olee otú ìhè si enwu n’ọchịchịrị taa, oleekwa otú ndị dị umeala n’obi si erite uru?

10 Ka ọchịchịrị dị otú ahụ gbara, Jehova na-eme ka ìhè na-enwu n’ihi ndị dị umeala n’obi. N’ihi nke a, ọ na-eji ndị ohu ya e tere mmanụ nọ n’ụwa, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” eme ihe, ha ‘na-enwukwa dị ka ndị na-enye ìhè.’ (Matiu 24:45; Ndị Filipaị 2:15) Òtù ohu ahụ, bụ́ ndị ọtụtụ nde ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ na-akwado, na-egbukepụ ìhè ime mmụọ dabeere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Jọn 10:16) N’ụwa a nke gbara ọchịchịrị, ìhè dị otú ahụ na-enye ndị dị umeala n’obi olileanya, na-enyere ha aka iso Chineke na-enwe mmekọrịta, na-enyekwara ha aka izere ọnyà ime mmụọ. Ọ dị oké ọnụ ahịa, na-enye ndụ.

“M Ga-ekele Aha Gị”

11. Ihe ọmụma dị aṅaa ka Jehova nyere n’oge Aịsaịa?

11 N’oge ndị ahụ gbara ọchịchịrị Aịsaịa dịrị ndụ, nakwa ọbụna n’oge ndị ahụ ka gbaa ọchịchịrị mgbe nke ahụ gasịrị bụ́ mgbe ndị Babilọn dọọrọ mba Jehova n’agha, olee ụdị nduzi Jehova nyere? E wezụga inye nduzi banyere omume ọma, tupu oge eruo, o kwupụtara n’ụzọ doro anya otú ọ ga-esi emezu nzube ya banyere ndị ya. Dị ka ihe atụ, tụlee amụma ndị dị ebube dị n’Aịsaịa isi 25 ruo 27. Okwu ndị dị n’isiakwụkwọ ndị a na-egosi otú Jehova siri mee ihe laa azụ n’oge ahụ na otú o si na-eme ihe taa.

12. Okwu dị aṅaa sitere n’obi ka Aịsaịa kwuru?

12 Nke mbụ, Aịsaịa kwupụtara, sị: “Jehova, Chineke m ka Ị bụ; m ga-eme ka Ị dị elu, m ga-ekele aha Gị.” Lee nkwupụta otuto sitere n’obi nke a bụ! Ma gịnị kpaliri onye amụma ahụ ikpe ụdị ekpere a? E kpughere otu isi ihe kpatara ya ná nkera nke abụọ nke amaokwu ahụ, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “N’ihi na I [Jehova] mewo ihe ebube, bụ́ ndụmọdụ dị iche iche site na mgbe dị anya gara aga, n’ikwesị ntụkwasị obi na eziokwu.”—Aịsaịa 25:1.

13. (a) Ihe ọmụma dị aṅaa mere ka ekele Aịsaịa nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mụta ihe site n’ihe nlereanya Aịsaịa?

13 Ka ọ na-erule n’oge Aịsaịa, Jehova emeworo Israel ọtụtụ ihe ndị dị ebube, e detuwokwa ha edetu. O doro anya na Aịsaịa maara ihe ndekọ ndị a nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ maara na Jehova si n’ịbụ ohu n’Ijipt kpọpụta ndị ya ma zọpụta ha pụọ n’ọnụma nke usuu ndị agha Fero n’Oké Osimiri Uhie. Ọ maara na Jehova si n’ọzara duru ndị ya banye n’Ala Nkwa ahụ. (Abụ Ọma 136:1, 10-26) Ihe ndekọ ndị mere eme dị otú ahụ gosiri na Jehova Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye a pụrụ ịdabere na ya. ‘Ndụmọdụ ya dị iche iche’—ihe nile ọ na-ezube—na-emezu. Ezi ihe ọmụma Chineke nyere wusikwuru Aịsaịa ike ịnọgide na-aga ije n’ìhè. N’ihi ya, ọ bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya. Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya na-amụ Okwu Chineke e dere ede ma na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị, anyị onwe anyị kwa ga-anọgide n’ìhè.Abụ Ọma 119:105; 2 Ndị Kọrint 4:6.

E Bibie Otu Obodo

14. Gịnị ka e buru n’amụma banyere otu obodo, oleekwa obodo o yiri ka ọ bụ?

14 A na-ahụ otu ihe atụ nke ndụmọdụ Chineke n’Aịsaịa 25:2, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “I mewo ka obodo ghọọ obo ihe; I mewo ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dara ada: I mewo ka ụlọ elu nke ndị ala ọzọ ghara ịbụ obodo; ruo mgbe ebighị ebi a gaghị ewu ya.” Olee obodo dị ihe a? O yiri ka Aịsaịa ọ nọ na-ekwu n’ụzọ amụma banyere Babilọn. N’ezie, oge ruru mgbe Babilọn ghọrọ nanị obo ihe.

15. Olee “obodo ukwu” dịnụ taa, gịnịkwa ga-eme ya?

15 Obodo ahụ Aịsaịa kpọtụrụ aha ò nwere nke dị nnọọ ka ya taa? Ee. Akwụkwọ Mkpughe na-ekwu banyere “obodo ukwu ahụ, nke nwere alaeze na-achị ndị eze ụwa.” (Mkpughe 17:18) Obodo ukwu ahụ bụ “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:5) Taa, akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ bụ Krisendọm, nke ndị ụkọchukwu ya na-ebute ụzọ n’imegide ọrụ nkwusa Alaeze nke ndị Jehova. (Matiu 24:14) Otú ọ dị, dị ka Babilọn oge ochie, a ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ n’isi nso, ọ gaghị ebili ọzọ ma ọlị.

16, 17. Olee otú ndị iro Jehova siworo sọpụrụ ya n’oge ochie nakwa n’oge a?

16 Gịnị ọzọ ka Aịsaịa na-ebu n’amụma banyere “obodo e wusiri ike”? Ka ọ na-agwa Jehova okwu, Aịsaịa na-asị: “Ndị dị ike ga-asọpụrụ Gị, obodo nke ndị mba ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji ga-atụ egwu Gị.” (Aịsaịa 25:3) Olee otú obodo ndị iro a, “obodo nke ndị mba ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji,” ga-esi asọpụrụ Jehova? Cheta ihe mere eze kasị ike nke Babilọn, bụ́ Nebukadneza. Mgbe o nwesịrị ahụmahụ na-akpali iche echiche bụ́ nke mere ka adịghị ike nke ya pụta ìhè, a manyere ya ikweta ịdị ukwuu nke Jehova na ike Ya nke kasị ike nile. (Daniel 4:34, 35) Mgbe Jehova gosipụtara ike ya, a na-amanye ọbụna ndị iro ya ikweta ọrụ ya ndị dị ike, ọ bụ ezie na ha adịghị eji obi ha eme ya.

17 Ọ̀ dịtụwo mgbe a manyere Babilọn Ukwu ahụ ikweta ọrụ ndị dị ike nke Jehova? Ee. N’oge agha ụwa mbụ, ndị ohu Jehova e tere mmanụ mere nkwusa n’okpuru mkpagbu. Na 1918 ha gara ná ndọrọ n’agha ime mmụọ mgbe a tụrụ ndị isi nke Watch Tower Society mkpọrọ. Ọ fọrọ nke nta ka ọrụ nkwusa a haziri ahazi kwụsị. E mesịa, na 1919, Jehova weghachiri ha ma jiri mmụọ ya nyekwuo ha ike, nke mere na ha malitere ịrụ ọrụ e nyere ha bụ́ ikwusa ozi ọma ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Mak 13:10) E buru ihe a nile n’amụma n’akwụkwọ Mkpughe, dịkwa ka e buru mmetụta ọ ga-enwe n’ebe ndị na-emegide ha nọ. Ha ‘tụrụ egwu wee nye Chineke nke eluigwe otuto.’ (Mkpughe 11:3, 7, 11-13) Ọ bụghị na a tọghatara ha nile, kama, a manyere ha ịnakwere ọrụ dị ike nke Jehova n’oge ahụ, dị nnọọ ka Aịsaịa buru n’amụma.

‘Ebe Siri Ike Nye Onye Na-adịghị Ike’

18, 19. (a) N’ihi gịnị ka ndị mmegide jiworo daa n’imebi iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Jehova? (b) Olee otú a ga-esi eweda “abụ ọma nke ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji”?

18 N’ilekwasị anya ugbu a ná mmeso obiọma Jehova na-emeso ndị na-eje ije n’ìhè ahụ, Aịsaịa gwara Jehova, sị: “Ị bụworo onye na-enweghị ike ebe siri ike, Ị bụworo ogbenye ebe siri ike n’ime mkpa na-akpa ya, ebe mgbaba ịpụ n’oké mmiri ozuzo, ndò ịpụ n’okpomọkụ, mgbe oké ifufe nke ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji dị ka oké mmiri ozuzo na-amakwasị mgbidi. Dị ka okpomọkụ n’ebe kpọrọ nkụ, otú a ka Ị ga-eme ka mkpọtụ nke ndị ala ọzọ daruo ala; dị ka okpomọkụ site na ndò nke igwe ojii, otú a ka a ga-eweda abụ ọma nke ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji.”—Aịsaịa 25:4, 5.

19 Kemgbe 1919, ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji agbalịwo ihe nile iji mebie iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị na-efe ezi ofufe, ma ha adawo. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova bụ ebe e wusiri ike na ebe mgbaba nke ndị ya. Ọ na-enye ndò dị jụụ pụọ n’okpomọkụ na-ere ọkụ nke mkpagbu, ọ na-eguzokwa dị ka mgbidi siri ike megide oké ifufe mmiri nke mmegide. Anyị bụ́ ndị na-aga ije n’ìhè Chineke ji obi ike atụ anya oge “a ga-eweda abụ ọma nke ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji.” Ee, anyị ji oké mmasị na-echere ụbọchị ahụ mgbe ndị iro Jehova na-agakwaghị adị.

20, 21. Oké oriri dị aṅaa ka Jehova na-eme, gịnịkwa ka oké oriri ahụ ga-agụnye n’ụwa ọhụrụ?

20 Jehova na-eme ihe karịrị ichebe ndị ohu ya. Ọ na-enye ha ihe dị ka Nna nke hụrụ ha n’anya. Mgbe ọ tọhapụsịrị ndị ya na Babilọn Ukwu ahụ na 1919, o dokwaara ha oké oriri mmeri, bụ́ nri ime mmụọ o nyere n’ụba. E buru nke a n’amụma n’Aịsaịa 25:6, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma.” Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi iso n’oriri ahụ! (Matiu 4:4) N’ezie, a kwajuru ihe ndị dị mma oriri n’elu “tebụl Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 10:21) Site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” a na-enye anyị ihe nile pụrụ ịdị anyị mkpa mgbe ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ.

21 E nwekwara ihe ndị ọzọ oriri a nke Chineke mere na-agụnye. Oriri ime mmụọ anyị na-eri ugbu a na-echetara anyị nri nkịtị a ga-enwe n’ụba n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. Mgbe ahụ, “oké oriri nke ihe mara abụba” ga-agụnye nri nkịtị n’ụba. Ọ dịghị onye ga na-anọ agụụ n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ. Lee ahụ efe nke ahụ ga-abụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi anyị hụrụ n’anya bụ́ ndị na-ata ahụhụ ugbu a n’ihi “oké ụnwụ” ahụ e buru n’amụma bụ́ nke so ‘n’ihe ịrịba ama’ nke ọnụnọ Jisọs! (Matiu 24:3, 7) Nye ha, okwu ọbụ abụ ahụ na-akasi obi n’ezie. O kwuru, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16.

22, 23. (a) Olee “ihe mkpuchi,” ma ọ bụ “ihe mfụchi,” a ga-ewepụ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? (b) Olee otú a ga-esi ewepụ ‘ịta ụta nke ndị Jehova’?

22 Gezie ntị ná nkwa dị ebube ọbụna karị. N’iji mmehie na ọnwụ tụnyere “ihe mkpuchi” ma ọ bụ “ihe mfụchi,” Aịsaịa na-asị: “N’ugwu a ka [Jehova] ga-eloda ihu ihe mfụchi ahụ e ji afụchi ndị nile dị iche iche, na ihe mkpuchi ahụ e ji ekpuchi mba nile.” (Aịsaịa 25:7) Cheedị echiche! Mmehie na ọnwụ, bụ́ ihe ndị kpukwasịworo ihe a kpọrọ mmadụ dị ka blanket na-adịghị ekwe mmadụ kuru ume, agakwaghị adị. Lee ka anyị si atụ anya ụbọchị ahụ mgbe a ga-eji uru nke àjà mgbapụta Jisọs mee ihe n’ụzọ zuru ezu maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ma na-ekwesị ntụkwasị obi!—Mkpughe 21:3, 4.

23 Ka ọ na-atụ aka n’oge ahụ magburu onwe ya, onye amụma ahụ e nyere ike mmụọ nsọ na-emesi anyị obi ike, sị: “[Chineke ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile; ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.” (Aịsaịa 25:8) Ọ dịghị onye ga-anwụ n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ kwaa ákwá n’ihi na onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ ya. Lee mgbanwe na-enye obi ụtọ nke a ga-abụ! Ọzọkwa, ọ dịghị ebe ọ bụla n’ụwa a a ga-anụ nkọcha na mgbasa echiche ụgha nke Chineke na ndị ohu ya diworo eri ogologo oge. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova ga-ewepụ onye na-akpata ha—nna nke ụgha, bụ́ Setan Ekwensu, tinyere mkpụrụ nile nke Setan.—Jọn 8:44.

24. Olee otú ndị na-eje ije n’ìhè si emeghachi omume n’ọrụ ndị dị ike Jehova na-arụ n’ihi ha?

24 Mgbe ndị na-aga ije n’ìhè ahụ tụgharịrị uche ná ngosipụta ndị dị otú ahụ nke ike Jehova, a na-akpali ha ịkpọsa, sị: “Lee, Chineke anyị ka Nke a bụ; anyị elewo anya Ya, Ọ ga-azọpụtakwa anyị: Nke a bụ Jehova; anyị elewo anya Ya, ka anyị tegharịa egwu ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.” (Aịsaịa 25:9) N’isi nso, ihe a kpọrọ mmadụ na-eme ezi omume ga-enwe ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ. A ga-ewepụ ọchịchịrị ahụ kpam kpam, ìhè Jehova ga-amụkwasịkwa ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ̀ dị olileanya pụrụ ịdị ebube karịa nke a? Ọ dịghị ma ọlị!

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa taa ịga ije n’ìhè ahụ?

• Gịnị mere Aịsaịa ji kelee aha Jehova?

• Gịnị mere na ọ dịghị mgbe ndị iro ga-emebi nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Chineke?

• Olee ngọzi bara ụba na-echere ndị na-aga ije n’ìhè ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ndị bi na Juda ji ụmụaka chụọrọ Mọlek àjà

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ịmara banyere ọrụ ndị dị ike nke Jehova kpaliri Aịsaịa ikele aha Jehova

[Foto dị na peeji nke 16]

Ìhè Jehova ga-amụkwasị ndị ezi omume ruo mgbe ebighị ebi