Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzọpụta Nye Ndị Na-ahọrọ Ìhè Ahụ

Nzọpụta Nye Ndị Na-ahọrọ Ìhè Ahụ

Nzọpụta Nye Ndị Na-ahọrọ Ìhè Ahụ

“Jehova bụ ìhè m na nzọpụta m; ònye ka m ga-atụ egwu?”—ABỤ ỌMA 27:1.

1. Ihe ndị dị aṅaa na-enye ndụ ka Jehova wepụtara?

JEHOVA bụ Isi Iyi nke ìhè anyanwụ nke na-eme ka o kwe mee ịdị ndụ n’ụwa. (Jenesis 1:2, 14) Ọ bụkwa Onye Okike nke ìhè ime mmụọ, bụ́ nke na-eme ka ọchịchịrị na-akpata ọnwụ nke ụwa Setan, ghara ịdị. (Aịsaịa 60:2; 2 Ndị Kọrint 4:6; Ndị Efesọs 5:8-11; 6:12) Ndị na-ahọrọ ìhè ahụ pụrụ iso ọbụ abụ ahụ kwuo, sị: “Jehova bụ ìhè m na nzọpụta m; ònye ka m ga-atụ egwu?” (Abụ Ọma 27:1a) Otú ọ dị, dị ka ọ dị n’oge Jisọs, ndị na-ahọrọ ọchịchịrị pụrụ nanị ịtụ anya ịbụ ndị a ga-ama ikpe.—Jọn 1:9-11; 3:19-21, 36.

2. N’oge ochie, gịnị mere ndị jụrụ ìhè Jehova na ndị gere ntị n’okwu ya?

2 N’oge Aịsaịa, ihe ka ọtụtụ ná ndị ha na Jehova gbara ndụ jụrụ ìhè ahụ. N’ihi ya, Aịsaịa hụrụ mbibi e bibiri alaeze ebe ugwu nke Israel dị ka otu mba. Na 607 T.O.A. kwa, e bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya ma dọrọ ndị bi na Juda n’agha laa n’ala ọzọ. Otú ọ dị, e wusikwuru ndị gere ntị n’okwu Jehova ike iguzogide ndapụ n’ezi ofufe nke oge ahụ. Banyere 607 T.O.A., Jehova kwere nkwa na ndị gere ya ntị ga-alanarị. (Jeremaịa 21:8, 9) Taa, anyị bụ́ ndị hụrụ ìhè ahụ n’anya pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe mere laa azụ n’oge ahụ.—Ndị Efesọs 5:5.

Obi Ụtọ nke Ndị Nọ n’Ìhè Ahụ

3. Taa, obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe, olee “mba nke na-eme ezi omume” anyị hụrụ n’anya, oleekwa “obodo siri ike” nke “mba” ahụ nwere?

3 “Obodo siri ike ka anyị nwere; nzọpụta ka [Chineke] ga-edo ka ọ bụrụ mgbidi ya nile na ekpe ya. Megheenụ ọnụ ụzọ ámá nile, ka mba nke na-eme ezi omume nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nile wee baa n’ime.” (Aịsaịa 26:1, 2) Ndị a bụ okwu ọṅụ nke ndị tụkwasịrị Jehova obi kwuru. Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Aịsaịa legara anya n’ebe Jehova nọ dị ka nanị ezi Isi Iyi nke nchebe, ọ bụghị na chi ụgha nke ụmụ amaala ibe ha. Taa, anyị na-enwe obi ike yiri nke ahụ. Ọzọkwa, anyị hụrụ ‘mba Jehova nke na-eme ezi omume’—“Israel nke Chineke”—n’anya. (Ndị Galetia 6:16; Matiu 21:43) Jehova n’onwe ya kwa hụrụ mba a n’anya n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ya. Site ná ngọzi ya, Israel nke Chineke nwere “obodo siri ike,” bụ́ nzukọ yiri obodo nke na-akwado ma na-echebe ya.

4. Ụzọ iche echiche dị aṅaa ka anyị ga-eme nke ọma ịzụlite?

4 Ndị nọ n’ime “obodo” a maara nke ọma na Jehova “na-echebe onye e meworo ka uche ya dabere na [Ya], o wee na-adịzu n’udo: n’ihi na ọ bụ [Jehova] ka ọ na-atụkwasị obi.” Jehova na-akwado ndị ji uche ha atụkwasị ya obi ma na-ekwenyere ụkpụrụ ezi omume ya. N’ihi ya, ndị kwesịrị ntụkwasị obi na Juda ṅara ntị n’agbamume Aịsaịa, bụ́: “Tụkwasịnụ obi na Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi: n’ihi na Jaa Jehova bụ oké nkume nke mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 26:3, 4; Abụ Ọma 9:10; 37:3; Ilu 3:5) Ndị nwere ụzọ iche echiche ahụ na-elegara “Jaa Jehova” anya dị ka nanị Oké Nkume na-enye nchebe. Ha na ya “na-adịzu n’udo.”—Ndị Filipaị 1:2; 4:6, 7.

Mweda n’Ala Nye Ndị Iro Chineke

5, 6. (a) Olee otú e si mechuo Babilọn oge ochie ihu? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e si mechuo “Babilọn ukwu ahụ” ihu?

5 Gịnị ma ọ bụrụ na a na-akpagbu ndị tụkwasịrị Jehova obi? Ọ dịghị ha mkpa ịtụ egwu. Jehova na-ekwe ka ihe ndị dị otú ahụ mee ruo oge ụfọdụ, ma ọ na-eweta ahụ efe n’ikpeazụ, ọ na-ekpekwa ndị na-akpata mkpagbu ahụ ikpe. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:4-7; 2 Timoti 1:8-10) Tụlee ihe mere otu “obodo dị elu.” Aịsaịa na-ekwu, sị: “[Jehova ebudawo] ndị bi n’elu, bụ́ obodo dị elu; Ọ na-eme ka ọ dị ala, Ọ na-eme ka ọ dị ala ọbụna ruo ala: Ọ na-eme ka ọ daruo ájá. Ụkwụ ga-azọda ya; bụ́ ụkwụ abụọ nke onye e wedara n’ala, ha na nzọụkwụ nke ndị na-enweghị ike.” (Aịsaịa 26:5, 6) Obodo dị elu a na-ekwu banyere ya n’ebe a pụrụ ịbụ Babilọn. Obodo ahụ kpagburu ndị Chineke n’ezie. Ma, gịnị mere Babilọn? Na 539 T.O.A., ndị Midia na ndị Peasia meriri ya. Lee mweda n’ala ọ bụ!

6 N’oge anyị, okwu amụma Aịsaịa na-akọwa nke ọma ihe meworo “Babilọn ukwu ahụ” kemgbe 1919. Obodo ahụ dị elu dara ọdịda na-emechu ihu n’afọ ahụ mgbe a manyere ya ịtọhapụ ndị Jehova ná ndọrọ n’agha ime mmụọ. (Mkpughe 14:8) Ihe ọzọ merenụ na-emechu ihu ọbụna karị. Obere ìgwè ndị Kraịst ahụ tụgharịrị wee ‘na-azọda’ ndị jibu ha eji. Na 1922 ha malitere ịkpọsa ọgwụgwụ na-abịanụ nke Krisendọm, na-akpọsa opi ahụ ndị mmụọ ozi anọ fụrụ bụ́ nke dị ná Mkpughe 8:7-12 nakwa ahụhụ atọ ahụ e buru amụma ha ná Mkpughe 9:1–11:15.

“Ụzọ Onye Ezi Omume Na-eso Bụ Izi Ezi Nile”

7. Nduzi dị aṅaa ka ndị na-echigharịkwuru ìhè Jehova na-enweta, ònye ka ha na-ele anya ya, gịnịkwa ka ha na-ahụ n’anya?

7 Jehova na-enye ndị chigharịkwuuru ìhè ya nzọpụta, ọ na-eduzikwa ụzọ ha, dị ka Aịsaịa gosiziri, sị: “Ụzọ onye ezi omume na-eso bụ izi ezi nile: Gị onye ziri ezi na-eme ka ụzọ onye ezi omume dị larịị. Ọzọ, n’ụzọ nke ikpe Gị nile, Jehova, ka anyị leworo anya Gị: aha Gị na ncheta Gị na-atị mkpụrụ obi anyị akpịrị.” (Aịsaịa 26:7, 8) Jehova bụ Chineke ezi omume, ndị na-efe ya ofufe aghaghịkwa idebe ụkpụrụ ezi omume ya. Mgbe ha mere otú ahụ, Jehova na-eduzi ha, na-eme ka ụzọ ha dị larịị. Site n’ịgbaso nduzi ya, ndị a dị umeala n’obi na-egosi na ha na-ele anya Jehova ma jiri obi ha nile na-ahụ aha ya—“ncheta” ya—n’anya.—Ọpụpụ 3:15.

8. Àgwà dị aṅaa kwesịrị nṅomi ka Aịsaịa gosipụtara?

8 Aịsaịa hụrụ aha Jehova n’anya. Nke ahụ pụtara ìhè site n’ihe ọzọ o kwuru: “Ná mkpụrụ obi m ka akpịrị Gị ga-atị m n’abalị; ee, mmụọ m nke dị n’ime m ka m ga-eji chọsie Gị ike: n’ihi na mgbe ikpe Gị nile na-adakwasị ụwa, ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.” (Aịsaịa 26:9) Akpịrị Jehova tịrị Aịsaịa ‘ná mkpụrụ obi ya’—n’ahụ ya dum. Jiri anya nke uche hụ onye amụma ahụ ka o ji oge ndị dị jụụ n’abalị na-ekpeku Jehova ekpere, na-ekwupụta echiche ya kasị mie emie ma na-achọsi nduzi Jehova ike. Lee ezi ihe nlereanya nke ahụ bụ! Ọzọkwa, Aịsaịa mụtara ezi omume site n’ikpe Jehova. Na nke a, o chetaara anyị mkpa ịnọ na nche mgbe nile dị, na-amụ anya ịghọta uche Jehova.

Ụfọdụ Na-ahọrọ Ọchịchịrị

9, 10. Olee obiọma Jehova gosipụtara n’ebe mba ya na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi nọ, ma olee otú ha si meghachi omume?

9 Jehova gosiri Juda nnukwu ebere ịhụnanya, ma ọ dị mwute na ọ bụghị ha nile meghachiri omume n’ụzọ dị mma. Ugboro ugboro, ihe ka ọtụtụ họọrọ inupụ isi na ịdapụ n’ezi ofufe kama ịhọrọ ìhè nke eziokwu Jehova. Aịsaịa kwuru, sị: “A sị na e meere onye na-emebi iwu amara, ọ gaghị amụta ezi omume; n’ala nke izi ezi nile ọ ga-eme ajọ omume, ma ọ gaghị ahụ ịdị elu nke Jehova.”—Aịsaịa 26:10.

10 N’oge Aịsaịa bụ́ mgbe aka Jehova chebere Juda pụọ n’aka ndị iro ya, ihe ka ọtụtụ jụrụ ịnakwere nke a. Mgbe o ji udo ya gọzie ha, mba ahụ egosipụtaghị ekele ọ bụla. N’ihi ya, Jehova gbahapụrụ ha ka ha jeere “ndị nwenụ ọzọ” ozi, na-ekwe n’ikpeazụ ka a dọrọ ndị Juu n’agha laa Babilọn na 607 T.O.A. (Aịsaịa 26:11-13) Ma, ihe fọdụrụnụ ná mba ahụ lọghachiri n’ikpeazụ n’ala nna ha dị ka ndị e mere ka ha dị ọcha.

11, 12. (a) Ọdịnihu dị aṅaa ka ndị ji Juda eji nwere? (b) Na 1919, ọdịnihu dị aṅaa ka ndị jibu ndị ohu Jehova e tere mmanụ eji nwere?

11 Gịnị banyere ndị dọọrọ Juda n’agha? Aịsaịa zara n’ụzọ amụma, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị adị ndụ; ndị na-adịghị ndụ adịghị ebili: n’ihi nke a ka I letaworo ha wee kpochapụ ha, mee ka ncheta nile nke dịịrị ha laa n’iyi.” (Aịsaịa 26:14) Ee, mgbe Babilọn dasịrị na 539 T.O.A., ọ dịgideghị gaa n’ihu. Ka oge na-aga, obodo ahụ agaghịzi adị. Ọ ‘gaghị adị ndụ,’ alaeze ukwu ya kwa ga-aghọzi ihe a na-akọ n’akụkọ. Lee ịdọ aka ná ntị nke a bụụrụ ndị na-enwe olileanya ná ndị dị ike nke ụwa a!

12 Akụkụ ụfọdụ nke amụma a mezuru mgbe Chineke kwere ka ndị na-ejere ya ozi gaa ná ndọrọ n’agha ime mmụọ na 1918 ma mesịa mee ka a tọhapụ ha na 1919. Site n’oge ahụ gaa n’ihu, ndị jibu ha eji, bụ́ Krisendọm n’ụzọ bụ́ isi, enwekwaghị ọdịnihu dị mma. Ma ngọzi na-echere ndị Jehova, bara ụba n’ezie.

“Ị Tụkwasịwo Mmadụ ná Mba Nke A”

13, 14. Olee ngọzi bara ụba ndị ohu Jehova e tere mmanụ nweworo kemgbe 1919?

13 Chineke gọziri mmụọ nchegharị nke ndị ohu ya e tere mmanụ na 1919 ma mee ka ha mụbaa. Nke mbụ, e lekwasịrị anya n’ịchịkọta ihe fọdụrụnụ n’Israel nke Chineke, mgbe ahụkwa, a malitere ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Aịsaịa buru ngọzi ndị a n’amụma, sị: “Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a, Jehova, Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a; Ị natawo nsọpụrụ: I mewo ka nsọtụ nile nke ala dị anya. Jehova, n’ahụhụ ka ha letaworo Gị, ha takwuru ntakwu n’ekpere nke ukwuu mgbe ịdọ aka ná ntị Gị ruru ha ahụ.”—Aịsaịa 26:15, 16.

14 Taa, a gbasawo nsọtụ nke Israel nke Chineke gburugburu ụwa, ọnụ ọgụgụ nke oké ìgwè mmadụ a tụkwasịwokwara dịzi ihe dị ka nde isii ndị ji ịnụ ọkụ n’obi ekere òkè n’ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14) Lee ngọzi sitere n’aka Jehova nke ahụ bụ! Leekwa otuto nke a na-ewetara aha ya! A na-anụ aha ahụ taa n’ala 235—mmezu dị ebube nke nkwa ya.

15. Olee mbilite n’ọnwụ ihe atụ e nwere na 1919?

15 Enyemaka Jehova dị Juda mkpa iji pụọ ná ndọrọ n’agha Babilọn. Ha apụghị imewo ya n’ike nke aka ha. (Aịsaịa 26:17, 18) N’otu aka ahụ, nnwere onwe nke Israel nke Chineke na 1919 bụ ihe akaebe nke nkwado Jehova. Ọ pụghị iwerewo ọnọdụ ma e wezụga ya. Mgbanwe e nwere n’ọnọdụ ha dị nnọọ ịtụnanya nke na Aịsaịa ji ya tụnyere mbilite n’ọnwụ: “Ndị Gị ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ; ozu m nile ga-ebili. Tetanụ, tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá: n’ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi Gị bụ, ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.” (Aịsaịa 26:19; Mkpughe 11:7-11) Ee, a ga-amụghachi ndị na-adịghị ndụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, maka ọrụ ọhụrụ!

Nchebe n’Oge Ndị Dị Ize Ndụ

16, 17. (a) Na 539 T.O.A., gịnị ka ọ dị mkpa ka ndị Juu mee iji lanarị ọdịda Babilọn? (b) Gịnị ka o yiri ka ọ bụ ha bụ ‘ime ụlọ’ ndị ahụ taa, oleekwa otú ha si abara anyị uru?

16 Nchebe Jehova na-adị ndị ohu ya mkpa mgbe nile. Otú ọ dị, n’isi nso, ọ ga-esetịpụ aka ya na nke ikpeazụ ya megide ụwa Setan, enyemaka ya ga-adịkwa ndị na-efe ya ofufe mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (1 Jọn 5:19) Jehova na-adọ anyị aka ná ntị banyere oge ahụ dị ize ndụ, sị: “Bịa, ndị m, bata n’ime ụlọ gị nile, mechibido ụzọ gị nile n’azụ gị: zobe onwe gị nanị otu ntabi anya nta, ruo mgbe oké iwe ga-agabiga. N’ihi na, lee, Jehova na-esi n’ọnọdụ Ya apụta iji ajọ omume nke ndị bi n’ụwa leta ha: ọzọ, ala ga-ekpughe ọbara ya, ọ gaghị ekpuchikwa ndị ya e gburu egbu ọzọ.” (Aịsaịa 26:20, 21; Zefanaịa 1:14) Ịdọ aka ná ntị a gosiri ndị Juu otú ha ga-esi alanarị ọdịda Babilọn na 539 T.O.A. Ndị ṅara ntị na ya ga-anọgidewo n’ụlọ ha, nọrọ ná nchebe pụọ n’aka ndị agha na-emeri ha bụ́ ndị nọ n’ámá dị iche iche.

17 Taa, ‘ime ụlọ’ e kwuru n’amụma ahụ yiri ka ọ na-ezo aka n’ọtụtụ iri puku ọgbakọ nke ndị Jehova gburugburu ụwa. Ọgbakọ ndị dị otú ahụ bụ ihe nchebe ọbụna ugbu a, ebe ndị Kraịst na-achọta nchebe n’etiti ụmụnna ha, n’okpuru nlekọta ịhụnanya nke ndị okenye. (Aịsaịa 32:1, 2; Ndị Hibru 10:24, 25) Otú ahụ ka ọ dị karịsịa n’ihi ịdị nso nke ọgwụgwụ nke usoro ihe a bụ́ mgbe nlanarị ga-adabere ná nrubeisi.—Zefanaịa 2:3.

18. Olee otú Jehova ga-esi ‘gbuo ogologo anụ ahụ’ n’isi nso?

18 Aịsaịa buru amụma banyere oge ahụ, sị: “N’ụbọchị ahụ Jehova ga-ewere mma agha Ya dị arọ dị ukwuu dị ike ji mmehie ha leta leviathan, bụ́ agwọ na-agba ọsọ, na leviathan, bụ́ agwọ gbagọrọ agbagọ; Ọ ga-egbukwa ogologo anụ ahụ nke dị n’oké osimiri.” (Aịsaịa 27:1) Gịnị bụ “leviathan” nke oge a? N’ụzọ doro anya, ọ bụ “agwọ ochie ahụ,” bụ́ Setan n’onwe ya, tinyere ajọ usoro ihe ya, nke o ji alụ agha megide Israel nke Chineke. (Mkpughe 12:9, 10, 17; 13:14, 16, 17) Na 1919, Leviathan ejidelighịzi ndị Chineke. Ka oge na-aga, ọ ga-apụ n’anya kpam kpam. (Mkpughe 19:19-21; 20:1-3, 10) N’ụzọ dị otú ahụ, Jehova ‘ga-egbu ogologo anụ ahụ.’ Ka ọ dị ugbu a, ọ dịghị ihe Leviathan ga-anwa ime ndị Jehova ga-aga nke ọma n’ụzọ na-adịgide adịgide. (Aịsaịa 54:17) Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịbụ ndị e mesiri obi ike banyere nke ahụ!

“Otu Ubi Vine nke Mmanya Vine Na-asụ Ụfụfụ”

19. Gịnị bụ ọnọdụ nke ihe ahụ fọdụrụnụ taa?

19 N’iburu ìhè a nile sitere n’aka Jehova n’uche, ọ̀ bụ na anyị enweghị ihe nile mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ? Ee, anyị nwere! Aịsaịa kọwara ọṅụ ndị Jehova na-enwe n’ụzọ magburu onwe ya mgbe o dere, sị: “N’ụbọchị ahụ: Otu ubi vine nke mmanya vine na-asụ ụfụfụ, tienụ mkpu ọṅụ banyere ya. Mụ onwe m, Jehova, bụ onye nche ya; na mgbe nile ọ bụla dịkasịrị nta ka M na-ede ya mmiri: ka onye ọ bụla wee ghara iji ihe ọjọọ leta ya, abalị na ehihie ka M na-eche ya.” (Aịsaịa 27:2, 3) Jehova elekọtawo “ubi vine” ya, bụ́ ihe fọdụrụ n’Israel nke Chineke, lekọtakwa ndị enyi ha na-arụsi ọrụ ike. (Jọn 15:1-8) Ihe si na ya pụta abụwo mkpụrụ nke na-ewetara aha ya otuto, na-ewetakwara ndị ohu ya nọ n’ụwa oké ọṅụ.

20. Olee otú Jehova si echebe ọgbakọ ndị Kraịst?

20 Anyị pụrụ inwe obi ụtọ na iwe mbụ Jehova were megide ndị ohu ya e tere mmanụ—nke o ji maka ya kwe ka ha gaa ná ndọrọ n’agha ime mmụọ na 1918—akwụsịla. Jehova n’onwe ya kwuru, sị: “Ọnụma adịghị n’ime m: ọ ga-adị m nnọọ mma ma ogwu na uke ga-emegide m n’agha! M ga-awakwu ha, M ga-esurekọta ha n’otu. Ma ọ bụ, ya jide ebe m siri ike, ọ ga-eme ka Mụ na ya dị n’udo; ee, ọ ga-eme ka Mụ na ya dị n’udo.” (Aịsaịa 27:4, 5) Iji jide n’aka na vine ya nọgidere na-agbapụta “mmanya vine na-agba ụfụfụ,” Jehova na-egwepịa, na-erepịakwa mmetụta ọ bụla yiri ahịhịa nke pụrụ imerụ ha. N’ihi ya, ka onye ọ bụla ghara itinye ọdịmma nke ọgbakọ ndị Kraịst n’ihe ize ndụ! Ka onye ọ bụla ‘jide ebe siri ike nke Jehova,’ na-achọ ihu ọma na nchebe ya. N’ime otú ahụ, anyị na-eso Chineke eme udo—ihe dị oké mkpa nke na Aịsaịa kwuru ya ugboro abụọ.—Abụ Ọma 85:1, 2, 8; Ndị Rom 5:1.

21. N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo mejuo ihu elu ụwa dum mmadụ bi “n’ihe omume”?

21 A gara n’ihu ịkọwa ngọzi ahụ, sị: “N’ọdịnihu Jekọb ga-agba mkpọrọgwụ: Israel ga-agbawa okooko dị ka osisi, maa ifuru: ha wee mejuo ihu elu ụwa dum mmadụ bi n’ihe omume.” (Aịsaịa 27:6) E mezuwo amaokwu a kemgbe 1919, na-enye ihe àmà magburu onwe ya nke ike Jehova. Ndị Kraịst e tere mmanụ ejiriwo ‘ihe omume,’ bụ́ nri ime mmụọ na-edozi ahụ, mejuo ụwa. N’etiti ụwa nke rụrụ arụ, ha ji ọṅụ echekwa ụkpụrụ dị elu nke Chineke. Jehova nọgidekwara na-eji mmụba agọzi ha. N’ihi ya, ọtụtụ nde ndị enyi ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, “na-efekwa [Chineke] ofufe ehihie na abalị.” (Mkpughe 7:15) Ka anyị ghara ileghara mgbe ọ bụla ọmarịcha ihe ùgwù nke ikere òkè “n’ihe omume” na iso ndị ọzọ kerịta ya, anya!

22. Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịara ndị na-anakwere ìhè ahụ?

22 N’oge ndị a dị oké egwu, mgbe ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị ana-ekpuchikwa mba dị iche iche, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe ekele na Jehova na-amụkwasị ndị ya ìhè ime mmụọ? (Aịsaịa 60:2; Ndị Rom 2:19; 13:12) Nye ndị nile na-anakwere ya, ìhè dị otú ahụ pụtara udo nke uche na ọṅụ ugbu a, na ọbụna ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere anyị bụ́ ndị hụrụ ìhè ahụ n’anya ga-eji jiri obi anyị na-enye Jehova otuto ma soro ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Jehova bụ ebe siri ike nke ndụ m; ònye ka m ga-atụ oké egwu? Na-ele anya Jehova: dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.”—Abụ Ọma 27:1b, 14.

Ị̀ Na-echeta?

• Ọdịnihu dị aṅaa ka ndị na-emegide ndị Jehova nwere?

• Mmụba dị aṅaa ka e buru n’amụma n’Aịsaịa?

• “N’ime ụlọ” dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịnọgide, n’ihi gịnịkwa?

• Gịnị mere ọnọdụ nke ndị Jehova ji ewetara ya otuto?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 22]

MBIPỤTA ỌHỤRỤ

E kwuru ihe ka ukwuu n’ihe ọmụma a tụlere n’isiokwu abụọ a dịịrị ọmụmụ dị ka okwu n’usoro ihe omume mgbakọ distrikti maka 2000/2001. Ná ngwụsị nke okwu ahụ, e wepụtara mbipụta ọhụrụ, nke isiokwu ya bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I. Akwụkwọ a dị peeji 416 tụlere isiakwụkwọ 40 mbụ nke akwụkwọ Aịsaịa n’amaokwu n’amaokwu.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọ bụ nanị ndị ezi omume ka a na-ekwe ka ha banye ‘n’obodo siri ike’ nke Jehova, bụ́ nzukọ ya

[Foto dị na peeji nke 19]

Aịsaịa chọrọ Jehova “n’abalị”

[Foto dị na peeji nke 21]

Jehova na-echebe “ubi vine” ya, na-emekwa ka ọ na-amị mkpụrụ