Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mbilite n’Ọnwụ Jisọs Nọ n’Ikpe

Mbilite n’Ọnwụ Jisọs Nọ n’Ikpe

Mbilite n’Ọnwụ Jisọs Nọ n’Ikpe

“Apụrụ m ịgwa unu n’eziokwu na ọ bụ ezie na anyị pụrụ ijide nnọọ n’aka na Jisọs dịrị ndụ . . . , anyị apụghị iji nkwenye siri ike otú ahụ kwuo na anyị maara na Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie.” Ihe a ka ụkọchukwu ukwu nke Chọọchị England, bụ́ Achịbishọp nke Canterbury kwuru.

ONYE Kraịst bụ́ Pọl onyeozi enweghị obi abụọ dị otú ahụ. N’isi nke 15 nke akwụkwọ ozi mbụ o ji ike mmụọ nsọ degara ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọrint oge ochie, Pọl dere, sị: “Enyere m n’aka unu na mbụ ihe m natakwara idebe, na Kraịst nwụrụ n’ihi mmehie anyị nile, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị; na e likwara Ya; na e mewokwara ka O si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị.”—1 Ndị Kọrint 15:3, 4.

Ọ bụ okwukwe ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst nwere ná mbilite n’ọnwụ ya kpaliri ha ikwusa oziọma ahụ gburugburu ógbè ndị Gris na Rom—“n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) N’ezie, mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ kpọmkwem ntọala nke nkwenkwe ndị Kraịst.

Otú ọ dị, site nnọọ ná mmalite, ndị mmadụ nwere obi abụọ banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs ma jụ ikwere na ya. Nye ndị Juu n’ozuzu ha, ọ bụ ikwulu Chineke bụ́ ụmụazụ Jisọs ịzọrọ na nwoke a a kpọgburu akpọgbu bụ Mesaịa ahụ. Nyekwa ihe ka ọtụtụ ná ndị Gris gụrụ akwụkwọ, bụ́ ndị kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, echiche nke mbilite n’ọnwụ bụ ihe na-agbaka ntị.—Ọrụ 17:32-34.

Ndị Obi Abụọ nke Oge A

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ụfọdụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst ebipụtawo akwụkwọ na isiokwu ndị na-ekwu na mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ akụkọ ifo, ha akpaliwokwa arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ banyere isiokwu a. N’ọchịchọ ha na-achọ “Jisọs ahụ a kọrọ n’akụkọ,” ndị ọkà mmụta dị iche iche na-arụ ụka na ihe e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ banyere ili tọgbọ chakoo na omume Jisọs mere ka a hụ ya anya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ bụcha nnọọ akụkọ ifo, ndị e chepụtara ogologo oge mgbe ọ nwụsịrị iji kwado nzọrọ a na-azọrọ na o nwere ike sitere n’eluigwe.

Dị ka ihe atụ, tụlee echiche nke ọkà mmụta bụ́ onye Germany bụ́ Gerd Lüdemann, bụ́ prọfesọ nke Agba Ọhụrụ bụrụkwa onye dere akwụkwọ bụ́ What Really Happened to Jesus—A Historical Approach to the Resurrection. Ọ rụrụ ụka na mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ “okwu na-enweghị isi” nke onye ọ bụla nwere “echiche nkà mmụta sayensị nke ụwa” na-aghaghị ịjụ.

Prọfesọ Lüdemann na-ekwusi ike na Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie nke pụtara n’ihu Pita onyeozi bụ ọhụụ nke Pita hụrụ n’ihi oké iru újú na obi amamikpe o nwere n’ihi ngọnahụ ọ gọnahụrụ Jisọs. Dịkwa ka Lüdemann si kwuo, mpụta Jisọs pụtara n’ihu ihe karịrị ndị kwere ekwe 500 n’otu oge bụ “ìgwè mmadụ ịnọ n’ọhụụ.” (1 Ndị Kọrint 15:5, 6) N’ikwu ya n’ụzọ dị nkenke, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na ihe ndị e dekọrọ na Bible banyere Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ usoro ahụmahụ ndị e nwere n’uche bụ́ ndị mere ka ndị ahụ na-eso ụzọ nweghachi obi ike onwe onye n’ụzọ ime mmụọ na ịnụ ọkụ n’obi nke ije ozi ala ọzọ.

N’ezie, ọtụtụ ndị enwechaghị mmasị n’arụmụka ndị metụtara nkà mmụta. Otú ọ dị, anyị nile kwesịrị inwe mmasị n’okwu banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na e meghị ka o si n’ọnwụ bilie, e guzobere Iso Ụzọ Kraịst na ntọala ụgha. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ ihe mere eme n’ezie, e guzobere Iso Ụzọ Kraịst n’eziokwu. N’ọnọdụ ndị ahụ, ọ bụghị nanị na a nwapụtara ihe Kraịst na-azọrọ dị ka eziokwu kama a nwapụtakwara nkwa ya dị ka eziokwu. Ọzọkwa, ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ dị, ọnwụ abụghị onye mmeri ukwu kama ọ bụ onye iro a pụrụ imeri emeri.—1 Ndị Kọrint 15:55.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Site na Self-Pronouncing Edition of the Holy Bible, nke nwere nsụgharị King James na nke Revised