Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
Ọ BỤRỤ na ị bụ onye Kraịst e mere baptism, obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali gị ime uche ya. Ọzọkwa, ozi ubi aghaghị n’ezie ịbụ ọrụ ị na-arụ karịsịa. E kwuwerị, Jisọs Kraịst nyere ụmụazụ ya nile ọrụ ịbụ ndị na-eme ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20) Ee, ị pụrụ ịdị na-arụ ọrụ ego ugbu a iji na-akwado onwe gị. Ma dị ka onye na-eso ụzọ Jisọs na otu n’ime Ndịàmà Jehova, nke mbụ, ị bụ onye Kraịst bụ́ onye ozi—onye na-ebute ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ.—Matiu 24:14.
Ikekwe ị nọ ná ngwụsị nke afọ iri na ụma ma ọ bụ ná mmalite nke afọ ndị nke 20 gị. Ikekwe, i chebaworo ihe ị na-aga ime ná ndụ echiche nke ọma. N’ịtụle nhọrọ ndị i nwere, inwe afọ ojuju onwe onye yikarịrị ka ọ ga-abụ otu isi ihe dị mkpa.
Tụlezie ihe Jørgen nọ na Denmark na-ekwu banyere nhọrọ o mere. Jørgen na-akọwa ya dị ka “ụzọ ndụ kwesịrị ekwesị bụ́ nke ị pụrụ itinye uche n’ọrụ kasị mkpa e nwere.” Eva, bụ́ nwanyị dị afọ 31 nọ na Gris, na-ekwu, sị: “M jiri ndụ m tụnyere nke ndị ọgbọ m, ana m ekwubikarị na ọ ka nwee nzube, na-eju afọ karị, ma na-akpalikwa akpali karị.” Olee ụzọ ndụ na-enye afọ ojuju dị otú ahụ? Olee otú ị pụrụ isi gbasoo ụzọ ndụ dị otú ahụ?
Chineke Ọ̀ Na-eduzi Gị?
Mmadụ ime nhọrọ n’ụzọ ndụ ọ ga-agbaso pụrụ ịta nnọọ akpụ. N’ezie, ọ pụrụ ịdị ụfọdụ ndị ka ọ bụrụ na Chineke ga-egosi ha kpọmkwem ihe ọ chọrọ ka ha mee.
Mgbe Mosis nọ na Midian, Jehova nyere ya ntụziaka ka ọ laghachi Ijipt ma duru ndị Israel pụọ n’ohu. (Ọpụpụ 3:1-10) Mmụọ ozi Chineke pụtara n’ihu Gideọn, bụ́ onye a họpụtara ịzọpụta Israel pụọ ná mmegbu. (Ndị Ikpe 6:11-14) Devid nọ na-azụ atụrụ mgbe Chineke gwara Samuel ka o tee ya mmanụ dị ka eze ọzọ nke Israel. (1 Samuel 16:1-13) A dịghị esi n’ụzọ ndị dị otú ahụ eduzi anyị taa. Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe ma kpebie otú anyị ga-esi eji ikike Chineke nyere anyị eme ihe.
Jehova emegheworo ndị Kraịst na-eto eto taa “ọnụ ụzọ dị ukwuu nke [ha] ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.” (1 Ndị Kọrint 16:9) N’ụzọ dị aṅaa? N’afọ iri gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze ejiriwo ihe karịrị 2,125,000 rịa elu gaa n’ihe karịrị 6,000,000 gburugburu ụwa. Ole ndị na-enye aka n’iwepụta ọtụtụ nde Bible, akwụkwọ, broshuọ, magazin, na traktị ndị dị mkpa maka nkwado ime mmụọ nakwa maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ikwusa ozi ọma? Ndị òtù ezinụlọ Betel zuru ụwa ọnụ na-enwe ihe ùgwù a a gọziri agọzi.
Ndụ Na-akwụghachi Ụgwọ
Betel pụtara “Ụlọ Chineke,” ebe obibi Betel bụkwa ebe obibi nke ndị Kraịst nyere onwe ha n’afọ ofufo bụ́ ndị na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ nakwa n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society. (Jenesis 28:19, ihe odide ala ala peeji nke NW) A pụrụ iji ezinụlọ Betel nke oge a tụnyere ‘ezinụlọ a haziri nke ọma bụ́ nke e ji amamihe wulite’ nakwa nke e ji ịhụnanya n’ebe Jehova nọ tọọ ntọala ya.—Ilu 24:3.
Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọnọdụ yiri nke ezinụlọ bụ́ nke dị na Betel? Onye òtù ezinụlọ Betel dị na Estonia bụ́ onye dị afọ 25 na-ekwu, sị: “Mmetụta nke ịnọ n’etiti ndị enyi Jehova mgbe nile na-atọ m ụtọ. Nke a ka bụkwa ihe m kasị jiri kpọrọ ihe na Betel.”—Abụ Ọma 15:1, 2.
Abụ Ọma 110:3) Na United States, pasent 46 nke ndị nọ na Betel nọ n’agbata afọ 19 na 29. Dị ka Aịsaịa, ha asịwo: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Aịsaịa—onye rawoororị onwe ya nye Jehova—nọ na-enye onwe ya n’afọ ofufo maka ihe ùgwù ije ozi ọzọ. O doro anya na nke a gụnyere ịchụ ụfọdụ ihe ndị baara ya uru n’àjà. Ndị nọ n’ozi Betel na-ahapụ ebe obibi ha na ebe ha maara nke ọma, nakwa nne, nna, ụmụnne ndị ikom, ụmụnne ndị inyom, na ndị enyi. Ha ji ọchịchọ obi achụ àjà ndị a “n’ihi ozi ọma” ahụ.—Mak 10:29, 30.
Gburugburu ụwa, ihe dị ka mmadụ 19,500 nwere ihe ùgwù nke ije ozi Betel ugbu a. (N’aka nke ya, lee ngọzi ime mmụọ ndị dị na Betel! Otu onye na-eto eto so n’ezinụlọ Betel dị na Russia na-akọwa, sị: “Site n’ịchụ onwe anyị n’àjà, anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ. Apụrụ m ikwu na n’ebe m nọ, ngọzi Jehova dị nnọọ ukwuu karịa àjà ndị m chụrụ.”—Malakaị 3:10.
Ndụ Betel
Olee otú ndụ Betel dị? Ndị òtù ezinụlọ Betel na-ekweta na ọ na-ewuli elu ma na-enye afọ ojuju, ọbụna na-akpali akpali. Jens, bụ́ onye dị afọ 43, na-anụ ụtọ ozi Betel. N’ihi gịnị? Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ n’ihi inwe mmetụta na anyị so eme mgbalị dị ukwuu n’ịrụ ọrụ dị mkpa. Ana m amata ókè ọrụ Jehova haruru na ịdị mkpa ya.”
Site Monday ruo Saturday, a na-eji ofufe ụtụtụ amalite ụbọchị ọ bụla na Betel. Nke a bụ nkwurịta okwu dabeere na Bible, nke onye okenye nwere ahụmahụ na-eduzi. Ná mgbede Monday, a na-ewepụta otu awa maka ọmụmụ Bible ezinụlọ ahụ nke a na-eji Ụlọ Nche amụ, okwu nke dabeere n’isiokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke kwesịrị nnọọ ezinụlọ Betel karịsịa, na-esochi mgbe ụfọdụ.
Gịnị na-eme mgbe mmadụ bịara ọhụrụ na Betel? Iji mee ka ndị ọhụrụ mụta ndụ Betel, ụmụnna nwoke tozuru okè nke ezinụlọ ahụ na-ekwu okwu ndị metụtara akụkụ dịgasị iche nke ozi Betel. Ruo ọtụtụ izu n’afọ mbụ ahụ, onye ọhụrụ so n’ezinụlọ Betel na-aga ụlọ akwụkwọ magburu onwe ya a na-enwe kwa izu bụ́ nke e dokwara iji mee ka ọ ghọta Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ sakwuru mbara. Ndị bịara ọhụrụ na-enwekwa usoro ọgụgụ Bible pụrụ iche. N’afọ mbụ ha n’ozi Betel, ndị ọhụrụ so n’ezinụlọ ahụ na-agụchapụ Bible dum.
Gịnị ka ọzụzụ nile a na-arụpụta? Joshua, onye dị afọ 33 nke so n’ezinụlọ Betel dị na Hong Kong, na-aza, sị: “Betel emewo n’ezie ka ekele m nwere n’ebe Jehova nọ mikwuo emi. Apụrụ m iso ọtụtụ ụmụnna ndị nwere ahụmahụ bụ́ ndị jiworo ihe ka ukwuu ná ndụ ha jeere Jehova ozi, na-akpakọrịta. Ana m enwe mmasị karịsịa n’usoro ihe omume ime mmụọ dị iche iche, dị ka ofufe ụtụtụ na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ezinụlọ ahụ. Ọzọkwa, ụzọ ndụ a haziri ahazi na nke dị mfe e nwere na ya na-amasị m. Nke a na-eme ka m ghara inwe nchegbu ndị na-enweghị isi. Ana m amụtakwa otú e si eji àgwà ndị Kraịst eme ihe, nke a abụwokwa ihe bara uru mgbe nile.”
Ndị òtù ezinụlọ Betel na-etinye ihe ka ukwuu n’oge na mgbalị ha n’ime ihe ha wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ime. Ya bụ, iji ike ọkpụkpụ aka na nke uche ha eme ihe n’ụzọ bụ́ isi iji rụọ ọrụ e nyere ha na Betel. Ọ dị mkpa ime ọtụtụ ihe dịgasị iche. Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n’ígwè obibi akwụkwọ ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’ebe ndụkọta akwụkwọ, na-emepụta akwụkwọ bụ́ ndị a na-ebuga n’ọtụtụ ọgbakọ. Ndị ọzọ na-eje ozi na kichin, ebe iri ihe, ma ọ bụ n’ebe ịsa ákwà. Ọrụ ndị ọzọ na-agụnye ọrụ ime ka ihe dị ọcha, ọrụ ugbo, ọrụ ihe owuwu, na ihe ndị ọzọ. Ndị ọzọ nwere ibu ọrụ nke ilekọta ngwá ọrụ ndị dị ná ngalaba ndị a. Ndị ọzọ na-enye nlekọta ahụ ike ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’ọfịs. Ọrụ nile a na-arụ na Betel nwechara ihe ịma aka ndị na-enye ọṅụ, ha na-akwụghachikwa ụgwọ n’ụzọ dị egwu. Ọrụ a na-arụ na Betel na-enye afọ ojuju karịsịa n’ihi na ọ na-akwalite ọdịmma Alaeze ma bụrụ nke a na-arụ n’ihi ịhụnanya e nwere n’ebe Chineke nọ.
A na-ekenye ndị òtù ezinụlọ Betel ọgbakọ ndị ha ga na-aga, bụ́ ebe ha na-eji anya ha ahụrụ abamuru nke ọrụ ha. Ha na-anụ ụtọ ịga nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ ahụ na ikere òkè n’ọrụ nkwusa. N’ihi ya, ndị òtù ezinụlọ Betel azụlitewo njikọ siri ike n’ebe ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ọgbakọ ha nọ.—Rita, onye òtù ezinụlọ Betel dị na Britain, na-ekwu, sị: “Enwere m ekele n’ebe ọgbakọ m dị! Mgbe m nọ ná nzukọ nakwa n’ozi, ọ na-ewusikwu okwukwe m ike nke ukwuu ịhụ ụmụnna nwoke, ụmụnna nwanyị, ụmụaka, na ndị agadi m hụrụ n’anya, n’ebe ahụ! Ihe ọ sọrọ ya mee, ha na-abịa. Nke ahụ na-enyere m aka ịnụkwu ọkụ n’obi n’ozi Betel m.”
Ndụ Betel abụghị nanị ọrụ ọrụ, nzukọ, ozi ubi, na ọmụmụ ihe. Ezinụlọ ahụ na-enwekwa oge ntụrụndụ. Site n’oge ruo n’oge, a na-enwe usoro ihe omume bụ́ “Abalị Ezinụlọ” bụ́ ndị na-enye obi ụtọ ma na-akwụghachi ụgwọ n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ nke na-enye ohere ịnụ ụtọ nkà nke ọtụtụ ndị nakwa ịmụta ihe ndị na-agba ume banyere ndụ ndị ọzọ na-eje ozi na Betel. Ihe ọzọ na-enyekwa obi ụtọ bụ nleta ndị na-ewuli elu ndị ọzọ na-eme. A pụrụ inwe ebe ntụrụndụ ụfọdụ, nakwa ọ́bá akwụkwọ maka ọgụgụ akwụkwọ na ime nnyocha onwe onye. A gaghị echefukwa nkwurịta okwu dị ụtọ ndị a na-enwe gburugburu tebụl n’oge nri.
Tọm, bụ́ onye òtù ezinụlọ Betel dị n’Estonia, na-ekwu, sị: “E nwere otu oké osimiri dị nnọọ nso na Betel, na nso ebe ahụkwa, e nwere oké ọhịa mara mma bụ́ ebe na-amasị mụ na nwunye m ịga mee obere ngagharị. Mgbe ụfọdụ, ana m eso ndị enyi m n’ọgbakọ nakwa na Betel akụ golf, hockey, na tennis. Mgbe ihu igwe dịkwa mma, anyị na-aga ịgba ịnyịnya ígwè.”
Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime Iji Ruo Eru?
N’ezie, Betel bụ n’ụzọ bụ́ isi ebe ndị Kraịst tozuru òkè na-ejere Jehova ozi dị nsọ ma na-arụ ọrụ maka ọdịmma nke ndị kwere ekwe
ibe ha gburugburu ụwa. Ndị na-aghọ ndị òtù ezinụlọ Betel aghaghị iru ihe ụfọdụ a chọrọ. Gịnị ka ị pụrụ ime iji ruo eruo maka ozi Betel?Dị ka Timoti, bụ́ onye so Pọl onyeozi jee ozi, ndị a na-anakwere maka ozi Betel aghaghị inwe ezi nguzo n’ọgbakọ. (1 Timoti 1:1) “Ụmụnna . . . bi na Listra na Aịkọniọm gbaara [Timoti] ezi àmà.” (Ọrụ 16:2) N’agbanyeghị na ọ bụ nwata, Timoti maara Akwụkwọ Nsọ, gbaakwa mkpọrọgwụ n’eziokwu ahụ. (2 Timoti 3:14, 15) N’otu aka ahụ, a na-achọ ka ndị a ga-anara maka ozi Betel nwee ihe ọmụma nke Bible.
Ọ dị ndị òtù ezinụlọ Betel mkpa inwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke Timoti na ọchịchọ o nwere ibute ọdịmma Alaeze ụzọ karịa nke ya pụtara nnọọ ìhè nke na Pọl kwuru banyere ya, sị: “Enweghị m onye ọ bụla nke mkpụrụ obi ya yiri nke ya, bụ́ Ndị Filipaị 2:20-22.
onye ga-echegbu onwe ya banyere ọnọdụ unu n’ezie. N’ihi na ha nile na-achọ ihe nke aka ha, ọ bụghị ihe nke Jisọs Kraịst. Ma unu maara ọnwụnwa ya, na, dị ka nwa na-eso nna ya, otú a ka o soro m bụrụ ohu n’izisa ozi ọma.”—Ozi Betel chọrọ ndị ikom na ndị inyom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ndokwa ndị e meere ndị òtù ezinụlọ Betel na-eme ka o kwe ha omume ito eto n’ụzọ ime mmụọ site n’ọmụmụ Bible, ịgachi nzukọ ndị Kraịst na ozi ubi anya, na isoro ndị Kraịst tozuru okè na-akpakọrịta. E si otú a enyere ndị nọ na Betel aka ịgbaso ndụmọdụ Pọl bụ́: “Na-ejegharịnụ n’ime [Kraịst Jisọs], bụrụkwa ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime Ya, ndị a na-ewulikwa elu dị ka ụlọ n’ime Ya, ndị a na-ewerekwa okwukwe unu mee ka unu guzosie ike, dị ka e ziri unu, na-ekelebiga ókè.”—Ndị Kọlọsi 2:6, 7.
N’ihi ọdịdị nke ọrụ ndị a na-arụ na Betel, ndị a na-anara maka ihe ùgwù ije ozi a aghaghị ịgbasi ike n’anụ ahụ ma nwee ezi ahụ ike. Ọ bụrụ na i ruru eru n’ihe ndị anyị kpọtụworo aha, dị afọ 19 ma ọ bụ karịa, ma bụrụ onye e meworo baptism ma ọ dịkarịa ala otu afọ, anyị na-agba gị ume ichebara ozi Betel echiche.
Anyị Nile Nwere Ọrụ
Dị ka ndị Kraịst, n’ezie anyị nile na-achọ ibute ọdịmma Alaeze ụzọ ná ndụ nakwa iji mkpụrụ obi anyị dum na-ejere Jehova ozi. (Matiu 6:33; Ndị Kọlọsi 3:23) Anyị pụkwara ịgba ndị na-eje ozi na Betel ume ịnọgide na-eje ozi dị nsọ n’ebe ahụ. Karịsịa, e kwesịrị ịgba ụmụnna na-eto eto bụ́ ndị ruru eru maka ozi Betel ume ime mgbalị iji nweta ihe ùgwù a a gọziri agọzi.
Ozi Betel bụ ụzọ ndụ ime mmụọ na-enye afọ ojuju—nke pụrụ n’ezie ịbụ ọrụ kasị mma nye gị. Ọ dị otú ahụ nye Nick, bụ́ onye malitere ije ozi na Betel mgbe ọ dị afọ 20. Mgbe o jesịrị ozi Betel ruo afọ iri, ọ na-ekwu, sị: “Ana m ekpegara Jehova ekpere mgbe mgbe iji kelee ya maka obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Gịnị ọzọ ka m pụrụ ịrịọ? N’ebe a, ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-agbalị ike ha ijere Jehova ozi, gbara anyị gburugburu.”
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
Gịnị Ka Ndị Okenye na Ndị Nne na Nna Pụrụ Ime?
Ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị kwesịrị ịgba ụmụ okorobịa ume karịsịa itinye akwụkwọ maka Betel. Na nso nso a, otu nnyocha e mere n’etiti ndị òtù ezinụlọ Betel na-akatabeghị ahụ gosiri na pasent 34 n’ime ha bụ ndị ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta gbara ume n’ụzọ bụ́ isi ime ozi Betel ihe mgbaru ọsọ ha. Ee, ọgbakọ ha pụrụ inwe mfu nke ozi ha na-eje. Ma ọ dị mma ịmara na n’agbanyeghị na obi abụọ adịghị ya na Timoti nwere mmetụta ọma n’ebe ndị ọzọ na-eto eto nọ na Listra na Aịkọnịọm nọ, ndị okenye nọ n’ebe ahụ ejichighị ya iso Pọl jee ozi. Ha ekwubighị na ikwe ka Timoti sonyere onyeozi ahụ ga-abụ mfu dị nnọọ ukwuu nye ọgbakọ ha.—1 Timoti 4:14.
Karịsịa, ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịchọ inwe mmetụta dị mma n’ebe ụmụ ha nọ n’okwu a. Ná nnyocha ahụ a ka kpọtụsịrị aha, pasent 40 nke ndị a jụrụ ajụjụ hotara nne na nna ha dị ka ebe ha si nweta agbamume bụ́ isi maka ịbanye n’ozi Betel. Otu nwanna nwanyị bụ́ onye nọworo na-eje ozi na Betel ruo afọ ole na ole kwuru, sị: “Ndụ nne na nna m n’ozi Jehova bụụrụ m ihe mkpali siri ike ịbanye ozi Betel. Site n’ịhụ ihe nlereanya ha n’ozi oge nile, amaara m nnọọ na nke a ga-abụ ụzọ ndụ kasị mma na nke kasị enye afọ ojuju ịhọrọ.”
[Igbe dị na peeji nke 24]
HA NWERE EKELE MAKA OZI BETEL
“Eji m ozi m na-eje na Betel kpọrọ ihe. Ọ bụ ihe na-enye afọ ojuju ịmara na m ejeworo Jehova ozi n’ụbọchị nile nakwa na m ga-eme otú ahụ echi, nwanne echi, na ụbọchị ndị ọzọ. Nke a na-enye m akọ na uche dị mma ma na-eme ka echiche ndị dị mma jupụta m n’uche.”
“Betel bụ ebe ị pụrụ itinye oge na ume ọrụ gị nile n’ijere Jehova ozi n’enweghị ihe ndọpụ uche. Nke a na-eweta ọṅụ nke obi. Ma ị pụkwara ịhụ nzukọ Jehova n’ụzọ dị iche. Ị na-enwe mmetụta nke ịnọkwu nnọọ nso n’ebe bụ́ isi nke nzukọ a, nke a na-emekwa ka ọ bụrụ ihe na-akpali nnọọ akpali.”
“Ịbịa Betel bụ ihe kasị mma metụworo m. Ịmụ ihe adịghị agwụ agwụ n’ebe a. N’ebe a kwa, mmụta abụghị maka ịrụzu ihe onwe onye m, kama ọ bụ maka Jehova. N’ebe a, ọrụ m agaghị abụ n’efu ma ọlị.”
“Iji nkà m eme ihe na Betel na-eme ka m nwee afọ ojuju na obi iru ala n’ihi na m ji ha arụrụ Jehova na ụmụnna m ọrụ.”
“Apụghị m ịchọta ezi afọ ojuju na obi ụtọ n’ọrụ mbụ m. Enwewo m ọchịchọ ruo ọtụtụ afọ isoro ụmụnna m ndị ikom na ndị inyom na-arụ ọrụ nakwa ịrụrụ ha ọrụ. Ọ bụ ya mere m ji bịa Betel. Ana m enweta ezi afọ ojuju n’ịmara na mgbalị m nile ga-abara ndị ọzọ uru n’ụzọ ime mmụọ nakwa na ọ ga-ewetara Jehova otuto.”