Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okpukpe Ọ̀ Ga-eweta Udo Ụwa?

Okpukpe Ọ̀ Ga-eweta Udo Ụwa?

Okpukpe Ọ̀ Ga-eweta Udo Ụwa?

SITE n’August 28 ruo August 31, 2000, ihe karịrị ndị nnọchiteanya 500 si mba 73 zukọrọ na New York City. Ha zukọrọ n’ụlọ ọrụ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu maka “Nzukọ Udo Ụwa nke Ndị Ndú Okpukpe na Ndị Ndú Ime Mmụọ Maka Narị Afọ Iri A.” Okpukpe ndị ndú ahụ—ndị ọtụtụ n’ime ha yi ákwà isi, uwe mwụda na-acha odo odo, okpu ábụ̀bà, ma ọ bụ uwe ogologo dị oji—nọchitere anya ha dị nnọọ ọtụtụ. Okpukpe Baha’i, okpukpe Buddha, okpukpe Hindu, Alakụba, okpukpe Jain, okpukpe ndị Juu, okpukpe Shinto, okpukpe Sikh, okpukpe Tao, okpukpe Zoroaster, na okpukpe dị iche iche nke Krisendọm socha na ha.

Ndị nnọchiteanya ahụ zukọrọ n’ụlọ ọrụ òtù Mba Ndị Dị n’Otu n’ụbọchị abụọ mbụ nke nzukọ ụbọchị anọ ahụ. Otú ọ dị, ọ bụghị òtù Mba Ndị Dị n’Otu haziri ma ọ bụ kwụọ ihe ndị e mefuru ná nzukọ ahụ kama ọ bụ òtù ọrụ ebere dị iche iche mere ya. Otú o sina dị, ma òtù UN ma ndị ndú okpukpe kwuru banyere mkpa ọ dị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji kwụsị ịda ogbenye, ịkpa ókè agbụrụ, nsogbu ndị metụtara gburugburu ebe obibi, agha, na ngwá agha ndị na-egbu mmadụ n’igwe.

Ndị nnọchiteanya ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ aha ya bụ́ “Nkwekọrịta Maka Udo Zuru Ụwa Ọnụ.” Ka akwụkwọ ahụ na-ekweta na ime ihe ike na agha bụ ihe ndị “a na-eme mgbe ụfọdụ n’aha okpukpe,” o kwupụtara na ndị ahụ na-abịanye aka na ya na ‘òtù Mba Ndị Dị n’Otu ga-ejikọ aka iji weta udo.’ Otú ọ dị, e nweghị mkpebi ọ bụla kpọmkwem nke na-egosi otú a pụrụ isi mee nke a.

N’ụbọchị nke abụọ, Bawa Jain, bụ́ odeakwụkwọ ukwu nke nzukọ ahụ, kwubiri okwu mmeghe ya site n’ịkọwa na afọ ụfọdụ tupu mgbe ahụ, ya hụrụ otu ihe e sere n’ụlọ ọrụ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Ihe osise ahụ gosiri otu nwoke toro ogologo karịa ụlọ Ọfịs Ndị Isi nke Mba Ndị Dị n’Otu. Ọ nọ na-akụ aka n’ụlọ ahụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ọnụ ụzọ. Ihe e dere n’okpuru ihe osise ahụ bụ: “Onyeisi Udo.” Maazị Jain kwuru, sị: “[Ihe osise ahụ] nwere mmetụta miri emi n’ahụ m ozugbo m hụrụ ya. Ajụrụ m mmadụ dị iche iche ihe [ọ] pụtara. Echere m na taa, amatala m azịza ya. Mgbakọ unu nile gbakọtara ebe a, ndị ndú ime mmụọ na nke okpukpe nke ụwa, na-egosi m na [nke a] bụ onyeisi udo ahụ na-akụ aka n’ọnụ ụzọ ụlọ ọrụ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu.”

Bible na-enye echiche dị iche. Ọ na-egosi na Onyeisi Udo bụ Jisọs Kraịst. Ọ ga-eweta udo zuru ụwa ọnụ, ọ bụghị site ná mgbalị nke ndị isi ọchịchị ma ọ bụ ndị ndú okpukpe nke ụwa a, kama site n’Alaeze Chineke. Ọ bụ Alaeze a—ọchịchị eluigwe nke Chineke—ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ijikọta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ma mee ka e mee uche Chineke n’ụwa.—Aịsaịa 9:6; Matiu 6:9, 10.