Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ Ma Dị Ndụ!

Tụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ Ma Dị Ndụ!

Tụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ Ma Dị Ndụ!

“Ịtụkwasị uche ná Mmụọ Nsọ bụ ndụ.”—NDỊ ROM 8:6.

1, 2. Ọdịiche dị aṅaa ka Bible na-egosi n’etiti “anụ ahụ” na “Mmụọ Nsọ”?

Ọ BỤGHỊ obere ihe ịma aka ịnọgide na-enwe omume dị ọcha n’ihu Chineke n’etiti ọha mmadụ rụrụ arụ bụ́ ndị na-eme ka imeju ihe ụtọ nke agụụ anụ ahụ yie ihe dị oké mkpa. Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ na-egosi ọdịiche dị n’etiti “anụ ahụ” na “Mmụọ Nsọ,” na-egosi ókè doro anya dị n’etiti ajọ ihe na-esite na mmadụ ikwe ka anụ ahụ na-emehie emehie na-achịkwa ya na ngọzi ndị na-esite na mmadụ ikwe ka mmetụta nke mmụọ nsọ Chineke na-achịkwa ya.

2 Dị ka ihe atụ, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụ Mmụọ na-eme ka mmadụ dị ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọ bụla: okwu nke Mụ onwe m gwaworo unu, ha bụ mmụọ, bụrụkwa ndụ.” (Jọn 6:63) Nye ndị Kraịst nọ na Galetia, Pọl onyeozi dere, sị: “Agụụ na-agụ anụ ahụ megide Mmụọ Nsọ, agụụ na-agụkwa Mmụọ Nsọ megide anụ ahụ; n’ihi na ndị a na-emegide onwe ha.” (Ndị Galetia 5:17) Pọl kwukwara, sị: “Onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye Mmụọ Nsọ ga-esite ná Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.”—Ndị Galetia 6:8.

3. Gịnị dị mmadụ mkpa iji nwere onwe ya pụọ n’ọchịchọ ndị na-ezighị ezi?

3 Mmụọ nsọ Jehova—ike ya nọ n’ọrụ—pụrụ iwepụ n’ụzọ dị irè “ihe ọjọọ dị iche iche na-agụ anụ ahụ” nakwa nchịkwa na-ebibi ihe nke anụ ahụ anyị na-emehie emehie. (1 Pita 2:11) Iji nwere onwe anyị pụọ n’agbụ nke ọchịchọ na-ezighị ezi, ọ dị oké mkpa ka anyị nwee enyemaka nke mmụọ Chineke, n’ihi na Pọl dere, sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ; ma ịtụkwasị uche ná Mmụọ Nsọ bụ ndụ na udo.” (Ndị Rom 8:6) Gịnị ka ịtụkwasị uche ná mmụọ nsọ pụtara?

“Ịtụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ”

4. Gịnị ka “ịtụkwasị uche ná Mmụọ Nsọ” pụtara?

4 Mgbe Pọl dere banyere “ịtụkwasị uche ná Mmụọ Nsọ,” o ji okwu Grik pụtara “ụzọ iche echiche, uche (a tụkwasịrị n’ihe), . . . nzube, nchụso, mgbaso,” mee ihe. Ngwaa ya na ya yiri pụtara “iche echiche, ichela echiche n’otu ụzọ kpọmkwem.” N’ihi ya, ịtụkwasị uche ná mmụọ nsọ pụtara ịbụ onye ike Jehova nọ n’ọrụ na-achịkwa, na-akwalikwa. Ọ na-egosi na anyị ji ọchịchọ obi ekwe ka mmụọ nsọ Chineke na-achịkwa echiche, ọchịchọ, na nchụso anyị kpam kpam.

5. Ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ hà aṅaa ka anyị kwesịrị ikwe ka mmụọ nsọ na-achịkwa anyị?

5 Pọl mere ka ókè anyị kwesịrị ikwe ka mmụọ nsọ na-achịkwaru anyị pụta ìhè mgbe o kwuru banyere ịbụ ‘ohu site ná Mmụọ Nsọ.’ (Ndị Rom 7:6) Ná ndabere nke okwukwe ndị Kraịst nwere n’àjà mgbapụta Jisọs, e mewo ka ha nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ndị mmehie na-achịkwa, ha esiwokwa otú ahụ ‘nwụọ’ n’ọnọdụ ha mbụ dị ka ndị ohu ya. (Ndị Rom 6:2, 11) Ndị nwụrụ ọnwụ ihe atụ n’ụzọ dị otú ahụ ka dị ndụ n’anụ ahụ ma nwerezie onwe ha ịgbaso Kraịst dị ka “ndị ohu nke ezi omume.”—Ndị Rom 6:18-20.

Mgbanwe Dị Egwu

6. Mgbanwe dị aṅaa ka ndị na-aghọ “ohu nke ezi omume” na-enwe?

6 Mgbanwe site n’ịbụ “ndị ohu nke mmehie” gaa n’ijere Chineke ozi dị ka “ndị ohu nke ezi omume” dị egwu n’ezie. Pọl dere banyere ụfọdụ mere mgbanwe dị otú ahụ, sị: ‘A sachawo unu, e dowo unu nsọ, a gụwo unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.’—Ndị Rom 6:17, 18; 1 Ndị Kọrint 6:11.

7. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ile ihe anya n’ụzọ Jehova si ele ha anya?

7 Iji nwee mgbanwe dị ịrịba ama otú ahụ, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ mụta banyere ụzọ Jehova si ele ihe anya. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid rịọsiri Chineke arịrịọ ike, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile . . . Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe.” (Abụ Ọma 25:4, 5) Jehova gere Devid ntị, Ọ pụkwara ịza ekpere dị otú ahụ n’ebe ndị na-ejere ya ozi n’oge a nọ. Ebe ọ bụ na ụzọ Chineke na eziokwu ya dị ọcha ma dị nsọ, ịtụgharị uche na ha ga-enye aka ma ọ bụrụ na a nwaa anyị imeju ọchịchọ anụ ahụ na-adịghị ọcha.

Òkè Dị Oké Mkpa nke Okwu Chineke Na-ekere

8. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị na-amụ Bible?

8 E dere Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ike mmụọ nsọ ya. N’ihi ya, otu ụzọ dị oké mkpa isi kwe ka mmụọ nsọ ahụ na-arụ ọrụ n’ime anyị bụ site n’ịgụ na ịmụ Bible—kwa ụbọchị ma ya kwe mee. (1 Ndị Kọrint 2:10, 11; Ndị Efesọs 5:18) Iji eziokwu Bible na ụkpụrụ ya na-emejupụta uche na obi anyị ga-enyere anyị aka iguzogide mwakpo a na-awakpo ọnọdụ ime mmụọ anyị. Ee, mgbe ọnwụnwa nke ime omume rụrụ arụ bilitere, mmụọ Chineke pụrụ ime ka anyị cheta ihe ncheta ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na ụkpụrụ nduzi ndị pụrụ ime ka mkpebi anyị ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke sikwuo ike. (Abụ Ọma 119:1, 2, 99; Jọn 14:26) Ya mere, a gaghị aghọgbu anyị gaa n’ịgbaso ụzọ na-ezighị ezi.—2 Ndị Kọrint 11:3.

9. Olee otú ọmụmụ Bible si eme ka mkpebi anyị mere ichekwa mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike?

9 Ka anyị nọgidere na-eji ezi obi na ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ site n’enyemaka nke mbipụta ndị dabeere na Bible, mmụọ Chineke na-emetụta uche na obi anyị, na-eme ka nkwanye ùgwù anyị nwere n’ebe ụkpụrụ Jehova dị mikwuo emi. Mmekọrịta anyị na Chineke ga-aghọ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. Mgbe ọnwụnwa chere anyị ihu, anyị agaghị na-eche banyere otú ime ihe ọjọọ pụrụ isi dị ụtọ. Kama nke ahụ, ihe mbụ ga-abụ nchegbu anyị bụ ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova. Ekele siri ike anyị nwere maka mmekọrịta anyị na ya ga-akwali anyị ịlụso ọchịchọ ọ bụla nke pụrụ imebi ya ọgụ.

“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”

10. N’ihi gịnị ka irubere iwu Jehova isi ji dị mkpa iji na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ?

10 Ọ bụrụ na anyị ga-atụkwasị obi ná mmụọ nsọ, inwe ihe ọmụma nke Okwu Chineke ezughị. Eze Solomọn maara ụkpụrụ Jehova nke ọma, ma o bighị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha n’akụkụ ikpeazụ nke ndụ ya. (1 Ndị Eze 4:29, 30; 11:1-6) Ọ bụrụ na anyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, anyị ga-ahụ mkpa nke, ọ bụghị nanị ịmara ihe Bible na-ekwu, kamakwa iji obi anyị dum na-erube isi n’iwu Chineke. Nke ahụ pụtara iji nlezianya na-enyocha ụkpụrụ nile nke Jehova ma jiri ịdị uchu na-agbalị ịgbaso ha. Ọbụ abụ ahụ nwere ụdị àgwà a. Ọ bụrụ n’abụ, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Mgbe anyị nwere nchegbu n’ezie banyere ịgbaso iwu Chineke, a na-akwali anyị igosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke. (Ndị Efesọs 5:1, 2) Kama ịbụ ndị a na-adọta ime ihe ọjọọ dị ka a ga-asị na anyị enweghị enyemaka, anyị na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọchịchọ nke ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na-emekwa ka anyị gbakụta “ọrụ nile nke anụ ahụ” bụ́ ndị rụrụ arụ, azụ.—Ndị Galetia 5:16, 19-23; Abụ Ọma 15:1, 2.

11. Olee otú ị ga-esi akọwa na iwu Jehova nke na-amachibido ịkwa iko bụ ihe nchebe nye anyị?

11 Olee otú anyị pụrụ isi zụlite nkwanye ùgwù na ịhụnanya miri emi n’ebe iwu Jehova dị? Otu ụzọ bụ site n’iji nlezianya na-enyocha abamuru ya. Tụlee iwu Chineke nke mere ka mmekọahụ dịịrị nanị ndị lụrụ di na nwunye ma machibido ịkwa iko nile. (Ndị Hibru 13:4) Irube isi n’iwu a ọ̀ na-anapụ anyị ihe ọma ọ bụla? Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya ọ̀ ga-enye iwu nke na-anapụ anyị ihe bara uru? Ọ dịghị ma ọlị! Leenụ ihe na-eme ná ndụ ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-adịghị ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ọma nke Jehova. Iburu ime ọkwà na-edubakarị ha n’isikwopụ afọ ime ma ọ bụ ikekwe n’alụmdi na nwunye ha na-etorubeghị maka ya na nke obi ụtọ kọrọ. Ọtụtụ ndị aghaghị ịzụlite nwa n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ọzọkwa, ndị na-akwa iko na-ekpughepụ onwe ha nye ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. (1 Ndị Kọrint 6:18) Ọ bụrụkwa na onye na-ejere Jehova ozi akwaa iko, mmetụta uche ọ na-eweta pụrụ ibibi ihe. Ịnwa ịbịajụ obi amamikpe pụrụ ịkpata ehighị ụra abalị na mmekpa ahụ nke uche. (Abụ Ọma 32:3, 4; 51:3) Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na o doghị anya na e nyere iwu Jehova nke na-amachibido ịkwa iko iji chebe anyị? Ee, e nwere n’ezie abamuru dị ukwuu dị n’ịnọgide na-adị ọcha n’omume!

Kpee Ekpere Maka Enyemaka Jehova

12, 13. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ikpe ekpere mgbe anyị nwewara ọchịchọ mmehie?

12 N’ezie, ịtụkwasị uche ná mmụọ nsọ chọrọ ekpere si n’obi. O kwesịrị ekwesị ịrịọ maka enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu . . . na-amata inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu nke eluigwe ga-esi aṅaa ghara iwere karị Mmụọ Nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ Ya?” (Luk 11:13) N’ekpere, anyị pụrụ igosipụta ndabere anyị n’ebe mmụọ nsọ dị maka enyemaka n’ihe banyere adịghị ike anyị. (Ndị Rom 8:26, 27) Ọ bụrụ na anyị aghọta na ọchịchọ ma ọ bụ àgwà mmehie na-emetụta anyị, ma ọ bụ ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị na-ahụ n’anya emee ka anyị mata nke a, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkpọ nsogbu ahụ aha kpọmkwem n’ekpere anyị ma rịọ maka enyemaka Chineke n’imeri ọchịchọ ndị ahụ.

13 Jehova pụrụ inyere anyị aka ịtụkwasị uche n’ihe ndị ziri ezi, ihe ndị dị ọcha, ihe ndị dị mma, na ihe ndị kwesịrị otuto. Leekwa ka o si daba adaba ịrịọsi ya arịrịọ ike ka “udo nke Chineke” wee na-eche obi na echiche uche anyị nche! (Ndị Filipaị 4:6-8) Ya mere, ka anyị na-ekpe ekpere maka enyemaka Jehova iji “na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ.” (1 Timoti 6:11-14) Site n’enyemaka Nna anyị nke eluigwe, nchegbu na ọnwụnwa agaghị eru n’ókè nke enweghị nchịkwata. Kama nke ahụ, ndụ anyị ga-enwe udo nke Chineke na-enye.

Emela Ihe Ga-ewute Mmụọ Nsọ

14. N’ihi gịnị ka mmụọ Chineke ji bụrụ ihe mkpali maka ịdị ọcha?

14 Ndị ohu Jehova tozuru okè na-etinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ n’onwe ha: “Unu emenyụla Mmụọ Nsọ.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:19) Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ Chineke bụ “mmụọ nke ịdị nsọ,” ọ dị ọcha, dị nsọ. (Ndị Rom 1:4) Mgbe ọ na-arụ ọrụ n’ime anyị, mmụọ ahụ na-esi otú ahụ abụ ihe mkpali maka ịdị nsọ, ma ọ bụ ịdị ọcha. Ọ na-enye aka idebe anyị n’ụzọ ndụ dị ọcha bụ́ nke e ji irubere Chineke isi mara. (1 Pita 1:2) Àgwà ọ bụla na-adịghị ọcha na-apụta ilelị mmụọ nsọ ahụ, nke ahụ pụkwara ịkpata ihe ndị na-ebibi ihe. N’ụzọ dị aṅaa?

15, 16. (a) Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe ga-ewute mmụọ nsọ Chineke? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ Jehova?

15 Pọl dere, sị: “Unu emekwala ihe ga-ewute Mmụọ Nsọ nke Chineke, Onye a kara unu akara n’ime Ya ruo ụbọchị mgbapụta.” (Ndị Efesọs 4:30) Akwụkwọ Nsọ na-akọwa mmụọ nsọ Jehova dị ka akara, ma ọ bụ ‘ihe ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi ji mara na ha ga-enwezu nkwa ahụ nile.’ Nke ahụ bụkwa ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (2 Ndị Kọrint 1:22; 1 Ndị Kọrint 15:50-57; Mkpughe 2:10) Mmụọ Chineke pụrụ iduzi ndị e tere mmanụ na ndị enyi ha nwere olileanya ịdị ndụ n’elu ala gaa ná ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi, ọ pụkwara inyere ha aka izere ọrụ mmehie.

16 Onyeozi ahụ dọrọ aka ná ntị megide ọchịchọ nke ịgha ụgha, izu ohi, omume ihere, na ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ihe ndị dị otú ahụ dọrọ mmasị anyị, anyị ga na-aga n’ụzọ megidere ndụmọdụ nke Okwu Chineke bụ́ nke sitere n’ike mmụọ nsọ. (Ndị Efesọs 4:17-29; 5:1-5) Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, anyị pụrụ isi otú ahụ na-eme ihe ga-ewute mmụọ nsọ Chineke, n’eziekwa, nke ahụ bụ ihe anyị kwesịrị izere. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime anyị amalite ileghara ndụmọdụ nke Okwu Jehova anya, anyị pụrụ ịmalite ịzụlite omume ma ọ bụ àgwà ndị pụrụ iduga n’ịma ụma eme mmehie nakwa n’enweghịzi ihu ọma Chineke ma ọlị. (Ndị Hibru 6:4-6) Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ghara ịdị na-eme mmehie ugbu a kpọmkwem, anyị pụrụ ịdị na-etinye isi n’ụzọ ahụ. Site n’ịnọgide na-eme ihe n’ụzọ megidere nduzi nke mmụọ nsọ, anyị ga na-eme ihe na-ewute ya. Anyị ga na-eguzogidekwa ma na-eme ihe na-ewute Jehova, bụ́ onye na-enye mmụọ nsọ. Dị ka ndị hụrụ Chineke n’anya, anyị achọghị ime nke ahụ ma ọlị. Kama nke ahụ, ka anyị na-ekpe ekpere maka enyemaka Jehova ka anyị wee ghara ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ ya kama ka anyị nwee ike iwetara aha nsọ ya nsọpụrụ site n’ịnọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ.

Nọgide Na-atụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ

17. Olee ụfọdụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anyị pụrụ isetịpụ, n’ihi gịnịkwa ka ịrụ ọrụ iji ruo ha ga-eji bụrụ ihe amamihe?

17 Otu ụzọ kwesịrị ịrịba ama anyị ga-esi nọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ bụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ma rụọ ọrụ iji ruo ha. N’ịdabere ná mkpa na ọnọdụ anyị, ihe mgbaru ọsọ anyị pụrụ ịgụnye ime ka àgwà ọmụmụ ihe anyị ka mma, ịmụba òkè anyị na-ekere n’ọrụ nkwusa ahụ, ma ọ bụ iru eru maka otu ihe ùgwù ije ozi kpọmkwem, dị ka ozi ịsụ ụzọ oge nile, ozi Betel, ma ọ bụ ọrụ ozi ala ọzọ. Nke a ga-eme ka ihe ime mmụọ dịgide n’obi anyị, ọ ga-enyekwara anyị aka iguzogide ịbụ ndị adịghị ike mmadụ meriri, ma ọ bụ ịbụ ndị ihe mgbaru ọsọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na ọchịchọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke e ji mara usoro ihe a, na-achịkwa. N’ezie, nke a bụ ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso, n’ihi na Jisọs gbara ume, sị: “Unu akpadola akụ̀ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi: kama kpadoonụ akụ̀ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi: n’ihi na ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.”—Matiu 6:19-21.

18. N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa ịnọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ na mgbe ikpeazụ a?

18 Ịtụkwasị uche ná mmụọ nsọ na ịbịajụ ọchịchọ ụwa bụ n’ezie ihe amamihe dị na ya ime na “mgbe ikpeazụ” a. (2 Timoti 3:1-5) E kwuweri, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:15-17) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye Kraịst na-eto eto achụsoo ihe mgbaru ọsọ nke ozi oge nile, nke a pụrụ ịbụ ihe nduzi n’afọ ndị na-ama aka nke oge uto ma ọ bụ nke oge a na-akatabeghị ahụ. Mgbe a rụgidere ya imebi nguzo ya, onye dị otú ahụ ga-eji anya nke uche ya hụ nke ọma ihe ọ chọrọ ịrụzu n’ozi Jehova. Onye dị otú ahụ ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe ga-ewere ya dị ka ihe amamihe na-adịghị na ya, ọbụna ihe nzuzu, ịbụ onye na-agaghị eru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ n’ihi nchụso ihe onwunwe ma ọ bụ ihe ụtọ ọ bụla nke mmehie na-ekwe nkwa inye. Cheta na Mosis bụ́ onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe “họọrọ ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke, kama inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge.” (Ndị Hibru 11:24, 25) Ma ànyị na-eto eto ma ànyị emewo agadi, anyị na-eme nhọrọ yiri nke ahụ mgbe anyị na-anọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ kama ịtụkwasị uche n’anụ ahụ na-emehie emehie.

19. Uru dị aṅaa ka anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ?

19 “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ, ya na Chineke dị n’iro,” ebe “ịtụkwasị uche ná Mmụọ Nsọ bụ ndụ na udo.” (Ndị Rom 8:6, 7) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ, anyị ga-enweta udo dị oké ọnụ ahịa. A ga-echebe obi na ike iche echiche anyị n’ụzọ zukwuru ezu pụọ ná mmetụta nke ọnọdụ mmehie anyị. Anyị ga-aka enwe ike iguzogide ọnwụnwa nke ime ihe ọjọọ. Anyị ga-enwetakwa enyemaka Chineke iji nagide ọgụ na-aga n’ihu n’etiti anụ ahụ na mmụọ nsọ.

20. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọ pụrụ ikwe omume inwe mmeri n’ọgụ a anụ ahụ na mmụọ nsọ na-alụ?

20 Site n’ịnọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ, anyị na-anọgide na-enwe njikọ dị oké mkpa n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye na-enye ma ndụ ma mmụọ nsọ. (Abụ Ọma 36:9; 51:11) Setan bụ́ Ekwensu na ndị ọrụ ya na-eme ihe nile ha pụrụ ime iji mebie mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Ha na-anwa ịchịkwa uche anyị, na-amara na ọ bụrụ na anyị adaa, nke a ga-emecha duga n’anyị ịbụ ndị iro Chineke nakwa n’ọnwụ. Ma anyị pụrụ inwe mmeri n’ọgụ a anụ ahụ na mmụọ nsọ na-alụ. Nke ahụ bụ ahụmahụ Pọl nwere, n’ihi na mgbe ọ na-ede banyere ọgụ nke ya, o bu ụzọ jụọ, sị: “Ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?” Mgbe ahụ, n’igosipụta na nnapụta ga-ekwe omume, o kwuru, sị: “Ekele dịrị Chineke na ndọpụta sitere n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 7:21-25) Anyị onwe anyị kwa pụrụ ikele Chineke site n’aka Kraịst maka inye anyị ụzọ isi na-anagide adịghị ike mmadụ ma nọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ ya na olileanya dị ebube nke ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka ịtụkwasị uche ná mmụọ nsọ pụtara?

• Olee otú anyị pụrụ isi kwe ka mmụọ nsọ Jehova na-arụ ọrụ n’ime anyị?

• Kọwaa ihe mere, n’ọgụ anyị na-alụso mmehie, o ji dị oké mkpa ịmụ Bible, irube isi n’iwu Jehova, na ikpeku ya ekpere.

• Olee otú isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ pụrụ isi mee ka anyị nọgide n’ụzọ nke ndụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọmụmụ Bible na-enyere anyị aka iguzogide mwakpo a na-awakpo ọnọdụ ime mmụọ anyị

[Foto dị na peeji nke 17]

O kwesịrị ekwesị ikpe ekpere maka enyemaka Jehova iji merie ọchịchọ mmehie

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-atụkwasị uche ná mmụọ nsọ