Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngọzi Alaeze Pụrụ Ịbụ nke Gị

Ngọzi Alaeze Pụrụ Ịbụ nke Gị

Ngọzi Alaeze Pụrụ Ịbụ nke Gị

ONYE Kraịst bụ́ Pọl onyeozi maara asụ asụsụ ụfọdụ ndị bụ́ isi nke oge ya n’ụzọ na-aga were were. O nwetara agụmakwụkwọ nke ya na nke mahadum nke oge a bụ otu ihe. O nwetara ihe nile ruuru nwa amaala Rom. (Ọrụ 21:37-40; 22:3, 28) Iru eru ndị a pụrụ imewo ka o nwee ike ịghọ ọgaranya na onye a ma ama. Ma, o kwuru, sị: “Ihe ọ bụla nke baara m uru, ihe ndị a ka m gụrụ n’ihe iyi n’ihi Kraịst anyị. . . . Ana m agụkwa ha n’ihe mkpofu, ka m wee rite Kraịst n’uru.” (Ndị Filipaị 3:7, 8) N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo okwu dị otú ahụ?

N’ịbụ onye a mabu dị ka Sọl onye Tasọs nakwa dị ka onye na-akpagbu ndị “dị n’Ụzọ a,” Pọl ghọrọ onye kwere ekwe mgbe e mesịrị ka ọ hụ Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie ma mee ka ọ dị ebube, n’ọhụụ. (Ọru 9:1-19) Nye Pọl, ahụmahụ a o nwere n’ụzọ Damaskọs gosipụtara n’ụzọ obi abụọ na-adịghị ya na Jisọs bụ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye ga-achị n’Alaeze ahụ e kwere ná nkwa, n’ọdịnihu. O mekwara ka ụzọ ndụ Pọl gbanwee n’ụzọ dị egwu, dị ka e gosipụtara n’okwu ya dị ike dị n’elu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, n’ịbụ onye nwere obi ziri ezi na nke eziokwu, Pọl chegharịrị.—Ndị Galetia 1:13-16.

N’ime Bible, a na-asụgharịkarị ngwaa bụ́ “chegharịa” site n’okwu Grik nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịmara ihe mgbe e mesịrị,” ọ bụghị nke pụtara “ibu ụzọ mara ihe.” N’ihi ya, nchegharị na-agụnye mmadụ ime mgbanwe n’uche, àgwà, ma ọ bụ ná nzube ya, mmadụ ịjụ ụzọ ndụ ya mbụ dị ka nke na-adịghị enye afọ ojuju. (Ọrụ 3:19; Mkpughe 2:5) N’ọnọdụ Pọl, o kweghị ka ihe omume ahụ dị mkpa mere n’ụzọ Damaskọs bụrụ nke mmetụta uche nkịtị ma ọ bụ ọbụna ihe a na-asị na ọ bụ ahụmahụ ime mmụọ. Nye ya, ọ bụ ihe mere ka ọ mara eziokwu ahụ bụ́ na ụzọ ndụ ya mbụ, nke amaghị Kraịst, bụ nke na-abaghị n’ihe. Ọ ghọtakwara na iji rite uru n’ihe ọmụma o nwetara ọhụrụ banyere Kraịst, ọ ghaghị ime ihe iji mezie ụzọ ndụ ya.—Ndị Rom 2:4; Ndị Efesọs 4:24.

Mgbanwe nke Wetara Ngọzi

Na mbụ, ihe ọmụma Pọl nwere banyere Chineke sitere n’ụzọ bụ́ isi n’ịrọ òtù nke ndị Farisii, bụ́ nke o so na ya. Nkwenkwe ha gụnyere ọtụtụ nkà ihe ọmụma na ọdịnala mmadụ. N’ihi ajọ mbunobi okpukpe, ịnụ ọkụ n’obi na mgbalị Pọl ghọrọ nke hiere ụzọ. N’agbanyeghị na o chere na ọ na-ejere Chineke ozi, n’ezie ọ nọ na-alụso ya ọgụ.—Ndị Filipaị 3:5, 6.

Mgbe Pọl nwetasịrị ezi ihe ọmụma banyere Kraịst na òkè ọ na-ekere ná nzube Chineke, ọ hụrụ na e nwere nhọrọ ọ ga-eme: Ọ̀ ga-anọgide na-abụ onye Farisii ma nọgide na-enwe ọkwá na ùgwù, ka ọ̀ ga-agbanwe ụzọ ndụ ya ma malite ime ihe dị mkpa iji bụrụ onye Chineke nakweere? N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Pọl mere nhọrọ ziri ezi, n’ihi na ọ sịrị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m: n’ihi na ọ bụ ike nke Chineke ruo nzọpụta nye onye ọ bụla nke kwere; onye Juu na mbụ, na onye Grik kwa.” (Ndị Rom 1:16) Pọl ghọrọ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma banyere Kraịst na Alaeze ahụ.

Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pọl gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Mụ onwe m agụghị onwe m na ejidewo m ruo ugbu a: ma otu ihe ka m na-eme, ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru ókè ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 3:13, 14) Pọl ritere uru site n’ozi ọma ahụ n’ihi na o ji ọchịchọ obi gbahapụ ihe nọ na-adọpụ ya site n’ebe Chineke nọ, o jikwa obi ya dum chụsoo ihe mgbaru ọsọ ndị ha na nzube Chineke kwekọrọ.

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

Ikekwe ị ka nụrụ nnọọ ozi ọma Alaeze ahụ na nso nso a. Olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs zuru okè ọ̀ na-amasị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị, n’ihi na anyị nile nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa ịdị ndụ na ịnụ ụtọ ndụ n’udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Bible na-ekwu na Chineke etinyewo “mgbe ebighị ebi” n’obi anyị. (Eklisiastis 3:11) Ya mere, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ anyị inwe olileanya maka oge mgbe ndị mmadụ pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’udo na n’obi ụtọ. Nke ahụ bụkwa ihe ozi ọma Alaeze ahụ na-enye.

Otú ọ dị, iji mee ka olileanya ahụ bụrụ ihe e ji n’aka, ọ dị gị mkpa ime nchọpụta ma hụ ihe ozi ọma ahụ bụ maka ya. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “[Nwapụtara onwe gị] ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Ya mere, dị ka Pọl, mgbe i nwetasịrị ihe ọmụma na nghọta, ị ghaghị ime nhọrọ.

N’aka nke ọzọ, ị pụrụ inweworị nkwenkwe ụfọdụ banyere ọdịnihu gị. Cheta na Sọl nwererịị echiche ya banyere uche Chineke tupu ọ ghọọ Pọl onyeozi. Ma kama ịtụ anya inweta mkpughe n’aka Chineke n’ụzọ ọrụ ebube, gịnị ma i lee okwu ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ maara n’ezie ihe bụ́ uche Chineke banyere ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa? Ihe nnwapụta dị aṅaa ka m pụrụ inye iji gosi na ihe m kweere ziri ezi? Ihe nnwapụta m ọ̀ pụrụ ịbụ nke kwụ ọtọ ma e were Okwu Chineke, bụ́ Bible, nyochaa ya?’ Ọ gaghị efu gị ihe ọ bụla inyocha nkwenkwe okpukpe gị n’ụzọ dị otú a. N’ezie, i kwesịrị ime otú ahụ n’ihi na Bible na-agba anyị ume, sị: “Na-anwanụ ihe nile; jidesienụ ihe ọma ike.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) E kwuwerị, ọ̀ bụ na ọ bụghị nnakwere Chineke kasị mkpa n’ezie?—Jọn 17:3; 1 Timoti 2:3, 4.

Ndị ndú okpukpe pụrụ ikwe anyị nkwa ọdịnihu ebighị ebi. Ma nkwa ahụ agaghị enyere anyị aka inweta ngọzi Alaeze Chineke, ọ gwụla ma ọ̀ dabeere n’ozizi Bible. N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs dọsiri aka ná ntị ike, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ga-aba n’alaeze eluigwe; kama ọ bụ onye na-eme ihe Nna m Nke bi n’eluigwe na-achọ.”—Matiu 7:21.

Rịba ama mmesi ike Jisọs mesiri ime ihe Nna ya na-achọ dị ka ihe ndabere maka inweta ngọzi nke Alaeze Chineke. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụghị iwu na Chineke ga-anakwere ihe pụrụ iyi ka ò nwere ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke. N’ezie, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha Gị buo amụma, ànyị ejighịkwa aha Gị chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ànyị ejighịkwa aha Gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka M ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla M maara unu: si n’ebe M nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:22, 23) N’ụzọ doro anya, ihe dị mkpa bụ ka anyị jide n’aka na anyị ghọtara n’ụzọ ziri ezi ihe ozi ọma Alaeze ahụ bụ n’ezie ma mezie omume kwekọrọ na ya.—Matiu 7:24, 25.

Enyemaka Dị

Ruo ihe karịrị 100 afọ, Ndịàmà Jehova anọwo na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Site n’akwụkwọ ndị e biri ebi nakwa n’okwu ọnụ, ha na-enyere ndị mmadụ aka gburugburu ụwa inweta ezi ihe ọmụma banyere ihe Alaeze ahụ bụ, ngọzi ndị ọ ga-eweta, na ihe mmadụ na-aghaghị ime iji nweta ngọzi ndị dị otú ahụ.

Anyị na-agba gị ume imeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi Ndịàmà Jehova na-ekwusa dị. Site n’ịnakwere ozi ọma ahụ na ime ihe kwekọrọ na ya, ị pụrụ inweta ngọzi ndị dị ebube, ọ bụghị nanị ugbu a kamakwa n’ọdịnihu bụ́ mgbe Alaeze Chineke ga-achị ụwa nile.—1 Timoti 4:8.

Mee ihe ugbu a, n’ihi na ngọzi nke Alaeze Chineke dị nso!

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Site n’akwụkwọ ndị e biri ebi nakwa n’okwu ọnụ, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke