Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?

Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?

Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?

“NDỊ Mụrụ Ụmụ Chọrọ Ndị Mmadụ, Ọ Bụghị Ụmụaka Na-erube Isi.” Otú ahụ ka otu isi akụkọ gbara n’otu akwụkwọ akụkọ kwuru. Ihe a akwụkwọ akụkọ a kwuru dabeere n’ihe si ná nnyocha e mere na New Zealand pụta, bụ́ nke kpughere na ọ bụ nanị “pasent 22 nke ndị zaghachirinụ chere na e kwesịrị ịkụziri ụmụaka nrubeisi n’ụlọ.” Nnyocha ahụ chọpụtakwara na ndị mụrụ ụmụ taa kweere na ọ ka nnọọ mkpa ịkụziri ụmụaka ihe ndị dị ka ezi àgwà, nnwere onwe, na ibu ọrụ.

N’ọgbọ a nke ime ihe masịrị onye na ịchọ ọdịmma onwe onye jupụtara na ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwere obi abụọ banyere nrubeisi nakwa banyere ịkụziri ya ụmụaka. Ma nrụbeisi n’oge a bụ nwata ọ̀ bụ nnọọ ihe a ga-ele anya dị ka ihe oge ya gafeworo? Ka ò so n’ime ihe ndị dị mkpa ụmụaka pụrụ ịmụta ma rite uru na ha? Nke ka mkpa, olee otú Jehova Chineke, bụ́ Onye Mmalite nke ndokwa ezinụlọ, si ele irubere ndị mụrụ ụmụ isi, anya, oleekwa ụfọdụ n’ime uru ndị a na-erite site ná nrubeisi dị otú ahụ?—Ọrụ 17:28; Ndị Efesọs 3:14, 15.

“Nke A Bụ Ihe Ziri Ezi”

Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ dị n’Efesọs akwụkwọ, sị: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi.” (Ndị Efesọs 6:1) N’ihi ya, isi ihe mere e ji erube isi n’ụzọ dị otú ahụ bụ na o kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke nke ihe ziri ezi. Dị ka Pọl si kwuo ya, “nke a bụ ihe ziri ezi.”

N’ikwekọ na nke a, anyị na-arịba ama na Okwu Chineke na-akọwa ịdọ aka ná ntị nke ndị mụrụ ụmụ ji ịhụnanya enye dị ka ihe mara mma, “okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, ihe ịnya olu ka ha ga-abụrụ olu gị,” nakwa dị ka ihe “na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ilu 1:8, 9; Ndị Kọlọsi 3:20) N’ụzọ dị nnọọ iche, inupụrụ ndị mụrụ ụmụ isi na-akpata enweghị ihu ọma Chineke.—Ndị Rom 1:30, 32.

“Ka Ihe Wee Na-agara Gị nke Ọma”

Pọl rụtụrụ aka n’uru ọzọ dị n’irube isi mgbe o dere, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:2, 3; Ọpụpụ 20:12) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmadụ irubere ndị mụrụ ya isi ga-esi baara ya uru?

Iji malite, ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ndị mụrụ ụmụ ka tozuo okè ma nwee ahụmahụ karị? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ha amaghị ihe dị ukwuu banyere kọmputa ma ọ bụ ụfọdụ isiokwu ndị ọzọ a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ, ha maara ihe dị ukwuu banyere ibi ndụ na ịnagide nsogbu dị iche iche nke ndụ. N’aka nke ọzọ, ndị na-eto eto enweghị echiche guzoziri eguzozi ndị na-esite ná ntozu okè. N’ihi ya, ha na-emekarị mkpebi ọkụ ọkụ, na-adabakarị ná nrụgide na-ezighị ezi nke ndị ọgbọ, bụ́ nke na-aghọkarị ha ahịa. N’ụzọ ezi uche dị na ya, Bible na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata.” Gịnị bụ ihe ngwọta ya? “Mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị ga-eme ka ọ dị anya n’ebe ọ nọ.”—Ilu 22:15.

Abamuru nke nrubeisi gụnyere ihe karịrị nnọọ mmekọrịta nwa na onye mụrụ ya. Ka ọha mmadụ wee na-aga nke ọma ma na-arụpụta ihe, a ghaghị inwe nkwekọ, bụ́ nke n’aka nke ya, chọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nrubeisi. Dị ka ihe atụ, n’alụmdi na nwunye, ọ bụ ịdị njikere ikwenye, ọ bụghị ịdị na-achọkarị ihe n’aka onye nke ọzọ ma ghara ichebara ihe ndị ruuru ndị ọzọ na mmetụta ha echiche, na-eweta udo, nkwekọ, na obi ụtọ. N’ebe ọrụ, irubere ndị were mmadụ n’ọrụ isi dị oké mkpa ka achụmnta ego ma ọ bụ mgbalị ọ bụla wee bụrụ nke ga-aga nke ọma. N’ihe metụtara iwu na iwu nchịkwa gọọmenti, ọ bụghị nanị na nrubeisi na-eme ka mmadụ ghara inweta ntaramahụhụ kamakwa ọ na-eweta ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe.—Ndị Rom 13:1-7; Ndị Efesọs 5:21-25; 6:5-8.

Ndị na-eto eto bụ́ ndị na-enupụ isi megide ịbụisi na-aghọkarị ndị na-ekwesịghị ekwesị n’obodo. N’ụzọ dị iche, nrubeisi mmadụ mụtara n’oge ọ bụ nwata pụrụ ịdịru n’oge ndụ ya dum n’ụzọ na-akwụghachi ụgwọ. Lee uru ọ bara ịmụta nke a n’oge mmadụ bụ nwata!

Ụgwọ Ọrụ Bụ́ Isi Maka Nrubeisi

Ọ bụghị nanị na nrubeisi na-eweta mmekọrịta obi ụtọ nke ezinụlọ na abamuru ndị ọzọ na-adịru oge ndụ nile kamakwa ọ na-atọ ntọala nke a pụrụ iwukwasị mmekọrịta kasị mkpa—nke mmadụ na Onye Okike ya. Dị ka ‘Onye Okike Ukwu’ nke “isi iyi ndụ” dị n’ebe ọ nọ, ọ bụ ihe kwesịrị nnọọ ekwesị ka anyị rubere Jehova Chineke isi n’ụzọ zuru ezu.—Eklisiastis 12:1; Abụ Ọma 36:9.

Okwu ahụ bụ́ “rube isi” n’ụdị ya dịgasị iche pụtara ọtụtụ ugboro n’ime Bible. Tụkwasị na nke ahụ, e nwere ọtụtụ ebe e zoro aka n’iwu, ụkpụrụ, ihe e nyere n’iwu, na ikpe nke Chineke, bụcha ndị chọrọ ka anyị rube isi na ha. O doro anya na Chineke na-ele nrubeisi anya dị ka ihe a chọrọ n’aka anyị iji bụrụ ndị ọ na-anakwere. Ee, nrubeisi bụ ihe dị oké mkpa maka iso Jehova na-enwe mmekọrịta. (1 Samuel 15:22) N’ụzọ dị mwute, ọchịchọ mmadụ bu pụta ụwa abụghị nrubeisi kama ọ bụ nnupụisi. “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” ka Bible na-ekwu. (Jenesis 8:21) Ya mere, a ghaghị ịmụta nrubeisi ọ bụghị nanị n’oge a bụ nwata kama n’oge ndụ dum. Ime otú ahụ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.

Cheta na, dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, iwu ahụ e nyere ka a na-erubere ndị mụrụ ụmụ isi nwere nkwa abụọ, ya bụ, “ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” A na-achọta ebe e mesiri nkwa a ike n’Ilu 3:1, 2: “Nwa m, echezọla iwu m; ma ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị.” Ụgwọ ọrụ bụ́ isi dịịrị ndị na-erube isi bụ mmekọrịta onwe onye ha na Jehova nwere ugbu a na ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke udo.—Mkpughe 21:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 30, 31]

Nrubeisi na-eweta mmekọrịta obi ụtọ n’ezinụlọ, n’ebe ọrụ, nakwa n’ebe Jehova nọ