“Okwu Jehova Nọgidere Na-eto Eto”
“Okwu Jehova Nọgidere Na-eto Eto”
“Ọ bụ onye na-ezisa okwu ọnụ Ya n’ụwa; ngwa ngwa ka okwu Ya na-agba ọsọ.”—ABỤ ỌMA 147:15.
1, 2. Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, gịnịkwa ka ọ gụnyere?
A NA-ACHỌTA otu n’ime amụma ndị kasị dị ịtụnanya na Bible n’Ọrụ 1:8. N’oge na-adịghị anya tupu Jisọs arịgoo n’eluigwe, ọ gwara ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Lee nnukwu ọrụ nke a gaje ịbụ!
2 Ịkpọsa okwu Chineke n’ụwa nile aghaghị iyiwo ọrụ na-ama aka nye ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ahụ na-eso ụzọ bụ́ ndị natara ya. Tụlee ihe ọ gụnyere. Ha aghaghị inyere ndị mmadụ aka ịghọta ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ịgbara Jisọs àmà na-achọkwa isoro ndị ọzọ kerịta ozizi ya dị ike na ịkọwa òkè ọ na-ekere ná nzube Jehova. Ọzọkwa, ọrụ ahụ gụnyere ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ma mezie ha baptism. A gajekwa ime nke a n’ụwa nile!—Matiu 28:19, 20.
3. Gịnị ka Jisọs mesiri ụmụazụ ya obi ike banyere ya, oleekwa otú ha si meghachi omume n’ọrụ e nyere ha?
3 Otú o sina dị, Jisọs mesiri ụmụazụ ya obi ike na mmụọ nsọ ga-anọnyere ha n’ịrụzu ọrụ ahụ o nyeworo ha. N’ihi ya, n’agbanyeghị otú ọrụ ahụ haruru na mgbalị ndị mmegide ji ike mee n’esepụghị aka iji kwụsị ha, ndị na-eso ụzọ mbụ nke Jisọs mere ihe ọ tụziiri ha ime, n’ụzọ gara nke ọma. Ọ bụ ihe mere eme nke a na-apụghị ịgọpụ agọpụ.
4. Olee otú ịhụnanya Chineke si pụta ìhè n’ọrụ ahụ e nyere bụ́ ka e mee nkwusa nye ndị ọzọ ma zie ha ihe?
4 Ọrụ ime nkwusa na izi ihe zuru ụwa ọnụ bụ ngosipụta nke ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị na-amaghị ya nọ. O nyere ha ohere nke ịbịaru Jehova nso ma nweta mgbaghara mmehie. (Ọrụ 26:18) Ọrụ ahụ e nyere bụ́ ka e mee nkwusa ma zie ihe gosipụtakwara ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị na-ezi ozi ahụ nọ, ebe ọ bụ na ọ na-enye ha ohere igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova na igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ụmụ mmadụ ibe ha nọ. (Matiu 22:37-39) Pọl onyeozi ji ozi ndị Kraịst kpọrọ ihe nke ukwuu nke na o zoro aka na ya dị ka “akụ̀.”—2 Ndị Kọrint 4:7.
5. (a) Ebee ka anyị na-achọta ihe ndekọ a pụrụ ịdabere na ya karịsịa banyere ndị Kraịst oge mbụ, uto dịkwa aṅaa ka a kọwara n’ime ya? (b) Gịnị mere akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi ji baara ndị ohu Chineke uru taa?
5 A na-achọta ihe ndekọ a pụrụ ịdabere na ya karịsịa banyere ọrụ nkwusa nke ndị Kraịst oge mbụ n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, nke onye na-eso ụzọ bụ́ Luk dere. Ọ bụ ihe ndekọ nke uto dị ịtụnanya ma dị ngwa. Uto a ihe ọmụma nke Okwu Chineke toro na-echetara anyị Abụ Ọma 147:15, nke na-asị: “[Jehova] na-ezisa okwu ọnụ Ya n’ụwa; ngwa ngwa ka okwu Ya na-agba ọsọ.” Ihe ndekọ banyere ndị Kraịst oge mbụ, bụ́ ndị mmụọ nsọ nyere ike, bụ ma ihe na-akpali akpali ma ihe bara uru nke ukwuu nye anyị taa. Ndịàmà Jehova na-arụ otu ọrụ ahụ bụ́ ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ, nanị na ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka nnọọ ukwuu. Anyị na-enwekwa nsogbu ndị yiri nke ndị Kraịst nwere na narị afọ mbụ. Ka anyị na-atụle otú Jehova si gọzie ma nye ndị Kraịst oge mbụ ahụ ike, a na-eme ka okwukwe anyị nwere ná nkwado ya sikwuo ike.
Uto E Nwere n’Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-eso Ụzọ
6. Nkebi ahịrịokwu dị aṅaa metụtara uto pụtara ugboro atọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, gịnịkwa ka ọ na-ezo aka na ya?
6 Otu ụzọ isi nyochaa mmezu nke Ọrụ 1:8 bụ ịtụle okwu ahụ bụ́ “okwu Jehova nọgidere na-eto eto,” bụ́ nkebi ahịrịokwu pụtara nanị ugboro atọ n’ime Bible, na-enwe ihe ndị dịtụ iche n’ime ha, ndị a na-achọtakwa nke ọ bụla n’ime ha n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi. (Ọrụ 6:7; 12:24; 19:20, NW) “Okwu Jehova,” ma ọ bụ “okwu Chineke,” n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-ezo aka n’ozi ọma ahụ—ozi na-akpali akpali nke eziokwu Chineke, ozi dị ndụ, dị ike bụ́ nke gbanwere ndụ nke ndị nakweere ya.—Ndị Hibru 4:12.
7. Gịnị ka e jikọrọ ya na uto nke okwu Chineke n’Ọrụ 6:7, gịnịkwa mere n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A.?
7 Ebe mbụ e zoro aka n’uto nke okwu Chineke bụ n’Ọrụ 6:7. N’ebe ahụ, anyị na-agụ, sị: “[Okwu Chineke nọgidere na-eto eto, NW]; ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba na Jerusalem hie nne; oké ìgwè ndị nchụàjà na-aṅakwa okwukwe ahụ ntị.” N’ebe a, e jikọrọ uto na mmụba e nwere n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ. Tupu mgbe ahụ, n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., a wụsara mmụọ nsọ Chineke n’isi ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 bụ́ ndị gbakọtara n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu ụlọ. Pita onyeozi kwuziri okwu na-akpali akpali, n’ime ndị gekwara ntị, ihe dị ka 3,000 ghọrọ ndị kwere ekwe n’ụbọchị ahụ kpọmkwem. Lee mkpọtụ a na-aghaghị imewo ka ọtụtụ puku mmadụ na-aga n’otu ọdọ mmiri ma ọ bụ n’ọdọ mmiri dị iche iche dị n’ime nakwa gburugburu Jerusalem ka e mee ha baptism n’aha Jisọs, bụ́ nwoke ahụ a kpọgbuworo dị ka onye omempụ ihe dị ka ụbọchị 50 tupu mgbe ahụ!—Ọrụ 2:41.
8. Olee otú ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ si mụbaa n’afọ ndị sochiri Pentikọst 33 O.A.?
8 N’ezie, nke ahụ bụ nanị mmalite ya. Mgbalị ndị ndú okpukpe ndị Juu nọgidere na-eme iji kwụsị ọrụ nkwusa ahụ enweghị isi. N’ụzọ mere ka ndị ndú ahụ nwee obi nkoropụ, “Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara [ndị ahụ na-eso ụzọ] kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.” (Ọrụ 2:47) N’oge na-adịghị anya, “ọnụ ọgụgụ ndị ikom ahụ wee ruo ihe ha ka [puku ise].” Mgbe nke ahụ gasịrị, “e wee tụkwasị karị nye Onyenwe anyị ndị kweere na Ya, ìgwè mmadụ ma ndị ikom ma ndị inyom.” (Ọrụ 4:4; 5:14) Anyị na-agụ banyere oge ọzọ mgbe nke ahụ gasịrị, sị: “Ya mere nzukọ Kraịst n’ime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe a na-ewuli ya elu dị ka ụlọ; ọ na-abakwa ụba, ebe ọ na-aga n’egwu Onyenwe anyị na nkasi obi nke Mmụọ Nsọ.” (Ọrụ 9:31) Afọ ụfọdụ mgbe nke a gasịrị, ikekwe n’ihe dị ka 58 O.A., e zoro aka ‘n’ọtụtụ mmadụ hiri nne n’etiti ndị kweworo na Jisọs.’ (Ọrụ 21:20) Ka ọ na-erule oge ahụ, e nwekwara ọtụtụ ndị Jentaịl kwere ekwe.
9. Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa ndị Kraịst oge mbụ?
9 N’ụzọ dị ukwuu, ọ bụ site ná ntọghata ka e si nwee uto a n’ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ. Okpukpe ahụ malitere ọhụrụ—ma ọ na-arụsi ọrụ ike. N’abụtụghị ndị òtù chọọchị n’ọnụ, ndị ahụ na-eso ụzọ raara onwe ha nye Jehova na Okwu ya n’ụzọ zuru ezu, ebe ọ bụ na ha mụtara eziokwu ahụ mgbe ụfọdụ site n’aka ndị a kpagburu n’ụzọ jogburu onwe ya. (Ọrụ 16:23, 26-33) Ndị nakweere Iso Ụzọ Kraịst mere otú ahụ n’ihi mkpebi ha chere echiche nke ọma ma jiri akọ na uche mee. (Ndị Rom 12:1) E nyere ha ọzụzụ n’ụzọ Chineke; eziokwu ahụ dị n’uche nakwa n’obi ha. (Ndị Hibru 8:10, 11) Ha dị njikere ịnwụ n’ihi ihe ha kweere na ya.—Ọrụ 7:51-60.
10. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst oge mbụ nakweere, ihe dịkwa aṅaa yiri ya ka anyị na-ahụ taa?
10 Ndị nakweere ozizi ndị Kraịst ghọtara na ha nwere ibu ọrụ nke isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ. Nke a tụnyere ụtụ kpọmkwem n’uto ọzọ e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ. Otu ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “E wereghị iso ndị ọzọ kwurịta ihe e kweere dị ka ihe dịịrị nanị ndị na-anụ nnọọ ọkụ n’obi ma ọ bụ ndị a họpụtara maka izisa ozi ọma. Izisa ozi ọma bụ ihe ruuru na ọrụ dịịrị onye ọ bụla so na Chọọchị. . . . Ojiji ndị nile bụ́ ndị Kraịst ji ọchịchọ obi ha bụrụ ya nyere Iso Ụzọ Kraịst nkwali dị ukwuu site kpọmkwem ná mmalite.” O dekwara, sị: “Izisa ozi ọma bụ ihe na-akwagide ndị Kraịst oge mbụ.” Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ezi ndị Kraịst nọ taa.
Uto E Nwere n’Ọnụ Ọgụgụ Ókèala
11. Olee ụdị uto a kọwara n’Ọrụ 12:24, oleekwa otú nke a si were ọnọdụ?
11 A na-achọta ebe nke abụọ e zoro aka n’uto nke okwu Chineke n’Ọrụ 12:24 (NW): “Okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-agbasa.” N’ebe a, e jikọrọ nkebi okwu ahụ na uto e nwere n’ọnụ ọgụgụ ókèala. N’agbanyeghị mmegide sitere n’aka ndị ọchịchị, ọrụ ahụ nọgidere na-enwe ihe ịga nke ọma. Ebe mbụ a nọ wụsa mmụọ nsọ bụ na Jerusalem, okwu ahụ sikwa ebe ahụ gbasaa ngwa ngwa. Mkpagbu e nwere na Jerusalem mere ka ndị na-eso ụzọ gbasaa n’ógbè ndị dị gburugburu Judia na Sameria. Gịnị si na ya pụta? “Ndị gbasara jegharịrị na-ezisa ozi ọma, bụ́ okwu Chineke.” (Ọrụ 8:1, 4) E duziri Filip ịgba àmà nye otu nwoke bụ́ onye, mgbe e mesịrị ya baptism, ji ozi ahụ gaa Etiopia. (Ọrụ 8:26-28, 38, 39) Ngwa ngwa, eziokwu ahụ gbanyere mkpọrọgwụ na Lida, Ala Dị Larịị nke Sherọn, na Jọpa. (Ọrụ 9:35, 42) Mgbe e mesịrị, Pọl onyeozi mere njem gaa ọtụtụ puku kilomita n’oké osimiri nakwa n’ala, na-eguzobe ọgbakọ dị iche iche n’ọtụtụ mba dị na Mediterranean. Pita onyeozi gara Babilọn. (1 Pita 5:13) N’ime afọ 30 a wụsasịrị mmụọ nsọ na Pentikọst, Pọl dere na ‘e kwusawo ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe,’ ikekwe ọ na-ezo aka n’ụwa a maara n’oge ahụ.—Ndị Kọlọsi 1:23.
12. Olee otú ndị na-emegide Iso Ụzọ Kraịst si kweta na okwu Chineke nwere uto n’ọnụ ọgụgụ ókèala?
Ọrụ 17:6 na-akọ na na Tesalọnaịka, n’ebe ugwu Gris, ndị mmegide tiri mkpu, sị: “Ndị a, bụ́ ndị kpuru elu ụwa dum mmadu bi ihu, ha eruwokwa n’ebe a.” Ọzọkwa, ná mmalite narị afọ nke abụọ, Pliny nke Nta si Bitinia degara Eze Ukwu Trajan nke Rom akwụkwọ banyere Iso Ụzọ Kraịst. O mere mkpesa, sị: “Ọ bụghị nanị n’obodo ukwu ka [ọ] dị, kama o bufewo mmebi ihe ya n’obodo nta na mba ndị dị ha nso.”
12 Ọbụna ndị na-emegide Iso Ụzọ Kraịst kwetara na okwu Chineke agbanyewo mkpọrọgwụ n’Alaeze Ukwu Rom dum. Dị ka ihe atụ,13. N’ụzọ dị aṅaa ka uto e nwere n’ọnụ ọgụgụ ókèala si egosipụta ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ?
13 Uto a e nwere n’ọnụ ọgụgụ ókèala bụ ngosipụta nke ịhụnanya miri emi Jehova nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta nọ. Mgbe Pita hụrụ ka mmụọ nsọ na-apụta ìhè n’ebe onye Jentaịl ahụ bụ́ Kọniliọs nọ, o kwuru, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ee, ozi ọma ahụ bụ ma nọgide na-abụ ozi dịịrị mmadụ nile, uto okwu Chineke na-etokwa n’ọnụ ọgụgụ ókèala nyere ndị nọ n’ebe nile ohere imeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ịhụnanya Chineke dị. Na narị afọ nke 21 a, okwu Chineke agbasawo n’ụzọ nkịtị ruo akụkụ nile nke ụwa.
Uto nke Nwere Mmeri
14. Uto dị aṅaa ka a kọwara n’Ọrụ 19:20, gịnịkwa ka okwu Chineke meriri?
14 Ebe nke atọ e zoro aka n’uto nke okwu Chineke bụ n’Ọrụ 19:20 (NW): “Okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-enwe mmeri n’ụzọ dị ike.” Okwu Grik mbụ a sụgharịrị ịbụ “na-enwe mmeri” na-enye echiche nke “itinye ikike.” Amaokwu ndị bu ụzọ na-akọ na ọtụtụ ndị nọ n’Efesọs ghọrọ ndị kwere ekwe, ọtụtụ n’ime ha bụ́ ndị na-eme mgbaasị surekwara akwụkwọ ha n’ọkụ n’ihu mmadụ nile. N’ụzọ dị otú a, okwu Chineke meriri nkwenkwe okpukpe ụgha. Ozi ọma ahụ merikwara ihe mgbochi ndị ọzọ, dị ka mkpagbu. Ọ dịghị ihe pụrụ ịkwụsị ya. Na nke a, anyị na-ahụ ọzọ ihe ya na ezi Iso Ụzọ Kraịst nke oge anyị yiri n’ụzọ pụtara ìhè.
15. (a) Gịnị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Bible dere banyere ndị Kraịst oge mbụ? (b) Ònye ka ndị ahụ na-eso ụzọ kwuru na ihe ịga nke ọma ha sitere n’aka ya?
15 Ndị ozi na ndị Kraịst oge mbụ ndị ọzọ ji ịnụ ọkụ n’obi kpọsaa okwu Chineke. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Bible kwuru banyere ha, sị: “Mgbe ndị mmadụ nwere ọchịchọ ikwu banyere Onyenwe ha, ha na-achọta ọtụtụ ụzọ isi mee ya. N’ezie, ọ bụ nkwali nke ndị ikom na ndị inyom a na-akpali mmasị anyị karịa usoro ha ji eme ihe.” Ma, ndị Kraịst oge mbụ ahụ ghọtara na ihe ịga nke ọma ha nwere n’ozi ha adabereghị nanị ná mgbalị ha. Ọ bụ Chineke nyere ha ọrụ ha, ọ kwadokwara ha n’ịrụzu ya. Uto ime mmụọ na-esi n’aka Chineke. Pọl onyeozi kwetara nke a n’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Kọrint. O dere, sị: “Mụ onwe m kụrụ osisi, 1 Ndị Kọrint 3:6, 9.
Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. N’ihi na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—Mmụọ Nsọ Na-arụ Ọrụ
16. Gịnị na-egosi na mmụọ nsọ nyere ndị ahụ na-eso ụzọ ike iji nkwuwa okwu na-ekwu okwu?
16 Cheta na Jisọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na mmụọ nsọ ga-ekere òkè n’uto nke okwu Chineke nakwa na mmụọ nsọ ga-enye ndị ahụ na-eso ụzọ ike n’ọrụ ime nkwusa ha. (Ọrụ 1:8) Olee otú nke a si mee? N’oge na-adịghị anya mgbe a wụsasịrị ndị ahụ na-eso ụzọ mmụọ nsọ na Pentikọst, a kpọrọ Pita na Jọn ịgwa Sanhedrin ndị Juu okwu, bụ́ ụlọikpe kasị elu n’ala ahụ, nke ikpe ogbugbu Jisọs Kraịst mara ndị ọkàikpe ya. Ndị ozi ahụ hà ga-ama jijiji n’ụjọ n’ihu nzukọ ukwu ahụ na-enweghị omume enyi? Ọ dịghị ma ọlị! Mmụọ nsọ nyere Pita na Jọn ike iji nkwuwa okwu kwuo okwu nke na ndị na-emegide ha nwere oké ihe ijuanya, “ha wee mata ha, na ha na Jisọs anọworị.” (Ọrụ 4:8, 13) Mmụọ nsọ mekwara ka Stifen jiri nkwuwa okwu gbaara Sanhedrin ahụ àmà. (Ọrụ 6:12; 7:55, 56) Tupu mgbe ahụ, mmụọ nsọ akpaliwo ndị ahụ na-eso ụzọ iji nkwuwa okwu mee nkwusa. Luk na-akọ, sị: “Mgbe ha rịọsịrị arịrịọ, e wee mee ka ebe ha nọ ná nzukọ mee mkpọtụ; ha nile wee jupụta ná Mmụọ Nsọ, wee were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.”—Ọrụ 4:31.
17. Olee ụzọ ndị ọzọ mmụọ nsọ si nyere ndị ahụ na-eso ụzọ aka n’ozi ha?
17 Site ná mmụọ nsọ ya dị ike, Jehova, nakwa Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie, duziri ọrụ nkwusa ahụ. (Jọn 14:28; 15:26) Mgbe a wụsara Kọniliọs, ndị ikwu ya, na ezi ndị enyi ya mmụọ nsọ, Pita onyeozi ghọtara na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù pụrụ iru eru ịbụ ndị e mere baptism n’aha Jisọs Kraịst. (Ọrụ 10:24, 44-48) Mgbe e mesịrị, mmụọ nsọ keere òkè bụ́ isi n’ịhọpụta Banabas na Sọl (Pọl onyeozi) maka ije ozi ala ọzọ nakwa n’ịtụzi ebe ha kwesịrị ịga na ebe ha na-ekwesịghị ịga. (Ọrụ 13:2, 4; 16:6, 7) O duziri usoro ime mkpebi nke ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem. (Ọrụ 15:23, 28, 29) Mmụọ nsọ duzikwara nhọpụta nke ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst.—Ọrụ 20:28.
18. Olee otú ndị Kraịst oge mbụ si gosipụta ịhụnanya?
18 Tụkwasị na nke ahụ, mmụọ nsọ pụtara ìhè n’ebe ndị Kraịst n’onwe ha nọ, na-amipụta àgwà nsọpụrụ Chineke, dị ka ịhụnanya. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ịhụnanya kpaliri ndị ahụ na-eso ụzọ isoro ibe ha kerịta ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Pentikọst nke 33 O.A. gasịrị, e mere ndokwa maka onyinye e wetakọrọ ọnụ iji gboo mkpa anụ ahụ nke ndị na-eso ụzọ nọ na Jerusalem. Ihe ndekọ Bible ahụ na-asị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’etiti ha mkpa na-akpa: n’ihi na ka ha hà, bụ́ ndị nwere ala ma ọ bụ ụlọ, ha na-ere ha, weta ọnụ ahịa nile nke ihe nile e rere, tọgbọ ha n’ụkwụ ndị ozi: e wee na-eke òkè enye ha nile n’otu n’otu, dị ka ọ dị onye ọ bụla mkpa.” (Ọrụ 4:34, 35) Ọ bụghị nanị ndị kwere ekwe ibe ha ka ha gosiri ịhụnanya a kamakwa ha gosiri ya ndị ọzọ site ma n’iso ha kerịta ozi ọma ahụ ma n’igosi ha obiọma n’ụzọ ndị ọzọ. (Ọrụ 28:8, 9) Jisọs kwuru na a ga-eji ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà mara ụmụazụ ya. (Jọn 13:34, 35) N’ezie, àgwà ahụ dị oké mkpa bụ́ ịhụnanya dọtara ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ ma mee ka e nwee uto na narị afọ mbụ, dị nnọọ ka ọ na-eme taa.—Matiu 5:14, 16.
19. (a) Ụzọ atọ dị aṅaa ka okwu Chineke si too na narị afọ mbụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 N’ozuzu ya, okwu Grik e ji mee ihe maka “mmụọ nsọ” pụtara ugboro 41 n’asụsụ mbụ e ji dee akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi. N’ụzọ doro anya, e jikọtara ezigbo uto ndị Kraịst na narị afọ mbụ na ike nakwa nduzi nke mmụọ nsọ n’ụzọ chiri anya. Ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ mụbara, okwu Chineke gbasara n’ụzọ sara mbara, o merikwara okpukpe na nkà ihe ọmụma nke oge ahụ. Ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ taa na-enwe uto yiri nke a e nwere na narị afọ mbụ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle uto dịkwa ịrịba ama okwu Chineke na-enwe n’oge a.
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ nke oge mbụ si too?
• N’ụzọ dị aṅaa ka okwu Chineke si gbasaa n’ókèala dị iche iche?
• Olee otú okwu Chineke si nwee mmeri na narị afọ mbụ?
• Òkè dị aṅaa ka mmụọ nsọ keere n’uto nke okwu Chineke?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 12]
Filip mere nkwusa nye onye Etiopia, na-eme ka ozi ọma ahụ gbasaa n’ókèala ndị ọzọ
[Foto dị na peeji nke 13]
Mmụọ nsọ duziri ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 10]
N’elu elu n’aka nri: Nsepụtaghachi nke Obodo Jerusalem n’oge Ụlọ Nsọ nke Abụọ-nke dị na mbara ala Holyland Hotel, Jerusalem