Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ozi Ọma Alaeze Ahụ—Gịnị Ka Ọ Bụ?

Ozi Ọma Alaeze Ahụ—Gịnị Ka Ọ Bụ?

Ozi Ọma Alaeze Ahụ—Gịnị Ka Ọ Bụ?

N’afọ gara aga, n’ala 235 gburugburu ụwa, mmadụ 6,035,564, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, tinyere awa 1,171,270,425 n’ịgwa ndị ọzọ banyere ya. Tụkwasị n’ikwu ya n’ọnụ, ha nyefere ihe karịrị nde 700 nke akwụkwọ ndị e biri ebi n’aka ndị mmadụ iji kpọsaa ma kọwaa ya. Ha kesakwara ọtụtụ puku kaseti a na-ege ege na kaseti vidio iji kpọsaa ya. Gịnị ka “ọ” bụ?

“Ọ” BỤ ozi ọma Alaeze Chineke. N’ezie, ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, e kwusara “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe” n’ọ̀tụ̀tụ̀ anyị na-ahụ ya taa.—Matiu 24:14.

Ndị na-arụ ọrụ nkwusa na izi ihe a zuru ụwa ọnụ bụcha ndị ọrụ afọ ofufo. E lee ya anya n’ụzọ ụwa, ọ pụrụ iyi ka ha erughị eru ịrụ ọrụ ahụ. Gịnịzi mere ha ji enwe obi ike na ihe ịga nke ọma? Ike nke ozi ọma Alaeze ahụ bụ otu ihe bụ́ isi, n’ihi na ọ bụ ozi banyere ngọzi ndị ga-abịara ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị a bụ ngọzi mmadụ nile na-achọsi ike—obi ụtọ, nnwere onwe pụọ n’ihe isi ike akụ̀ na ụba, ezi ọchịchị, udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, nakwa ihe ọzọ nke ihe ka n’ọtụtụ mmadụ na-ewere dị ka ihe a na-apụghị ikwere ekwere—ndụ ebighị ebi! Nke a bụ ozi ọma n’ezie nye ndị na-achọ nzube nke ndụ. Ee, ngọzi ndị a nakwa ndị ọzọ pụrụ ịbụ nke gị ma ọ bụrụ na i meghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe mkpọsa nke ozi ọma Alaeze ahụ dị.

Gịnị Ka Alaeze ahụ Bụ?

Otú ọ dị, gịnị ka Alaeze ahụ a na-akpọsa dị ka ozi ọma bụ? Ọ bụ Alaeze ahụ a kụziwooro ọtụtụ nde mmadụ ikpe ekpere banyere ya n’okwu ndị a a maara nke ọma: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.

Ọ bụ Alaeze ahụ onye Hibru ahụ bụ́ Daniel onye amụma kwuru okwu banyere ya n’ihe karịrị narị afọ 25 gara aga mgbe o dere, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Ya mere, ozi ọma ahụ bụ banyere Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị Chineke ga na-achị bụ́ nke ga-ewepụ ajọ omume nile ma na-achịzi n’elu ụwa nile n’udo. Ọ ga-emezu nzube mbụ nke Onye Okike ahụ maka ihe a kpọrọ mmadụ nakwa maka ụwa.—Jenesis 1:28.

“Alaeze Eluigwe Dị Nso”

N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, otu nwoke raara onwe ya nye bụ́ onye ọdịdị na omume ya dọọrọ mmasị nke ukwuu, kwusara ozi ọma Alaeze ahụ n’ihu ọha na nke mbụ ya. Nwoke ahụ bụ Jọn Onye Na-eme Baptism, nwa onye Juu bụ́ Zekaraịa onye nchụàjà na nwunye ya, bụ́ Elizabet. Jọn nọ na-eyi uwe e ji ajị camel mee, na-ekekwa ajị̀ e ji akpụkpọ anụ mee n’úkwù ya, dị ka Elaịja onye amụma mere, bụ́ onye sere onyinyo ya. Ma ọ bụ ozi ya dọọrọ mmasị ọtụtụ ndị. “Chegharịanụ,” ka ọ kpọsara, “n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.”—Matiu 3:1-6.

Ndị na-ege Jọn ntị bụ ndị Juu, bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ ndị na-efe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. Dị ka otu mba, ha anatawo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ site n’aka Mosis ihe dị ka afọ 1,500 tupu mgbe ahụ. Ụlọ nsọ ahụ dị ebube, bụ́ ebe a chụrụ àjà n’ụzọ kwekọrọ n’Iwu ahụ, ka guzo na Jerusalem. Ndị Juu nwere obi ike na ofufe ha ziri ezi n’anya Chineke.

Otú ọ dị, ka ụfọdụ ndị mmadụ na-ege Jọn ntị, ha malitere ịghọta na okpukpe ha adịghị ka ha cheburu na ọ dị. Ọdịbendị na nkà ihe ọmụma ndị Gris abatawo n’ozizi okpukpe ndị Juu. Iwu ahụ a natara Chineke site n’aka Mosis bụzi nke e ji nkwenkwe na ọdịnala mmadụ gwagbuo, ọbụna jiri ha mee ka ọ gharazie ịdị irè. (Matiu 15:6) N’ịbụ ndị ndị ndú okpukpe ha obi kpọrọ nkụ bụkwa ndị na-adịghị eme ebere duhiere, ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu efeghịzi Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. (Jemes 1:27) Ọ dị ha mkpa ichegharị ná mmehie ha megide Chineke nakwa megide ọgbụgba ndụ Iwu ahụ.

N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Juu nọ na-atụ anya mpụta nke Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa, ụfọdụ nọkwa na-eche banyere Jọn, sị: “Ma eleghị anya ya onwe ya bụ Kraịst ahụ.” Otú ọ dị, Jọn ekwetaghị na ya bụ kama ọ kọọrọ ha banyere onye ọzọ, bụ́ onye o kwuru, sị: “[Erughị m] ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya.” (Luk 3:15, 16) N’ịkọwara ụmụazụ ya onye Jisọs bụ, Jọn kwuru, sị: “Lee, Nwa atụrụ Chineke, Nke na-ebupụ mmehie nke ụwa!”—Jọn 1:29.

Nke ahụ bụ ozi ọma n’ezie, n’ihi na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jọn nọ na-egosi mmadụ nile ụzọ na-eduga ná ndụ na obi ụtọ—Jisọs, bụ́ onye “na-ebupụ mmehie nke ụwa.” Dị ka ụmụ Adam na Iv, a mụrụ mmadụ nile n’okpuru nchịkwa aka ike nke mmehie na ọnwụ. Ndị Rom 5:19 na-akọwa, sị: “Dị ka e doro ọha mmadụ ná ndị mmehie site n’aṅaghị ntị nke otu mmadụ ahụ [Adam], ọbụna otú a ka a ga-edo ọha mmadụ ná ndị ezi omume site n’ịṅa ntị nke otu Onye ahụ [Jisọs].” Jisọs, dị ka nwa atụrụ a ga-eji chụọ àjà, gaje ‘ibupụ mmehie’ ma gbanwee ọnọdụ dị mwute nke ihe omume ụmụ mmadụ. “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” ka Bible na-akọwa, “ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

Dị ka nwoke zuru okè—n’ezie, nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ—Jisọs malitere ikwusa ozi ọma. Ihe ndekọ Bible dị na Mak 1:14, 15 na-agwa anyị, sị: “Ma mgbe a rasịịrị Jọn nye, Jisọs bịara na Galili, na-ekwusa ozi ọma Chineke, sị, Oge ezuwo, alaeze Chineke dịkwa nso: chegharịanụ, kwekwanụ n’ozi ọma.”

A gọziri ndị meghachiri omume ma gosipụta okwukwe n’ebe ozi Jisọs dị, n’ụzọ dị ukwuu. Jọn 1:12 na-ekwu, sị: “Ka ha hà, bụ́ ndị naara Ya [Jisọs], ha ka O nyere ike ịghọ ụmụ Chineke, bụ́ ndị kwere n’aha Ya.” Ebe ọ bụ na ha bụ ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ndị ikom Chineke, ha so ná ndị ga-enweta ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 2:25.

Ma ihe ùgwù nke inweta ngọzi Alaeze ahụ adịghịrị nanị ndị mmadụ nọ na narị afọ mbụ. Dị ka a kpọtụrụ uche na mbụ, a na-ekwusa ma na-akụzi ozi ọma Alaeze Chineke n’elu ụwa nile mmadụ bi taa. Ya mere ngọzi Alaeze ka dị. Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji nweta ngọzi ndị dị otú ahụ? Isiokwu na-esonụ ga-akọwa.