Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Ndị Rom 5:3-5, gịnị mere Pọl onyeozi ji dee olileanya n’ikpeazụ n’usoro ihe ndị o depụtara?

Pọl depụtara usoro nke ihe ndị Kraịst na-enweta—mkpagbu, ntachi obi, ọnọdụ a nwapụtara anwapụta, na olileanya. “Olileanya” a abụghị olileanya mbụ mmadụ na-enweta site na Bible, kama ọ bụ olileanya na-ewusikwu ike, nke mikwuru emi, ma na-ejupụta ejupụta bụ́ nke onye Kraịst pụrụ inweta ka oge na-aga.—12/15, peeji nke 22-23.

Gịnị mere onye Kraịst taa pụrụ iji nwee mmasị n’egwuregwu ndị e mere na Gris oge ochie?

Ịghọta ọdịdị na omenala nke egwuregwu ndị ahụ pụrụ ime ka a ghọta nnọọ ọtụtụ amaokwu Bible. Ụfọdụ n’ime ha na-ezo aka ‘n’ịgba otú ọ dị n’iwu,’ ‘ịtụpụ ibu nile ọ bụla na ilegide anya n’ihe nlereanya Jisọs,’ ‘ịgbasị ọsọ ahụ,’ na inweta okpueze, ma ọ bụ ihe mgbata n’ọsọ. (2 Timoti 2:5; 4:7, 8; Ndị Hibru 12:1, 2; 1 Ndị Kọrint 9:24, 25; 1 Pita 5:4)—1/1, peeji nke 28-30.

Ụzọ ọhụrụ dị aṅaa e si kpọsaa ozi ọma ahụ ka a malitere na January 1914?

E wepụtara “Photo-Drama of Creation” n’oge ahụ. Ihe mejupụtara ya bụ ihe ngosi dị akụkụ anọ nke nwere ihe nkiri a na-emegharị ahụ na ya na ọtụtụ narị slide ndị tụrụ àgwà e ji enyo mee, a nọ na-akpọ okwu ndị e kwunyere n’ígwè phonograph bụ́ ndị e ji na-akọwa ihe nkiri ndị ahụ ka a nọ na-egosi ọtụtụ n’ime ha. E mepụtara Ihe Nkiri a ụzọ 20 ma jiri ha mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ịkụziri ndị mmadụ ozi Bible.—1/15, peeji nke 8-9.

Olee ụzọ Òtù Na-achị Isi si dị iche n’ebe ụlọ ọrụ iwu kwadoro dị?

Ebe ndị ọrụ nke ụlọ ọrụ iwu kwadoro na-eme ntụli aka maka ịhọpụta ndị nduzi nke ụlọ ọrụ ahụ, ọ bụghị mmadụ ọ bụla na-ahọpụta Òtù Na-achị isi kama ọ bụ Jisọs Kraịst. Ọ dịghị mkpa na ndị nduzi nke ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova ji eme ihe ga-abụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Ná nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania e mere n’oge na-adịbeghị anya, ndị so n’Òtù Na-achị Isi bụ́ ndị nọ na-eje ozi dị ka ndị nduzi na ndị isi ya ji aka ha hapụ ọkwá ha. Ụmụnna tozuru okè bụ́ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ nọchiri ha. (Jọn 10:16) N’ụzọ dị otú a, Òtù Na-achị Isi pụrụ itinye oge ka ukwuu n’ịkwadebe nri ime mmụọ ma sikwa otú ahụ na-elekọta mkpa ime mmụọ nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.—1/15, peeji nke 29, 31.

Ihe atụ abụọ dị aṅaa sitere na Bible ka anyị pụrụ inyocha iji mụta otú e si anagide nkụda mmụọ?

Otu bụ Hana, nne Samuel. Ọ pụrụ inwewo nkụda mmụọ mgbe Ilaị, bụ́ onyeisi nchụàjà Israel, ghọtahiere ya. Kama nke ahụ, o ji ezi obi na nkwanye ùgwù kọwaara ya ihe ndị bụ́ eziokwu. Ọzọkwa, Hana ebughịrị Ilaị iwe n’obi. Onye nke abụọ bụ Mak, bụ́ onye na-aghaghị inwewo nkụda mmụọ mgbe Pọl onyeozi na-achọghị ka o soro ya gaa njem ozi ala ọzọ. Kama inwe nkụda mmụọ n’ihi ihe ùgwù a funahụrụ ya, ọ gara n’ihu n’ozi ya, soro Banabas na-arụ ọrụ njegharị.—2/1, peeji nke 20-22.

N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji kpachara anya banyere inye ndị ọzọ, ma ọ bụ ịnara ha, usoro ihe omume kọmputa ndị e mepụtaghachiri emepụtaghachi?

A na-anata akwụkwọ ikike maka ihe ka ọtụtụ n’usoro ihe omume kọmputa (gụnyere egwuregwu) bụ́ nke na-akpara onye nwe ha ma ọ bụ onye ji ha eme ihe ókè itinye usoro ihe omume ahụ nanị n’otu kọmputa. Dị ka ọ na-adịkarị, imepụtaghachi ndị ọzọ, ọbụna mgbe anyị na-enye ha n’efu, bụ ịda iwu ikike mmepụtaghachi. Ndị Kraịst chọrọ irube isi n’iwu, ‘na-enyeghachi Siza ihe nke Siza.’ (Mak 12:17)—2/15, peeji nke 28-29.

Ole ndị bụ Cyril na Methodius, ụtụ dịkwa aṅaa ka ha tụnyere n’ọmụmụ Bible?

Ha bụ ụmụnne abụọ a mụrụ na Tesalọnaịka, Gris, na narị afọ nke itoolu. Ha mepụtara mkpụrụ okwu a na-ede ede maka asụsụ dị iche iche nke ndị Slav ma sụgharịa ihe ka ukwuu na Bible gaa n’asụsụ Slavic.—3/1, peeji nke 28-29.

Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịtụkwasị uche ná Mmụọ Nsọ” pụtara?—Ndị Rom 8:6.

Ọ pụtara ịbụ onye ike Jehova nọ n’ọrụ na-achịkwa, na-akwalikwa. Anyị pụrụ ikwe ka mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’ime anyị site n’ịgụ na ịmụ Bible, site n’iji obi anyị dum na-erube isi n’iwu Chineke, nakwa site n’ikpe ekpere maka mmụọ Chineke.—3/15, peeji nke 15.

Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ na-adị anyị ka a na-aghọtahie anyị?

Ọ dị mkpa ịchọ iji mmụọ nke ịhụnanya mee ka ihe doo anya. Ọ bụrụ na o yie ka nke ahụ enweghị ihe ịga nke ọma, obi ekoropụla gị. Rịọ nghọta na enyemaka n’aka Jehova, bụ́ onye “na-atụzi obi nile.” (Ilu 21:2; 1 Samuel 16:7)—4/1, peeji nke 21-23.