Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Òtù Zuru Ụwa Ọnụ nke Ndị Na-elekọta Ibe Ha

Òtù Zuru Ụwa Ọnụ nke Ndị Na-elekọta Ibe Ha

Òtù Zuru Ụwa Ọnụ nke Ndị Na-elekọta Ibe Ha

RUO ebe ọ bụla anya pụrụ iru, e nwere ndị mmadụ n’ebe ahụ. Ọtụtụ ndị emewo agadi, ụfọdụ ha nwere nnọọ nkwarụ nke na ha apụghị ịga ije. E nwere ndị inyom dị ime na ndị di na nwunye na-akatabeghị ahụ bụ́ ndị na-elekọta obere ụmụaka. Ha nile bụcha ndị gbara ọsọ ndụ—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka—bụ́ ndị agha obodo, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ manyere isi n’ebe obibi ha gbapụ iji chọọ ebe mgbaba ná mba dị ha nso. A manyewo ụfọdụ ndị ugboro ugboro isi n’ebe ha bi gbapụ. E nwee ihe àmà mbụ nke ọgba aghara obodo ma ọ bụ nke ọdachi na-emere onwe ya, ha na-ewere ngwongwo ụfọdụ ha nwere n’ụlọ, kpọrọ ụmụ ha, ma tinye isi n’ebe ka dịrị nchebe. E mesịa, mgbe ọnọdụ dịghachiri mma, ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ na-alaghachi iji wughachi ebe obibi ha ma malitekwa ụwa n’isi.

Eri ọtụtụ afọ, Central African Republic anabatawo ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ si n’ọtụtụ mba. Na nso nso a, a manyere ọtụtụ puku mmadụ, gụnyere ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova, isi na Democratic Republic of Congo agha tisasịrị gbaga na Central African Republic bụ́ ebe e nwetụrụ nchebe.

Ụmụnna Agbata Ọsọ Enyemaka

Ndịàmà nọ na Central African Republic gụrụ ya dị ka ihe ùgwù bụ́ ịhazi ihe enyemaka n’ịkwalite ọdịmma ndị mmadụ. E nwetara ebe obibi maka ụmụnna ndị Kraịst na-abịanụ. Na mbụ, a chọtagasịrị ọnụ ụlọ n’ebe obibi ndị mmadụ, ma ka ọnụ ọgụgụ ndị gbara ọsọ ndụ rịrị elu, ọ bịara doo anya na ọ dị mkpa ka e mee ndokwa ndị gbakwuru ọkpụrụkpụ. E ji Ụlọ Nzukọ Alaeze Ụfọdụ mere ebe obibi. Ndịàmà bi n’ógbè ahụ malitere ọrụ itinyekwu ọkụ, ịdọta pọmpụ, na ite ala ụlọ simenti iji mee ka ahụ ruo ndị a gaje inye ụlọ n’ebe ahụ ala. Ndị ahụ gbara ọsọ ndụ so nnọọ ụmụnna ahụ bi n’ógbè ahụ rụọ ọrụ iji guzobe ebe obibi nwa oge ndị a. E mere ndokwa maka usoro ihe omume zuru ezu nke nzukọ ndị Kraịst n’asụsụ Lingala ka e wee na-enye ndị a si esi bịa nri ime mmụọ na-enye ndụ, nke ọma. Mmekọrịta chiri anya dị n’etiti Ndịàmà bi n’ógbè ahụ na ndị ọbịa ha gosipụtara na òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ dị adị n’ezie.

Ezinụlọ ndị gbara ọsọ ndụ eruteghị otu mgbe. Mgbe ụfọdụ, ndị so n’otu ezinụlọ bụ́ ndị gara iche iche, hụghachiri onwe ha mgbe ha ruru n’ebe ha na-agbaga. E debere ihe ndekọ nke ndị ruteworo n’udo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ọ bụla. E mere ndokwa ịchọta ndị ka na-efu efu. Alaka ụlọ ọrụ nke na-eduzi ọrụ Ndịàmà Jehova ná mba ahụ na-ezipụ ụgbọala atọ kwa ụbọchị iji nyere Ndịàmà ka nọ n’ụzọ aka nakwa iji chọọ ndị nwere ike ifuwo. E ji ihe nrịba ama e dere okwu ndị gbara okpotokpo, bụ́ “WATCH TOWER—Jehovah’s Witnesses,” hụwa ụgbọala ndị ahụ ama.

Cheedị echiche banyere ọṅụ ụmụaka asaa gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị e kewapụworo ha na nne na nna ha nwere mgbe ha hụrụ ụgbọala Ndịàmà Jehova. Ha gbagara n’ebe ụgbọala ahụ dị ngwa ngwa ma kọwaa onwe ha dị ka Ndịàmà. Ụmụnna ahụ nyeere ha aka ịbanye n’ụgbọala ahụ, ha wee buga ha n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ebe ha mesịrị hụghachi ezinụlọ ha.

Gịnị nyewooro ezi ndị Kraịst a aka ịnagide ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ bụghị nanị otu ugboro, kama ugboro ugboro? Ha kwenyesiri nnọọ ike na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ dị ka e buru ya n’amụma n’Akwụkwọ Nsọ.—2 Timoti 3:1-5; Mkpughe 6:3-8.

N’ihi ya, ha maara na n’isi nso, Jehova Chineke ga-eweta agha, ịkpọasị, ime ihe ike, na esemokwu ná njedebe. Nsogbu nke ịgba ọsọ ndụ agaghịzi adị. Ka ọ dịgodị, n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi nke dị ná 1 Ndị Kọrint 12:14-26, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ilekọta ibe ha. N’agbanyeghị na osimiri, ókèala, asụsụ, na ibipụ n’ebe dị anya, mere ka ha ghara ibikọ ọnụ, ha na-echebara ibe ha echiche, ya mere ha na-eme ihe ngwa ngwa mgbe onye ọ bụla nọ ná mkpa.—Jemes 1:22-27.

[Map dị na peeji 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

AFRICA

Central African Republic

Democratic Republic of Congo

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

E ji Ụlọ Nzukọ Alaeze atọ mere ebe a na-anabata ndị mmadụ

[Foto dị na peeji nke 31]

A rụrụ kichin ngwa ngwa

[Foto dị na peeji nke 31]

Ọtụtụ ndị na-abatakwu

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

A ka mụrụ ha nnọọ ọhụrụ ma ha aghọọlarị ndị gbara ọsọ ndụ