Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Agbanyeghị Otú E Si Zụlite Gị

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Agbanyeghị Otú E Si Zụlite Gị

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Agbanyeghị Otú E Si Zụlite Gị

NICHOLAS nwere àgwà nnupụisi kemgbe ọ bụ nwata. * Ka oge na-aga, ahụ erughị ala ya dugara ya n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ nakwa n’aṅụrụma. Nicholas na-akọwa, sị: “Nna m bụ onye aṅụrụma, ọ kpatakwaara mụ na nwanne m nwanyị nhụjuanya dị ukwuu.”

N’ozuzu, nne na nna Malinda bụ ndị ụka a na-akwanyere ùgwù n’ógbè ha. Ma, ha nọkwa n’otu òtù nzuzo. “Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha na-eme n’òtù nzuzo ha rụrụ arụ nye m ma gbuo mmụọ m dị ka nwata,” ka Malinda, bụ́ onye nọ n’afọ ndị 30 ya ugbu a, na-akwa n’arịrị. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Echiche nke enweghị olileanya na mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru bụ́ nke a kụnyere n’ime m emetụtawo m n’esepụghị aka kemgbe m maara ihe.”

Ònye pụrụ ịgọnahụ na ime ihe ike, mmetọ, ndị nne na nna ileghara ụmụ ha anya, na ihe ndị ọzọ na-adịghị mma abụwo ihe ọtụtụ ndị nwetara n’oge ha bụ ụmụaka? Ihe ọjọọ nke mmadụ enweghị obi ụtọ n’oge ọ bụ nwata na-akpata pụrụ ịdị ukwuu. Ma, ọ̀ bụ iwu na ihe mwute ndị dị otú ahụ ga-emebi ohere mmadụ nwere ịnata eziokwu nke Okwu Chineke na ịchọta ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma nke obi ụtọ? N’agbanyeghị otú e si zụlite ha, Nicholas na Malinda hà pụrụ inwe ihe ịga nke ọma dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe? Buru ụzọ tụlee ihe atụ nke Eze Josaịa nke Juda.

Ihe Atụ Sitere n’Akwụkwọ Nsọ

Josaịa chịrị Juda ruo afọ 31 na narị afọ nke asaa T.O.A. (659-629 T.O.A.) N’oge e chiri Josaịa eze, mgbe e gbusịrị nna ya, ọnọdụ e nwere na Juda dị nnọọ njọ. Ndị na-efe Beal na ndị ji chi bụ́ isi nke Amọn, bụ́ Malkam, aṅụ iyi jupụtara na Juda nakwa na Jerusalem. Ndị isi Juda bụ “ọdụm na-agbọ ụja,” ndị ikpe ya kwa bụ “anụ ọhịa wolf nke anyasị,” ka Zefanaịa, bụ́ onye amụma Chineke n’oge ahụ, kwuru. N’ihi ya, ime ihe ike na aghụghọ jupụtara n’ala ahụ. Ọtụtụ ndị nọ na-ekwu n’obi ha, sị: “Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ.”—Zefanaịa 1:3–2:3; 3:1-5.

Onye ọchịchị dị aṅaa ka Josaịa bụ? Onye na-edekọ ihe ndị mere n’oge Bible bụ́ Ezra na-ede, sị: “[Josaịa mere] ihe ziri ezi n’anya Jehova, jee ije n’ụzọ nile nke Devid nna ya, o wezụgaghịkwa onwe ya n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.” (2 Ihe E Mere 34:1, 2) Ihe àmà na-egosi na Josaịa nwere ihe ịga nke ọma n’ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. Ma gịnị ka ezinụlọ o si pụta dị ka ya?

Onye E Nyere Ọzụzụ Dị Mma Ka Ọ̀ Bụ Onye E Metọrọ n’Oge Ọ Bụ Nwata?

Mgbe a mụrụ Josaịa na 667 T.O.A., nna ya, bụ́ Emọn, dị nanị afọ 16, nna nna ya bụ́ Manase nọkwa na-achị Juda. Manase bụ otu n’ime ndị eze kasị njọ chịtụrụla Juda. N’ịbụ onye wuuru Beal ebe ịchụàjà dị iche iche, “o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova hie nne.” O mere ka ụmụ ya ndị ikom gabiga n’ime ọkụ, jiri eluigwe tụọ isi ọma na isi ọjọọ, gbaa afa, mee ihe mgbaasị, wụfuo ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Manase webatakwara arụsị ọ pịrị apị n’ụlọ Jehova. O mere ka Juda na Jerusalem sihie ụzọ “ime ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Israel.”—2 Ihe E Mere 33:1-9.

Manase dị njọ ruo nke na Jehova mere ka e kee ya agbụ kpụga ya Babilọn, bụ́ otu n’ime obodo ukwu nke eze Asiria. Mgbe e ji Manase eji, o chegharịrị, wetuo onwe ya ala, ma rịọ Jehova mgbaghara. Chineke nụrụ arịrịọ amara ya ma weghachi ya n’ocheeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase malitere iwepụ ihe ndị na-adịghị mma n’ala ahụ, o nwekwara ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma.—2 Ihe E Mere 33:10-17.

Mmetụta dị aṅaa ka ajọ omume Manase na nchegharị ya mgbe e mesịrị nwere n’ahụ nwa ya nwoke bụ́ Emọn? O mere ajọ omume hie nne. Mgbe Manase chegharịrị ma mee mgbalị ime ka mba ahụ dị ọcha pụọ ná mmerụ ya onwe ya webatara na ya, Emọn emeghachighị omume n’ụzọ dị mma. Ka Emọn nọkwasịrị n’ocheeze mgbe ọ dị afọ 22, o “[mere] ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dị ka Manase, bụ́ nna ya, mere.” Kama iweda onwe ya ala n’ihu Jehova, “Emọn nke a mere ka ikpe ma ya hie nne.” (2 Ihe E Mere 33:21-23) Josaịa dị nanị afọ isii mgbe Emọn ghọrọ eze Juda. Lee ahụmahụ ndị dị egwu Josaịa na-aghaghị inwewo n’oge ọ bụ nwata!

Ọchịchị ọjọọ nke Emọn jedebere mgbe afọ abụọ gasịrị bụ́ mgbe ndị ohu ya gbara izu megide ya ma gbuo ya. Otú ọ dị, ndị ala ahụ gburu ndị ahụ gbara izu megide Emọn ma chie nwa ya nwoke, bụ́ Josaịa, eze.—2 Ihe E Mere 33:24, 25.

N’agbanyeghị ọnọdụ dị njọ e nwere n’oge ọ bụ nwata, Josaịa mere ihe dị mma n’anya Jehova. Ọchịchị ya nwere nnọọ ihe ịga nke ọma nke na Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị eze nke buuru ya ụzọ dị ka ya, onye weere obi ya nile, werekwa mkpụrụ obi ya nile, werekwa ike ya nile, chigharịkwute Jehova, dị ka iwu nile nke Mosis si dị; ọ dịghịkwa onye ọzọ dị ka ya biliri mgbe ọ nwụsịrị.”—2 Ndị Eze 23:19-25.

Lee ihe nlereanya na-agba ume Josaịa bụụrụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nwere ahụmahụ dị egwu n’oge ha bụ nwata! Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ya? Gịnị nyeere Josaịa aka ịhọrọ ụzọ ziri ezi ma nọgide na ya?

Chọọ Ịmara Jehova

Mmetụta dị mma e nwere n’oge Josaịa bụ nwata bụ nke nna nna ya nwere nchegharị, bụ́ Manase. Bible ekwughị otú ha nweruru mmekọrịta, na afọ ole Josaịa dị mgbe Manase meziri ụzọ ya. Ebe ọ bụ na ezinụlọ ndị Juu na-eru ibe ha nso, Manase pụrụ ịgbalịwo ichebe nwa nwa ya pụọ ná mmetụta ndị na-emerụ emerụ gbara ya gburugburu site n’ịkụnye n’obi nwa nwa ya, nkwanye ùgwù maka ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na okwu ya. Mkpụrụ ọ bụla nke eziokwu nke Manase kụnyere n’obi Josaịa, ikekwe tinyere mmetụta ndị ọzọ dị mma, rụpụtara ihe dị mma n’ikpeazụ. N’afọ nke asatọ ya n’ocheeze Juda, Josaịa dị afọ 15 chọrọ ịmara na ime uche Jehova.—2 Ihe E Mere 34:1-3.

Nanị ụzọ ụfọdụ ndị si anụ ihe ime mmụọ n’oge ha bụ ụmụaka bụ site n’aka ndị ikwu ha dị anya, ndị enyi, ma ọ bụ ndị agbata obi ha. Ma, ọ bụrụ na a zụọ mkpụrụ a e si otú a kụọ, ọ pụrụ ịmị ezi mkpụrụ n’ikpeazụ. Malinda, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, nwere onye agbata obi merela agadi nke nwere obiọma bụ́ onye na-eweta magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ụlọ ha mgbe nile. N’iji obi ụtọ na-echeta ya, Malinda kwuru, sị: “Ihe kasị masị m banyere onye agbata obi anyị ahụ bụ na ọ dịghị eme ememe ụbọchị ezumike. Nke a dị mkpa nye m n’ihi na ememe Halloween na ụfọdụ n’ime ememe ezumike ndị ọzọ bụ oge a na-eme ememe okpukpe dị iche iche n’òtù nzuzo nke ndị mụrụ m.” Afọ iri mgbe e mesịrị, mgbe otu enyi Malinda kpọrọ ya ịga otu nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, o chetara onye agbata obi ha a ma kwere ozugbo ịga. Nke ahụ nyeere ya aka ịchọ eziokwu ahụ.

Nwee Obi Umeala n’Ihu Chineke

E ji mgbanwe dị ukwuu e mere n’okpukpe n’ala Juda mara ọchịchị Josaịa. Mgbe Josaịa mesịrị mkpọsa were afọ isii megide ikpere arụsị ma kpochasịa ala Juda, ọ malitere ịrụzi ụlọ Jehova. Ka ọrụ ahụ na-aga n’ihu, lee ihe bara uru Onyeisi Nchụàjà bụ́ Hilkaịa chọtara! Ọ hụrụ ihe odide mbụ nke “akwụkwọ iwu Jehova.” N’ịbụ onye Hilkaịa nyere ihe a na-akpali akpali a chọtara, Shefan bụ́ odeakwụkwọ kọọrọ eze ihe meworonụ. Ihe dị otú ahụ a rụzuru ò mere ka Josaịa dị afọ 25 buliwe onwe ya elu?—2 Ihe E Mere 34:3-18.

“Mgbe eze nụrụ okwu nile nke iwu ahụ,” ka Ezra na-ede, “ọ dọwara uwe ya nile.” Nke a bụ ngosipụta nke iru újú sitere n’obi n’ihi na ọ ghọtara na ọ bụghị ihe nile Chineke nyere n’iwu ka ndị nna nna ya ha merela. N’ezie, ọ bụ ihe àmà nke ịdị umeala n’obi! Eze ahụ zigara ndị nnọchiteanya ise ngwa ngwa ịga jụọ Jehova ase site n’ọnụ onye amụma nwanyị bụ́ Hulda. Ndị nnọchiteanya ahụ welatara ozi dị otú a: ‘Ihe ọjọọ ga-abịa n’ihi inupụ isi n’Iwu Jehova. Ma n’ihi na gị onwe gị, bụ́ Eze Josaịa, huuru ala n’ihu Jehova, a ga-achịkọta gị jee n’ili gị n’udo, ị gaghịkwa ahụ ihe ọjọọ ahụ.’ (2 Ihe E Mere 34:19-28) Àgwà Josaịa mere Jehova obi ụtọ.

N’agbanyeghị otú e si zụlite anyị, anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi umeala n’ihu ezi Chineke, bụ́ Jehova, ma na-egosipụta àgwà nkwanye ùgwù n’ebe ọ nọ nakwa n’ebe Okwu ya, bụ́ Bible, dị. Nicholas, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, mere nke a. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na ndụ m jupụtara ná nsogbu n’ihi ịṅụ ọgwụ ọjọọ na aṅụrụma, enwere m mmasị na Bible ma nwee agụụ ime ka ndụ m nwee nzube. N’ikpeazụ, ezutere m Ndịàmà Jehova, gbanwee ụzọ ndụ m, ma nabata eziokwu ahụ.” Ee, anyị pụrụ inwe nkwanye ùgwù n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe Okwu ya dị n’agbanyeghị ebe anyị bi.

Rite Uru Site ná Ndokwa Jehova

Josaịa nwekwara nkwanye ùgwù miri emi n’ebe ndị amụma Jehova nọ. Ọ bụghị nanị na ọ jụrụ ase site n’ọnụ onye amụma nwanyị bụ́ Hulda kama ndị amụma ndị ọzọ nọ n’oge ya nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe ọ nọ. Dị ka ihe atụ, ma Jeremaịa ma Zefanaịa katọsiri ikpere arụsị nke a na-eme na Juda ike. Lee ka ịṅa ntị n’ozi ha na-aghaghị isiwo nyekwuo Josaịa ike ka ọ na-eme mkpọsa megide ofufe ụgha!—Jeremaịa 1:1, 2; 3:6-10; Zefanaịa 1:1-6.

‘Nna ukwu,’ bụ́ Jisọs Kraịst, ahọpụtawo ìgwè ụmụazụ ya e tere mmanụ—“ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”—inye nri ime mmụọ n’oge ya. (Matiu 24:45-47) Site ná mbipụta ndị dabeere na Bible na ndokwa ọgbakọ, òtù ohu ahụ na-adọrọ uche aga n’uru ndị a na-erite n’ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible ma na-atụ aro ndị dị irè banyere itinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Lee ka o si kwesị ekwesị na anyị ga-eji ndokwa Jehova mere iji nyere anyị aka imeri àgwà ọjọọ ọ bụla gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ime anyị, na-eme ihe! Site na nwata, Nicholas kpọrọ ịchịisi asị. Ọbụna ka ọ mụtara eziokwu nke Okwu Chineke, adịghị ike a dọlara ya azụ n’ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Ịgbanwe àgwà a abụghịrị ya obere ihe ịma aka. Ma, ka oge na-aga, o nwere ihe ịga nke ọma. N’ụzọ dị aṅaa? “Site n’enyemaka nke ndị okenye abụọ na-aghọta ihe,” ka Nicholas na-akọwa, “ekwetara m na m nwere nsogbu ma malite itinye ndụmọdụ ịhụnanya ha sitere n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụ ezie na m na-ewetụ obere iwe mgbe ụfọdụ, achịkwaala m àgwà nnupụisi m ugbu a.”

Malinda n’onwe ya kwa na-achọ ndụmọdụ ndị okenye mgbe ọ na-eme mkpebi ndị dị mkpa ná ndụ ya. Mgbe ọ na-eme ihe banyere echiche nke enweghị olileanya na mmetụta nke abaghị n’ihe bụ́ ndị ọ malitere inwe mgbe ọ bụ nwata, ọ na-ahụta isiokwu dị iche iche dị n’Ụlọ Nche na Teta! dị ka ndị bara oké uru karịsịa. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ, n’otu isiokwu, a na-enwe nanị otu paragraf ma ọ bụ ahịrịokwu—otu ihe nnọọ—nke na-emetụ m n’ahụ. Ihe dị ka afọ itoolu gara aga, amalitere m ichekwa isiokwu ndị dị otú ahụ n’otu akwụkwọ e ji ede ihe bụ́ nke a na-adụkọtaghị adụkọta ka m wee nwee ike ịga na ha ngwa ngwa.” Taa, akwụkwọ ya atọ e ji ede ihe nwere ihe dị ka isiokwu 400!

Ee e, ọ dịghị ndị mmadụ mkpa ịnọgide na-abụ ndị ndụ ezinụlọ dị njọ na-emetụta. Site n’enyemaka Jehova, ha pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Dị nnọọ ka nzụlite dị mma na-adịghị eme ka e jide n’aka na mmadụ ga-abụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, mmadụ ịbụ onye a zụlitere n’ụzọ dị njọ adịghị egbochi ya ịghọ onye na-atụ egwu Chineke.

Mgbe a chọtasịrị akwụkwọ Iwu ahụ n’oge a na-arụzi ụlọ nsọ ahụ, Josaịa wee ‘gbaa ndụ n’ihu Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi ya nile na mkpụrụ obi ya nile nọgide na-erubere ya isi.’ (2 Ihe E Mere 34:31) O sighịkwa ná mkpebi ya wezụga onwe ya ruo ọnwụ ya. N’otu aka ahụ, Malinda na Nicholas kpebisiri ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke na inwe ihe ịga nke ọma dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ka gị onwe gị kwa kpebie ịnọ Chineke nso na iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. Ị pụrụ inwe obi ike na ị ga-enwe ihe ịga nke ọma, n’ihi na Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.”—Aịsaịa 41:10, 13.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanweela aha ụfọdụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

N’agbanyeghị na o nwere ahụmahụ dị egwu n’oge ọ bụ nwata, Josaịa chọrọ ịmara Jehova ma mee ka ndụ ya nwee ihe ịga nke ọma

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị okenye pụrụ inyere gị aka imeri àgwà ndị gbamiworo mkpọrọgwụ

[Foto dị na peeji nke 28]

“Ụlọ Nche” na “Teta!” pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe