Anyị Anọghị Nanị Anyị Mgbe E Lere Okwukwe Anyị Ule
Anyị Anọghị Nanị Anyị Mgbe E Lere Okwukwe Anyị Ule
Vicky bụ nwatakịrị nwanyị dị mma n’ile anya—onye ahụ siri ike, bụ́ onye mara mma, ma dị nnọọ gara gara. Ee, mgbe a mụrụ ya n’oge opupu ihe ubi nke 1993, anyị nwere nnọọ obi ụtọ nke ukwuu. Anyị biri n’otu obodo nta dị n’ebe ndịda Sweden, ndụ dịkwa anyị ụtọ.
OTÚ ọ dị, mgbe Vicky dị otu afọ na ọkara, ụwa anyị yiri ka o tisara. Ahụ esighị ya ike ruo oge ụfọdụ, ya mere anyị kpọgara ya n’ụlọ ọgwụ. Anyị agatụghị echefu oge dọkịta gwara anyị na nwa anyị nwanyị na-arịa ajọ ọrịa lymphoblastic leukemia, ụdị cancer ụmụaka bụ́ nke na-emetụta mkpụrụ ndụ ọbara ọcha.
O siiri anyị ike ikweta na obere nwa anyị nwanyị na-arịa ọrịa ọjọọ a. Ọ ka malitere nnọọ ịma ihe na-aga gburugburu ya, ugbu a kwa, ọ pụrụ ịnwụ. N’ịnwa ịkasi anyị obi, dọkịta ahụ kwuru na a pụrụ inye ọgwụgwọ ga-enwetụ ihe ịga nke ọma, bụ́ nke gụnyere iji ọgwụ na ọbara hiri nne mee ihe. Nke ahụ bụ ihe ọzọ wụrụ anyị akpata oyi n’ahụ.
E Lee Okwukwe Anyị Ule
Anyị hụrụ nwa anyị nwanyị n’anya n’ezie ma chọọ inye ya nlekọta ahụ ike kasị mma. Ma, mmịnye ọbara bụ ihe anyị na-agatụghị anabata. Anyị kwenyesiri ike n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ́ nke kwuru n’ụzọ doro anya na ndị Kraịst aghaghị ‘ịhapụ ọbara.’ (Ọrụ 15:28, 29) Anyị makwaara na mmịnye ọbara dị ize ndụ n’onwe ya. Ọtụtụ mmadụ ebutewo ọrịa dị iche iche ma nwụọ site ná mmịnye ọbara. Nanị nhọrọ anyị nwere bụ ọgwụgwọ bụ́ ịgba nke na-agaghị agụnye mmịnye ọbara. N’akụkụ a, ọgụ anyị lụrụ maka okwukwe anyị maliteziri.
Gịnị ka anyị ga-eme? Anyị kpọtụụrụ Ụlọ * Ozugbo ahụ, e zigara ozi fax n’ụlọ ọgwụ dị iche iche gburugburu Europe iji chọta ụlọ ọgwụ na dọkịta dị njikere iji ọgwụ gwọọ ya n’amịnyeghị ya ọbara. Ịnụ ọkụ n’obi na ịhụnanya ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst gosiri ná mgbalị ha inyere anyị aka wusiri anyị nnọọ ike. A hapụghị nanị anyị n’ọgụ anyị lụrụ maka okwukwe anyị.
Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Sweden iji rịọ maka enyemaka.N’ime awa ole na ole, a chọtara otu ụlọ ọgwụ na otu dọkịta na Homburg/Saar, Germany. E mere ndokwa ka anyị jiri ụgbọelu gaa ebe ahụ n’echi ya ka e wee lee Vicky ahụ. Mgbe anyị bịarutere, ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst si n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Homburg, nakwa ụfọdụ n’ime ndị ikwu anyị, nọ n’ebe ahụ ịnabata anyị. Onye nnọchiteanya nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ dị n’ógbè ahụ jikwa obi ụtọ nabata anyị. O so anyị gaa n’ụlọ ọgwụ ahụ ma nye anyị nkwado nile kwere omume. Ahụ ruru anyị ala ịhụ na ọbụna n’ala ọzọ, anyị nwere ụmụnna ime mmụọ bụ́ ndị kwụ anyị n’akụkụ.
Mgbe anyị zutere Dr. Graf n’ụlọ ọgwụ ahụ, anyị nwetara nkasi obi ọzọ. Ọ bụ nnọọ onye na-egosi nghọta, o mesikwara anyị obi ike na ya ga-eme ihe nile kwere omume iji gwọọ Vicky n’amịnyeghị ya ọbara. Ọ bụrụgodị na ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin ya agbadaruo gram ise n’ime desilita ọ bụla, na ya ga-adị njikere ịnọgide na-agwọ ya n’amịnyeghị ya ọbara. O kwukwara na nchọpụta a chọpụtara ọrịa ahụ ngwa ngwa na mkpọta a kpọtara Vicky ebe ahụ ozugbo mere ka ọ nọrọ n’ọnọdụ dị mma inweta ọgwụgwọ ga-aga nke ọma. O kwetara na nke ahụ ga-abụ nke mbụ ọ na-agwọ ọrịa dị ka nke Vicky n’amịnyeghị ọbara. Anyị nwere nnọọ ekele ma nwee obi ụtọ n’obi ike nke Dr. Graf nakwa ná mkpebi siri ike o mere inyere anyị aka.
Nsogbu Ego
Ugbu a, ihe bụ́ nsogbu bụ, Olee otú anyị ga-esi akwụ ihe ọgwụgwọ Vicky ga-efu? O nyeghị anyị ọnụ okwu mgbe a gwara anyị na ịgwọ ya ruo afọ abụọ ga-efu ihe dị ka deutsche mark 150,000. Ego anyị nwere enweghịdị ebe o ruru, n’otu mgbe ahụkwa, ọ dị oké mkpa ka a malite ịgwọ Vicky ozugbo. Ebe ọ bụ na anyị si Sweden bịa Germany ịnara ọgwụgwọ, anyị erughị eru inweta inshọransị ahụ ike. Ya mere, anyị na obere nwa anyị nwanyị ahụ na-adịtụghị nakwa dọkịta bụ́ ọkachamara nke dị njikere inyere anyị aka nọ ebe ahụ, ma anyị ejighị ego zuru ezu.
Ndị ụlọ ọgwụ ahụ gbataara anyị ọsọ enyemaka ma gwa anyị na ha ga-amalite ịgwọ ya ozugbo ma ọ bụrụ na anyị akwụnyegodị mark 20,000 ma bịanye aka n’akwụkwọ na anyị ga-akwụtọpụ nke fọdụrụ. E nwere ego anyị chekwara, sitekwa n’enyemaka ịhụnanya nke ndị ikwu na ibe anyị, anyị kwuru mark 20,000 ahụ—ma gịnịkwanụ banyere nke fọdụrụ?
Ọzọkwa, e chetaara anyị na anyị anọghị nanị anyị n’ọgụ anyị na-alụ maka okwukwe anyị. Otu nwanna ime mmụọ anyị, bụ́ onye anyị na-amaghị n’oge ahụ, dị njikere iweghara ibu nke ịkwụ ego fọdụrụnụ. Otú ọ dị, onyinye mmesapụ aka ya adịghịzi anyị mkpa, ebe ọ bụ na e nwere ndokwa ndị ọzọ anyị mere.
Ọkachamara n’Ịgwọ Ọrịa Abanye n’Ọrụ
A malitere iji ọgwụ gwọwa ya. Ọtụtụ ụbọchị na izu agafee. Mgbe ụfọdụ, ọ na-esiri ma obere nwa anyị nwanyị ma anyị onwe anyị ike. N’aka nke ọzọ, anyị na-enwe obi ụtọ na ekele dị ukwuu mgbe ọ bụla ọ dị ka ọ gbakewela. Ọgwụgwọ ahụ e ji ọgwụ gwọọ ya were ọnwa asatọ. Ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ala nke hemoglobin Vicky gbadataruru bụ gram isii n’ime desilita ọ bụla, Dr. Graf mezukwara nkwa ya.
Ihe karịrị afọ isii agaala, ahụ ikpeazụ e lere ya iji mara otú mmiri ọkpụkpụ azụ ya dị gosiri na o nweghịzi ọrịa leukemia. Ọ bụzi nwatakịrị nwanyị na-enwe obi ụtọ nke na-enweghịzi ihe mgbaàmà ọ bụla nke ọrịa ahụ. Ee, o yiri
ọrụ ebube ịhụ na Vicky agbakeela nnọọ kpam kpam. Anyị maara na ọtụtụ ụmụaka na-arịa otu ọrịa a na-anwụ n’agbanyeghị na e ji ọgwụ na ọbara na-agwọ ha.Anyị emeriwo n’ọgụ anyị lụrụ maka okwukwe anyị, ma ọ bụghị n’enwetaghị enyemaka nke ndị ikwu, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị anyị bụ́ ndị Kraịst, na ndị ọkachamara n’ịgwọ ọrịa. Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ nyere anyị nkwado zuru ezu ehihie na abalị. Dr. Graf na ndị òtù ya tinyere nkà ha n’ọrụ iji nyere Vicky aka ịgbake. Anyị nwere ekele n’ezie maka ihe a nile.
E Mewo Ka Okwukwe Anyị Sikwuo Ike
Otú ọ dị, karịsịa, anyị kelere Chineke anyị, bụ́ Jehova, maka nlekọta ịhụnanya ya na ike anyị nwetara site n’Okwu ya, bụ́ Bible. Mgbe anyị leghachiri anya azụ, anyị na-aghọta otú anyị mụtaruworo ihe na otú ahụmahụ a tara akpụ anyị nwere ná ndụ siworo mee ka okwukwe anyị sikwuo ike.
Ugbu a, ọchịchọ anyị sitere n’obi bụ anyị na Jehova Chineke ịnọgide na-enwe mmekọrịta chiri anya na ịkụziri nwa anyị nwanyị uru ibi ndụ kwekọrọ n’ihe Ọ na-achọ bara. Ee, anyị chọrọ inye ya ihe nketa ime mmụọ dị mma nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs na-abịanụ n’elu ala ebe a.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ na-elekọta njikọ zuru ụwa ọnụ nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ. N’aka nke ha, ndị mejupụtara kọmitii a bụ ndị Kraịst na-arụ ọrụ afọ ofufo bụ́ ndị a zụrụ ịkwalite nkwekọrịta n’etiti ndị dọkịta na ndị ọrịa ha bụ́ Ndịàmà. E nwere ihe karịrị Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ 1,400 bụ́ ndị na-enyere ndị ọrịa aka n’ihe karịrị ala 200.