Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Ize Ndụ Zoro Ezo Nye Ahụ Ike Ọha”

“Ihe Ize Ndụ Zoro Ezo Nye Ahụ Ike Ọha”

“Ihe Ize Ndụ Zoro Ezo Nye Ahụ Ike Ọha”

N’ỤZỌ dị ịtụnanya, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị toruworo ogo mmadụ bụ́ ndị na-eji internet eme ihe na United States eletawo ụdị ụfọdụ nke ógbè mmekọahụ, ka nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya banyere mmekọahụ n’Internet kpughere. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ jizi Internet emeju agụụ mmekọahụ ha. “Nke a bụ ihe ize ndụ zoro ezo nye ahụ ike ọha bụ́ nke na-etiwapụ, n’otu akụkụ, n’ihi na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-aghọta ya otú ahụ ma ọ bụ na-ewere ya dị ka ihe a na-agaghị eji gwurie egwu,” ka Dr. Al Cooper, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ nke mere nnyocha ahụ na-ekwu.

Olee ndị mmekọahụ dị otú ahụ a na-enwe n’Internet na-emetụta karịsịa? Ọ bụ “ndị ji Internet eme ihe bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na a bịadawo ma kpaara ike mmekọahụ ha ókè ná ndụ ha nile” ma bụrụ ndị “chọtara, na mberede, ohere ndị na-adịghị agwụ agwụ ha ga-eji na-emeju agụụ mmekọahụ ha” n’Internet, ka Dr. Cooper na-ekwu.

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga n’ógbè mmekọahụ mgbe nile na-ewere omume ahụ dị ka ihe na-adịghị emerụ ahụ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị? Dị nnọọ ka ahụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ si amalite ịnabatawa ọgwụ ndị ahụ riri ya ahụ, ọtụtụ ndị mmekọahụ Internet riri ahụ na-achọ “ọ̀tụ̀tụ̀” hikwuru nne nke mmekọahụ n’Internet iji mejuo oké ọchịchọ ha. Leenụ, ha pụrụ ọbụna itinye ọrụ ha na mmekọrịta ha na di ma ọ bụ nwunye ha n’ihe ize ndụ!

Otú ọ dị, ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ nwere ihe ọzọ mere ha ga-eji zere ileta ógbè mmekọahụ n’Internet. Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị; ọ bụkwa n’ihi ihe ndị a ka iwe Chineke na-abịakwasị ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” (Ndị Kọlọsi 3:5, 6) Ka mmadụ wee ‘mee ka ihe nile dị ya n’ahụ nwụọ’ ma a bịa n’ihe metụtara agụụ mmekọahụ na-adịghị ọcha, ọ dị ya mkpa ịzụlite ịhụnanya siri ike n’ebe Jehova Chineke nọ. (Abụ Ọma 97:10) Ọ bụrụ na ọ hụta onwe ya dị ka onye a na-araba n’ihe ahụ dị ize ndụ nye ahụ ike ọha bụ́ mmekọahụ Internet, o kwesịrị ime ka ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike site n’ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Iso Ndịàmà Jehova na-enwe mmekọrịta dị mma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ ime ihe dị ukwuu n’inyere mmadụ aka ime ka mkpebi ya ime ihe na-atọ Chineke ụtọ sikwuo ike.