Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Lee Onye Na-eme Ihe Ebube Dị Iche Iche!

Lee Onye Na-eme Ihe Ebube Dị Iche Iche!

Lee Onye Na-eme Ihe Ebube Dị Iche Iche!

“Guzo, ghọta [ọrụ dị iche iche dị ebube] nke Chineke.”—JOB 37:14.

1, 2. Na 1922, nchọpụta dị aṅaa na-ebu isi ka e mere, oleekwa otú e si meghachi omume na ya?

RUO ọtụtụ afọ, ọkà mmụta ihe ochie na onye England a ma ama jikọrọ aka n’ịchọ akụ̀ ahụ dị oké ọnụ ahịa. N’ikpeazụ, na November 26, 1922, n’ebe a na-eli ndị fero Ijipt bụ́ nke dị n’ebe ahụ a ma ama bụ́ Ndagwurugwu nke Ndị Eze, ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Howard Carter na Lord Carnarvon hụrụ ihe ha na-achọ—ili Fero Tutankhamen. Mgbe ha ruru n’ibo a rachiri arachi, ha hịọpuru oghere. Carter si n’oghere ahụ weba kandụl ma nyoba anya.

2 Carter mesịrị kọọ, sị: “Mgbe Lord Carnarvon, bụ́ onye na-enweghịzi ike idi nchere ọ na-echere, ji ahụ erughị ala jụọ, sị, ‘Ọ̀ dị ihe ị na-ahụ?’ nanị ihe m kwuliri bụ, ‘Ee, ihe ndị dị ebube.’” Otu igbe ozu ọlaedo so n’ime ọtụtụ puku akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ndị dị n’ili ahụ. Ị pụrụ ịhụwo ụfọdụ n’ime “ihe ndị dị ebube” ahụ na foto ma ọ bụ n’ebe ngosi ihe mgbe ochie. Ma, otú ọ sọrọ ihe ndị ahụ dị n’ebe ngosi ihe mgbe ochie ha dịruo n’ebube, o yikarịrị ka e nweghị ihe jikọrọ ha na ndụ gị. Ya mere, ka anyị gaa n’ihe ebube ndị metụtara gị ma baara gị uru.

3. Olee ebe anyị na-achọta ihe ọmụma banyere ihe ebube dị iche iche bụ́ ndị pụrụ ịbara anyị uru?

3 Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere otu nwoke nke dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ gara aga, nwoke a ma ama karịa onye ọ bụla bụ́ ọkà n’ime ihe nkiri, ọkà n’egwuregwu, ma ọ bụ onye si n’ezinụlọ eze. A kpọrọ ya onye dị ukwuu karịa ụmụ Ihu Anyanwụ nile. Ị ga-ama aha ya—Job. E dere banyere ya n’otu akwụkwọ Bible dum. Ma, otu n’ime ndị ha na Job dịkọrọ ndụ, bụ́ nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu, chere na ọ dị mkpa ịgbazi ya. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Elaịhu kwuru na Job na-echebara onwe ya na ndị nọ ya gburugburu echiche gabiga ókè. Na Job isi 37, anyị na-achọta ndụmọdụ ụfọdụ ndị ọzọ a kapịrị ọnụ amamihe dị na ha, bụ́ ndị pụrụ ịbara anyị ezigbo uru.—Job 1:1-3; 32:1–33:12.

4. Gịnị dugara n’agbamume Elaịhu nke e dekọrọ na Job 37:14?

4 Mmadụ atọ e chere na ha bụ ndị enyi Job kwuru ogologo okwu banyere ebe ndị ha kweere na Job emehiewo n’echiche ma ọ bụ n’omume. (Job 15:1-6, 16; 22:5-10) Elaịhu ji ndidi chere ruo mgbe mkparịta ụka ahụ gwụsịrị. Mgbe ahụ, o ji nghọta na amamihe kwuo okwu. O kwuru ọtụtụ ihe ndị bara uru, ma rịba echiche a bụ́ isi ama: “Ṅaa ntị na nke a, Job: guzo, ghọta [ọrụ dị iche iche dị ebube, NW ] nke Chineke.”—Job 37:14.

Onye Rụrụ Ọrụ Ndị Ahụ

5. Gịnị ka “ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke” bụ́ ndị Elaịhu zoro aka na ha na-agụnye?

5 Rịba ama na Elaịhu atụghị aro ka Job ṅaa onwe ya, ya onwe ya bụ́ Elaịhụ, ma ọ bụ ụmụ mmadụ ndị ọzọ ntị. Elaịhu ji amamihe gbaa Job—na anyị onwe anyị—ume ichebara ọrụ dị iche iche dị ebube nke Jehova Chineke echiche. Gịnị ka i chere na nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke” na-agụnye? Ọzọkwa, n’agbanyeghị nchegbu ndị ị pụrụ inwe banyere ahụ ike, ọnọdụ akụ̀ na ụba, ọdịnihu, ezinụlọ gị, ndị ọrụ ibe gị, na ndị agbata obi gị, n’ihi gịnị ka i kwesịrị iji na-echebara ọrụ nile nke Chineke echiche? N’ụzọ doro anya, ọrụ dị iche iche dị ebube nke Jehova Chineke na-agụnye amamihe ya na ikike o nwere n’ebe ihe nile o kere eke a na-ahụ anya dị bụ́ ndị gbara anyị gburugburu. (Nehemaịa 9:6; Abụ Ọma 24:1; 104:24; 136:5, 6) Iji mee ka nke a doo anya, rịba ama ihe e kwuru n’akwụkwọ Joshua.

6, 7. (a) Ọrụ ndị dị aṅaa dị ebube ka Jehovah rụrụ n’oge Mosis na Joshua? (b) A sị na ị hụrụ nke ọ bụla n’ime ọrụ ndị ahụ a rụrụ n’oge Mosis nakwa n’oge Joshua, olee otú ị gaara esiwo meghachi omume?

6 Jehova tiri Ijipt oge ochie ihe otiti, wee kewaa Oké Osimiri Uhie ka Mosis nwee ike iduru ndị Israel oge ochie gaa ná nnwere onwe. (Ọpụpụ 7:1–14:31; Abụ Ọma 106:7, 21, 22) E nwere ihe omume yiri ya nke a kọrọ na Joshua isi 3. Joshua, bụ́ onye nọchiri Mosis, gaje iduru ndị Chineke gafee mmiri ọzọ wee banye n’Ala Nkwa ahụ. Joshua kwuru, sị: “Doonụ onwe unu nsọ: n’ihi na echi ka Jehova ga-eme ihe ebube dị iche iche n’etiti unu.” (Joshua 3:5) Ihe ebube dịgasị aṅaa?

7 Ihe ndekọ ahụ na-egosi na Jehova mepere ihe mgbochi nke bụ́ mmiri, bụ́ Osimiri Jọdan, ka ọtụtụ puku ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka nwee ike isi n’ala akọrọ gafee. (Joshua 3:7-17) A sị na anyị nọ n’ebe ahụ na-ele anya ka osimiri ahụ mepere, ndị ahụ nile agafeekwa n’enweghị nsogbu, ebube ihe omume ahụ dị gaara amasịwo anyị! O gosipụtara ike Chineke nwere n’ebe ihe e kere eke dị. Ma, ugbu a—n’oge ndụ anyị—e nwere ihe ndị dịkwa ebube otú ahụ. Iji mata ụfọdụ n’ime ihe ndị a na ihe mere anyị kwesịrị iji chebara ha echiche, tụlee Job 37:5-7.

8, 9. Ọrụ ndị dị aṅaa dị ebube ka Job 37:5-7 na-ezo aka na ha, ma gịnị mere anyị ji kwesị iche echiche banyere ihe ndị a?

8 Elaịhu kwuru, sị: “Chineke na-eji olu Ya maa égbè eluigwe n’ụzọ dị ebube; Ọ na-eme ihe ukwu, ma anyị amaghị ha.” Gịnị ka Elaịhu bu n’uche banyere Chineke ime ihe “n’ụzọ dị ebube”? O hotara snow na oké mmiri ozuzo. Ihe ndị a ga-akwụsị ọrụ onye ọrụ ugbo n’ubi ya, na-eme ka o nwee oge na ihe mere ọ ga-eji chebara ọrụ Chineke echiche. Ọ pụrụ ịbụ na anyị abụghị ndị ọrụ ugbo, ma mmiri ozuzo na snow pụrụ imetụta anyị. Na-adabere n’ebe anyị bi, snow na mmiri ozuzo pụkwara igbochi ọrụ anyị. Ànyị na-ewepụta oge iji tụgharịa uche n’onye mere ihe ndị dị otú ahụ dị ebube na ihe nke a pụtara? Ì metụwo otú ahụ?

9 N’ụzọ dị ịrịba ama, dị ka anyị na-agụ na Job isi 38, Jehova Chineke n’onwe ya nwere echiche yiri nke ahụ ka ọ na-ajụ Job ajụjụ ndị bara uru. Ọ bụ ezie na ọ bụ Job ka Onye Okike anyị jụrụ ajụjụ ndị a, o doro anya na ha na-emetụta àgwà anyị, ịdị adị anyị, na ọdịnihu anyị. Ya mere ka anyị lee ihe Chineke jụrụ, ka anyị cheekwa echiche banyere ihe ndị ha na-egosi, ee, ka anyị mee ihe Job 37:14 na-agba anyị ume ime.

10. Job isi 38 kwesịrị inwe mmetụta dị aṅaa n’ebe anyị nọ, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka ọ na-ewelite?

10 Isi 38 si otú a malite: “Jehova wee si n’oké ifufe zaa Job, sị, Ònye bụ onye a nke na-eme ka ndụmọdụ gbaa ọchịchịrị site n’okwu ọmụma ihe na-adịghị? Biko, kee ihe okike n’úkwù gị dị ka onye dị ike; M ga-ajụkwa gị, gị meekwa ka M mara.” (Job 38:1-3) Nke a doziri ọnọdụ maka ihe sochirinụ. O nyeere Job aka ịgbanwe echiche ya gaa n’ịmara na o guzo n’ihu Onye Okike nke eluigwe na ala nakwa na ọ ga-aza ajụjụ n’ihu ya. Nke ahụ bụkwa ihe dị mma ka anyị na ndị ọgbọ anyị mee. Chineke kpọtụziri uche n’ụdị ihe ndị Elaịhu hotara. “Olee ebe ị nọ mgbe M tọrọ ntọala ụwa? Gosi m, ma ọ bụrụ na ị maara nghọta. Ònye doro ọ̀tụ̀tụ̀ ya nile, ma a sị na ị maara? Ma ọ bụ ònye setịrị eriri ọ̀tụ̀tụ̀ n’elu ya? N’elu gịnị ka e mere ka ụkwụ ya nile bamie? Ma ọ bụ ònye tọgbọrọ nkume nkuku ya?”—Job 38:4-6.

11. Gịnị ka Job 38:4-6 kwesịrị ime ka anyị ghọta?

11 Olee ebe Job nọ—olee ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ—mgbe ụwa malitere ịdị? Ànyị bụ ndị na-atụpụta ụkpụrụ, bụ́ ndị tụpụtara ụkpụrụ nke otú ụwa anyị ga-adị, wee site n’ihe atụ ahụ mee otú ọ ga-aha dị ka a ga-asị na e ji eriri ọ̀tụ̀tụ̀ mee ihe? Ọ dịghị ma ọlị! Ụmụ mmadụ amalitebedịghị ịdị mgbe ahụ. Dị ka a ga-asị na ụwa anyị bụ ụlọ, Chineke jụrụ, sị: “Ònye tọgbọrọ nkume nkuku ya?” Anyị maara na e debere ụwa n’ebe kwesịrị nnọọ ekwesị site n’anyanwụ ka anyị biri ma nọgide na-adị ndụ na ya. Ọ hàkwa otú kwesịrị ekwesị. A sị na mbara ụwa anyị buru nnọọ ibu karị, ikuku hydrogen agaghị esi na mbara ikuku anyị pụọ, ụwa anyị ga-abụkwa ebe ndụ na-apụghị ịdị. N’ụzọ doro anya, ọ dị onye “tọgbọrọ nkume nkuku ya” n’ebe kwesịrị ekwesị. Job ò kwesịrị ịnata otuto maka ya? Ànyị kwesịrị? Ka ọ̀ bụ Jehova Chineke kwesịrị ịnata ya?—Ilu 3:19; Jeremaịa 10:12.

Olee Mmadụ nke Nwere Azịza Ha?

12. Ajụjụ a na-achọta na Job 38:6 na-eduga anyị iche banyere gịnị?

12 Chineke jụkwara, sị: “N’elu gịnị ka e mere ka ụkwụ ya nile bamie?” Nke ahụ ọ́ bụghị ezigbo ajụjụ? Ma eleghị anya, anyị maara nke ọma banyere otu okwu nke Job na-amaghị—ike ndọda. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-aghọta na ike ndọda nke e nwere n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ukwuu nke anyanwu na-eme ka ụwa anyị nọsie ike n’ọnọdụ ya, ụkwụ ya bamiri abami dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ma, ọ̀ dị onye ghọtara ike ndọda n’ụzọ zuru ezu?

13, 14. (a) Gịnị ka a na-aghaghị ikweta banyere ike ndọda? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ọnọdụ ahụ Job 38:6 na-eme ka ọ pụta ìhè?

13 Otu akwụkwọ e bipụtara na nso nso a, nke aha ya bụ The Universe Explained (A Kọwaa Eluigwe na Ala) na-ekweta na ‘ike ndọda bụ ike a kasị mara, ma bụrụ nke a ghọtara ihe kasị dị ala banyere ya, n’ike ndị sitere n’okike.’ Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ike ndọda yiri ka ọ na-agafe ebe ikuku na-adịghị n’otu ntabi anya, n’enweghị ụzọ ọ bụla doro anya o si eme otú ahụ. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọkà n’ihe ọmụmụ physics amalitewo ịkọ nkọ na ike ndọda pụrụ ịdị na-aga n’ụzarị nke ihe mejupụtara ya bụ ụmụ irighiri ihe a na-akpọ graviton . . . Ma ọ dịghị onye ji ịdị adị ha n’aka kpọmkwem.” Cheedị echiche banyere ihe nke ahụ pụtara!

14 Nkà mmụta sayensị enwewo ọganihu ruo afọ 3,000 kemgbe Jehova jụsịrị Job ajụjụ ndị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ma anyị ma ndị ọkachamara n’ihe ọmụmụ physics adịghị onye pụrụ ịkọwazu ike ndọda, bụ́ nke na-eme ka ụwa anyị nọgide na-aga gburugburu n’ebe kwesịrị ekwesị, n’ebe o kwesịrị ịdị iji mee ka anyị dịrị ndụ n’ebe a. (Job 26:7; Aịsaịa 45:18) Nke a abụghị ịtụ aro na ọ dị anyị nile mkpa imewe mgbalị ịchọpụta ihe omimi nile banyere ike ndọda. Kama nke ahụ, ichebara ọbụna otu akụkụ a nke ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke echiche kwesịrị inwe mmetụta n’otú anyị si ele Ya anya. Amamihe na ihe ọmụma ya hà na-eme ka ị tụọ egwu, ị̀ na-aghọtakwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị matakwuo uche ya?

15-17. (a) Na gịnị ka Job 38:8-11 lekwasịrị anya, na-eduga n’ajụjụ ndị dị aṅaa? (b) Gịnị ka a na-aghaghị ikweta banyere ihe ọmụma banyere oké osimiri na ebe ha dịgasị n’elu ala?

15 Onye Okike gara n’ihu n’ajụjụ ọ na-ajụ: “Ònye ji ibo ọnụ ụzọ mechibido oké osimiri, mgbe ọ wapụtara dị ka a ga-asị na ọ na-esi n’akpa nwa pụta; mgbe M doro igwe ojii ka ọ bụrụ uwe ya, na oké ọchịchịrị ka ọ bụrụ ákwà okike ya, M wee kpawaara ya ókè m, tinye ihe ntụchi na ibo ọnụ ụzọ, sị, Ruo ebe a ka ị ga-abịa, ma ị gaghị agabiga ya; n’ebe a ka a ga-akwụsịkwa mpako nke ebili mmiri gị nile?”—Job 38:8-11.

16 Imechibido oké osimiri ụzọ na-emetụta kọntinent dị iche iche, oké osimiri, na uto na ntalata nke mmiri. Ruo ogologo oge hà aṅaa ka mmadụ kiriworo ma mụọ ihe ndị a? Ọ bụ ruo ọtụtụ puku afọ—ọ kpụkwara nnọọ ọkụ n’ọnụ na narị afọ gara aga. Ị pụrụ iche n’echiche na a ghaghị ịmataworị ihe ka ukwuu n’ihe ndị a pụrụ ịmata banyere ha ka ọ dị ugbu a. Ma, n’afọ 2001 a, ọ bụrụ na i nyochaa isiokwu ahụ n’ọ́bá akwụkwọ ndị buru ibu ma ọ bụ jiri ike ime nnyocha sara mbara nke Internet mee ihe iji chọta isi ihe ndị kasị ọhụrụ, gịnị ka ị ga-achọpụta?

17 N’otu akwụkwọ e ji eme nchọpụta bụ́ nke a nakweere n’ebe nile, ị pụrụ ịchọta ihe a e kwetara: “Ebe ibe ala kọntinent dị iche iche nakwa ala oké osimiri ndị dị n’elu ala dịgasị nakwa ebe ihe ndị dị n’ibe ala ndị bụ́ isi dịgasị, anọwo eri oge na-abụ otu n’ime nsogbu kasị agbagwoju anya ná nnyocha na nchepụta nke sayensị.” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ a ka hotasịrị nnọọ nyere ihe anọ pụrụ ịbụ nkọwa ya ma kwuo na ihe ndị a “so n’ọtụtụ nchepụta e nwere.” Dị ka ị pụrụ ịma, nchepụta “na-enye echiche nke enweghị ihe àmà zuru ezu iji nye nkọwa e ji n’aka.”

18. Gịnị ka Job 38:8-11 na-eme ka i kwubie?

18 Nke ahụ ọ́ dịghị eme ka ọbịbịa ajụjụ ndị ahụ anyị na-agụ na Job 38:8-11 bịara n’ezi oge pụta ìhè? N’ezie, anyị ekwesịghị ịnara otuto maka nhazi nke ihe ndị a nile dị n’ime ụwa anyị. Ọ bụghị anyị debere ọnwa ka ike ndọrọ ya wee na-enye aka ime ka e nwee uto na ntalata nke mmiri bụ́ nke na-adịghị erikpukarị ụsọ oké osimiri anyị ma ọ bụ anyị onwe anyị. Ị maara onye mere ya, Onye Na-eme ihe ebube dị iche iche.—Abụ Ọma 33:7; 89:9; Ilu 8:29; Ọrụ 4:24; Mkpughe 14:7.

Nye Jehova Otuto Kwesịrị Ya

19. Okwu ndị ahụ e ji uri kwuo dị na Job 38:12-14 na-adọrọ uche anyị gaa n’ihe ndị dị aṅaa na-eme eme?

19 Ụmụ mmadụ apụghị ịnara otuto maka ịga gburugburu nke ụwa, bụ́ nke e zoro aka na ya na Job 38:12-14. Ịga gburugburu a na-eme ka e nwee chi ọbụbọ, nke na-amakarị nnọọ mma nke ukwuu. Ka anyanwụ na-awapụtakwu, ọdịdị nke ụwa anyị na-apụtawanye ìhè, dị ka ụrọ nke e ji ihe na-akanye ya akara na-agbanwe ọdịdị ya. Anyị chebara ngagharị nke ụwa ọbụna ntakịrị echiche, ọ ghaghị iju anyị anya na ụwa adịghị agba gburugburu oké ngwa ngwa bụ́ nke ga-eweta ọdachi, dị ka anyị pụrụ ịmata n’ụzọ dị mfe. Ọ dịghịkwa eji nnọọ nwayọọ nwayọọ aga nke na ehihie na abalị, n’ịbụ ndị ga-adị ogologo karị, ga-eme ka e nwee okpomọkụ na oyi gabigara ókè bụ́ ndị ga-eme ka ọ ghara ikwe mee mmadụ ịdị ndụ. N’ikwu eziokwu, anyị kwesịrị inwe obi ụtọ na ọ bụ Chineke, ọ bụghị ìgwè ụmụ mmadụ, setịpụrụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke ịga gburugburu ahụ.—Abụ Ọma 148:1-5.

20. Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ndị a jụrụ na Job 38:16, 18?

20 Ugbu a, were ya na Chineke jụrụ gị ajụjụ ndị ọzọ a: “Ị̀ bawo n’ebe nsụpụta nile nke oké osimiri? Ma ọ bụ ì jegharịwo n’ebe michasịrị emi nke ogbu mmiri?” Ọbụna ọkà n’ịmụ ihe banyere osimiri apụghị ịza ajụjụ ahụ n’ụzọ zuru ezu! “Ị̀ ghọtawo ruo obosara ụwa? Gosi m, ma ọ bụrụ na ị mazuwo ya.” (Job 38:16, 18) Ì jezuwo ma chọpụtasịa ógbè nile nke ụwa, ma ọ bụ ọbụna akụkụ ka ukwuu na ya? Ichebara ebe ndị mara mma na ihe ndị dị ebube dị n’ụwa anyị echiche hà pụrụ iwe afọ ndụ ole? Leekwa oge magburu onwe ha ha ga-abụ!

21. (a) Echiche ndị dị aṅaa nke nkà mmụta sayensị ka ajụjụ ndị dị na Job 38:19 pụrụ iwelite? (b) Ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ìhè kwesịrị ịkwali anyị ime gịnị?

21 Leekwa anya n’ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Job 38:19: “Olee ebe ọ dị, bụ́ ụzọ ebe obibi ìhè? Ọchịchịrị kwa, olee ebe ọ dị, bụ́ ọnọdụ ya?” Ọ pụrụ ịbụ na ị maara na ruo ogologo oge, echiche kasịnụ e nwere bụ na ìhè na-aga dị ka ụzarị, dị ka ụzarị anyị pụrụ ikiri n’ọdọ mmiri. E mesịa, na 1905, Albert Einstein kọwara na ìhè na-eme dị ka ụmụ irighiri, ma ọ bụ ngwugwu, nke ike. Nke ahụ ò mere ka okwu bie? Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya jụrụ, sị: “Ìhè ọ̀ bụ ụzarị ka ọ̀ bụ ụmụ irighiri ihe?” Ọ na-aza, sị: “Dị ka o yiri, [ìhè] apụghị ịbụ ha abụọ n’ihi na ihe atụ abụọ ahụ [ụzarị na ụmụ irighiri ihe] dịgasị nnọọ iche. Azịza kasị mma bụ na ìhè abụtụghị nke ọ bụla n’ime ha.” Ma, ìhè nke sitere n’anyanwụ ka nọgidere na-eme ka ahụ na-ekpo anyị ọkụ (site n’ịchakwasị anyị n’ahụ kpọmkwem nakwa n’achakwasịghị anyị kpọmkwem), ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dịghị mmadụ ọ bụla ka nwere ike ịkọwazu ọrụ Chineke n’akụkụ a. Anyị na-eri nri ma na-ekuru ikuku oxygen e mepụtara ka ihe ọkụkụ na-eji ìhè eme ihe. Anyị pụrụ ịgụ ihe, hụ ihu ndị anyị hụrụ n’anya, lekwasị ọdịda nke anyanwụ anya, na ihe ndị ọzọ. Ka anyị na-eme ihe ndị ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igosi ekele maka ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke?—Abụ Ọma 104:1, 2; 145:5; Aịsaịa 45:7; Jeremaịa 31:35.

22. Olee otú Devid oge ochie si meghachi omume n’ebe ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke dị?

22 Ebumnobi anyị n’ịtụgharị uche n’ọrụ ndị dị ebube Jehova na-arụ ọ̀ bụ nanị ka anyị wee nwee mkpali, dị ka a ga-asị na ha na-emenye anyị egwu ma ọ bụ mee ka anyị ghara inwe ọnụ okwu? Ọ dịghị ma ọlị. Onye ọbụ abụ oge ochie ahụ kwetara banyere ekweghị omume nke ịghọta na ikwu okwu n’ọrụ nile nke Chineke. Devid dere, sị: “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ [ọrụ gị dị iche iche dị ebube, NW], . . . a sị na aga m egosi kwuokwa okwu banyere ha, ha karịrị ịgụ ọnụ.” (Abụ Ọma 40:5) Otú ọ dị, ihe ọ na-ekwu n’ezie apụtaghị na ọ ga-agbachi nkịtị banyere ọrụ dị ebube ndị a. Devid gosipụtara nke a site ná mkpebi ya siri ike o kwupụtara n’Abụ Ọma 9:1: “M ga-eji obi m nile kelee Jehova; M ga-akọkwa akụkọ [ọrụ Gị dị iche iche dị ebube, NW].”

23. Gịnị bụ mmeghachi omume gị n’ebe ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke dị, oleekwa otú ị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka?

23 Ọ̀ bụ na e kwesịghị ịkwali anyị otú ahụ? Ọ̀ bụ na mmetụta ijuanya anyị nwere n’ebe ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke dị ekwesịghị ịkwali anyị ikwu banyere ya, banyere ihe o meworo, na banyere ihe ọ ka ga-eme? Azịza ya doro anya—anyị kwesịrị ‘ịkọsa akụkọ ebube Ya n’etiti mba nile, akụkọ ọrụ Ya dị iche iche dị ebube n’etiti ndị nile dị iche iche.’ (Abụ Ọma 96:3-5) Ee, anyị pụrụ igosipụta ekele obi umeala anyị maka ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke site n’iso ndị ọzọ kerịta ihe anyị mụtaworo banyere ya. Ọ bụrụgodị na ha tolitere n’ọdịbendị na-adịghị ekwere n’Onye Okike, okwu anyị ndị ziri ezi ma na-enye ihe ọmụma pụrụ ịkpali ha ịmata Chineke. Karịa nke ahụ, ọ pụrụ ịkwali ha ịchọ ịmụta banyere na ijere onye ahụ “kere ihe nile” ozi, Onye Na-arụ ọrụ dị iche iche dị ebube, bụ́ Jehova.—Mkpughe 4:11.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Agbamume e dekọrọ na Job 37:14 na-eduga gị n’iche banyere ọrụ ndị dị aṅaa nke Chineke?

• Olee ihe ụfọdụ ndị e mere ka ha pụta ìhè na Job isi 37 na 38 bụ́ ndị sayensị na-apụghị ịkọwa n’ụzọ zuru ezu?

• Olee mmetụta ị na-enwe banyere ọrụ dị iche iche dị ebube nke Chineke, gịnị ka ọ na-akpali gị ime?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 7]

Ònye mechibidoro oké osimiri, na-eme ka ọ dịrị n’ọnọdụ ya?

[Foto dị na peeji nke 7]

Ònye gaworo ebe nile mara mma nke ụwa anyị, bụ́ nke Chineke kere?