Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-echebara Oké Ọrụ Nile nke Chineke Echiche

Na-echebara Oké Ọrụ Nile nke Chineke Echiche

Na-echebara Oké Ọrụ Nile nke Chineke Echiche

“Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ: a pụghị idoro Gị ha n’usoro.”—ABỤ ỌMA 40:5.

1, 2. Olee ihe àmà anyị nwere banyere oké ọrụ nile nke Chineke, gịnịkwa ka nke a kwesịrị ịkpali anyị ime?

MGBE ị na-agụ Bible, ị pụrụ ịhụ n’egbughị oge na Chineke meere ndị ya n’oge ochie, bụ́ Israel, ihe ebube dị iche iche. (Joshua 3:5; Abụ Ọma 106:7, 21, 22) Ọ bụrụgodị na Jehova adịghị etinye aka n’ụzọ ahụ ugbu a n’ihe omume ụmụ mmadụ, anyị na-ahụ gburugburu anyị ọtụtụ ihe ndị na-egosi oké ọrụ ya nile. Ya mere anyị nwere ihe mere anyị ga-eji sonyere ọbụ abụ ahụ n’ikwu, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.”—Abụ Ọma 104:24; 148:1-5.

2 Ọtụtụ ndị taa na-ajụ ma ọ bụ na-eleghara ihe àmà doro anya otú ahụ banyere ọrụ dị iche iche nke Onye Okike, anya. (Ndị Rom 1:20) Otú ọ dị, anyị ga-eme nke ọma ịtụgharị uche na ha nakwa iru ná nkwubi okwu metụtara ọnọdụ anyị n’ihu Onye Mere anyị na ọrụ anyị nwere ịrụrụ ya. Job isi 38 ruo 41 bụ ihe enyemaka magburu onwe ya na nke a, n’ihi na n’ebe ahụ, Jehova dọọrọ uche Job gaa n’akụkụ ụfọdụ nke oké ọrụ Ya. Tụlee isiokwu ụfọdụ bara uru Chineke welitere.

Oké Ọrụ Ndị Dị Ebube

3. Dị ka e dekọrọ na Job 38:22, 23, 25-29, ihe ndị dị aṅaa ka Chineke jụrụ ajụjụ banyere ha?

3 N’otu oge, Chineke jụrụ Job, sị: “Ị̀ bawo n’ụlọ nkwakọba nile nke snow, ma ọ bụ ị̀ na-ahụ ụlọ nkwakọba nile nke akụ́ mmiri igwe, nke M gbochiworo nye mgbe mkpa, nye ụbọchị ọgụ na agha?” N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa anyị, snow na akụ́ mmiri igwe bụcha ihe ndị a na-ahụ mgbe nile. Chineke gara n’ihu ikwu, sị: “Ònye waworo ụzọ mmiri nye iju mmiri, ma ọ bụ ụzọ nye àmụ̀mà nke égbè eluigwe; ime ka mmiri zokwasị ala ebe ọ dịghị onye ọ bụla bi; bụ́ ọzara mmadụ na-ebighị n’ime ya; ime ka afọ ju mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ n’efu; na ime ka o puo, bụ́ mpupụta ọhụrụ nke ahịhịa ndụ? Mmiri ozuzo, ò nwere nna? Ma ọ bụ ònye mụworo mkpụrụ igirigi? N’afọ ònye ka ice na-esi apụta? Hoar-frost nke eluigwe kwa, ònye mụworo ya?”—Job 38:22, 23, 25-29.

4-6. N’echiche dị aṅaa ka ihe ọmụma mmadụ nwere banyere snow bụ nke na-ezughị ezu?

4 Ụfọdụ bụ́ ndị bi n’etiti ọha mmadụ na-eme ihe ọkụ ọkụ, ndị na-aghaghịkwa ime njem, pụrụ iwere snow dị ka ihe mgbochi nkịtị. Ma, ọtụtụ ndị ọzọ na-ewere snow dị ka ihe na-enye obi ụtọ, nke na-eme ka ebe nile maa mma n’oge oyi, na-eme ka e nwee ohere ime ihe ndị pụrụ iche. N’iburu ajụjụ Chineke n’uche, ị̀ maara banyere snow nke ọma, ọbụna otú ọ na-adị? Eenụ, anyị maara otú ikpo snow na-adị, ikekwe site na foto nke ikpo snow ma ọ bụ n’ihi na anyị ahụwo ọtụtụ snow n’ezie. Ma olee banyere ụmụ mpekere snow n’otu n’otu? Ị̀ ma otú ha na-adị, ikekwe mgbe i leruworo ha anya n’ebe ha si apụta?

5 Ụfọdụ ndị etinyewo ọtụtụ iri afọ n’ịmụ banyere na n’ise mpekere snow foto. Otu mpekere snow pụrụ ịbụ nke otu narị ụmụ obere mkpụrụ ice bụ́ ndị nwere ọdịdị dị iche iche mara mma mejupụtara. Akwụkwọ bụ́ Atmosphere na-ekwu, sị: “Oké ndịgasị iche nke mpekere snow bụ ihe akụkọ, ọ bụkwa ezie na ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwusi ike na ọ dịghị iwu na-achịkwa ihe e kere eke bụ́ nke machibidoro imepụtaghachi ụdị ha, a hụtụbeghị mpekere abụọ yiri onwe ha. . . . Wilson A. Bentley, bụ́ onye tinyere ihe karịrị afọ 40 n’iji ígwè microscope na-enyocha ma na-ese ụmụ mpekere snow foto n’ahụtụbeghị abụọ yiri ibe ha kpọmkwem, mere otu nnyocha buru nnọọ ibu.” Ọ bụrụgodị na n’ọnọdụ a na-adịghị ahụkebe, abụọ eyie ibe ha, nke ahụ ọ̀ ga-ebelata ịdị ebube nke ụdị mpekere snow dịgasị iche?

6 Cheta ajụjụ Chineke jụrụ: “Ị̀ bawo n’ụlọ nkwakọba nile nke snow?” Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ urukpuru bụ ụlọ nkwakọba nke snow. Ị̀ pụrụ iche n’echiche ịbanye n’ụlọ nkwakọba ndị a iji gụọ mkpụrụ snow nile e nwere n’ụdị ha dị iche iche ọnụ na ịmụ otú ha si malite? Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma sayensị na-ekwu, sị: “A matachabeghị ọdịdị na mmalite nke mkpụrụ ice, bụ́ ndị dị nnọọ mkpa iji kpasuo mkpụkọba nke obere mkpụrụ mmiri ndị dị n’urukpuru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi nke -40°F (-40 degree Celsius).”—Abụ Ọma 147:16, 17; Aịsaịa 55:9, 10.

7. Olee otú ihe ọmụma mmadụ nwere banyere mmiri ozuzo saruru na mbara?

7 Ma ọ bụ gịnị banyere mmiri ozuzo? Chineke jụrụ Job, sị: “Mmiri ozuzo, ò nwere nna? Ma ọ bụ ònye mụworo mkpụrụ igirigi?” Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu, sị: “N’ihi ịdị mgbagwoju anya nke mmegharị nke ikuku na oké ịdị iche nke udè na ụmụ irighiri ihe ndị mejupụtara ikuku, o yiri ka ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume inye nchepụta echiche zuru ezu ma saa mbara banyere otú igwe ojii na igirigi si amalite.” N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ndị ọkà mmụta sayensị enyewo nkọwa ndị sara mbara, ma n’ezie ha apụghị ịkọwa mmiri ozuzo n’ụzọ zuru ezu. Ma, ị maara na mmiri dị mkpa na-ezo, na-eme ka mmiri dee ụwa, na-akwado ihe ọkụkụ, na-emekwa ka o kwe mee ịdị ndụ, nakwa ka ọ dị ụtọ.

8. N’ihi gịnị ka okwu Pọl ndị e dekọrọ n’Ọrụ 14:17 ji daba adaba?

8 Ọ̀ bụ na ị gaghị ekwenye ná nkwubi okwu ahụ Pọl onyeozi ruru? Ọ gbara ndị ọzọ ume ịhụ n’ime oké ọrụ ndị a, ihe àmà nke Onye na-eme ha. Pọl kwuru banyere Jehova Chineke, sị: “Ọ hapụghị Onwe ya n’enweghi ihe àmà, ebe Ọ na-eme ezi ihe, na-enyekwa unu mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi unu n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.”—Ọrụ 14:17; Abụ Ọma 147:8.

9. Olee otú oké ọrụ nile nke Chineke si egosipụta ike ya dị ukwuu?

9 E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na Onye na-arụ oké ọrụ ndị dị otú ahụ, ndị bakwara uru nwere amamihe na-enweghị nsọtụ na ike dị ukwuu. A bịa n’ike ya, cheedị echiche banyere nke a: E kwuru na a na-enwe ihe karịrị égbè eluigwe 45,000 kwa ụbọchị, ihe karịrị nde 16 n’otu afọ. Nke a pụtara na ihe dị ka 2,000 na-ewere ọnọdụ kpọmkwem ugbu a. Oké igwe ojii nke otu égbè eluigwe na-akpata na-eji ike ruru ka nke bọmbụ nuklia iri ma ọ bụ karị a tụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ, emegharị. Ị na-ahụ ụfọdụ n’ime ike ahụ dị ka àmụ̀mà. E wezụga na ọ na-emenye ụjọ, àmụ̀mà na-enye aka n’ezie n’imepụta ụdị nitrogen dị iche iche na-abanye n’ime ala, bụ́ ebe ihe ọkụkụ na-amịkọrọ ha dị ka fatịlaịza sitere n’okike. Ya mere àmụ̀mà bụ ike e mere ka ọ pụta ìhè, kama ọ na-abakwa ezigbo uru.—Abụ Ọma 104:14, 15.

Mmetụta Dị Aṅaa Ka Ọ Na-enwe n’Ebe Ị Nọ?

10. Olee otú ị ga-esi aza ajụjụ ndị dị na Job 38:33-38?

10 Were ya na ị nọ n’ọnọdụ Job, Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ana-ajụ gị ajụjụ. O yikarịrị ka ị ga-ekweta na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ adịghị echebakarịrị oké ọrụ nile nke Chineke echiche. Jehova na-ajụ anyị ajụjụ ndị ahụ anyị na-agụ na Job 38:33-38. “Ị̀ mawo ụkpụrụ nile nke eluigwe? Ma ọ bụ ị̀ na-edo ndozi okwu ya n’ụwa? Ị̀ na-eweli olu gị elu ruo igwe ojii, ka njubiga mmiri wee kpuchie gị? Ị̀ na-ezipụ àmụ̀mà, ka ha wee jee, sịkwa gị, Lee anyị? Ònye tinyeworo amamihe n’akụkụ dị n’ime? Ma ọ bụ ònye nyeworo akọ na uche nghọta? Ònye na-agụ mbara igwe ọnụ site n’amamihe? Ma ọ bụ ònye na-atọgbọ karama akpụkpọ nile nke eluigwe ịgbapụ mmiri ha, mgbe ájá na-aghọ ụrọ, mgbe ọkpụrụkpụ ájá nile na-arapara n’ahụ onwe ha?”

11, 12. Olee ihe ụfọdụ ndị na-egosi na Chineke bụ Onye na-arụ oké ọrụ dị iche iche?

11 Anyị atụlewo nanị isi ihe ole na ole Elaịhu jụrụ Job, anyị anụwokwa ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị Jehova gwara Job ka ọ zaa “dị ka onye dị ike.” (Job 38:3) Anyị sịrị “ụfọdụ” n’ihi na n’isi nke 38 na 39, Chineke lekwasịrị anya n’ihe ndị ọzọ e kere eke bụ́ ndị kwesịrị ịrịba ama. Dị ka ihe atụ, ìgwè kpakpando dị iche iche nke eluigwe. Ònye maara iwu ma ọ bụ ụkpụrụ ha nile? (Job 38:31-33) Jehova dọọrọ uche Job gaa n’ụfọdụ n’ime ụmụ anụmanụ—ọdụm na ugoloọma, ewu ọhịa na ịnyịnya ọhịa, atụ́ na enyí nnụnụ, nnukwu ịnyịnya na ugo. Ya bụ, Chineke jụrụ Job ma ọ̀ bụ ya nyere anụmanụ ndị a njimara ha dịgasị iche, na-eme ka ha nwee ike ịdị ndụ na ịmụba. Ọ pụrụ ịtọ gị ụtọ ịmụ isiakwụkwọ ndị a, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-enwe mmasị n’ịnyịnya ma ọ bụ n’anụmanụ ndị ọzọ.—Abụ Ọma 50:10, 11.

12 Ị pụkwara inyocha Job isi 40 na 41, bụ́ ebe Jehova gwara Job ọzọ ka ọ zaa ajụjụ a jụgasịrị ya banyere ihe abụọ e kere eke kpọmkwem. Anyị na-aghọta na ihe ndị a bụ enyí mmiri (Òtòbò), nke buru oké ibu ma sie ike n’ahụ, na agụ iyi Naịl ahụ siri ike (Leviathan). Nke ọ bụla n’ime ha bụ ihe e kere eke dị ịtụnanya n’ụzọ nke ya, nke kwesịrị ka anyị chebara ya echiche. Ka anyị lee nkwubi okwu ndị anyị kwesịrị iru na ha ugbu a.

13. Ajụjụ ndị Chineke jụrụ hà nwere mmetụta dị aṅaa n’ahụ Job, oleekwa otú ihe ndị a kwesịrị isi metụta anyị?

13 Job isi 42 na-egosi anyị mmetụta ajụjụ Chineke jụrụ nwere n’ahụ Job. Tupu mgbe ahụ Job chebigara echiche ókè banyere onwe ya na ndị ọzọ. Ma site n’ịnakwere mgbazi nke pụtara ìhè n’ajụjụ ndị Chineke jụrụ, Job gbanwere echiche ya. O mere nkwupụta, sị: “Amawo m na Ị [Jehova] pụrụ ime ihe nile, amawokwa m na a dịghị egbochi nzube ọ bụla nke sitere na Gị. Ònye bụ onye a nke na-ezobe ndụmọdụ n’enweghị ọmụma ihe? N’ihi ya ka m gosiworo ihe nke m na-adịghị aghọta, ihe dịkarịrị m ebube, nke m na-adịghị amata.” (Job 42:2, 3) Ee, mgbe Job chebasịịrị oké ọrụ nile nke Chineke echiche, o kwuru na ihe ndị a dịkarịrị ya ebube. Mgbe anyị tụlesịrị ihe ndị a dị ịtụnanya e kere eke, anyị kwesịkwara inwe mkpali maka amamihe na ike nke Chineke. N’ihi nzube dị aṅaa? Ọ̀ bụ nanị ka anyị nwee mkpali maka ike na ikike buru ibu nke Jehova? Ka è kwesịrị ịkpali anyị ime ihe karịrị nke ahụ?

14. Olee otú Devid si meghachi omume n’ebe oké ọrụ nile nke Chineke dị?

14 N’Abụ Ọma nke 86, anyị na-ahụ okwu ndị yiri nke ahụ nke Devid kwuru, bụ́ onye kwuru n’abụ ọma bu ụzọ, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi. Otu ụbọchị na-agwawara ụbọchị ibe ya okwu ọnụ n’ụba, otu abalị na-ekwupụtakwara abalị ibe ya ihe ọmụma.” (Abụ Ọma 19:1, 2) Ma Devid gakwuru n’ihu. N’Abụ Ọma 86:10, 11, anyị na-agụ, sị: “Onye ukwu ka Ị bụ, Ị na-arụkwa oké ọrụ dị iche iche: Gị onwe gị bụ Chineke, nanị Gị. Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.” Egwu Devid na-atụ Onye Okike maka oké ọrụ ya nile, na-agụnye ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke egwu nsọpụrụ. Ị pụrụ ịghọta ihe kpatara ya. Devid achọghị ime ihe na-agaghị amasị Onye ahụ nke pụrụ ịrụ oké ọrụ ndị a. Anyị ekwesịghịkwa ime ihe na-agaghị amasị ya.

15. N’ihi gịnị ka egwu nsọpụrụ Devid na-atụ Chineke ji kwesị ekwesị?

15 Devid aghaghị ịghọtaworị na ebe ọ bụ na Chineke nwere ma na-achịkwa ike buru ibu, ọ pụrụ iji ya mee ihe megide onye ọ bụla na-ekwesịghị inweta ihu ọma ya. Nye ha, nke ahụ na-emenye ụjọ. Chineke jụrụ Job, sị: “Ị̀ bawo n’ụlọ nkwakọba nile nke snow, ma ọ bụ ị̀ na-ahụ ụlọ nkwakọba nile nke akụ́ mmiri igwe, nke M gbochiworo nye mgbe mkpa, nye ụbọchị ọgụ na agha?” Snow, akụ́ mmiri igwe, oké mmiri ozuzo, ifufe, na àmụ̀mà socha ná ngwá agha ya. Leekwa ihe e kere eke dị ike n’ụzọ dị egwu ha bụ!—Job 38:22, 23.

16, 17. Gịnị na-egosipụta ike dị egwu Chineke nwere, oleekwa otú o siworo jiri ike dị otú ahụ mee ihe n’oge gara aga?

16 Ma eleghị anya ị na-echeta ọdachi ụfọdụ mere n’ógbè unu nke ọ bụ otu n’ime ihe ndị a kpatara ya—ajọ ifufe, typhoon, cyclone, akụ́ mmiri igwe, ma ọ bụkwanụ idei mmiri. Iji maa atụ, ka afọ 1999 na-eru ná ngwụsị, oké ifufe fere na ndịda ebe ọdịda anyanwụ Europe. O juru ọbụna ndị ọkachamara n’ihu igwe anya. Ifufe na-efenụ ruru kilomita 200 n’otu awa, wee sekapụ ọtụtụ puku elu ụlọ, kwatuo ogidi ọkụ eletrik dị iche iche, kwatuokwa nnukwu ụgbọala dị iche iche. Gbalịa jiri anya nke uche hụ nke a: Oké ifufe ahụ foliri ma ọ bụ gbajie ihe dị ka nde osisi 270, ọ gbajiri 10,000 nanị n’otu ogige ntụrụndụ dị na Versailles, ná mpụga Paris. Ọtụtụ nde ebe obibi nọ n’enweghị ọkụ eletrik. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100 mmadụ nwụrụ. Ihe ahụ nile mere n’otu mkpirikpi oge. Lee ike dị egwu ọ bụ!

17 Mmadụ pụrụ ịkpọ oké ifufe ihe omume a na-adịghị eduzi eduzi, bụ́kwa nke a na-adịghị achịkwa achịkwa. Otú ọ dị, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na Onye ahụ nwere ike nile, arụọ oké ọrụ site n’iji ike ndị dị otú ahụ mee ihe n’ụzọ a chịkwara achịkwa? O mere ihe yiri nke ahụ laa azụ n’oge Abraham, bụ́ onye mụtara na Onyeikpe nke ụwa nile atụwo ajọ omume nke obodo abụọ, bụ́ Sọdọm na Gọmọra, n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ha rụrụ nnọọ arụ nke na mkpu mkpesa a na-eti banyere ha rịgokwuuru Chineke, bụ́ onye nyeere ndị ezi omume nile aka isi n’obodo ndị ahụ a mara ikpe gbapụ. Akụkọ ihe mere eme na-ekwu, sị: “Jehova wee mee ka brimstone na ọkụ si n’eluigwe zokwasị” obodo ndị ahụ dị ka mmiri. Nke ahụ bụ oké ọrụ, ichebe ndị ezi omume na ibibi ndị ajọ omume na-enweghị nchegharị.—Jenesis 19:24.

18. Ihe ebube ndị dị aṅaa ka Aịsaịa isi 25 na-ezo aka na ha?

18 Mgbe e mesịrị, Chineke mara obodo oge ochie bụ́ Babilọn ikpe, nke pụrụ ịbụ obodo ahụ e zoro aka na ya n’Aịsaịa isi 25. Chineke buru amụma na otu obodo ga-aghọ mkpọmkpọ ebe: “I mewo ka obodo ghọọ obo ihe; I mewo ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dara ada: I mewo ka ụlọ elu nke ndị ala ọzọ ghara ịbụ obodo; ruo mgbe ebighị ebi a gaghị ewu ya.” (Aịsaịa 25:2) Ndị na-eme nleta n’oge a n’ebe Babilọn oge ochie dịbu pụrụ ịnwapụta na nke a mezuru. Mbibi Babilọn ọ̀ bụ ihe ndabakọ nkịtị? Ee e. Kama nke ahụ, anyị pụrụ ịnakwere nkọwa Aịsaịa: “Jehova, Chineke m ka Ị bụ; m ga-eme ka Ị dị elu, m ga-ekele aha Gị; n’ihi na I mewo ihe ebube, bụ́ ndụmọdụ dị iche iche site na mgbe dị anya gara aga, n’ikwesị ntụkwasị obi na eziokwu.”—Aịsaịa 25:1.

Oké Ọrụ Dị Iche Iche n’Ọdịnihu

19, 20. Olee mmezu anyị pụrụ ịtụ anya ya banyere Aịsaịa 25:6-8?

19 Chineke mezuru amụma ahụ dị n’elu n’oge gara aga, ọ ga-emekwa ihe n’ụzọ dị ebube n’ọdịnihu. N’ihe a na-ekwu n’ebe a, bụ́ ebe Aịsaịa hotara “ihe ebube dị iche iche” nke Chineke, anyị na-ahụ amụma a pụrụ ịtụkwasị obi nke a ka ga-emezu, dị nnọọ ka ikpe ahụ a mara Babilọn si mezuo. Olee “ihe ebube” e kwere ná nkwa? Aịsaịa 25:6 na-ekwu, sị: “N’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma.”

20 A ga-emezu amụma ahụ n’ezie n’ime ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa, nke dị anyị nnọọ n’ihu. N’oge ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ ná nsogbu ndị na-anyịgbu ọtụtụ ndị taa. N’ezie, amụma ahụ dị n’Aịsaịa 25:7, 8 na-emesi obi ike na Chineke ga-eji ike ya nke ike ihe rụọ otu n’ime oké ọrụ kachasịnụ a ga-arụtụwo: “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile; ịta ụta nke ndị Ya ka Ọ ga-ewezụgakwa n’elu ụwa nile: n’ihi na Jehova ekwuwo ya.” Pọl onyeozi mesịrị hota ihe n’akụkụ ihe odide ahụ ma were ya mee ihe ná mweghachi Chineke ga-eweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ, n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Lee oké ọrụ nke ahụ ga-abụ!—1 Ndị Kọrint 15:51-54.

21. Oké ọrụ ndị dị aṅaa ka Chineke ga-arụrụ ndị nwụrụ anwụ?

21 Ihe ọzọ mere anya mmiri nke iru újú ga-eji pụọ n’anya bụ na a ga-ewepụ nsogbu anụ ahụ nile nke ụmụ mmadụ. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị—mee ka ndị kpụrụ ìsì hụ ụzọ, ka ndị ntị chiri nụ ihe, ka ndị nwere nkwarụ nwee ume. Jọn 5:5-9 na-akọ na ọ gwọrọ nwoke daworo ngwụrọ ruo afọ 38. Ndị hụrụ ihe merenụ chere na ihe a bụ ihe ijuanya, ma ọ bụ oké ọrụ. Ọ bụkwa! Otú ọ dị, Jisọs gwara ha na ihe ga-aka eju anya ga-abụ mkpọlite ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ: “Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”—Jọn 5:28, 29.

22. N’ihi gịnị ka ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu ga-eji jiri olileanya na-elepụ anya n’ihu?

22 Nke ahụ aghaghị imezu n’ihi na onye na-ekwe nkwa ahụ bụ Jehova. Jide n’aka na mgbe ọ ga-eji ike mweghachi ihe ya dị ukwuu mee ihe ma jiri nlezianya duzie ya, ihe ọ ga-arụpụta ga-adị ebube. Abụ Ọma nke 72 na-ezo aka n’ihe ọ ga-eme site n’aka Ọkpara ya bụ́ Eze. Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ mgbe ahụ dị ka osisi ndụ. Udo ga-aba ụba. Chineke ga-anapụta ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu. Ọ na-ekwe nkwa, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanọn [oge ochie]: mmadụ ga-esikwa n’obodo waa okooko osisi dị ka ihe a kụrụ n’ala.”—Abụ Ọma 72:16.

23. Gịnị ka oké ọrụ nile nke Chineke kwesịrị ịkwali anyị ime?

23 N’ụzọ doro anya, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji echebara oké ọrụ nile nke Jehova echiche—ihe ndị o mere n’oge gara, ihe ndị ọ na-eme taa, na ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu dị nso. “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke, bụ, bụ́ Chineke nke Israel, Onye nanị Ya na-arụ oké ọrụ dị iche iche: ihe a gọziri agọzi ka aha nsọpụrụ Ya bụkwa ruo mgbe ebighị ebi; ka ụwa nile jupụtakwa ná nsọpụrụ Ya. Amen, na Amen.” (Abụ Ọma 72:18, 19) Nke ahụ kwesịrị ịbụ isiokwu anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi esoro ndị ikwu na ndị ọzọ ekwurịta. Ee, ka anyị ‘kọsaa akụkọ ebube Ya n’etiti mba nile, akụkọ oké ọrụ Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche.’—Abụ Ọma 78:3, 4; 96:3, 4.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú ajụjụ ndị a jụrụ Job si eme ka ókè a kpaara ihe ọmụma mmadụ pụta ìhè?

• Ihe atụ ndị dị aṅaa nke oké ọrụ nile nke Chineke bụ́ ndị e mere ka ha pụta ìhè na Job isi 37-41 na-akpali mmasị gị?

• Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe anyị tụlesịrị ụfọdụ n’ime oké ọrụ nile nke Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Gịnị ka ị na-ekwubi banyere ọtụtụ mpekere snow dịgasị iche na ike na-emenye egwu nke àmụ̀mà?

[Ebe E Si Nweta Foto]

snowcrystals.net

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ka oké ọrụ nile nke Chineke bụrụ ihe gị na ndị ọzọ na-ekwurịtakarị