Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nna Chọọchị—Hà Bụ Ndị Na-akwado Eziokwu Bible?

Ndị Nna Chọọchị—Hà Bụ Ndị Na-akwado Eziokwu Bible?

Ndị Nna Chọọchị—Hà Bụ Ndị Na-akwado Eziokwu Bible?

Ma ị̀ na-azọrọ na ị bụ onye Kraịst ma ọ̀ bụ na ị naghị azọrọ, ha pụrụ nnọọ imetụtawo echiche i nwere banyere Chineke nke Bible, Jisọs, na Iso Ụzọ Kraịst. A kpọrọ otu n’ime ha Onye Ọnụ Ọlaedo; kpọọ onye nke ọzọ, Onye Ukwu. N’ozuzu, a kọwawo ha dị ka “ndị kasị egosipụta ndụ Kraịst.” Hà bụ ole ndị? Ha bụ ndị okpukpe oge ochie bụ́ ndị ọkà n’echiche, ndị edemede, ndị ọkà mmụta okpukpe, na ndị ọkà ihe ọmụma bụ́ ndị metụtaworo ihe ka ukwuu n’echiche “ndị Kraịst” nke oge a—Ndị Nna Chọọchị.

“Ọ BỤGHỊ nanị Bible bụ okwu Chineke,” ka prọfesọ ihe ọmụmụ okpukpe nke chọọchị Ọtọdọks nke Gris bụ́ Demetrios J. Constantelos na-azọrọ. “Mmụọ Nsọ nke na-ekpughe okwu Chineke abụghị ihe a pụrụ imechibido n’ime akwụkwọ.” Olee ebe ọzọ a pụrụ, ma eleghị anya, isi nweta mkpughe Chineke nke a pụrụ ịdabere na ya? Constantelos na-azọrọ n’ime akwụkwọ ya bụ́ Understanding the Greek Orthodox Church, sị: “A na-ele Ọdịnala Nsọ na Akwụkwọ Nsọ anya dị ka akụkụ abụọ nke mkpughe Chineke.”

Ntọala nke “Ọdịnala Nsọ” ahụ na-agụnye ozizi na ihe odide nke Ndị Nna Chọọchị. Ha bụ ndị ọkà mmụta okpukpe a ma ama na ndị ọkà ihe ọmụma bụ́ “ndị Kraịst” bụ́ ndị biri ndụ n’agbata narị afọ nke abụọ na nke ise O.A. Ruo ókè hà aṅaa ka ha metụtaworo echiche “ndị Kraịst” nke oge a? Hà gbasoro Bible n’ozizi ha? Gịnị kwesịrị ịbụ ntọala siri ike nke eziokwu ndị Kraịst nye onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst?

Akụkọ Ihe Mere Eme Banyere Ha

N’etiti narị afọ nke abụọ O.A., ndị sị na ha bụ ndị Kraịst nọ na-agbachitere okwukwe ha megide ndị Rom na-akpagbu ha nakwa ndị jụrụ okwukwe. Otú ọ dị, nke a bụ ọgbọ nwere nnọọ ọtụtụ echiche nkà mmụta okpukpe. Arụmụka okpukpe a rụrịtara banyere “ịbụ Chineke” nke Jisọs na ọdịdị na ọrụ nke mmụọ nsọ mere ka e nwee ihe karịrị nkewa nkịtị n’ụzọ nkà mmụta. Oké esemokwu na nkewa a na-apụghị imekwata emekwata e nwere n’ihi ozizi “ndị Kraịst” gbasara banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọdịbendị, mgbe ụfọdụ, na-akpata ọgba aghara, nnupụisi, ọgụ ime obodo, na ọbụna agha. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Paul Johnson na-ede, sị: “Iso Ụzọ Kraịst [nke si n’ezi ofufe dapụ] ji ọgba aghara, esemokwu nakwa nkewa malite ma digide otú ahụ gaa n’ihu. . . . Ebe etiti na ebe ọwụwa anyanwụ Mediterranean nke narị afọ mbụ na nke abụọ AD jupụtara nnọọ n’ọtụtụ echiche okpukpe a na-apụghị ịgụta ọnụ, nke ọ bụla ana-agbalị ịgbasa. . . . Ya mere, site ná mmalite, e nwere ọtụtụ ụdị dịgasị iche nke Iso Ụzọ Kraịst ndị na-enwechaghị ebe ha na ibe ha yirịtara.”

N’oge ahụ, ndị edemede na ndị ọkà n’echiche bụ́ ndị chere na ọ dị oké mkpa iji okwu nkà ihe ọmụma na-akọwa ozizi “ndị Kraịst,” malitere ịba ụba. Iji mee ka ndị ọgọ mmụọ gụrụ akwụkwọ bụ́ ndị a tọghatara ọhụrụ ‘n’Iso Ụzọ Kraịst’ nwee afọ ojuju, ndị edemede okpukpe dị otú ahụ mere ka ihe odide ha dabere n’ụzọ dị ukwuu n’akwụkwọ ndị Gris na nke ndị Juu e dere tupu mgbe ahụ. Malite n’aka Justin Martyr (ihe dị ka 100-165 O.A.), bụ́ onye ji Grik dee akwụkwọ ya, ndị sị na ha bụ ndị Kraịst ghọrọ ndị nakweere, n’ụzọ dịwanye nnọọ mgbagwoju anya, ihe nketa nkà ihe ọmụma nke ọdịbendị ndị Gris.

Omume a pụtara nnọọ ìhè n’ihe odide Origen (ihe dị ka 185-254 O.A.), bụ́ onye edemede Gris si Aleksandria. Akwụkwọ Origen bụ́ On First Principles bụ mgbalị mbụ e leziri anya mee iji jiri nkà ihe ọmụma ndị Gris kọwaa ozizi ndị bụ́ isi nke nkà mmụta okpukpe “ndị Kraịst.” Kansụl nke Nicaea (325 O.A.), nakwa mgbalị ya ịkọwa na ikwubi na Kraịst bụ “Chineke,” bụ ihe dị ịrịba ama nyere ihe mkpali ọhụrụ n’ịkọwa ozizi “ndị Kraịst.” Kansụl ahụ kara akara mmalite nke oge mgbe kansụl ukwu dị iche iche nke chọọchị nwara ịkọwa ozizi n’ụzọ a kapịkwuru ọnụ.

Ndị Edemede na Ndị Ọkà Okwu

Eusebius nke Sisaria, bụ́ onye dere akwụkwọ ya n’oge Kansụl nke Nicaea mbụ, so Eze Ukwu Constantine mekọọ ihe. Ruo ihe ji nke nta karịa 100 afọ e nwesịrị Kansụl nke Nicaea, ndị ọkà mmụta okpukpe, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha ji Grik dee akwụkwọ ha, ji arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ a rụrụ ogologo oge wulite ihe gaje ịbụ ozizi a ga-eji na-amata Krisendọm, Atọ n’Ime Otu. Ndị bụ́ isi n’ime ha bụ Athanasius, bụ́ bishọp nwere anyaike nke Aleksandria, na mmadụ atọ bụ́ ndị ndú chọọchị si Kapadọsia, Asia Minor—Basil Onye Ukwu, nwanne ya nwoke bụ́ Gregory nke Nyssa, na enyi ha bụ́ Gregory nke Nazianzus.

Ndị edemede na ndị ụkọchukwu nke oge ahụ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke nkà ikwu okwu. Gregory nke Nazianzus na John Chrysostom (nke pụtara “Onye Ọnụ Ọlaedo”) bụ́ ndị ji Grik kwuo okwu ha nakwa Ambrose nke Milan na Augustine nke Hippo bụ́ ndị ji Latin kwuo nke ha, bụcha ndị ọkà okwu ma nke a na-akọ, ndị ọkà n’ụdị nkà a kasị kwanyere ùgwù nakwa nke kasị wuo ewuo n’oge ha. Onye edemede a kasị kwanyere ùgwù n’oge ahụ bụ Augustine. Ihe odide ya dị iche iche nke nkà mmụta okpukpe emetụtawo echiche “ndị Kraịst” taa n’akụkụ ya nile. Jerome, bụ́ nwoke kasị wuo ewuo dị ka onye gụrụ oké akwụkwọ n’oge ahụ, bụ onye bụ́ isi sụgharịrị Bible site n’asụsụ ndị mbụ ya gaa na Vulgate Latin.

Otú ọ dị, ajụjụ ndị dị mkpa bụ: Ndị Nna Chọọchị ahụ hà gbasochiri Bible anya? N’ozizi ha, hà gbasochiri Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee, anya? Ihe odide ha hà bụ ihe nduzi dị mma iji nweta ezi ihe ọmụma nke Chineke?

Ozizi Chineke Ka Ọ̀ Bụ Ozizi Mmadụ?

Na nso nso a, Bishọp Ukwu nke Chọọchị Ọtọdọks nke Gris bụ́ Methodius nke Pisidia dere akwụkwọ bụ́ The Hellenic Pedestal of Christianity iji gosi na ọdịbendị na nkà ihe ọmụma Gris bụ ebe e si nweta echiche “ndị Kraịst” nke oge a. N’akwụkwọ ahụ, o kwetara ozugbo, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndị Nna Chọọchị nile a ma ama weere echiche ndị Gris dị ka ihe kasị baa uru, ha gbazitekwara ha site n’ọdịnala oge ochie nke ndị Gris, na-eji ha eme ihe dị ka ụzọ isi ghọta ma kọwaa eziokwu ndị Kraịst n’ụzọ ziri ezi.”

Were, dị ka ihe atụ, echiche ahụ bụ́ na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ mejupụtara Atọ n’Ime Otu. Mgbe Kansụl nke Nicaea ahụ gasịrị, ọtụtụ Ndị Nna Chọọchị ghọrọ ndị kwenyesiri ike n’Atọ n’Ime Otu. Ihe odide na nkọwa ndị ha nyere bụ isi ihe ndị mere ka Atọ n’Ime Otu bụrụ ozizi bụ́ isi nke Krisendọm. Otú ọ dị, Atọ n’Ime Otu ọ̀ dị na Bible? Ee e. Ya mere, ebee ka Ndị Nna Chọọchị si nweta ya? Akwụkwọ bụ́ A Dictionary of Religious Knowledge na-ekwu na ọtụtụ mmadụ na-asị na Atọ n’Ime Otu “bụ ngwagbu a gbazitere site n’okpukpe ndị ọgọ mmụọ, ma webata ya n’okpukpe ndị Kraịst.” Akwụkwọ bụ́ The Paganism in Our Christianity (Ikpere Arụsị n’Iso Ụzọ Kraịst Anyị) na-akwadokwa nke ahụ, sị: “Mmalite nke [Atọ n’Ime Otu] sitere kpam kpam n’ikpere arụsị.” *Jọn 3:16; 14:28.

Ma ọ bụ, tụlee ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, nkwenkwe bụ́ na akụkụ ụfọdụ nke mmadụ na-adị ndụ mgbe ahụ nwụsịrị. Ọzọkwa, ọ bụ site n’aka Ndị Nna Chọọchị ka e si webata echiche a n’ime okpukpe nke na-adịghị ezi ihe ọ bụla banyere mkpụrụ obi ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị. Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Ebee ka nkwenkwe Ndị Nna Chọọchị nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi dabeere? “Echiche ndị Kraịst banyere mkpụrụ obi ime mmụọ nke Chineke kere ma tinye n’ime ahụ mgbe a tụụrụ ime mmadụ iji mee ka ọ bụrụ onye dị ndụ bụ ihe sitere na nkà ihe ọmụma ndị Kraịst nke e wuliteworo eri ogologo oge. Ọ bụ nanị n’aka Origen nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na St. Augustine nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ka e si guzobe mkpụrụ obi dị ka ihe bụ́ mmụọ ma wepụta echiche nkà ihe ọmụma banyere ọdịdị ya. . . . Ihe ka ukwuu n’ihe ndị mejupụtara [ozizi Augustine] . . . (gụnyere ihe ụfọdụ na-adịghị mma na ya) sitere n’Ozizi Plato nke Ọgbara Ọhụrụ,” ka New Catholic Encyclopedia na-ekwu. Magazin bụ́ Presbyterian Life na-ekwukwa, sị: “Anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ echiche ndị Gris nke e chepụtara n’òtù nzuzo oge ochie ndị na-eme ihe omimi, bụ́kwa nke ọkà ihe ọmụma bụ́ Plato kọwakwuru.” *

Ntọala Siri Ike nke Eziokwu Ndị Kraịst

Ọbụna ka e mesịrị nnyocha a dị mkpirikpi banyere akụkọ ihe mere eme nke Ndị Nna Chọọchị, nakwa mmalite nke ozizi ha, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịjụ, sị, Onye Kraịst nwere obi eziokwu ò kwesịrị ime ka nkwenkwe ya dabere n’ozizi nke Ndị Nna Chọọchị? Ka Bible zaa ya.

Nke mbụ, Jisọs Kraịst n’onwe ya kagburu iji ùtú aha okpukpe bụ́ “Nna” eme ihe mgbe o kwuru, sị: “Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu Onye bụ Nna unu, Ya bụ Onye nke eluigwe.” (Matiu 23:9) Ịkpọ onye ọ bụla bụ́ onye okpukpe “Nna” abụghị omume ndị Kraịst, Akwụkwọ Nsọ akwadoghịkwa ya. E dechara Okwu Chineke n’ihe dị ka 98 O.A. mgbe Jọn onyeozi desịrị akwụkwọ ya. N’ihi ya, ọ dịghị ezi ndị Kraịst mkpa ilegara mmadụ ọ bụla anya dị ka isi iyi nke mkpughe sitere n’ike mmụọ nsọ. Ha na-akpachapụ anya ịghara ‘ime okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu’ n’ihi ọdịnala mmadụ. Ikwe ka ọdịnala mmadụ weghara ọnọdụ nke Okwu Chineke na-ebibi ihe n’ụzọ ime mmụọ. Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”—Matiu 15:6, 14.

Mkpughe ọ bụla na-abụghị okwu Chineke dị na Bible ọ̀ dị onye Kraịst mkpa? Ee e. Akwụkwọ Mkpughe na-adọ aka ná ntị megide ịtụkwasị ihe ọ bụla n’ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-atụkwasịrị ha okwu, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti nile nke e deworo n’akwụkwọ a.”—Mkpughe 22:18.

Eziokwu ndị Kraịst dị n’ime Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16; 2 Jọn 1-4) Ịghọta ya n’ụzọ ziri ezi adịghị adabere na nkà ihe ọmụma ụwa. Banyere ndị nwara iji amamihe mmadụ na-akọwa mkpughe Chineke, o kwesịrị ekwesị ịjụghachi ajụjụ ndị ahụ Pọl onyeozi jụrụ, bụ́: “Olee ebe onye maara ihe nọ? olee ebe odeakwụkwọ nọ? olee ebe onye oge a, onye ya na ibe ya na-ajụrịta ajụjụ, nọ? Chineke [ó meghị] ka amamihe ụwa bụrụ ihe nzuzu?”—1 Ndị Kọrint 1:20.

Ọzọkwa, ezi ọgbakọ ndị Kraịst bụ “ide na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) Ndị nlekọta ya na-echekwa ịdị ọcha nke ozizi ha n’ime ọgbakọ, na-egbochi mmerụ ọ bụla metụtara ozizi ịbata. (2 Timoti 2:15-18, 25) Ha na-ewepụ n’ime ọgbakọ ‘ndị amụma ụgha, ndị ozizi ụgha, na ịrọ òtù dị iche iche nke ịla n’iyi.’ (2 Pita 2:1) Mgbe ndị ozi nwụsịrị, Ndị Nna Chọọchị kwere ka “ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ” gbanye mkpọrọgwụ n’ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Timoti 4:1.

A na-ahụ nke ọma ihe si ná ndapụ n’ezi ofufe a pụta n’ime Krisendọm taa. Nkwenkwe na ihe omume ya ekwekọtụghị n’eziokwu nke Bible.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 A pụrụ ịchọta ihe ọmụma sara mbara banyere ozizi Atọ n’Ime Otu na broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 16 Iji nweta ihe ọmụma sara mbara n’ihe Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi, lee peeji nke 98-104 na 375-380 nke Reasoning From the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

NDỊ NNA KAPADỌSIA

“Chọọchị Ọtọdọks . . . nwere nkwanye ùgwù pụrụ iche n’ebe ndị edemede nke narị afọ nke anọ nọ, karịsịakwa, n’ebe ndị ahụ ọ kpọrọ ‘Ndị Ụkọchukwu Ukwu atọ’ nọ, bụ́ Gregory nke Nazianzus, Basil Onye Ukwu, na John Chrysostom,” ka onye edemede bụ́ Kallistos, bụ́ onye mọnk, na-ekwu. Ndị Nna Chọọchị a hà mere ka ozizi ha dabere n’Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee? Akwụkwọ bụ́ The Fathers of the Greek Church na-ekwu banyere Basil Onye Ukwu, sị: “Ihe odide ya na-egosi na ya na Plato, Homer, na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nakwa ndị ọkà n’ikwu okwu, kpachiri anya n’ogologo ndụ ya nile, ha metụtakwara otú o si dee ihe odide ya n’ezie. . . . Basil nọgidere bụrụ ‘onye Gris.’” Otú ahụ ka ọ dị Gregory nke Nazianzus. “N’echiche ya, ọ ga-akasị mma Chọọchị igosi mmeri na ọkịka ọ ka ndị ọzọ ukwuu site n’ịnakwere ọdịnala nke ọdịbendị oge ochie kpam kpam.”

Prọfesọ Panagiotis K. Christou dere banyere ha atọ, sị: “Ọ bụ ezie na ha na-adọ aka ná ntị mgbe ụfọdụ megide ‘ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu’ [Ndị Kọlọsi 2:8]—iji kwekọọ n’iwu Agba Ọhụrụ—n’otu mgbe ahụ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi amụ nkà ihe ọmụma na ihe ọmụmụ ndị yiri ya, ọbụnadị na-atụrụ ndị ọzọ aro ịmụ ha.” N’ụzọ doro anya, ndị ụkọchukwu dị otú ahụ chere na Bible ezughị ezu iji kwado echiche ha. Ọchịchọ ha na-achọ ihe ndị ọzọ ha ga-agbakwasị ụkwụ na ha ọ̀ pụtara na ozizi ha dị iche na nke Bible? Pọl onyeozi dọrọ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e were ozizi dị iche iche nke sikwa n’ebe ọzọ pụta buhie unu.”—Ndị Hibru 13:9.

Ebe E Si Nweta Foto]

© Archivo Iconografico, S.A./CORBIS

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

CYRIL NKE ALEKSANDRIA—NNA CHỌỌCHỊ NKE KPATARA ESEMOKWU

Otu n’ime ndị kasị kpata esemokwu n’etiti Ndị Nna Chọọchị bụ Cyril nke Aleksandria (ihe dị ka 375-444 O.A.). Ọkọ akụkọ ihe mere na chọọchị bụ́ Hans von Campenhausen na-akọwa ya dị ka “onye na-ekwesi olu ike, na-eme ihe ike, dịkwa aghụghọ, bụ́ nke ịdị ukwuu nke ọrụ ya na ịdị elu nke ọkwá ya kpatara,” ma gbakwụnye na “ọ dịghị ewere ihe ọ bụla dị ka ihe ziri ezi ma ọlị, ọ gwụla ma ọ dị uru ọ ga-abara ya n’ịgbasakwu ikike ya . . . Obi ọjọọ na enweghị ụkpụrụ nke usoro ndị o ji eme ihe akụdaghị ya mmụọ ma ọlị.” Oge Cyril bụ bishọp nke Aleksandria, o ji inye aka azụ, ihe odide ụgha, na nkwutọ mee ihe iji chụtuo bishọp nke Constantinople. A na-eche na ọ bụ ya kpatara ogbugbu nke ọkà ihe ọmụma a ma ama aha ya bụ́ Hypatia na 415 O.A. Campenhausen na-ekwu banyere ihe odide nkà mmụta okpukpe Cyril, sị: “Ọ bụ ya malitere omume nke ịza ajụjụ ndị metụtara nkwenkwe site ọ bụghị n’ịdabere kpam kpam na Bible kama n’ịdabere n’akụkụ ihe odide na ìgwè ihe odide ndị kwesịrị ekwesị sitere n’akwụkwọ ndị a ma ama.”

[Foto dị na peeji nke 19]

Jerome

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian