Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Anagide Mmetụta Ndị Na-ezighị Ezi

Otú E Si Anagide Mmetụta Ndị Na-ezighị Ezi

Otú E Si Anagide Mmetụta Ndị Na-ezighị Ezi

● Esaf mere mkpesa, sị: “Ọ bụ nanị n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, n’efu ka m kwọworo ọbụ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ; bụrụkwa onye a na-eti ihe ogologo ụbọchị nile, onye ịba mba m dị kwa ụtụtụ.”—Abụ Ọma 73:13, 14.

● Beruk ji ịsụ ude kwuo, sị: “Ahụhụ na-adịrị m! n’ihi na Jehova atụkwasịwo ihe mwute n’elu ihe mgbu m; adọgbuwo m onwe m n’ọrụ n’ize ume m, ma achọtaghị m izu ike.”—Jeremaịa 45:3.

● Naomi kwara arịrị, sị: “Onye Nke pụrụ ime ihe nile meworo m ihe ilu nke ukwuu. Mụ onwe m, n’aka ojuju ka m jere, ma Jehova emewo ka m gbara aka lọta: n’ihi gịnị ka unu na-akpọ m Naomi, mgbe Jehova gbagidere m àmà, Onye Nke pụrụ ime ihe nile emejọwokwa m?”—Rut 1:20, 21.

BIBLE bu ọtụtụ ihe atụ nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi fee Jehova ofufe bụ́ ndị nwere nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị nile na-enwe mmetụta ndị dị otú ahụ site n’oge ruo n’oge. Ụfọdụ n’ime anyị pụrụ ịbụ ndị na-enwekarị nkụda mmụọ—ikekwe ọbụna ndị na-emetere onwe ha ebere ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ—karịa ndị ọzọ n’ihi ịbụ ndị nweworo ahụmahụ ndị dị mwute.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chịkwaghị mmetụta ndị a, ha pụrụ imebi mmekọrịta gị na ndị ọzọ nakwa nke gị na Jehova Chineke. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nke na-emetekarịrị onwe ya ebere na-ekweta, sị: “Ajụwo m ịza ọtụtụ òkù a kpọrọ m maka nnọkọ ntụrụndụ n’ihi na echere m na erughị m eru iso ndị nọ n’ọgbakọ na-akpakọrịta.” Lee mmetụta na-emebi ihe mmetụta ndị dị otú ahụ pụrụ inwe ná ndụ mmadụ! Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ha kwụsị?

Bịaruo Jehova Nso

N’Abụ Ọma nke 73, Esaf dere banyere mgbagwoju anya ya n’ezoghị ọnụ. Mgbe o ji ọnọdụ ya tụnyere ndụ na-aga nke ọma ndị ajọ omume na-ebi, o kworo ekworo. Ọ chọpụtara na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke dị mpako ma na-eme ihe ike, o yikwara ka ọ dịghị ihe a na-eme ha. Mgbe ahụ, Esaf gosipụtara obi abụọ banyere uru mgbaso ọ na-agbaso ụzọ ndụ ziri ezi baara ya.—Abụ Ọma 73:3-9, 13, 14.

Dị ka Esaf, ọ̀ dịwo mgbe ị chọpụtara ihe yiri ihe ịga nke ọma nke ndị ajọ omume bụ́ ndị na-eme ka a hụ omume ọjọọ ha, na-enwe? Olee otú Esaf si merie mmetụta ndị na-ezighị ezi o nwere? Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “M wee chee echiche ịmata nke a, ndọgbu onwe m n’ọrụ ka ọ bụ n’anya m; ruo mgbe m na-aba n’ebe nsọ nile nke Chineke, ghọta ikpeazụ ha.” (Abụ Ọma 73:16, 17) Esaf weere nzọụkwụ ziri ezi site n’ịgakwuru Jehova n’ekpere. N’iji okwu Pọl onyeozi mesịrị jiri mee ihe, Esaf bịadara “mmadụ nke mkpụrụ obi onwe ya na-achị” site n’ịkpọte “[mmadụ nke] Mmụọ Nsọ na-achị” bụ́ nke dị n’ime ya. N’ịbụ onye e mere ka ọhụhụ ụzọ ime mmụọ ya dị ọhụrụ, ọ ghọtara na Jehova kpọrọ ihe ọjọọ asị nakwa na mgbe oge ruru, a ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ.—1 Ndị Kọrint 2:14, 15.

Lee ka o si dị mkpa ka i kwe ka Bible nyere gị aka ilekwasị anya n’ihe na-eme eme n’ezie ná ndụ! Jehova na-echetara anyị na ya na-ahụ ihe ndị ajọ omume na-eme. Bible na-akụzi, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. . . . Ma ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma.” (Ndị Galetia 6:7-9) Jehova ga-edebe ndị ajọ omume “n’ebe nile na-alọ alọ”; ọ ga-eme ka ha “daa ruo ntikpọ.” (Abụ Ọma 73:18) Ikpe ziri ezi nke Chineke na-enwe mmeri mgbe nile n’ikpeazụ.

Iri nri ime mmụọ na tebụl Jehova n’esepụghị aka na iso ndị Chineke na-enwe mmekọrịta dị mma ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike na imeri nkụda mmụọ ma ọ bụ mmetụta ndị ọzọ na-ezighị ezi. (Ndị Hibru 10:25) Dị ka Esaf, site n’ịnọ Chineke nso, ị pụrụ inweta nkwado ịhụnanya ya. Esaf gara n’ihu ikwu, sị: “Mụ onwe m nọ n’aka Gị mgbe nile: I jidewo aka nri m. Ị ga-eji ndụmọdụ Gị na-edu m, e mesịa Ị ga-ejikwa nsọpụrụ nara m.” (Abụ Ọma 73:23, 24) Otu onye Kraịst nke e metọrọ mgbe ọ bụ nwata chọpụtara amamihe dị n’okwu ndị a. “Iso ọgbakọ na-akpachi anya,” ka ọ na-ekwu, “mere ka m hụ ndụ n’ụzọ dị iche. Ahụrụ m nnọọ nke ọma na ndị Kraịst bụ́ ndị okenye bụ ndị na-ahụ n’anya, na ha abụghị ndị uwe ojii kama ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ.” Ee, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nwere ọmịiko na-ekere òkè dị oké mkpa n’ime ka mmetụta ndị na-emebi ihe kwụsị.—Aịsaịa 32:1, 2; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8.

Nakwere Ndụmọdụ Jehova

Beruk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaịa onye amụma, zere ume n’ihi nsogbu mmetụta uche ọ na-enwe n’ọrụ e nyere ya. Otú ọ dị, Jehova ji obiọma mee ka Beruk lekwasị anya n’ihe ndị na-eme eme n’ezie. “Gị onwe gị, ị̀ na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? achọla ha: n’ihi na, lee, M gaje ime ka ihe ọjọọ bịakwasị anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta): ma M ga-enye gị ndụ gị ka ọ bụrụ ihe nkwata n’ebe nile ị ga-eje.”—Jeremaịa 45:2-5.

Jehova kọwara hoo haa na ọ bụ nchụso ndị Beruk ji ọchịchọ onwe onye nanị na-eme na-akpatara ya obi nkoropụ. Beruk apụghị ịdị na-enwe ọṅụ n’ọrụ Chineke nyere ya ma n’otu mgbe ahụ na-achọrọ onwe ya ihe ukwu. Gị onwe gị kwa pụrụ ịchọpụta na nzọụkwụ dị irè n’ezie nke na-eduga n’imeri nkụda mmụọ bụ izere ihe ndọpụ uche ma nweta udo nke uche bụ́ nke na-abịa site n’inwe afọ ojuju nke Chineke na-enye.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Nwanyị di ya nwụrụ, bụ́ Naomi, ekweghị ka obi erughị ala mee ka ọ ghara ime ihe ọ bụla na Moab mgbe di ya na ụmụ ya ndị ikom abụọ nwụrụ. Otú ọ dị, e nwere ihe àmà gosiri na ruo oge ụfọdụ, o nwere mmetụta dị ilu maka ya onwe ya na ndị nwunye abụọ nke ụmụ ya. Ka Naomi na-ezilaga ha, o kwuru, sị: “Ọ dị m ilu nke ukwuu karịa ka ọ dị unu, n’ihi na aka Jehova apụtawo imegide m.” Ọzọkwa, mgbe o ruru Betlehem, o siri ọnwụ, sị: “Unu akpọla m Naomi [“Ịdị Ụtọ M”], kpọọnụ m Mara [“Ihe Ilu”]: n’ihi na Onye Nke pụrụ ime ihe nile meworo m ihe ilu nke ukwuu.”—Rut 1:13, 20.

Otú ọ dị, Naomi anọpụghị iche n’ụlọ ákwá—ebe Jehova na ndị ya na-anọghị. Na Moab, ọ nụwo na “Jehova eletawo ndị Ya n’inye ha nri.” (Rut 1:6) Ọ ghọtara na ebe kasị mma ọ ga-anọ bụ ịnọnyere ndị Jehova. Naomi na nwunye nwa ya bụ́ Rut lọghachiri Juda mgbe nke ahụ gasịrị, o jikwa akọ duzie Rut n’ihe banyere otú o kwesịrị isi mesoo onye ikwu ha bụ́ Boaz, bụ́ onye mgbapụta ya, ihe.

N’otu aka ahụ taa, ndị na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụrụ na-anagide ihe mgbu mmetụta uche ahụ n’ụzọ na-aga nke ọma site n’ịnọgide na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ ndị Kraịst. Dị ka Naomi, ha na-anọgide na-etinye onwe ha n’ihe ime mmụọ, na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị.

Uru Ndị A Na-erite Site n’Itinye Amamihe Chineke n’Ọrụ

Ihe ndekọ Bible a na-eme ka a ghọta otú mmadụ pụrụ isi nagide ihe mmetụta ndị na-ezighị ezi na-akpata. Esaf chọọrọ enyemaka gaa n’ebe nsọ nke Jehova ma jiri ndidi chere Jehova. Beruk nabatara ndụmọdụ e nyere ya ma zere ndọpụ uche nke ihe onwunwe. Naomi nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’etiti ndị Jehova, na-akwadebe nwa agbọghọ ahụ bụ́ Rut maka ihe ùgwù ndị ọ ga-enweta n’ofufe nke ezi Chineke ahụ.—1 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Galetia 5:26; 6:4.

Ị pụrụ imeri nkụda mmụọ na mmetụta ndị ọzọ na-ezighị ezi site n’ịtụgharị uche ná mmeri ndị Jehova meworo ka ndị ya nwee, n’otu n’otu nakwa n’ìgwè. Iji mezuo nke ahụ, na-atụgharị uche n’omume ịhụnanya kasịnụ Jehova gosipụtara n’inye gị ihe mgbapụta. Nwee ekele maka ezi ịhụnanya nke òtù ụmụnna ndị Kraịst nwere. Lekwasị anya ná ndụ ị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke nke dị nnọọ nso. Meghachikwa omume dị ka Esaf: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, ka m wee kọọ akụkọ banyere ije ozi Gị nile.”—Abụ Ọma 73:28.