Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible nke Dị n’Otu Mpịakọta

Bible nke Dị n’Otu Mpịakọta

Bible nke Dị n’Otu Mpịakọta

IJI mepụta ọtụtụ Bible, ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị mbụ ji codex—akwụkwọ, ọ bụghị akwụkwọ mpịakọta, mee ihe. Otú ọ dị, ndị Kraịst ahụ amaliteghị ozugbo imepụta otu mpịakọta nke bu akwụkwọ nile nke Bible. Flavius Cassiodorus weere nzọụkwụ dị mkpa nke dugara n’imepụta n’ụzọ sara mbara Bible ndị dị n’otu mpịakọta na narị afọ nke isii.

A mụrụ Flavius Magnus Aurelius Cassiodorus n’ihe dị ka 485-490 O.A. n’ezinụlọ bara ọgaranya na Calabria, ná ngwụcha ebe ndịda Itali nke oge a. Ọ dịrị ndụ n’oge e nwere ọgba aghara n’akụkọ ihe mere eme nke Itali bụ́ mgbe ndị Goth nakwa e mesịa, ndị Byzantium, weghaara ala ahụ dịịrị banye na mmiri. Mgbe Cassiodorus dị ihe dị ka afọ 60 ma ọ bụ 70, o mepere ebe obibi ndị mọnk na ọ́bá akwụkwọ na Vivarium bụ́ nke dị nso n’ebe o bi na Squillace, Calabria.

Onye Ji Nlezianya Depụtaghachi Bible

Otu n’ime nchegbu bụ́ isi nke Cassiodorus bụ nkesa Bible. “N’echiche Cassiodorus,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Peter Brown na-ede, “a ga-eji ihe odide nile nke Latin mee ihe n’ime ka Akwụkwọ Nsọ ruo ndị mmadụ aka. A gaje iji ihe enyemaka nile e jibu na-amụ ma na-edepụtaghachi ihe odide oge ochie mee ihe iji ghọta Akwụkwọ Nsọ na iji jiri amamihe na-edepụtaghachi ha. Dị ka usoro mbara igwe e wepụtara ọhụrụ, a tụrụ anya ka ọdịbendị nke Latin n’ozuzu ya na-agba nnukwu anyanwụ nke Okwu Chineke gburugburu.”

Cassiodorus kpọkọtara ndị nsụgharị na ndị ọkà mmụta asụsụ n’ebe obibi ndị mọnk ahụ dị na Vivarium inyocha Bible n’ozuzu ya, o duzikwara usoro ndepụta ahụ e ji nlezianya mee. O nyefere nanị mmadụ ole na ole gụrụ akwụkwọ ọrụ ahụ. Ha gaje izere iji ọkụ ọkụ edezigharị ihe ndị e weere dị ka ihe ndị odeakwụkwọ dehiere. Ọ bụrụ na e nwere nsogbu n’ihe banyere ụtọ asụsụ, a na-ewere ihe odide oge ochie nke Bible dị ka ndị nwere ikike karịa otú ọha ndị Latin na-esi eji ya eme ihe. Cassiodorus tụziri, sị: “Njimara nke ụtọ asụsụ . . . bụ ihe a na-aghaghị ichekwa, ebe ọ bụ na ihe odide a maara dị ka nke sitere n’ike mmụọ nsọ apụghị ịbụ nke a ga-agwagbu agwagbu. . . . A ghaghị ichekwa ụzọ Bible si ekwu ihe, okwu ihe atụ ya, na akpaala okwu ya, a sịgodị na ha dị nnọọ iche n’ụkpụrụ Latin, dịkwa ka a na-aghaghị ichekwa ụdị dị iche iche nke aha aka ‘Hibru’.”—The Cambridge History of the Bible.

Codex Grandior

E nyere ndị odeakwụkwọ ahụ nọ n’ebe obibi ndị mọnk dị na Vivarium ọrụ idepụta ma ọ dịkarịa ala mbipụta atọ dịgasị iche nke Bible n’asụsụ Latin. Otu n’ime ndị a, ná mpịakọta itoolu, bu ma eleghị anya, ihe odide Latin Ochie, bụ́ nsụgharị nke pụtara ná ngwụsị narị afọ nke abụọ. Mbipụta nke abụọ nwere Vulgate Latin, nke Jerome dechara n’ihe dị ka ná mmalite narị afọ nke ise. E si n’ihe odide Bible atọ nweta nke atọ, bụ́ Codex Grandior, nke pụtara “codex nke ka ibu.” Mbipụta abụọ ndị ikpeazụ ahụ chịkọtara akwụkwọ Bible nile ọnụ n’otu mpịakọta.

O yiri ka ọ̀ bụ Cassiodorus bụ onye mbụ wepụtara Bible Latin ndị dị n’otu mpịakọta, kpọọ ha pandectae. * Obi abụọ adịghị ya na ọ hụrụ uru ijikọta akwụkwọ nile nke Bible n’otu mpịakọta bara, si otú ahụ na-ewepụ usoro na-eri oge nke iji mpịakọta dị iche iche na-eme ihe.

Site n’Ebe Ndịda Itali Gaa n’Àgwàetiti Britain

N’oge na-adịghị anya mgbe Cassiodorus nwụsịrị (ma eleghị anya n’ihe dị ka 583 O.A.), Codex Grandior malitere njem ya. N’oge ahụ, e kwetara na e buruwo otu akụkụ nke akwụkwọ ndị dị n’ọ́bá akwụkwọ Vivarium gaa n’ọ́bá akwụkwọ Lateran dị na Rom. Na 678 O.A., onyeisi ndị mọnk nke Anglo-Saxon bụ́ Ceolfrith wetara codex ahụ n’Àgwàetiti Britain mgbe o si Rom na-alọta. O si otú a rute n’ebe obibi abụọ nke ndị mọnk nke Wearmouth na nke Jarrow, bụ́ ndị Ceolfrith duziri, n’ihe bụzi Northumbria, England.

Bible Cassiodorus nke dị n’otu mpịakọta aghaghị ịkpaliwo mmasị Ceolfrith na ndị mọnk ya, bụ́ ndị o yiri ka mfe ọ dị n’iji ya eme ihe ọ̀ dọọrọ mmasị ha. Ya mere, n’ime nanị iri afọ ole na ole, ha mepụtara Bible n’ozuzu ya n’ụzọ atọ ọzọ dịcha n’otu mpịakọta. Nanị nke ka fọdụrụ n’ime ha bụ ihe odide buru ibu a na-akpọ Codex Amiatinus. O nwere peeji 2,060 e ji akpụkpọ nwa ehi mee, nke nke ọ bụla n’ime ha dị ihe dị ka sentimita 51 n’ogologo nakwa sentimita 33 n’obosara. A gụnye mkpo ya, ọ dị sentimita 25 n’ibu ma dịrị ihe karịrị kilogram 34 n’arọ. Ọ bụ Bible Latin zuru ezu kasị ochie nke dị n’otu mpịakọta ka dị adị. Ọkà mmụta Bible a ma ama na narị afọ nke 19 bụ́ Fenton J. A. Hort mere ka a mata codex n’afọ 1887. Hort kwuru, sị: “[Ihe odide] a dị ịrịba ama na-eme ka ọbụna onye nọ n’oge a nke hụworo Bible a nwee mmetụta nke fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ nke na-akpali ụjọ.”

Ilaghachi Itali

Codex Grandior mbụ ahụ Cassiodorus duziri mmepụta ya efuwo ugbu a. Ma nke Anglo-Saxon ahụ e si na ya mepụta, bụ́ Codex Amiatinus, bidoro njem o ji laghachi n’Itali ozugbo e dechara ya. Oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ, Ceolfrith kpebiri ịlaghachi Rom. O weere otu n’ime ihe odide Bible Latin ya atọ dị ka onyinye ọ ga-enye Popu Gregory nke Abụọ. Na 716 O.A., Ceolfrith nwụrụ n’ụzọ na Langres, France. Ma ndị ya na ha so mee njem ahụ ji Bible ya gaa n’ihu na njem ahụ. E mesịrị tinye codex ahụ n’ọ́bá akwụkwọ dị n’ebe obibi ndị mọnk dị n’Ugwu Amiata, n’ebe etiti Itali, bụ́ ebe o si nweta aha bụ́ Codex Amiatinus. Na 1782, e wegara ihe odide ahụ n’Ọ́bá Akwụkwọ Medicean-Laurentian dị na Florence, Itali, bụ́ ebe ọ ka bụ otu n’ime ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa ọ́bá akwụkwọ ahụ nwere.

Olee otú Codex Grandior siworo metụta anyị? Site n’oge Cassiodorus, ọtụtụ ndị odeakwụkwọ na ndị na-ebi akwụkwọ akwadowo mbipụta nke Bible ndị dị n’otu mpịakọta. Ruo taa, inwe Bible n’ụdị a emewo ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe karị iji ya eme ihe, sikwa otú ahụ na-erite uru n’ike ọ na-akpa ná ndụ ha.—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 O yiri ka à nọwo na-ekesa Bible n’ozuzu ya n’asụsụ Grik kemgbe narị afọ nke anọ ma ọ bụ nke ise.

[Map dị na peeji 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Njem nke Codex Grandior

Ebe obibi ndị mọnk nke Vivarium

Rom

Jarrow

Wearmouth

Njem nke Codex Amiatinus

Jarrow

Wearmouth

Ugwu Amiata

Florence

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

N’elu elu: Codex Amiatinus N’aka ekpe: Foto Ezra nke e sere na Codex Amiatinus

[Ebe E Si Nweta Foto]

Biblioteca Medicea Laurenziana, Firenze