Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inyere Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Aka Imeri Ọnwụnwa Ha

Inyere Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Aka Imeri Ọnwụnwa Ha

Inyere Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ Aka Imeri Ọnwụnwa Ha

OTU n’ime akụkọ ndị a kasị mara amara na-ekwu banyere ndị inyom di ha nwụrụ bụ ihe ndekọ Bible banyere Rut na nne di ya, bụ́ Naomi. Ndị inyom abụọ ahụ bụcha ndị inyom di ha nwụrụ. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị di Naomi nwụnahụrụ ya, ụmụ ya abụọ, nke otu n’ime ha bụ di Rut, nwụnahụkwara ya. Ebe ọ bụ na ha bi n’ógbè a na-arụ ọrụ ugbo nke na-adabere n’ebe ndị ikom nọ nke ukwuu, ọnọdụ ha dị oké mwute n’ezie.—Rut 1:1-5, 20, 21.

Otú ọ dị, Naomi nwere enyi na onye nkasi obi pụtara ìhè bụ́ nwunye nwa ya bụ́ Rut, bụ́ onye jụrụ ịhapụ ya. Ka oge na-aga, Rut bịara “dịrị [Naomi] mma karịa ụmụ ndị ikom asaa”—ọ bụghị nanị n’ihi ịhụnanya miri emi o nwere n’ebe Naomi nọ kamakwa n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ. (Rut 4:15) Mgbe Naomi tụrụ aro ka Rut laghachikwuru ezinụlọ ya na ndị enyi ya bụ́ ndị Moab, Rut ji otu n’ime okwu iguzosi ike n’ihe kasị emetụ n’ahụ bụ́ nke e dekọtụworo edekọ zaghachi, sị: “Ebe ị na-eje ka m ga-eje; ọ bụkwa ebe ị na-anọ ọnọdụ abalị ka m ga-anọ ọnọdụ abalị: ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m: ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m: Jehova mee m otú a, meekwa m ihe ọzọ otú a, mgbe ihe na-abụghị ọnwụ onwe ya ga-ekewa mụ na gị.”—Rut 1:16, 17.

Jehova Chineke rịbara omume Rut ama. Ọ gọziri obere ezinụlọ Naomi na Rut, e mesịakwa, Rut lụrụ onye Israel bụ́ Boaz. Naomi lekọtara nwa ha nwoke, bụ́ onye ghọrọ nna nna Jisọs Kraịst, dị ka a ga-asị na ọ bụ nwa ya. Akụkọ a mere eme bụ ihe atụ nke otú Jehova si eji ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị na-abịaru ya nso ma na-atụkwasị ya obi, akpọrọ ihe. Ọzọkwa, Bible na-agwa anyị na ọ na-eji ndị na-eji ịhụnanya enyere ndị inyom di ha nwụrụ aka n’ọnwụnwa ha akpọrọ ihe. Ya mere, olee otú anyị ga-esi na-akwado ndị inyom di ha nwụrụ nọ n’etiti anyị taa?—Rut 4:13, 16-22; Abụ Ọma 68:5.

Kapịa Okwu Ọnụ Kama Achịkwala Ndụ Ha

Mgbe ị na-enyere nwanyị di ya nwụrụ aka, ọ kasị mma ime ka ihe doo anya na ịkapị okwu ọnụ kama achịkwala ndụ ya. Zere okwu ndị a na-akapịghị ọnụ dị ka, “O nwee ihe dị gị mkpa mee ka m mara.” Nke ahụ pụrụ ịdị ka ịgwa onye oyi na agụụ ji, sị, “Nyaa ọkụ, rijuokwa afọ” ma mgbe ahụ n’emeghị ihe ọ bụla iji nye aka. (Jemes 2:16) Ọtụtụ ndị agaghị arịọ maka enyemaka mgbe e nwere ihe dị ha mkpa; kama nke ahụ, ha adịghị ekwupụta mkpa ha. Iji nyere ndị dị otú ahụ aka, a chọrọ nghọta, ịmata ihe bụ́ mkpa ha. N’aka nke ọzọ, ibutekarị ụzọ—na-achịkwazi ndụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ—pụrụ iduga ná mwute ma ọ bụ n’esemokwu. N’ihi ya, Bible na-emesi ike mkpa ọ dị imeru ihe n’ókè n’otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe. Ọ bụ ezie na ọ na-agba anyị ume inwe mmasị achọghị ọdịmma onwe onye nanị n’ebe ndị ọzọ nọ, ọ na-echetara anyị ịghara ịbụ ndị na-enyonye anya n’ihe ndị na-agbasaghị anyị.—Ndị Filipaị 2:4; 1 Pita 4:15.

Rut gosipụtara omume guzoziri eguzozi otú ahụ n’ebe Naomi nọ. Ọ bụ ezie na Rut ji iguzosi ike n’ihe nọnyere nne di ya, ọ chịkwaghị ndụ ya. O butere ụzọ n’ime ihe ụfọdụ n’ụzọ ezi uche dị na ha, dị ka inweta ihe ya na Naomi ga-eri, ma ọ gbasokwara ntụziaka Naomi.—Rut 2:2, 22, 23; 3:1-6.

N’ezie, ihe a chọrọ pụrụ ịdịgasị nnọọ iche site n’otu onye gaa n’ọzọ. Sandra, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, na-ekwu, sị: “Enwere m ihe dị m mkpa n’oge m nwere nsogbu—ezi ndị enyi na-ahụ n’anya bụ́ ndị gbara m gburugburu.” N’aka nke ọzọ, ọ dị Elaine, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, mkpa inwe oge ọ ga-anọrọ onwe ya. Ya mere, inye aka pụtara ịdị na-aghọta ihe na ịmata mgbe mmadụ chọrọ ịnọ nanị ya wee hapụ ya na ịnọ ya iji nye aka mgbe ọ dị mkpa.

Nkwado Ndị Na-esite n’Ezinụlọ

Ezinụlọ na-ahụ n’anya, ma ọ bụrụ na e nwere, pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mesighachi nwanyị di ya nwụrụ obi ike na ọ ga-enwe ike ịnagide ọnọdụ ya. N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ pụrụ inwe ike inye aka karịa ndị ọzọ, mmadụ nile pụrụ ịtụnye ụtụ. “Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.”—1 Timoti 5:4.

N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụghị ịdị mkpa inye nkwado ego ma ọ bụ ‘inyeghachi ihe.’ Ụfọdụ ndị inyom di ha nwụrụ nwere ego ga-ezuru ha ilekọta mkpa ha, ndị ọzọ rukwara eru inweta enyemaka ego site n’aka gọọmenti, bụ́ nke a na-enye n’ala ụfọdụ. Ma n’ebe ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa, ndị òtù ezinụlọ kwesịrị inye aka. Ọ bụrụ na nwanyị di ya nwụrụ enweghị ezi ndị ikwu ga-akwado ya ma ọ bụ ndị ikwu dị otú ahụ enweghị ike inye aka, Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ịgbatara ya ọsọ enyemaka: “Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha.”—Jemes 1:27.

Ndị na-etinye ụkpụrụ Bible ndị a n’ọrụ “na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ” n’ezie. (1 Timoti 5:3) Ịsọpụrụ mmadụ pụtara, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, igosipụta nkwanye ùgwù n’ebe onye ahụ nọ. Ndị a na-asọpụrụ na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e ji kpọrọ ihe, ndị a kwanyeere ùgwù. Ha adịghị eche na ndị ọzọ na-enye aka nanị n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị ha. N’agbanyeghị na Rut n’onwe ya bụ nwanyị di ya nwụrụ ruo oge ụfọdụ, o nyere Naomi nsọpụrụ n’ezie site n’iji ọchịchọ obi na ịhụnanya na-ejide n’aka na e gboro mkpa anụ ahụ na nke mmetụta uche Naomi. N’ezie, omume Rut wetaara ya aha ọma ngwa ngwa, nke na onye na-aga ịbụ di ya n’ọdịnihu gwara ya, sị: “Onye ọ bụla nọ n’obodo nke ndị m maara na ị bụ ezigbo nwanyị.” (Rut 3:11, ihe odide ala ala peeji nke NW) N’otu oge ahụ, obi abụọ adịghị ya na ịhụnanya Naomi nwere n’ebe Chineke nọ, àgwà ya nke achọghị oké ihe n’aka ndị ọzọ, na ekele miri emi o nwere maka mgbalị Rut na-emere ya, mere ka Rut na-enwe obi ụtọ inyere ya aka. Lee ezi onye nlereanya Naomi bụ taa nye ndị inyom di ha nwụrụ!

Bịaruo Chineke Nso

N’ezie, ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi apụghị imechi ohere nke ọnwụ di mmadụ kpatara. N’ihi nke a, ọ dị mkpa ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ bịaruo “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile,” nso karịsịa. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Tụlee ihe nlereanya Ana, nwanyị di ya nwụrụ nke ji okpukpe kpọrọ ihe bụ́ onye dị afọ 84 n’oge a mụrụ Jisọs.

Mgbe di Ana nwụrụ mgbe ha ka biri nanị afọ asaa, o chigharịkwuuru Jehova maka nkasi obi. “[Ọ pụghị] n’ụlọ Chineke, ma o weere obubu ọnụ na arịrịọ na-ekpere Chineke abalị na ehihie.” (Luk 2:36, 37) Jehova ò mere ihe banyere nsọpụrụ Chineke nke Ana? Ee! O gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe ọ nọ n’ụzọ pụrụ nnọọ iche site n’ikwe ka ọ hụ nwa ọhụrụ ahụ nke ga-etolite ịbụ Onye Nzọpụta nke ụwa. Lee ka nke a si kpalie Ana ma kasie ya obi! N’ụzọ doro anya, ọ hụrụ ịbụ eziokwu nke Abụ Ọma 37:4: “Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”

Chineke Na-eji Ndị Kraịst Ibe Anyị Arụ Ọrụ

Elaine na-ekwu, sị: “Ruo ogologo oge mgbe David nwụsịrị, enwere m ahụ mgbu, dị ka a ga-asị na e ji mma arụgharị agịrịga m. Echere m na ọ bụ nri agbarighị nke ọma n’afọ. Otu ụbọchị ọ bịara dị nnọọ njọ nke na m chere na aghaghị m ịhụ dọkịta. Otu nwanna nwanyị bụ́kwa enyi m nke na-aghọta ihe nyere echiche na iru újú m pụrụ iso na-akpata ya, ọ gbakwara m ume ịrịọ Jehova maka enyemaka na nkasi obi. Anaara m ndụmọdụ ya ozugbo ma kpee ekpere si n’obi nke m na-ekwupụtaghị ekwupụta, na-arịọ Jehova ka ọ kwagide m n’iru újú m. O mekwara otú ahụ!” Ahụ ike Elaine malitere ịka mma, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọbụna ahụ mgbu ya kwụsịrị.

Karịsịa, ndị okenye ọgbakọ pụrụ iji obiọma ghọọ ndị enyi nke ndị inyom di ha nwụrụ na-eru újú. Site n’iji nkà na nghọta na-enye ha nkwado ime mmụọ na nkasi obi mgbe nile, ndị okenye pụrụ inyere ha aka ịnọ Jehova nso n’agbanyeghị ọnwụnwa ha. N’ebe ọ dị mkpa, ndị okenye pụkwara inye aka n’ime ndokwa maka nkwado n’ụzọ ihe onwunwe. Ndị okenye dị otú ahụ nwere ọmịiko ma na-egosi nghọta na-aghọ n’ezie “ebe izonahụ ifufe.”—Aịsaịa 32:2; Ọrụ 6:1-3.

Nkasi Obi Na-adịgide Adịgide Site n’Aka Eze Ọhụrụ nke Ụwa

Onye ahụ Ana nke merela agadi nwere ọṅụ ịhụ ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga aghọọla ugbu a Eze Mesaịa nke Alaeze eluigwe nke Chineke. Ọchịchị a ga-ewepụ ihe nile na-akpata iru újú, gụnyere ọnwụ. Mkpughe 21:3, 4 na-ekwu banyere nke a, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo.” Ị̀ rịbara ama na akụkụ ihe odide a na-ezo aka n’ebe “mmadụ” nọ? Ee, a ga-atọhapụ ụmụ mmadụ n’ọnwụ nakwa n’iru újú na ịkwa ákwá nile ọ na-eweta.

Ma e nwere ọbụna ozi ọma ndị ọzọ! Bible na-ekwekwa nkwa mbilite n’ọnwụ maka ndị nwụrụ anwụ. “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Dị nnọọ ka Lazarọs, bụ́ onye Jisọs kpọlitere n’ọnwụ, ha ga-apụta dị ka ụmụ mmadụ, ọ bụghị dị ka ndị mmụọ e kere eke. (Jọn 11:43, 44) A ga-eme ka ndị “mere ezi ihe” mgbe nke ahụ gasịrị bụrụ mmadụ ndị zuru okè, ha ga-enwetakwa nlekọta dị ka nke nna nke Jehova ga-enye ka ọ ‘na-asaghe aka ya, werekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16.

Ndị onye ha hụrụ n’anya nwụnahụworo, bụ́kwa ndị nwere okwukwe n’olileanya a e ji n’aka, na-ahụ ya dị ka ihe na-enye nkasi obi dị ukwuu. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Ya mere, ọ bụrụ na ị bụ nwanyị di ya nwụrụ, jide n’aka na ị ‘na-ekpe ekpere n’ewepụghị aka’ maka nkasi obi na enyemaka dị gị mkpa kwa ụbọchị iji na-ebu ibu arọ gị dị iche iche. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; 1 Pita 5:7) Wepụtakwa oge kwa ụbọchị iji gụọ Okwu Chineke ka echiche Chineke wee kasie gị obi. Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, ị ga-ahụ n’onwe gị otú Jehova pụrụ isi nyere gị aka n’ezie ịchọta udo n’agbanyeghị ọnwụnwa na ihe ịma aka nile ị na-eche ihu dị ka nwanyị di ya nwụrụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Inye aka pụtara ịmata mgbe mmadụ chọrọ ịnọ nanị ya wee hapụ ya na ịnọ ya mgbe ọ dị mkpa

[Foto dị na peeji nke 7]

Chineke gọziri agadi nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ Ana