Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọdige Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Jehova

Nọdige Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Jehova

Nọdige Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Jehova

“Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—NDỊ FILIPAỊ 4:4.

1, 2. Olee otú otu nwanna nwoke na ezinụlọ ya si nwee ike ịnọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị na ihe nile ha nwere funahụrụ ha?

JAMES, bụ́ onye Kraịst dị afọ 70 nke bi Sierra Leone, arụsiwo ọrụ ike ná ndụ ya nile. Cheedị banyere ụdị ọṅụ o nwere n’ikpeazụ mgbe o chekwatara ego zuru iji zụta otu ụlọ e wuru n’ụzọ dị mfe bụ́ nke nwere ọnụ ụlọ anọ! Otú ọ dị, obere oge mgbe James na ezinụlọ ya kwabasịrị n’ụlọ ahụ, agha obodo tiwapụrụ ná mba ahụ, ọkụ gbapịakwara ụlọ ha. Ụlọ ha funahụrụ ha, ma ha akwụsịghị inwe ọṅụ. N’ihi gịnị?

2 James na ezinụlọ ya tụkwasịrị uche, ọ bụghị n’ihe funahụrụ ha, kama n’ihe ka fọdụrụ. James na-akọwa, sị: “Ọbụna n’oge ahụ e nwere oké nsogbu, anyị nọ na-enwe nzukọ, na-agụ Bible, na-ekpekọ ekpere ọnụ, na-esokwa ndị ọzọ ekerịta obere ihe anyị nwere. Anyị nọgidere na-enwe ọṅụ n’ihi na anyị lekwasịrị anya ná mmekọrịta dị ebube anyị na Jehova nwere.” Site n’ịgụkọ ngọzi ha, ndị nke kasịnụ n’ime ha bụ iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya, ndị Kraịst a na-ekwesị ntụkwasị obi nọgidere ‘na-aṅụrị ọṅụ.’ (2 Ndị Kọrint 13:11) N’ezie, ọ dịghị mfe idi ọnọdụ ọjọọ ahụ dakwasịrị ha. Ma ha akwụsịghị ịṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.

3. Olee otú ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ si nọgide na-enwe ọṅụ?

3 Ndị Kraịst oge mbụ nwetara ọnwụnwa ndị yiri nke James na ezinụlọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl onyeozi degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst okwu ndị a, sị: “Unu weerekwa ọṅụ nara mpụnara ahụ nke ọma, bụ́ nke a pụnaara unu ihe nile unu nwere.” Mgbe ahụ, Pọl kọwara isi ọṅụ ha, sị: “Ebe unu maara na unu nweere onwe unu dị ka ihe unu nwere, bụ́ ihe ka mma nke na-adigidekwa.” (Ndị Hibru 10:34, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ee, ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ nwere olileanya dị ike. Ha ji obi ike na-atụ anya inweta ihe a na-apụghị ịpụnara ha—“okpueze ahụ, bụ́ ndụ” nke na-adịghị emebi emebi bụ́ nke ha ga-enweta n’Alaeze eluigwe nke Chineke. (Mkpughe 2:10) Taa, olileanya ndị Kraịst anyị—ma ọ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke elu ala—pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ ọbụna mgbe anyị chere nsogbu dị iche iche ihu.

“N’akụkụ Olileanya Unu, Na-aṅụrịnụ Ọṅụ”

4, 5. (a) Gịnị mere ndụmọdụ Pọl bụ́ ‘ịṅụrị ọṅụ n’akụkụ olileanya’ ji bụrụ ihe bịara n’ezi oge nye ndị Rom? (b) Gịnị pụrụ ime ka onye Kraịst chezọọ olileanya ya?

4 Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Rom ume ‘ịṅụrị ọṅụ n’olileanya’ nke ndụ ebighị ebi ahụ. (Ndị Rom 12:12) Nke ahụ bụụrụ ndị Rom ndụmọdụ bịara n’ezi oge. Ihe na-erughị afọ iri Pọl degasịịrị ha akwụkwọ, ha nwetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, site n’iwu Eze Ukwu Nero nyere, a tagidekwara ụfọdụ n’ime ha ahụhụ ruo ọnwụ. Obi abụọ adịghị ya na okwukwe ha nwere na Chineke ga-enye ha okpueze ahụ bụ́ ndụ nke o kwere ná nkwa kwagidere ha ná nhụjuanya ha. Gịnị banyere anyị taa?

5 Dị ka ndị Kraịst, anyị onwe anyị kwa na-atụ anya na a ga-akpagbu anyị. (2 Timoti 3:12) Ọzọkwa, anyị na-aghọta na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara” anyị nile. (Eklisiastis 9:11) Onye anyị hụrụ n’anya pụrụ ịnwụ n’ihe mberede. Ọrịa ọjọọ pụrụ igbu nne ma ọ bụ nna anyị ma ọ bụkwanụ ezi enyi anyị. Ọ gwụla ma anyị na-atụkwasị uche nke ọma n’olileanya Alaeze anyị, anyị pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ mgbe ọnwụnwa ndị dị otú ahụ bịara. N’ihi ya, anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ “na-aṅụrị ọṅụ n’akụkụ olileanya ahụ”? Ugboro ole ka m na-ewepụta oge iji tụgharịa uche na ya? Paradaịs na-abịanụ, ọ̀ dị adị n’ezie nye m? M̀ na-ahụ onwe m ebe ahụ? Ọ̀ na-agụsi m agụụ ike ka ọgwụgwụ nke usoro ihe a ruo dị ka o si gụọ m n’oge mbụ m mụtara eziokwu ahụ?’ Ajụjụ ikpeazụ a kwesịrị ka e chebara ya echiche nke ọma. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị nwere ezi ahụ ike, na-ebi ndụ dị ntụsara ahụ, ma biri n’akụkụ ụwa ebe agha, ụnwụ nri, ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha na-adịchaghị, anyị pụrụ—ma ọ dịghị ihe ọzọ, ugbu a—ichezọ oké mkpa ọ dị ka ụwa ọhụrụ Chineke bịa.

6. (a) Mgbe a kpagburu Pọl na Saịlas, na gịnị ka ha tụkwasịrị uche? (b) Olee otú ihe nlereanya Pọl na Saịlas pụrụ isi bụrụ ihe agbamume nye anyị taa?

6 Ọzọkwa, Pọl nyere ndị Rom ndụmọdụ ‘ịtachi obi n’akụkụ mkpagbu ha.’ (Ndị Rom 12:12) Mkpagbu abụghị ihe ọhụrụ nye Pọl. N’otu oge, ọ hụrụ otu nwoke n’ọhụụ bụ́ onye kpọrọ ya òkù ‘ịgabita na Masedonia’ iji nyere ndị nọ ebe ahụ aka ịmụta banyere Jehova. (Ọrụ 16:9) Mgbe ahụ, Pọl, tinyere Luk, Saịlas, na Timoti, ji ụgbọ mmiri gaa Europe. Gịnị na-echere ndị ozi ala ọzọ ahụ na-anụ ọkụ n’obi? Ọ bụ mkpagbu! Mgbe Pọl na Saịlas mesịrị nkwusa n’obodo ukwu Masedonia bụ́ Filipaị, a pịara ha ụtarị ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. N’ụzọ doro anya, ụfọdụ ụmụ amaala Filipaị abụghị nanị na ha enweghị mmasị n’ebe ozi Alaeze ahụ dị—ha megidere ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Otú a ihe si dagharịa ò mere ka ndị ozi ala ọzọ ahụ na-anụ ọkụ n’obi kwụsị inwe ọṅụ? Ee e. Mgbe e tisịrị ha ihe ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ, ihe “dị ka n’etiti abalị Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkukwa Chineke abụ.” (Ọrụ 16:25, 26, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’ezie, ihe mgbu Pọl na Saịlas nwetara site n’ihe e tiri ha enyeghị ha ọṅụ, ma nke ahụ abụghị ihe ndị ozi ala ọzọ abụọ ahụ tụkwasịrị uche na ya. Ha tụkwasịrị uche n’ebe Jehova nọ nakwa n’ụzọ ndị o si na-agọzi ha. Site n’iji ọṅụ ‘na-atachi obi n’akụkụ mkpagbu,’ Pọl na Saịlas bụụrụ ụmụnna ha nọ na Filipaị nakwa n’ebe ndị ọzọ ezi ndị nlereanya.

7. N’ihi gịnị ka ekpere anyị kwesịrị iji na-agụnye ekele?

7 Pọl dere, sị: “N’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike.” (Ndị Rom 12:12) Ị̀ na-ekpe ekpere mgbe ị na-enwe nchegbu? Gịnị ka ị na-ekpenye n’ekpere? O yiri ka ị na-akpọtụ otu nsogbu aha ma rịọ Jehova maka enyemaka. Ma ị pụkwara ikpenye okwu ekele maka ngọzi ndị ị na-enweta. Mgbe nsogbu bilitere, ịtụgharị uche n’ịdị mma Jehova ná mmeso ọ na-emeso anyị na-enyere anyị aka ‘ịṅụrị ọṅụ n’akụkụ olileanya anyị.’ Devid, bụ́ onye ndụ ya jupụtara ná nsogbu, dere, sị: “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ: a pụghị idoro Gị ha n’usoro; a sị na aga m egosi kwuokwa okwu banyere ha, ha karịrị ịgụ ọnụ.” (Abụ Ọma 40:5) Dị ka Devid, ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche mgbe nile ná ngọzi ndị anyị na-enweta n’aka Jehova, anyị ga na-enwe ọṅụ n’ezie.

Nọgide Na-enwe Mmụọ Ziri Ezi

8. Gịnị na-enyere onye Kraịst aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ mgbe a na-akpagbu ya?

8 Jisọs na-agba ụmụazụ ya ume ịnọgide na-enwe mmụọ ziri ezi mgbe ha zutere ọnwụnwa dị iche iche. Ọ na-ekwu, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m.” (Matiu 5:11) Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Ikike anyị nwere iguzogide mmegide bụ ihe na-agba akaebe na mmụọ Jehova dịkwasịrị anyị. Pita onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya n’oge ya, sị: “Ọ bụrụ na a na-ata unu ụta n’aha Kraịst, ngọzi na-adịrị unu; n’ihi na Mmụọ nke ebube na Mmụọ nke Chineke na-anọgide n’ahụ unu.” (1 Pita 4:13, 14) Site ná mmụọ ya, Jehova ga-enyekwara anyị aka ịtachi obi ma si otú a nyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ.

9. Gịnị nyeere ụfọdụ ụmụnna aka ịchọta ihe ndị mere ha ga-eji na-enwe ọṅụ mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha?

9 Ọbụna mgbe anyị nọ n’ọnọdụ ndị kasị njọ, anyị pụrụ ịhụ ihe ndị mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Otu onye Kraịst nke aha ya bụ Adolf chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. O bi ná mba a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu ruo ọtụtụ afọ. E jidere Adolf na ọtụtụ ndị enyi ya, maakwa ha ikpe ịnọ mkpọrọ ruo ogologo oge n’ihi na ha jụrụ ịhapụ nkwenkwe ha ndị dabeere na Bible. Ndụ ụlọ mkpọrọ siri ike, ma dị ka Pọl na Saịlas, Adolf na ndị ibe ya hụrụ ihe ndị mere ha ga-eji na-enye Chineke ekele. Ha kwuru na ahụmahụ ha nwere n’ụlọ mkpọrọ nyeere ha aka ime ka okwukwe ha sikwuo ike na ịzụlite àgwà ndị bara uru nke ndị Kraịst, dị ka mmesapụ aka, mmetụta ọmịiko, na ịhụnanya ụmụnna. Dị ka ihe atụ, mgbe onye mkpọrọ nwetara ngwugwu e si n’ụlọ ha wetara ya, ọ na-esoro ndị kwere ekwe ibe ya kerịta ihe ndị dị n’ime ya, ndị ahụ na-ele ihe a e wetara anya dị ka ihe si n’aka Jehova, bụ́ Onye kasị enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” Omume obiọma dị otú ahụ wetaara ma onye nyere ya ma ndị e nyere ya ọṅụ. Ya mere, ahụmahụ ahụ e bu nnọọ n’uche iji mebie okwukwe ha mere n’ezie ka ha sikwuo ike n’ụzọ ime mmụọ!—Jemes 1:17; Ọrụ 20:35.

10, 11. Olee otú otu nwanna nwanyị si mee ihe banyere ajụjụ a gbara ya n’esepụghị aka na mkpọrọ e mesịrị tụọ ya ruo ogologo oge?

10 E jidere Ella, bụ́ onye bikwa ná mba a machibidoro ọrụ Alaeze ahụ iwu, maka isoro ndị ọzọ na-ekerịta olileanya ndị Kraịst ya. Ruo ọnwa asatọ, a gbara ya ajụjụ ọnụ n’esepụghị aka. Mgbe e mesịrị kpee ya ikpe, a mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ iri n’ụlọ mkpọrọ a na-enweghị ndị ọzọ na-efe Jehova na ya. Ella dị nanị afọ 24 n’oge ahụ.

11 N’ezie, Ella atụghị anya iji ihe ka ukwuu n’oge agbọghọbịa ya nọọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma ebe ọ bụ na ọ pụghị ịgbanwe ọnọdụ ya, o kpebiri ịgbanwe ụzọ o si ele ihe anya. N’ihi ya, ọ malitere ile ụlọ mkpọrọ ahụ anya dị ka ókèala ọ ga na-agba àmà na ya. “Enwere m ọtụtụ ndị m na-emere nkwusa,” ka ọ na-ekwu, “nke na afọ ndị ahụ gwụrụ nnọọ ngwa ngwa.” Mgbe ihe karịrị afọ ise gasịrị, a gbara Ella ajụjụ ọnụ ọzọ. Mgbe ndị na-agba ya ajụjụ chọpụtara na ụlọ mkpọrọ emebibeghị okwukwe ya, ha gwara ya, sị: “Anyị apụghị ịtọhapụ gị; ị gbanwebeghị.” “Ma agbanwewo m!” ka Ella ji mkpebi siri ike zaghachi. “Enwere m àgwà ka mma ugbu a karịa ka m nwere mgbe mbụ m gara mkpọrọ, okwukwe m sikwara nnọọ ike ugbu a karịa n’oge mbụ!” Ọ gbakwụnyekwara, sị: “Ọ bụrụ na unu achọghị ịtọhapụ m, aga m anọgide ruo mgbe Jehova ga-agbapụta m.” Mkpọchi a kpọchiri Ella ruo afọ ise na ọkara emebeghị ka ọ kwụsị inwe ọṅụ! Ọ mụtara inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla ọ nọ. Ị̀ pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya ya?—Ndị Hibru 13:5.

12. Gịnị pụrụ iwetara onye Kraịst udo nke uche n’ọnọdụ ndị tara akpụ?

12 Ekwubila na Ella nwere onyinye pụrụ iche nke mere ka o nwee ike iche ihe ịma aka ndị dị otú ahụ ihu. Mgbe Ella na-ezo aka n’oge a nọ na-agba ya ajụjụ ọnụ n’ọnwa ndị bu ụzọ tupu a maa ya ikpe, ọ kwetara, sị: “Ana m echeta ka eze m na-akụkọta ọnụ, eyikwara m egwele ụjọ na-atụ.” Otú ọ dị, Ella nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Ọ mụtawo ịtụkwasị ya obi. (Ilu 3:5-7) N’ihi ya, Chineke dị adị n’ezie nye ya karịa ka ọ dịbu. Ọ na-akọwa, sị: “Oge ọ bụla m banyere n’ụlọ ahụ a na-anọ agba m ajụjụ ọnụ, ana m enwe udo nke uche. . . . Ka ọnọdụ ahụ na-eyi egwu karị, otú ahụ ka udo ahụ na-emikwu emi.” Udo ahụ sitere n’aka Jehova. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

13. Gịnị na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị enwee mkpagbu, na anyị ga-enwe ikike ịtachi obi?

13 Ella, bụ́ onye a tọhapụworo kemgbe, nọgidere na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ihe isi ike. O mere nke a, ọ bụghị site n’ike nke aka ya, kama site n’ike Jehova nyere ya. Otú ahụkwa ka ọ dị Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Ya mere kama ihe ọzọ m ga-ewere obi ụtọ nile nyaa isi n’adịghị ike m nile, ka ike nke Kraịst wee rịdakwasị m, birikwa n’ime m. . . . N’ihi na mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:9, 10.

14. Nye ihe atụ otú onye Kraịst pụrụ isi na-enwe echiche ziri ezi banyere ọnọdụ tara akpụ na ihe pụrụ isi na ya pụta.

14 Nrụgide ndị ị na-enwe n’onwe gị taa pụrụ ịdịtụ iche ná ndị anyị tụleworo ebe a. Ma, n’agbanyeghị otú ha dị, nrụgide na-esi ike nnagide. Dị ka ihe atụ, onye were gị n’ọrụ pụrụ nnọọ ịdị na-akatọ ọrụ gị—ọbụna karịa nnọọ ka ọ na-eme nke ndị ọzọ e were n’ọrụ bụ́ ndị nọ n’okpukpe ọzọ. E nwere ike ọ gaghị ekwe gị omume ịchọ ọrụ ọzọ. Olee otú ị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ? Cheta Adolf na ndị enyi ya, bụ́ ndị ahụmahụ ha nwere n’ụlọ mkpọrọ kụziiri ịzụlite àgwà ndị dị mkpa. Ọ bụrụ na i jiri ezi obi mee mgbalị ime ka onye were gị n’ọrụ—ọbụna onye “ọ na-esi ike imeta mma”—nwee afọ ojuju, ị ga-azụlite àgwà dị iche iche nke ndị Kraịst dị ka ntachi obi na ogologo ntachi obi. (1 Pita 2:18) Ọzọkwa, ị pụrụ ịbakwu uru dị ka onye e were n’ọrụ, bụ́ nke pụrụ ịmụba ohere ndị i nwere inweta ọrụ ka enye afọ ojuju otu ụbọchị. Ka anyị tụlezie ụfọdụ ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ n’ozi Jehova.

Ime Ka Ihe Dị Mfe Na-eweta Ọṅụ

15-17. Gịnị ka otu di na nwunye mụtara na ọ pụrụ ime ka nchekasị belata, n’agbanyeghị na ha apụghị iwepụ kpam kpam ihe na-akpata ya?

15 E nwere ike ị gaghị enwecha nhọrọ banyere ụdị ọrụ ego ị ga-arụ ma ọ bụ banyere ebe ị ga na-arụ ọrụ, ma a pụrụ inwe akụkụ ndị ọzọ nke ndụ gị bụ́ ndị ị pụrụ ịchịkwa ruo ókè ụfọdụ. Tụlee ahụmahụ na-esonụ.

16 Otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst kpọrọ otu onye okenye ka ọ bịa rie ihe n’ụlọ ha. N’uhuruchi ahụ, nwanna nwoke ahụ na nwunye ya kọsaara onye okenye ahụ na na nso nso a, ha anọwo na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nrụgide nke ndụ na-erikpu. Ọ bụ ezie na ha abụọ na-arụ ọrụ oge nile bụ́ nke na-achọ ihe dị ukwuu n’aka ha, ha anọghị n’ọnọdụ nke ịchọ ọrụ ọzọ. Ha amaghị ókè ha pụrụ ịnagideru ya.

17 Mgbe ha gwara okenye ahụ ka o nye ha ndụmọdụ, o kwuru, sị: “Meenụ ka ihe dị mfe.” N’ụzọ dị aṅaa? Di na nwunye ahụ nọ na-eji ihe ruru awa atọ kwa ụbọchị aga ma na-alọta ọrụ. Onye okenye ahụ, bụ́ onye maara di na nwunye ahụ nke ọma, tụrụ aro ka ha tụlee ịkwaga n’ebe dị nso n’ebe e were ha n’ọrụ, ka ha wee nwee ike ibelata oge ha na-egbu iji na-aga ma na-alọta ọrụ kwa ụbọchị. A pụrụ iji oge mapụtaranụ lebara ihe ndị ọzọ dị mkpa anya—ma ọ bụ jiri ya nnọọ zuo ike. Ọ bụrụ na nrụgide nke ndụ na-anapụtụ gị ọṅụ, gịnị ma ị tụlee ma ị̀ pụrụ inweta ahụ efe site n’ime mgbanwe ụfọdụ?

18. Gịnị mere o ji dị oké mkpa iche echiche nke ọma tupu a na-eme mkpebi?

18 Ụzọ ọzọ e si ebelata nrụgide bụ iche echiche nke ọma tupu a na-eme mkpebi. Dị ka ihe atụ, otu onye Kraịst kpebiri ịrụ ụlọ. Ya ahọrọ ụkpụrụ dị nnọọ mgbagwoju anya, n’agbanyeghị na ọ rụtụbeghị ụlọ mbụ. Ugbu a, ya aghọta na ọ pụrụ izerewo nsogbu ndị na-enweghị isi ma ọ bụrụ na ‘ọ tụlere ijeụkwụ ya’ tupu ọ họrọ ụkpụrụ ụlọ ya. (Ilu 14:15) Onye Kraịst ọzọ kweere ịnọrọ onye kwere ekwe ibe ya n’akaebe maka ego mgbazinye. Dị ka nkwekọrịta ahụ si dị, ọ bụrụ na onye ahụ gbazitere ego akwụlighị ya, iwu ji onye ahụ nọọrọ ya n’akaebe ịkwụ ya. Na mbụ, ihe nile gara nke ọma, ma ka oge na-aga, onye ahụ gbazitere ego emezughị nkwa ya. Egwu atụọ onye ahụ gbazinyere ya ego, ya ekwuokwa na onye ahụ nọọrọ mmadụ n’akaebe ga-akwụghachi ego nile ahụ a gbazitere. Nke ahụ etinye oké nrụgide n’isi onye ahụ nọọrọ mmadụ n’akaebe. Ọ̀ pụrụ izerewo ya ma ọ bụrụ na o chebaara ihe nile gbara ya gburugburu echiche tupu ya anakwere ibu maka ụgwọ ahụ?—Ilu 17:18.

19. Olee ụfọdụ ụzọ anyị pụrụ isi mee ka nchekasị anyị na-enwe ná ndụ belata?

19 Mgbe ike gwụrụ anyị, ka anyị ghara ikwubi ma ọlị na anyị pụrụ ibelata nrụgide anyị na-enwe ma nwetaghachi ọṅụ site n’ịkwụsịlata ọmụmụ Bible onwe onye, ozi ubi, na ịga nzukọ. Leenụ, ihe ndị a bụ ụzọ ndị dị oké mkpa anyị pụrụ isi na-enweta mmụọ nsọ Jehova, nke otu n’ime mkpụrụ ya bụ ọṅụ. (Ndị Galetia 5:22) Ihe omume ndị Kraịst na-enye ume ọhụrụ mgbe nile, ọ dịkarịghịkwa agwụ ike n’ụzọ gabigara ókè. (Matiu 11:28-30) O yikarịrị nnọọ ka ọ bụ ọrụ ego ma ọ bụ ntụrụndụ, ọ bụghị ihe ime mmụọ, na-ewetara anyị ike ọgwụgwụ. Ịmụta ịlakpu ụra n’oge pụrụ inyere anyị aka inwetaghachi onwe anyị. Izutụkwu ike pụrụ ịba uru dị ukwuu. N. H. Knorr, bụ́ onye jere ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ruo ọnwụ ya, na-agwakarị ndị ozi ala ọzọ, sị: “Mgbe unu nwere nkụda mmụọ, ihe mbụ unu ga-eme bụ izurụtụ ike. Ọ ga-eju unu anya otú ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nsogbu ọ bụla unu nwere ga-esi yie ihe dị mfe mgbe unu hisịrị ezigbo ụra abalị!”

20. (a) Chịkọta ụfọdụ n’ime ụzọ ndị anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ. (b) Olee ihe ndị ị pụrụ ichetụ n’echiche mere ị ga-eji na-enwe ọṅụ? (Lee igbe dị na peeji nke 17.)

20 Ndị Kraịst nwere ihe ùgwù nke ijere “Chineke onye obi ụtọ” ozi. (1 Timoti 1:11, NW) Dị ka anyị hụworo, anyị pụrụ ịnọgide na-enwe ọṅụ ọbụna mgbe anyị nwere nsogbu ndị siri ike. Ka anyị lekwasị anya n’olileanya Alaeze ahụ, na-agbanwe echiche anyị mgbe ọ dị mkpa, na-emekwa ka ndụ anyị dị mfe. Mgbe ahụ, ọnọdụ ọ sọrọ anyị nọrọ na ya, anyị ga-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe okwu Pọl onyeozi dị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ.”—Ndị Filipaị 4:4.

Chebara Ajụjụ Ndị A Echiche nke Ọma:

• Gịnị mere ndị Kraịst kwesịrị iji tụkwasị uche nke ọma n’olileanya Alaeze ahụ?

• Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ọnọdụ ndị tara akpụ?

• Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịa ime ka ndụ anyị dị mfe?

• N’akụkụ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị meworo ka ndụ ha dị mfe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ihe Ndị Ọzọ Mere A Ga-eji Na-enwe Ọṅụ

Dị ka ndị Kraịst, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Tụlee ihe ndị na-esonụ:

1. Anyị maara Jehova.

2. Anyị amụtawo eziokwu nke Okwu Chineke.

3. A pụrụ ịgbaghara anyị mmehie anyị site n’okwukwe anyị nwere n’àjà Jisọs.

4. Alaeze Chineke na-achị—ụwa ọhụrụ ga-abịa n’oge na-adịghị anya!

5. Jehova akpọbatawo anyị n’ime paradaịs ime mmụọ.

6. Anyị na-enwe mkpakọrịta dị mma nke ndị Kraịst.

7. Anyị nwere ihe ùgwù nke ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ.

8. Anyị dị ndụ, anyị nwetụkwara ume.

Olee ihe ndị ọzọ ị pụrụ ikwu mere a ga-eji na-enwe ọṅụ?

[Foto dị na peeji nke 13]

Pọl na Saịlas ṅụrịrị ọṅụ ọbụna n’ụlọ mkpọrọ

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ì lekwasịrị anya n’atụmanya na-enye ọṅụ bụ́ ụwa ọhụrụ Chineke?