Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Soro Chineke Onye Obi Ụtọ Na-enwe Ọṅụ

Soro Chineke Onye Obi Ụtọ Na-enwe Ọṅụ

Soro Chineke Onye Obi Ụtọ Na-enwe Ọṅụ

“Nke fọdụrụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. . . . Chineke nke ịhụnanya na udo ga-anọnyekwara unu.”—2 NDỊ KỌRINT 13:11.

1, 2. (a) Gịnị mere ọtụtụ ndị adịghị enwe ọṅụ ná ndụ? (b) Gịnị bụ ọṅụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi zụlite ya?

N’ỤBỌCHỊ ndị a dị oké egwu, ọtụtụ mmadụ adịchaghị ahụ ihe ga-eme ka ha ṅụrịwa ọṅụ. Mgbe ọdachi dakwasịrị ha ma ọ bụ onye ha hụrụ n’anya, ha pụrụ inwe mmetụta yiri nke Job oge ochie nwere, bụ́ onye kwuru, sị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) A gụpụghị ndị Kraịst ná nrụgide na nchekasị a na-enwe ‘n’oge a dị oké egwu,’ ọ bụghịkwa ihe ijuanya na ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi na-enwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ.—2 Timoti 3:1.

2 Ma, ndị Kraịst pụrụ inwe ọṅụ, ọbụna mgbe ha nọ n’ọnwụnwa. (Ọrụ 5:40, 41) Iji ghọta otú nke a si ekwe omume, buru ụzọ tụlee ihe ọṅụ bụ. A kọwawo ọṅụ dị ka “mmetụta uche nke inweta ezi ihe ma ọ bụ ịtụ anya ezi ihe kpaliri.” * N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ewepụta oge gụkọọ ngọzi ndị anyị na-enweta ugbu a ka anyị na-atụgharị uche n’ọṅụ ndị na-echere anyị n’ụwa ọhụrụ Chineke, anyị pụrụ inwe ọṅụ.

3. N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na onye ọ bụla nwere, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ihe ụfọdụ mere ọ ga-eji na-aṅụrị ọṅụ?

3 Onye ọ bụla nwere ngọzi ndị ọ ga na-enwe ekele maka ha. Onyeisi ezinụlọ pụrụ ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ. Dị ka o kwesịrị ịdị, ọ ga na-enwe nchegbu. Ọ chọrọ igbo mkpa nke ndị ọ hụrụ n’anya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ọ gbasiri ike ma nwee ezi ahụ ike, ọ pụrụ inwe ekele maka nke ahụ. Ọ bụrụ na ọ chọta ọrụ, ọ ga-enwe ike ịrụsi ọrụ ike. N’aka nke ọzọ, nwanyị bụ́ onye Kraịst pụrụ ịbụ onye na-arịa ọrịa na-eme ka mmadụ ghara inwe ume. Ma, ọ pụrụ inwe ekele maka nkwado nke ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ na-ahụ n’anya bụ́ ndị na-enyere ya aka iji ùgwù na obi ike na-anagide ọrịa ya. Ezi ndị Kraịst nile, n’agbanyeghị ọnọdụ ha, pụkwara ịṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ùgwù nke ịmara Jehova, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ,” na Jisọs Kraịst, bụ́ “onye obi ụtọ ahụ na onye nanị ya bụ Eze Ukwu.” (1 Timoti 1:11; 6:15, NW) Ee, Jehova Chineke na Jisọs Kraịst na-enwe obi ụtọ n’ụzọ kasị ukwuu. Ha anọgidewo na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na ọnọdụ ndị dị n’ụwa dị nnọọ iche n’ihe Jehova zubere ná mmalite. Ihe nlereanya ha pụrụ ịkụziri anyị ihe dị ukwuu banyere otú anyị ga-esi nọgide na-enwe ọṅụ.

Ha Akwụsịbeghị Inwe Ọṅụ Ma Ọlị

4, 5. (a) Olee otú Jehova si meghachi omume mgbe mmadụ abụọ mbụ ahụ nupụrụ isi? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si nọgide na-enwe àgwà ziri ezi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ?

4 N’ogige Iden, Adam na Iv nwere ezi ahụ ike na uche zuru okè. Ha nwere ọrụ na-amịpụta mkpụrụ ịrụ nakwa gburugburu ebe mara mma ha nọ na-arụ ya. Nke kasịnụ, ha nwere ihe ùgwù nke iso Jehova na-ekwurịta okwu mgbe nile. Nzube Chineke bụ ka ha nwee ọdịnihu obi ụtọ. Ma ezi onyinye a nile enyeghị nne na nna anyị mbụ afọ ojuju; ha zuuru mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu site “n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” Nnupụisi a tọrọ ntọala maka enweghị obi ụtọ nile anyị, bụ́ ụmụ ha, nọ n’elu ya taa.—Jenesis 2:15-17; 3:6; Ndị Rom 5:12.

5 Otú ọ dị, Jehova ekweghị ka àgwà enweghị ekele nke Adam na Iv napụ ya ọṅụ ya. Obi siri ya ike na ma ọ dịghị ihe ọzọ, a ga-akpali obi nke ụfọdụ n’ime ụmụ ha ijere ya ozi. N’ezie, obi siri ya nnọọ ike nke na ọbụna tupu Adam na Iv amụọ nwa mbụ ha, ọ mara ọkwa banyere nzube ya ịgbapụta ụmụ ha ndị na-erube isi! (Jenesis 1:31; 3:15) N’ime narị afọ ndị sochirinụ, ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ gbasoro nzọụkwụ Adam na Iv, ma Jehova agbakụtaghị ezinụlọ mmadụ azụ n’ihi ịba ụba nke nnupụisi dị otú ahụ. Kama nke ahụ, o lekwasịrị anya n’ebe ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị ‘mere ka obi ya ṅurịa’ nọ, ndị mere ezi mgbalị ime ya obi ụtọ n’ihi na ha hụrụ ya n’anya.—Ilu 27:11; Ndị Hibru 6:10.

6, 7. Olee ihe ndị nyeere Jisọs aka ịnọgide na-enwe ọṅụ?

6 Gịnị banyere Jisọs—olee otú o si nọgide na-enwe ọṅụ? Dị ka mmụọ e kere eke dị ike n’eluigwe, Jisọs nwere ohere hiri nne ikiri ihe omume nke ndị ikom na ndị inyom nọ n’ụwa. Ezughị okè ha pụtara ìhè, n’agbanyeghị nke ahụ, Jisọs hụrụ ha n’anya. (Ilu 8:31) E mesịa, mgbe ọ bịara n’ụwa ma “biri n’etiti” ụmụ mmadụ n’ezie, ụzọ o si na-ele ihe a kpọrọ mmadụ anya agbanweghị. (Jọn 1:14) Gịnị nyeere Ọkpara Chineke zuru okè aka ịnọgide na-ele ezinụlọ mmadụ na-emehie emehie anya n’ụzọ ziri ezi otú ahụ?

7 Nke mbụ, Jisọs ji ezi uche mee ihe banyere ihe ndị ọ na-atụ anya ha, ma n’aka ya onwe ya ma n’aka ndị ọzọ. Ọ maara na ọ gajeghị ịtọghata ụwa nile. (Matiu 10:32-39) Ya mere, ọ ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọbụna otu onye nwere ezi obi meghachiri omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi Alaeze ahụ dị. Ọ bụ ezie na omume na àgwà nke ndị na-eso ụzọ ya adịghị enye afọ ojuju mgbe ụfọdụ, Jisọs maara na n’obi ha, ha chọrọ n’ezie ime uche Chineke, ọ hụkwara ha n’anya maka nke ahụ. (Luk 9:46; 22:24, 28-32, 60-62) N’ụzọ dị ịrịba ama, n’ekpere Jisọs kpekuru Nna ya nke eluigwe, ọ chịkọtara ụzọ ziri ezi ndị na-eso ụzọ ya gbasoworo ruo oge ahụ, sị: “Ha edebewokwa okwu Gị.”—Jọn 17:6.

8. Kwuo ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi ṅomie Jehova na Jisọs ma a bịa n’ịnọgide na-enwe ọṅụ.

8 Obi abụọ adịghị ya na anyị nile ga-erite uru site n’ịtụgharị uche n’ihe nlereanya Jehova Chineke na Kraịst Jisọs setịpụrụ n’akụkụ a. Ànyị pụrụ iṅomikwu Jehova n’ụzọ zuru ezu ikekwe site n’ịghara ịdị na-enwebiga nchegbu ókè mgbe ihe na-agazighị nnọọ dị ka anyị tụrụ anya ya? Ànyị pụrụ ịgbasochikwu nzọụkwụ Jisọs anya site n’ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi n’ebe ọnọdụ anyị nọ na ya ugbu a dị, nakwa site n’iji ezi uche na-eme ihe banyere ihe ndị anyị na-atụ anya n’aka anyị onwe anyị nakwa n’aka ndị ọzọ? Ka anyị hụ otú a pụrụ isi tinye ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị a n’ọrụ n’ụzọ dị irè n’otu akụkụ nke na-amasị nnọọ ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi n’ebe nile—ozi ubi.

Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Ozi Ahụ

9. Olee otú Jeremaịa si nwetaghachi ọṅụ ya, oleekwa otú ihe nlereanya ya pụrụ isi nyere anyị aka?

9 Jehova chọrọ ka anyị na-enwe ọṅụ n’ozi ya. Ọṅụ anyị ekwesịghị ịdabere n’ihe ndị anyị na-arụpụta. (Luk 10:17, 20) Jeremaịa onye amụma mere nkwusa ruo ọtụtụ afọ n’ókèala na-adịghị amịpụta mkpụrụ. Mgbe o lekwasịrị anya ná mmeghachi omume na-adịghị mma nke ndị ahụ, o nweghịzi ọṅụ. (Jeremaịa 20:8) Ma mgbe ọ tụgharịrị uche n’ịma mma nke ozi ahụ n’onwe ya, o nwetaghachiri ọṅụ. Jeremaịa gwara Jehova, sị: “A chọpụtawo okwu Gị, m wee rie ha; okwu Gị wee ghọọrọ m ihe obi ụtọ na ọṅụ obi m: n’ihi na a kpọkwasịwo m aha Gị, Jehova.” (Jeremaịa 15:16) Ee, Jeremaịa ṅụrịrị ọṅụ n’ihe ùgwù ya nke ikwusa okwu Chineke. Anyị pụkwara ime otú ahụ.

10. Olee otú anyị pụrụ isi chekwaa ọṅụ anyị na-enwe n’ozi ọbụna ma a sị na ókèala anyị adịghị amịpụta mkpụrụ ugbu a?

10 Ọ bụrụgodị na ihe ka ọtụtụ ajụ ịnakwere ozi ọma ahụ, anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji na-enwe ọṅụ ka anyị na-ekere òkè n’ozi ubi. Cheta na obi siri nnọọ Jehova ike na a ga-akpali ụfọdụ mmadụ ijere ya ozi. Dị ka Jehova, anyị ekwesịghị ma ọlị ịkwụsị inwe olileanya na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ ga-emesị hụ ihe iseokwu ahụ ma nakwere ozi Alaeze ahụ. Anyị agaghị echefu ma ọlị na ọnọdụ ndị mmadụ na-agbanwe agbanwe. Mgbe ha chere mfu ma ọ bụ ọdachi ha na-atụghị anya ya ihu, ọbụna mmadụ nke onwe ya kasị eju afọ pụrụ ịmalite ichesi echiche ike banyere nzube nke ndụ. Ị̀ ga-anọ ya inye aka mgbe onye dị otú ahụ ‘matara mkpa ime mmụọ ya’? (Matiu 5:3, NW) Leenụ, otu onye nọ n’ókèala gị nwere ike ịdị njikere ige ntị n’ozi ọma ahụ n’oge ọzọ ị ga-akpọtụrụ ya!

11, 12. Gịnị mere n’otu obodo, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na ya?

11 Ọdịdị nke ókèala anyị pụkwara ịgbanwe. Tụlee otu ihe atụ. Ìgwè ndị di na nwunye na-akatabeghị ahụ na ụmụ ha bikọtara ọnụ n’otu obodo nta. Mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ha, otu ihe ka a na-aza ha n’ọnụ ụzọ nile, “Anyị enweghị mmasị!” Ọ bụrụ na mmadụ egosi mmasị n’ozi Alaeze ahụ, ndị agbata obi ya adịghị egbu oge n’ịkụda mmụọ ya ka ọ ghara iso Ndịàmà nwee nkwurịta okwu ọzọ. N’ụzọ doro anya, ime nkwusa n’ebe ahụ bụ ihe ịma aka. Otú o sina dị, Ndịàmà ahụ adaghị mbà; ha nọgidere nnọọ na-eme nkwusa. Gịnị si na ya pụta?

12 Ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ụmụaka nọ n’obodo ahụ tolitere, lụọ di na nwunye, ma biri n’ebe ahụ. N’ịghọta na ụzọ ndụ ha ewetabeghịrị ha ezi obi ụtọ, ụfọdụ n’ime ndị a na-akatabeghị ahụ malitere ịchọ eziokwu ahụ. Ha chọtara ya mgbe ha meghachiri omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi ọma ahụ Ndịàmà na-ekwusa dị. Otú ahụ ka o si bụrụ na ka ọtụtụ afọ gasịrị, obere ọgbakọ ahụ malitere ito. Cheedị banyere ọṅụ ndị nkwusa Alaeze ahụ bụ́ ndị na-adaghị mbà nwere! Ka nnọgidesi ike n’ikerịta ozi Alaeze ahụ dị ebube wetakwara anyị onwe anyị ọṅụ!

Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Ga-akwado Gị

13. Olee ndị anyị pụrụ ịgakwuru mgbe anyị nwere nkụda mmụọ?

13 Mgbe nrụgide rịrị elu ma ọ bụ mgbe ọdachi kpara gị aka ọjọọ, ebee ka ị pụrụ ịga maka nkasi obi? Ọtụtụ nde ndị ohu Jehova raara onwe ha nye na-ebu ụzọ agakwuru Jehova n’ekpere, e mesịa ha agakwuru ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst. Mgbe Jisọs n’onwe ya nọ n’ụwa, o ji nkwado ndị na-eso ụzọ ya nyere ya kpọrọ ihe. N’abalị ahụ tupu ọ nwụọ, o kwuru banyere ha dị ka “ndị soworo m n’ọnwụnwa m nile.” (Luk 22:28) N’ezie, ndị ahụ na-eso ụzọ ezughị okè, ma nguzosi ike n’ihe ha bụụrụ Ọkpara Chineke ihe nkasi obi. Anyị onwe anyị kwa pụrụ inweta ike site n’aka ndị ofufe ibe anyị.

14, 15. Gịnị nyeere otu di na nwunye aka ịnagide ọnwụ nwa ha nwoke, gịnịkwa ka ị na-amụta site n’ahụmahụ ha?

14 Otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst aha ha bụ Michel na Diane mụtara otú nkwado nke ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị pụrụ ịbaru n’uru. A chọpụtara na nwa ha nwoke dị afọ 20, bụ́ Jonathan, bụ́ onye Kraịst gbasiri ike ma nwee atụmanya dị mma, na-arịa ọrịa akpụ ụbụrụ. Ndị dọkịta gbalịsiri ike ịzọpụta ya, ma ọnọdụ Jonathan kara njọ ruo otu mgbede, bụ́ mgbe ọ dara n’ụra ọnwụ. Obi gbawara Michel na Diane. Ha chọpụtara na Nzukọ Ije Ozi, bụ́ nke e dokwara n’uhuruchi ahụ, emechiwela. Ma, ebe nkasi obi dị ha oké mkpa, ha gwara onye okenye nke ha na ya nọ n’ebe ahụ ka o soro ha gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha bịarutere kpọmkwem n’oge a na-amara ọgbakọ ọkwà banyere ọnwụ Jonathan. Mgbe e mechiri nzukọ ahụ, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị gbara nne na nna ahụ anya mmiri juru anya gburugburu, makụọ ha ma gwa ha okwu nkasi obi. Diane na-echeta, sị: “Anyị tọgbọ chakoo mgbe anyị bịarutere n’ụlọ nzukọ ahụ, ma lee nkasi obi anyị nwetara site n’aka ụmụnna—lee ka ha si wulie anyị elu! Ọ bụ ezie na ha apụghị ime ka ihe mgbu anyị na-enwe kwụsị, ha nyeere anyị aka ịnagide nrụgide ahụ!”—Ndị Rom 1:11, 12; 1 Ndị Kọrint 12:21-26.

15 Ọdachi mere ka Michel na Diane bịarukwuo ụmụnna ha nso. O mekwara ka ha bịarukwuo ibe ha nso. Michel na-ekwu, sị: “Amụtawo m ịhụ ezigbo nwunye m n’anya ọbụna karị. N’oge anyị nwere nkụda mmụọ, anyị na-ekwurịta banyere eziokwu Bible na otú Jehova si akwagide anyị.” Diane na-agbakwụnye, sị: “Olileanya Alaeze ahụ dị oké ọnụ ahịa nye anyị ugbu a ọbụna karị.”

16. Gịnị mere o ji dị mkpa ibute ụzọ n’ime ka ụmụnna anyị mara banyere ihe ndị na-akpa anyị?

16 Ee, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịbụrụ anyị “ndị ngụgụ obi” n’oge ihe na-esiri anyị ike ná ndụ ma si otú ahụ na-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ. (Ndị Kọlọsi 4:11) N’ezie, ha apụghị ịma ihe dị anyị n’obi. Ya mere, mgbe nkwado dị anyị mkpa, ọ dị mma ime ka ha mara. Mgbe ahụ, anyị pụrụ igosipụta ezi ekele maka nkasi obi ọ bụla ụmụnna anyị nwere ike inye, na-ele ya anya dị ka nke si n’aka Jehova abịa.—Ilu 12:25; 17:17.

Lee Anya n’Ọgbakọ Gị

17. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka otu nne nanị ya na-azụ ụmụ na-enwe, oleekwa otú anyị si ele ndị dị ka ya anya?

17 Ka ị na-elerukwu ndị kwere ekwe ibe gị anya, otú ahụ ka ị ga na-amụtakwu inwe ekele maka ha ma na-achọta ọṅụ ná mkpakọrịta gị na ha. Lee anya n’ọgbakọ gị. Gịnị ka ị na-ahụ? È nwere nne na-azụ ụmụ nanị ya bụ́ onye na-adọga ịzụlite ụmụ ya n’ụzọ nke eziokwu? Ì chebarawo ezi ihe nlereanya ọ na-esetịpụ echiche nke ọma? Gbalịa iji anya nke uche hụ ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ọ na-eche ihu. Otu nne na-azụ ụmụ nanị ya nke aha ya bụ Jeanine na-ekwu ụfọdụ n’ime ha: owu ọmụma, ndị ikom nọ n’ebe ọrụ ịchọ iso gị nwee mmekọahụ, enweghị ego zuru ezu maka mmefu ndị dị mkpa. Ma o kwuru na nsogbu kasịnụ na-agụnye igbo mkpa mmetụta uche nke ụmụ ya, ebe ọ bụ na nwa nke ọ bụla pụrụ iche. Jeanine na-ekwu nsogbu ọzọ, sị: “Ọ pụrụ ịbụ ezigbo ihe ịma aka izere ọchịchọ nke ime nwa gị nwoke onyeisi ezinụlọ iji dochie anya di gị na-anọghị ya. Enwere m nwatakịrị nwanyị, ọ na-esikwara m ike icheta ịghara iji izu nzuzo m na-ebogbu ya.” Dị ka ọtụtụ puku ndị nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ nanị ha bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, Jeanine na-arụ ọrụ oge nile ma na-elekọta ezinụlọ ya. Ọ na-esokwa ụmụ ya amụ Bible, na-azụ ha n’ozi, na-akpọkwa ha aga nzukọ ọgbakọ. (Ndị Efesọs 6:4) Lee obi ụtọ Jehova na-aghaghị inwe ka ọ na-ekiri kwa ụbọchị mgbalị ezinụlọ a na-eme iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe! Ọ́ dịghị enye anyị ọṅụ inwe ndị dị otú ahụ n’etiti anyị? Ee, ọ na-enye.

18, 19. Nye ihe atụ nke otú anyị pụrụ isi na-ejikwu ndị òtù ọgbakọ akpọrọ ihe.

18 Lee anya ọzọ n’ọgbakọ gị. Ị pụrụ ịhụ ndị inyom di ha nwụrụ ma ọ bụ ndị ikom nwunye ha nwụrụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị ‘na-adịghị mgbe ha na-akọ akọ’ ná nzukọ. (Luk 2:37, NW) Owu ọ̀ na-ama ha mgbe ụfọdụ? Eenụ. Ha na-enwe mfu nke ukwuu maka di ma ọ bụ nwunye ha na-anọghị ya! Ma ha na-anọgide na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova ma na-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Àgwà ha ziri ezi nke ịkwụsi ike n’ihe na-etinye ihe n’ọṅụ nke ọgbakọ! Otu onye Kraịst nke jeworo ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 30 kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị kasị enye m ọṅụ bụ ịhụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị agadi nweworo ọtụtụ ọnwụnwa ka ha ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi!” Ee, ndị Kraịst meworo agadi n’etiti anyị bụụrụ ndị na-eto eto ihe agbamume dị ukwuu.

19 Gịnịkwanụ banyere ndị ọhụrụ bụ́ ndị malitere nnọọ n’oge na-adịbeghị anya iso ọgbakọ na-akpakọrịta? Ọ̀ bụ na a dịghị akpali mmasị anyị mgbe ha na-ekwupụta okwukwe ha ná nzukọ? Cheedị banyere ọganihu ha nweworo kemgbe ha malitere ịmụ Bible. Jehova aghaghị inwe obi ụtọ n’ebe ha nọ. Ànyị nwere? Ànyị na-egosipụta nkwado anyị, na-aja ha mma maka mgbalị ndị ha na-eme?

20. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na onye ọ bụla so n’ọgbakọ na-ekere òkè dị mkpa n’ime ọgbakọ?

20 Ị̀ bụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye, onye na-alụbeghị, ma ọ bụ onye na-azụ ụmụ nanị ya? Ị̀ bụ nwa na-enweghị nna (ma ọ bụ nne), nwanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwoke nwunye ya nwụrụ? Ị̀ bụ onye soworo ọgbakọ na-akpakọrịta ruo ọtụtụ afọ ka ị̀ bụ onye ka malitere nnọọ na nso nso a iso ya na-akpakọrịta? Jide n’aka na ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi gị bụụrụ anyị nile ihe agbamume. Mgbe ị na-esonyekwa n’ịbụ abụ Alaeze, mgbe ị na-aza ajụjụ ma ọ bụ na-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, òkè ị na-ekere na-etinye ihe n’ọṅụ anyị. Nke ka mkpa, ọ na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.

21. Olee ihe anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji mee ya, ma ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite?

21 Ee, ọbụna n’oge ndị a jupụtara ná nsogbu, anyị pụrụ inwe ọṅụ n’ife Chineke anyị bụ́ onye obi ụtọ ofufe. Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’agbamume Pọl, bụ́: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ. . . . Chineke nke ịhụnanya na udo ga-anọnyekwara unu.” (2 Ndị Kọrint 13:11) Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na anyị enweta ọdachi na-emere onwe ya, mkpagbu, ma ọ bụ oké ihe isi ike akụ̀ na ụba? Ọ̀ ga-ekwe anyị omume ịnọgide na-enwe ọṅụ ọbụna n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Zaa ya n’onwe gị ka ị na-atụle isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 119, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Olee otú e si akọwa ọṅụ?

• Olee otú ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ?

• Gịnị pụrụ inyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ókèala ọgbakọ anyị?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka i si eji ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ n’ọgbakọ gị akpọrọ ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ndị nọ n’ókèala anyị pụrụ ịgbanwe

[Foto dị na peeji nke 12]

Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ndị nọ n’ọgbakọ gị na-eche ihu?