Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee mgbe e tere “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ, dị ka e buru n’amụma na Daniel 9:24, NW?
Daniel 9:24-27 bụ amụma banyere mpụta nke “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú”—Kraịst. N’ihi ya, ite “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ bụ́ nke e buru n’amụma, adịghị ezo aka n’ite Ebe Kasị Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem mmanụ. Kama nke ahụ, okwu ahụ bụ́ “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” na-ezo aka n’ebe nsọ eluigwe nke Chineke—Ebe Kasị Nsọ nke eluigwe—ná nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. *—Ndị Hibru 8:1-5; 9:2-10, 23.
Olee mgbe ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke malitere ọrụ? Tụlee ihe mere mgbe Jisọs bịara ka e mee ya baptism na 29 O.A. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu ná ndụ ya, Jisọs mezuru okwu ndị dị n’Abụ Ọma 40:6-8. Pọl onyeozi mesịrị gosi na Jisọs kpekuru Chineke ekpere, sị: “Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha, ma ahụ ka Ị kwadebere nye m.” (Ndị Hibru 10:5) Jisọs maara na Chineke ‘achọghị’ ka a nọgide na-achụ àjà ụmụ anụmanụ n’ụlọ nsọ Jerusalem. Kama nke ahụ, Jehova kwadebeere Jisọs ahụ mmadụ zuru okè ịchụ dị ka àjà. N’igosipụta ọchịchọ ya sitere n’obi, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Lee, abịawo m (n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe Ị na-achọ, Chineke.” (Ndị Hibru 10:7) Gịnịkwanụ ka Jehova zaghachiri? Oziọma Matiu na-ekwu, sị: “Mgbe e mere Jisọs baptism, ngwa ngwa O si ná mmiri rịgota: ma lee, e meghere eluigwe nye Ya, O wee hụ Mmụọ nke Chineke ka Ọ na-efeda dị ka nduru, na-ebekwasịkwa Ya; ma lee, olu sitere n’eluigwe, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma.”—Matiu 3:16, 17.
Nnakwere Jehova Chineke nakweere ochiche e chere ahụ Jisọs maka àjà pụtara na e nweela ebe ịchụàjà karịrị ebe ịchụàjà nkịtị ahụ dị n’ụlọ nsọ Jerusalem. Nke a bụ ebe ịchụàjà nke ‘ọchịchọ,’ ma ọ bụ ndokwa Chineke maka ịnakwere ndụ mmadụ Jisọs dị ka àjà. (Ndị Hibru 10:10) Otite e ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ pụtara na Chineke emezuola ndokwa nile metụtara ụlọ nsọ ime mmụọ ya. * N’ihi ya, n’oge e mere Jisọs baptism, e tere ebe obibi eluigwe nke Chineke mmanụ, ma ọ bụ doo ya iche, dị ka “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” ná ndokwa nke nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Maka ntụle nke akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, lee peeji nke 14-19 nke Ụlọ Nche July 1, 1996.
^ par. 5 E zoro aka na nke a na peeji nke 194-195 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
[Foto dị na peeji nke 27]
E tere “Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile” mmanụ mgbe e mere Jisọs baptism