‘Keleenụ Ndịàmà Jehova Maka Nnwere Onwe Okpukpe’
‘Keleenụ Ndịàmà Jehova Maka Nnwere Onwe Okpukpe’
“TUPU ị kwachie ụzọ gị n’ihu Onyeàmà Jehova,” ka otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today na-ekwu, “cheretụ ma tụlee mkpagbu ihere a kpagburu ha n’oge na-adịchabeghị anya, nakwa ụtụ dị ukwuu ha tụnyeworo ná nnwere onwe ndị Ndezigharị Mbụ nke Ụkpụrụ Iwu United States mere ka anyị nile na-enwe.” A kpagburu Ndịàmà Jehova na United States n’afọ ndị 1940 dum n’ihi, tinyere ihe ndị ọzọ, ịjụ ikele ọkọlọtọ.—Ọpụpụ 20:4, 5.
E wetara ihe dị ka okwu ikpe 30 metụtara Ndịàmà Jehova n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States n’ime afọ ise dị n’agbata 1938 na 1943. Isiokwu ahụ na-ekwu, sị: “Ndịàmà welitere okwu ndị bụ́ isi metụtara Ndezigharị Mbụ ahụ nke na Ọkàikpe Harlan Fiske Stone dere, sị, ‘E kwesịrị inye Ndịàmà Jehova onyinye n’ihi aka ha nyere n’idozi nsogbu ikpe ndị metụtara nnwere onwe ụmụ amaala.’”
N’ihi ya, n’ebe ngwụsị ya, isiokwu ahụ na-ekwu, sị: “Okpukpe nile kwesịrị ikele Ndịàmà Jehova maka mgbasawanye nke nnwere onwe [okpukpe].”
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 32]
Foto dị n’azụ azụ, ụlọ: Foto nke Josh Mathes sere, Ihe e si n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States nweta; n’ala ala aka ekpe, ndị ọkàikpe: Ihe e si n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States nweta