Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lee Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ!”

“Lee Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ!”

Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè, Ndị Kwezuwokwara Ihe Nile

“Lee Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ!”

Ọ BỤ ajụjụ nke gbagwojuworo ndị ohu Jehova anya kemgbe ọtụtụ iri afọ. E mewo mgbalị eri oge iji Akwụkwọ Nsọ zaa ya. Okwu ahụ apụtawo n’ọtụtụ mkparịta ụka. Ma e mesịrị chọta azịza sitere na Bible, o nyekwara ndị na-ege ntị ná mgbakọ e nwere na Washington, D.C., na 1935 obi ụtọ dị ukwuu.

Ihe kpatara mkparịta ụka a nile bụ ajụjụ ahụ a na-ajụ n’ebe nile: Olee ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ e kwuru banyere ha ná Mkpughe 7:9? Ìgwè mmadụ a bụ́ ndị kwere ekwe hà ga-ebi n’eluigwe?

Ajụjụ Dịteworo Aka

Malite n’oge Jọn onyeozi ruo n’oge anyị, ndị Kraịst anọwo ná mgbagwoju anya banyere ndị “oké ìgwè mmadụ ahụ” bụ. Ndị Mmụta Bible weere oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ìgwè nke abụọ ga-ebi n’elugiwe, ìgwè mmadụ ndị maara eziokwu Bible ma ha mere ihe dị nta n’ịgbasa ya.

Otú ọ dị, e nwere ndị ụfọdụ so ndị Kraịst e tere mmanụ na-akpakọrịta, ndị ghọrọ ndị na-anụ nnọọ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma ahụ. Ha enweghị ọchịchọ ọ bụla nke ịga eluigwe. N’ezie, olileanya ha kwekọrọ n’okwu ihu ọha ahụ bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị,” bụ́ nke ndị Jehova kpọsara malite na 1918 ruo 1922. A ga-eji ndụ ebighị ebi n’elu ala gọzie ndị dị otú ahụ.

Ụlọ Nche (Bekee) nke October 15, 1923, tụlere ilu Jisọs banyere atụrụ na ụmụ ewu na-asị: “Atụrụ nọchiri anya ndị nke mba nile, ndị a na-ejighị mmụọ nsọ mụta, kama ha nwere ọchịchọ ezi omume, ndị nakweere Jisọs Kraịst n’uche ha dị ka Onyenwe ha, ndị na-achọ, na-enwekwa olileanya maka oge ka mma n’okpuru ọchịchị ya.”—Matiu 25:31-46.

Ìhè Enwuwanye

N’afọ 1931, akwụkwọ bụ́ Vindication, Akwụkwọ nke Mbụ, tụlere Ezikiel isi 9 ma mee ka a mata ndị ahụ a kara akara n’egedege ihu ha maka nchebe mgbe ụwa ga-abịa ná njedebe dị ka atụrụ ahụ dị n’ilu Jisọs. Vindication, Akwụkwọ nke Atọ (nke e bipụtara na 1932), kọwara àgwà obi ziri ezi nke nwoke ahụ na-abụghị onye Israel bụ́ Jehonadab, onye banyere n’ụgbọ ịnyịnya nke Eze Jehu e tere mmanụ nke Israel ma soro ya gaa iji hụ ịnụ ọkụ n’obi Jehu n’ibibi ndị na-efe ofufe ụgha. (2 Ndị Eze 10:15-28) Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Jehonadab nọchiri anya ma ọ bụ see onyinyo òtù ụmụ mmadụ ahụ nọ n’ụwa taa [bụ́ ndị] ha na nzukọ Setan na-adịghị agakọ, ndị na-ewere nguzo ha n’akụkụ nke ezi omume, ha bụkwa ndị Onyenwe anyị ga-echekwa n’oge Amagedọn, duru ha gabiga mkpagbu ahụ, ma nye ha ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ọ bụ ndị a bụ òtù ‘atụrụ’ ahụ.”

Na 1934, Ụlọ Nche mere ka o doo anya na ndị Kraịst bụ́ ndị nwere olileanya elu ala kwesịrị ịrara onwe ha nye Jehova ma bụrụ ndị e mere baptism. Ìhè na-enwusikwa ike n’ezie n’ihe banyere ndị òtù elu ala!—Ilu 4:18.

Ìhè Nghọta nke Na-enwusi Ike

A na-aga inwe nghọta ka doo anya nke Mkpughe 7:9-17. (Abụ Ọma 97:11) Ụlọ Nche ekwupụtaworị olileanya bụ́ na mgbakọ e mere ndokwa inwe na May 30 ruo June 3, 1935, na Washington, D.C., U.S.A., ga-abụ “ihe nkasi obi na abamuru n’ezie” nye ndị ahụ Jehonadab sere onyinyo ha. O mekwara otú ahụ!

N’okwu na-akpali akpali o kwuru n‘isiokwu bụ́ “Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ,” bụ́ nke ọ gwara ihe dị ka mmadụ 20,000 bịara mgbakọ, J. F. Rutherford wepụtara ihe àmà sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-egosi na “atụrụ ọzọ” nke oge a na “oké ìgwè mmadụ” nke Mkpughe 7:9 bụ otu ihe. (Jọn 10:16) Mgbe ọ na-akọwapụta ihe bụ́ isi n’okwu a, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ndị nile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala biko bilienụ ọtọ.” Ka ihe dị ukwuu ná ndị na-ege ntị biliri ọtọ, Rutherford kwupụtara, sị: “Lee oké ìgwè mmadụ ahụ.” Ebe nile dara jụụ, ihe sochiri ya bụ mkpu ọṅụ dara nnọọ ụda. N’echi ya, e mere Ndịàmà ọhụrụ dị 840 nke Jehova baptism, ihe ka ukwuu n’ime ha ana-ekwupụta n’ihu ọha na ha so n’oké ìgwè mmadụ ahụ.

Ọnụnọ A Kara Aka

Tupu 1935, ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu nke ndị gere ntị n’ozi Bible ma gosi ịnụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma ahụ gosipụtara mmasị n’ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa Paradaịs. Ha enweghị ọchịchọ ịga eluigwe, n’ihi na Chineke enyeghị ha olileanya nke ndụ eluigwe. Ha ikwu na ha so n’oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ gosiri na ka ọ na-erule afọ 1935, ọkpụkpọ nke ndị Kraịst ahụ e tere mmadụ dị 144,000 fọdụrụ nke nta ka o zuo.—Mkpughe 7:4.

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere, Setan bụ́ Ekwensu mere mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ iji kwụsị nchịkọbata nke ndị ahụ ga-emejupụta oké ìgwè mmadụ ahụ. A kpaara ọrụ nkwụsa Alaeze ahụ ókè n’ọtụtụ mba. N’oge ndị ahụ tara akpụ, ntakịrị oge kwa tupu ya anwụọ na January 1942, J. F. Rutherford kwuru, sị: “O yiri nnọọ ka ‘oké ìgwè mmadụ’ ahụ agaghị ebucha ibu.”

Ma n’ihi ngọzi Chineke, ihe gbanwere. N’ịbụ ndị ‘guzo dị ka ndị zuru okè, ndị kwezuwokwara ihe nile,’ ndị e tere mmanụ na ndị ibe ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ anọgidewo na-arụzu ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ. (Ndị Kọlọsi 4:12; Matiu 24:14; 28:19, 20) Ka ọ na-erule 1946, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova na-eme nkwusa gbaa ụwa gburugburu dị 176,456—nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. N’afọ 2000, ihe karịrị Ndịàmà 6,000,000 nọ na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’ala 235—oké ìgwè mmadụ n’ezie! Ọnụ ọgụgụ ha ka na-amụbakwa.