Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ

Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ

Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ

“M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.”—ABỤ ỌMA 32:8.

1. Olee isi ihe ndị dị mkpa maka alụmdi na nwunye na-aga nke ọma?

NDỊ na-akụ nkwà amalite ịkụ nkwà ha. Onye ọgụ egwú ejiri nkà jiri olu ụtọ ya sonyere nkwà ahụ. Ihe si na ya apụta bụ egwú dị ụtọ ná ntị. Ndị ikom abụọ esi n’otu nnukwu gwongworo na-ebudata katọn ndị ngwá ahịa juru. Otu onye ana-atụrụ ibe ya katọn ndị ahụ, ya ana-aghọrọ ya nnọọ n’ụzọ dị mfe ma na-echere ka a tụọrọ ya ọzọ. Ihe omume abụọ ahụ fọrọ nke nta ka ha yichaa ihe a na-etinyeghị mgbalị na ha. Ma, ònye ga-anwatụdị anwa ime ha n’amụghị ha amụ, n’enweghị onye ibe gbasiri ike, nakwa karịsịa, n’enweghị ụdị nduzi ma ọ bụ ntụzi ziri ezi. N’otu aka ahụ, alụmdi na nwunye na-aga nke ọma pụrụ iyi ihe ndabara. Otú ọ dị, ọ na-adaberekwa n’ezi onye ibe, ná mgbalị a haziri ahazi, nakwa karịsịa n’ezi ndụmọdụ. N’ezie, nduzi kwesịrị ekwesị dị oké mkpa.

2. (a) Ònye guzobere ndokwa alụmdi na nwunye, n’ihi nzube dịkwa aṅaa? (b) Olee otú e siworo mee ndokwa alụmdi na nwunye ụfọdụ?

2 Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye iche echiche banyere onye òtù ọlụlụ—onye ya na ya ga-ebikọ ndụ. Kemgbe Jehova Chineke guzobere alụmdi na nwunye, ọ bụwo ụzọ ndụ dị otú o kwesịrị. Ma, ọ bụghị nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, họtara nwunye ya. Jehova ji ịhụnanya nye ya nwanyị. (Jenesis 2:18-24) Di na nwunye mbụ ahụ ga-amụba ka ụmụ mmadụ wee jupụta n’ụwa n’ikpeazụ. Mgbe alụmdi na nwunye mbụ ahụ gasịrị, ọ bụ nne na nna nwanyị a na-aga ịlụ alụ na nke nwoke na-aga ịlụ nwunye na-emekarị ndokwa alụmdi na nwunye, n’oge ụfọdụ mgbe ha hụrụ na ndị o metụtara ekwenyela. (Jenesis 21:21; 24:2-4, 58; 38:6; Joshua 15:16, 17) Ọ bụ ezie na a ka na-enwekarị alụmdi na nwunye ndị nne na nna jiri aka ha hazie n’ala nakwa n’ọdịbendị ụfọdụ, ọtụtụ ndị taa na-eji aka ha ahọrọ onye ha ga-alụ.

3. Olee otú e kwesịrị isi họrọ onye òtù ọlụlụ?

3 Olee otú e kwesịrị isi họta onye òtù ọlụlụ? Ọdịdị elu ahụ—ihe ha hụrụ dị ka ihe dị mma n’anya—na-emetụta otú ụfọdụ ndị si eme nhọrọ ha. Ndị ọzọ na-achọ abamuru ihe onwunwe, onye ga-elekọta ha anya nke ọma nakwa onye ga-egbo mkpa na ọchịchọ ha. Ma nanị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ọ̀ pụrụ iduga ná mmekọrịta obi ụtọ nke na-enye afọ ojuju? “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu,” ka Ilu 31:30 na-ekwu, “ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.” Otu isi ihe dị mkpa dị n’okwu ahụ: Cheta Jehova mgbe ị na-ahọrọ onye òtù ọlụlụ.

Nduzi Ịhụnanya Sitere n’Aka Chineke

4. Enyemaka dị aṅaa ka Chineke na-enye n’ihe metụtara ịhọrọ onye òtù ọlụlụ?

4 Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, enyewo anyị Okwu ya e dere ede iji duzie anyị n’ihe nile. Ọ na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya ịhụ n’ime Bible ụkpụrụ nduzi bụ́ ndị nọworo na-adị irè eri oge maka ịhọrọ onye òtù ọlụlụ. Jehova chọrọ ka alụmdi na nwunye anyị bụrụ nke na-adịgide adịgide ma na-enye obi ụtọ. N’ihi ya, o nyewo anyị ihe enyemaka iji mee ka anyị ghọta ma tinye ụkpụrụ nduzi ndị a n’ọrụ. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe anyị ga-atụ anya n’aka Onye Okike anyị na-ahụ n’anya?—Abụ Ọma 19:8.

5. Gịnị dị oké mkpa iji nwee obi ụtọ na-adịgide adịgide n’alụmdi na nwunye?

5 Mgbe Jehova guzobere ndokwa alụmdi na nwunye, o zubere ka ọ bụrụ nkekọ na-adịgide adịgide. (Mak 10:6-12; 1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Ọ bụ ya mere ‘o ji kpọọ ịchụpụ nwunye asị,’ na-ekwe ka e mee otú ahụ nanị n’ihi “ịkwa iko.” (Malakaị 2:13-16; Matiu 19:9) Ya mere, ịhọrọ onye òtù ọlụlụ bụ otu n’ime nzọụkwụ ndị kasị sie ike anyị pụrụ iwere, e kwesịghịkwa ile ya anya dị ka obere ihe. Ọ bụ mkpebi ole na ole pụrụ ịkpata obi ụtọ ma ọ bụ mwute dị ka ya. Ọ bụ ezie na nhọrọ dị mma pụrụ ime ka ndụ mmadụ nwekwuo nzube ma na-eju afọ, nhọrọ amamihe na-adịghị na ya pụrụ iweta iru újú na-adịghị akwụsị akwụsị. (Ilu 21:19; 26:21) Ka obi ụtọ wee dịgide, ọ dị oké mkpa ime nhọrọ n’ụzọ amamihe ma dị njikere ikwe nkwa na-adịgide adịgide, n’ihi na Chineke guzobere alụmdi na nwunye dị ka njikọ ga-aga nke ọma n’ebe e nwere nkwekọ.—Matiu 19:6.

6. N’ihi gịnị ka o ji dị ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ mkpa karịsịa ịkpachara anya mgbe ha na-ahọrọ onye òtù ọlụlụ, oleekwa otú ha pụrụ isi mee mkpebi amamihe kasị dịrị na ya?

6 Karịsịa, ọ dị ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ mkpa ịkpachara anya iji hụ na mma elu ahụ na mkpali ndị siri ike emegharịghị ha anya mgbe ha na-ahọrọ onye òtù ọlụlụ. N’ezie, mmekọrịta dabeere nanị n’ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ibibi ngwa ngwa banyezie ná nlelị ma ọ bụ ọbụna ịkpọasị. (2 Samuel 13:15) N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ ịzụlite ịhụnanya na-adịgide adịgide ka anyị na-amarakwu onye òtù ọlụlụ anyị nakwa ka anyị na-aghọtakwu onwe anyị nke ọma. Ọ dịkwa anyị mkpa ịghọta na ihe kasị mma nye anyị nwere ike ghara ịbụ ihe obi anyị chọrọ na mbụ. (Jeremaịa 17:9) Ọ bụ ya mere nduzi Chineke a na-achọta n’ime Bible ji dị oké mkpa. Ọ na-enyere anyị aka ịghọta otú anyị pụrụ isi mee mkpebi ndị amamihe kasị dịrị na ha ná ndụ. Ọbụ abụ ahụ sịrị na Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.” (Abụ Ọma 32:8; Ndị Hibru 4:12) Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye pụrụ imeju mkpa anyị bu pụta ụwa maka ịhụnanya na mkpakọrịta, ọ na-ewetakwa ihe ịma aka ndị chọrọ ntozu okè na nghọta.

7. Gịnị mere ụfọdụ adịghị anara ndụmọdụ ndị dabeere na Bible banyere ịhọrọ onye òtù ọlụlụ, ma gịnị ka ime otú a pụrụ iduga na ya?

7 Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịṅa ntị n’ihe Onye Mmalite nke alụmdi na nwunye nwere ikwu n’ihe banyere ịhọrọ onye òtù ọlụlụ. Ma, anyị pụrụ ịjụ ozugbo mgbe nne na nna anyị ma ọ bụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-enye anyị ndụmọdụ dabeere na Bible. Anyị pụrụ iche na ha adịghị aghọta anyị nke ọma, ọchịchọ mmetụta uche ndị siri ike pụkwara ịkpali anyị ịgbaso ọchịchọ nke obi anyị. Otú ọ dị, mgbe anyị chere ihe ndị na-eme eme ihu, anyị pụrụ ịkwa ụta na anyị aṅaghị ntị na ndụmọdụ amamihe e nyere maka ọdịmma anyị. (Ilu 23:19; 28:26) Anyị pụrụ ịchọta onwe anyị n’alụmdi na nwunye ịhụnanya na-adịghị na ya, na-enwe ụmụ ndị ọ na-esiri anyị ike ilekọta na ikekwe ọbụna na-enwe onye òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe. Lee ihe mwute ọ pụrụ ịbụ ma ọ bụrụ na ndokwa nke pụrụ iwetaworo anyị obi ụtọ dị ukwuu aghọọ ihe na-ewetara anyị obi ọjọọ dị ukwuu!

Nsọpụrụ Chineke—Isi Ihe Dị Mkpa

8. Olee otú nsọpụrụ Chineke na-esi enye aka n’ime ka alụmdi na nwunye dịgide ma na-eweta obi ụtọ?

8 N’eziokwu, mmadụ abụọ ahụ inwe ndọrọ n’ebe ibe ha nọ na-enye aka n’ime ka alụmdi na nwunye sikwuo ike. Ma ụkpụrụ ndị e nwekọrọ ọnụ dị mkpa ọbụna karị iji mee ka njikọ alụmdi na nwunye dịgide ma na-enye obi ụtọ. Mmadụ abụọ ahụ ịbụ ndị na-asọpụrụ Jehova Chineke na-eme ka e nwee nkekọ na-adịgide adịgide ma na-akwalite ịdị n’otu n’ụzọ nke ọ na-adịghị ihe ọzọ na-eme ya. (Eklisiastis 4:12) Mgbe di na nwunye bụ́ ndị Kraịst mere ka ndụ ha dabere n’ezi ofufe nke Jehova, ha na-adị n’otu n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ omume. Ha na-amụkọ Okwu Chineke ọnụ. Ha na-ekpekọ ekpere ọnụ, nke ahụ na-emekwa ka obi ha bụrụ otu. Ha abụọ na-eso aga nzukọ ndị Kraịst, na-arụkọkwa ọrụ ọnụ n’ozi ubi. Ihe a nile na-enye aka n’ime ka ha nwee nkekọ ime mmụọ nke na-adọtakwu ha nso n’ebe ibe ha nọ. Ọbụna nke ka mkpa, ọ na-eweta ngọzi Jehova.

9. Gịnị ka Abraham mere n’ihe banyere ịchọtara Aịsak nwunye, gịnịkwa si na ya pụta?

9 N’ihi nsọpụrụ Chineke ya, nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Abraham gbalịrị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ mgbe oge ruru ịhọtara nwa ya nwoke bụ́ Aịsak nwunye. Abraham gwara onye na-ejere ya ozi n’ụlọ bụ́ onye ọ tụkwasịrị obi, sị: “M ga-emekwa gị ka i were Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na Chineke nke ụwa, ṅụọ iyi, na ị gaghị alụtara nwa m nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom nke ndị Kenean, ndị mụ onwe m bi n’etiti ha: kama ọ bụ ala m na ụmụnna m ka ị ga-ejekwuru, lụtara nwa m, bụ́ Aịsak, nwunye. . . . [Jehova] ga-eziga mmụọ ozi Ya n’ihu gị, ị ga-esikwa n’ebe ahụ lụtara nwa m nwunye.” Rebeka bịara bụrụ nwunye pụrụ iche, bụ́ onye Aịsak hụrụ n’anya nke ukwuu.—Jenesis 24:3, 4, 7, 14-21, 67.

10. Ihe ndị dị aṅaa dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ka a chọrọ n’aka ndị bụ́ di na ndị bụ́ nwunye?

10 Ọ bụrụ na anyị bụ ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, nsọpụrụ Chineke ga-enyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị ga-eme ka anyị nwee ike imezu ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka alụmdi na nwunye. N’ime ihe ndị a chọrọ n’aka di na nwunye bụ ndị a Pọl onyeozi hotara: “Ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. . . . Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya . . . Ndị bụ́ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya, . . . Unu onwe unu n’otu n’otu hụkwa nwunye unu n’anya, onye ọ bụla ya hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya; ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.” (Ndị Efesọs 5:22-33) Dị ka anyị pụrụ ịhụ, okwu Pọl ndị sitere n’ike mmụọ nsọ na-emesi ike mkpa ịhụnanya na nsọpụrụ dị. Ịgbaso ndụmọdụ a gụnyere inwe egwu nsọpụrụ n’ebe Jehova nọ. Ọ chọrọ nkwa e ji obi dum kwee, ma n’oge ihe dị mma ma n’oge ihe dị njọ. Ndị Kraịst na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị inwe ike iburu ibu ọrụ a.

Ikpebi Oge A Ga-alụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye

11. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa banyere oge a ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ka e nyere n’Akwụkwọ Nsọ? (b) Ihe atụ dị aṅaa na-egosi amamihe dị n’ịgbaso ndụmọdụ Bible e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 7:36?

11 Ịmara mgbe anyị dị njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye dị oké mkpa. Ebe ọ bụ na nke a dịgasị iche n’ebe otu onye na onye ọzọ nọ, Akwụkwọ Nsọ ekwughị afọ ole a ga-adị. Otú ọ dị, ọ na-egosi na ọ kasị mma ichere ruo mgbe anyị ‘gafere ntoju ntorobịa,’ bụ́ mgbe mkpali mmekọahụ ndị siri ike pụrụ imegharị mmadụ anya. (1 Ndị Kọrịnt 7:36, NW) “Mgbe m hụrụ ka ndị enyi m na-eso ụmụ nwoke na-eme mkpapụ ma na-alụ di, ọtụtụ ha n’oge ha dị afọ iri na ụma, o siiri m ike mgbe ụfọdụ itinye ndụmọdụ a n’ọrụ,” ka Michelle na-ekwu. “Ma aghọtara m na ndụmọdụ ahụ sitere n’aka Jehova, ọ na-agwakwa anyị nanị ihe bụ́ maka ọdịmma anyị. Site n’icheretụ tupu m lụọ di, abịara m nwee ike ilekwasị anya ná mmekọrịta mụ na Jehova ma nweta ahụmahụ ụfọdụ ná ndụ, bụ́ nke ị na-agaghị enwe ma eleghị anya n’oge ị dị afọ iri na ụma. Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, abịara m dịrị njikere karị ịhụ maka ibu ọrụ nakwa nsogbu ndị na-ebilite n’alụmdi na nwunye.”

12. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya mmadụ ịghara iji ọsọ gbaba n’alụmdi na nwunye mgbe ọ ka na-eto eto?

12 Ndị na-eji ọsọ alụ di ma ọ bụ nwunye mgbe ha ka bụ nnọọ ndị na-eto eto na-achọpụtakarị na mkpa ha na ọchịchọ ha na-agbanwe ka ha na-etozu okè. Ha na-achọpụta mgbe ahụ na ihe ndị ha hụburu dị ka ihe ndị a na-achọsi ike adịghịzi oké mkpa. Otu onye Kraịst na-eto eto kpebiri na ya ga-alụ di mgbe ọ dị afọ 16. Nne ya ochie lụrụ di mgbe ọ nọ n’afọ ndụ ahụ, otú ahụkwa ka nne ya mere. Mgbe otu nwa okoro o nwere mmasị n’ebe ọ nọ jụrụ ịlụ ya n’oge ahụ, ọ họọrọ onye ọzọ dị njikere ime otú ahụ. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị ná ndụ, ọ kwara ụta nke ukwuu maka mkpebi o mere ọkụ ọkụ.

13. Gịnị ka ndị na-alụ di ma ọ bụ nwunye mgbe ha na-etozubeghị okè na-adịghị enwekarị?

13 Mgbe ị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ dị mkpa inwe nghọta zuru ezu banyere ihe ndị ọ gụnyere. Ịlụ di ma ọ bụ nwunye mgbe mmadụ na-etozubeghị okè pụrụ iweta ọtụtụ nsogbu ndị o yiri ka ndị di na nwunye ka na-eto eto adịchaghị njikere ịchịkwa. E nwere ike ha agaghị enwe ahụmahụ na ntozu okè ndị dị mkpa iji chịkwaa nrụgide ndị a na-enwe n’alụmdi na nwunye na ịzụ ụmụ. Anyị kwesịrị ịbanye n’alụmdi na nwunye nanị mgbe anyị dị njikere n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ, ịmalite njikọ na-adịgide adịgide.

14. Gịnị dị mkpa iji na-edozi ọnọdụ ndị na-eweta nrụgide n’alụmdi na nwunye?

14 Pọl dere na ndị na-alụ di ma ọ bụ nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Nsogbu ga-ebilite n’ihi na ha bụ mmadụ abụọ dị nnọọ iche, ụzọ ha sikwa ele ihe anya ga-adị iche. N’ihi ezughị okè mmadụ, ọ pụrụ isi ike imezu ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ anyị n’aka ná ndokwa alụmdi na nwunye. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Kọlọsi 3:18, 19; Taịtọs 2:4, 5; 1 Pita 3:1, 2, 7) Ọ chọrọ ntozu okè na ịkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ iji chọọ ma gbasoo nduzi Chineke iji jiri ịhụnanya na-edozi ọnọdụ ndị na-eweta nrụgide.

15. Òkè dị aṅaa ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ikere n’ịkwadebe ụmụ ha maka alụmdi na nwunye? Nye ihe atụ.

15 Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịkwadebe ụmụ ha maka alụmdi na nwunye site n’inyere ha aka ịghọta mkpa ịgbaso nduzi Chineke dị. Site n’iji Akwụkwọ Nsọ na mbipụta ndị Kraịst mee ihe nke ọma, ndị mụrụ ụmụ pụrụ inyere ụmụ ha aka ikpebi ma ha ma ọ bụ onye ha na-aga ịlụ ha adịwo njikere ikwe nkwa ọlụlụ. * Blossom bụ́ onye dị afọ 18 chere na ya na otu nwa okoro nọ n’ọgbakọ ya hụrụ onwe ha n’anya. Ọ bụ onye ọsụ ụzọ oge nile, ha chọkwara ịlụ onwe ha. Ma nne na nna ya gwara ya ka o cherekwuo ruo otu afọ, na-eche na ọ ka dị nnọọ obere. Blossom mesịrị dee, sị: “Enwere m nnọọ ekele na m ṅara ntị na ndụmọdụ amamihe ahụ. N’ime afọ ahụ, etozutụkwuru m okè wee malite ịhụ na nwa okoro a enweghị àgwà ndị na-egosi ezi onye òtù ọlụlụ. O mesịrị si ná nzukọ Jehova pụọ, alanahụkwara m ihe gaara abụwo ọdachi ná ndụ m. Lee ka o si magbuo onwe ya inwe ndị nne na nna maara ihe bụ́ ndị a pụrụ ịdabere n’echiche ha!”

‘Lụọ Nanị n’Ime Onyenwe Anyị’

16. (a) Olee otú a pụrụ isi nwaa ndị Kraịst ọnwụnwa n’ihe banyere ‘ịlụ n’ime onyenwe anyị’? (b) Mgbe a nwara onye Kraịst ịlụ onye na-ekweghị ekwe, gịnị ka o kwesịrị ịtụgharị uche na ya?

16 Nduzi Jehova nyere ndị Kraịst doro nnọọ anya: ‘Lụọ nanị n’ime Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 7:39) A pụrụ ịnwa ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na ụmụ ha ọnwụnwa n’akụkụ a. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị na-eto eto pụrụ ịchọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma e nwere ike ha agaghị ahụ onye ha ga-alụ n’ọgbakọ. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, otú ahụ ka o yiri. Ndị ikom pụrụ ịdị ole na ole karịa ndị inyom n’otu ógbè, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị onye e lere anya dị ka onye kwesịrị ekwesị n’ógbè ahụ. Otu nwa okoro nke na-abụghị onye òtù ọgbakọ raara onwe ya nye pụrụ igosipụta mmasị n’ebe otu nwa agbọghọ bụ́ onye Kraịst nọ (ma ọ bụ nwa agbọghọ na-anọghị n’ọgbakọ egosi mmasị n’ebe nwoke bụ́ onye Kraịst nọ), e nweekwa nrụgide ileghara ụkpụrụ ndị Jehova setịpụworo anya. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ ga-adị mma ịtụgharị uche n’ihe nlereanya nke Abraham. Otu ụzọ o si nọgide soro Chineke na-enwe ezi mmekọrịta bụ site n’ịhụ na nwa ya nwoke bụ́ Aịsak lụrụ ezi onye na-efe Jehova. Aịsak mere otu ihe ahụ n’ebe nwa ya nwoke bụ́ Jekọb nọ. Ndị nile nke a metụtara tinyere mgbalị, ma o mere Chineke obi ụtọ ma weta ngọzi ya.—Jenesis 28:1-4.

17. N’ihi gịnị ka ịlụ onye na-ekweghị ekwe ji yie ka ọ ga-eweta ọdachi, oleekwa ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji ‘lụọ nanị n’ime Onyenwe anyị’?

17 N’ọnọdụ ole na ole, onye ahụ na-ekweghị ekwe mesịrị ghọọ onye Kraịst. Otú ọ dị, ịlụ onye na-ekweghị ekwe ewetawo ọdachi mgbe mgbe. Ndị ahụ e kekọtara n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ enweghị otu nkwenkwe, ụkpụrụ, ma ọ bụ ihe mgbaru ọsọ. (2 Ndị Kọrint 6:14) Nke a pụrụ inwe mmetụta na-ebibi ihe ná nkwurịta okwu nakwa n’obi ụtọ alụmdi na nwunye. Dị ka ihe atụ, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst kwara arịrị nke ukwuu n’eziokwu bụ́ na mgbe nzukọ na-ewuli elu gasịrị, ọ pụghị ịla n’ụlọ ma soro di ya na-ekweghị ekwe kwurịta ihe ime mmụọ. N’ezie, nke ka mkpa bụ na ‘ịlụ n’ime Onyenwe anyị’ bụ okwu metụtara iguzosi ike n’ihe nye Jehova. Mgbe anyị gbasoro Okwu Chineke, obi anyị adịghị ama anyị ikpe, n’ihi na anyị na-eme ihe “na-atọ ụtọ n’ihu Ya.”—1 Jọn 3:21, 22.

18. Mgbe mmadụ na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ihe ndị dị aṅaa dị mkpa ka o kwesịrị ichebara echiche, n’ihi gịnịkwa?

18 Mgbe ị na-atụle ịlụ di ma ọ bụ nwunye, omume ọma na ọnọdụ ime mmụọ nke onye ị na-aga ịlụ kwesịrị ịbụ nchegbu gị bụ́ isi. Àgwà ndị Kraịst, tinyere ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na nrara mmadụ ji obi dum rara onwe ya nye ya, bara nnọọ uru karịa ndọrọ elu ahụ. Chineke na-anakwere ndị ghọtara ma na-arụzu ibu ọrụ ha nke ịbụ di na nwunye siri ike n’ụzọ ime mmụọ. Nkwụsi ike kasịnụ di na nwunye ga-enwe na-abịa site na mmadụ abụọ ahụ ịsọpụrụ Onye Okike na ịnakwere nduzi ya n’ụzọ zuru ezu. N’ụzọ dị otú a, a na-enye Jehova nsọpụrụ, alụmdi na nwunye ahụ na-amalitekwa na ntọala ime mmụọ siri ike nke ga-atụnye ụtụ n’inwe nkekọ na-adịgide adịgide.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Lee Ụlọ Nche nke February 15, 1999, peeji nke 4-8.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka nduzi Chineke ji dị mkpa iji họrọ ezi onye òtù ọlụlụ?

• Olee otú nsọpụrụ Chineke ga-esi enye aka n’ime ka njikọ alụmdi na nwunye sikwuo ike?

• Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi kwadebe ụmụ ha maka alụmdi na nwunye?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ‘ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Itinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ n’ịhọrọ onye òtù ọlụlụ pụrụ iweta obi ụtọ dị ukwuu

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ngọzi bara ụba na-abịa site ‘n’ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị’