Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya
Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya
EBE ọ bụla i lere anya, nhụjuanya dị. Ụfọdụ ji aka ha na-akpatara ya onwe ha. Ha na-ebute ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ ma ọ bụ na-enweta ihe ndị ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ ise siga na-akpata. Ma ọ bụ ha pụrụ inwe nsogbu ahụ ike n’ihi erighị nri n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, nhụjuanya dị ukwuu na-esite n’ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe omume ndị karịrị ike mmadụ nkịtị: agha, ime ihe ike nke agbụrụ, mpụ, ịda ogbenye, ụnwụ nri, ọrịa. Otu ihe ọzọ ụmụ mmadụ na-apụghị ịchịkwa bụ nhụjuanya ndị e jikọtara ha na ịka nká na ọnwụ.
Bible na-emesi anyị obi ike na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) N’ihi gịnịzi ka Chineke na-ahụ n’anya jiworo kwere ka nhụjuanya a nile dịgide eri ọtụtụ narị afọ? Olee mgbe ọ ga-edozi ọnọdụ ahụ? Iji zaa ajụjụ ndị dị otú ahụ, ọ dị anyị mkpa inyocha nzube Chineke n’ihe banyere ụmụ mmadụ. Nke a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị na ihe ọ ga-eme banyere ya.
Onyinye nke Nnwere Onwe Ime Nhọrọ
Mgbe Chineke kere mmadụ mbụ, ọ bụghị nanị anụ ahụ nke nwere ụbụrụ ka o kere. Ọzọkwa, Chineke ekeghị Adam na Iv ịbụ ígwè ọrụ na-enweghị uche. O tinyere n’ime ha ikike nke nnwere onwe ime nhọrọ. Nke ahụ bụkwa onyinye mara nnọọ mma, n’ihi na ‘Chineke hụrụ ihe nile ọ bụla O mere, ma lee, ọ dị mma nke ukwuu.’ (Jenesis 1:31) Ee, “ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Anyị nile na-eji onyinye nke nnwere onwe ime nhọrọ a kpọrọ ihe n’ihi na anyị achọghị ka a na-atụziri anyị ụzọ nile anyị ga-esi na-eche echiche ma ọ bụ mee omume n’enwetụghị nnọọ ike ime nhọrọ n’ihe ọ bụla.
Otú ọ dị, à ga-eji onyinye ahụ mara nnọọ mma nke nnwere onwe ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè? Ná nduzi e nyere ndị Kraịst oge gboo, Okwu Chineke na-aza, sị: “Dị ka ndị nweere onwe ha, ma unu enweghị inwe onwe unu ahụ dị ka ihe mkpuchi nke ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu nke Chineke.” (1 Pita 2:16) Maka ọdịmma nke mmadụ nile, a ghaghị inwe ebe ọ ga-ejeru. N’ihi ya, ụkpụrụ iwu gaje ịchịkwa nnwere onwe ime nhọrọ. Ma ọ bụghị ya, a ga-enwe ọgba aghara.
Ọ̀ Bụ Iwu Onye?
Ọ̀ bụ iwu onye ga-ekpebi ebe kwesịrị ekwesị nnwere onwe ga-ejedebe? Azịza nye ajụjụ a na-emetụta isi ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. Ebe ọ bụ Chineke kere ụmụ mmadụ, ọ kasị mara iwu ndị ọ dị mkpa ka ha rube isi na ha maka ọdịmma ha na nke ndị ọzọ. Bible si otú a kwuo ya: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.
N’ụzọ doro anya, otu isi ihe dị mkpa bụ nke a: E keghị ụmụ mmadụ ịnọ n’adabereghị n’ebe Chineke nọ. O mere ha n’ụzọ nke na ihe ịga nke ọma ha na obi ụtọ ha na-adabere n’irube isi n’iwu ezi omume ya. Onye amụma Chineke bụ́ Jeremaịa sịrị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
Chineke mere ihe a kpọrọ mmadụ ịnọ n’okpuru iwu ya nke okike, dị ka iwu nke ike ndọda. N’ụzọ yiri nke ahụ, o mere ụmụ mmadụ ịnọ n’okpuru iwu omume ọma ya, bụ́ ndị e mere iji mee ka e nwee ọha mmadụ nke na-emekọ ihe ọnụ. Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere Okwu Chineke ji na-agba ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị.”—Ilu 3:5.
Ya mere, ihe a kpọrọ mmadụ apụghị inwe ihe ịga nke ọma ma ọlị n’iduzi onwe ha n’enweghị ọchịchị Chineke. N’ịgbalị ịnọrọ onwe ha n’adabereghị n’ebe ọ nọ, ndị mmadụ ga-echepụta usoro ọha na eze, nke akụ̀ na ụba, nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke okpukpe ndị na-emegiderịta onwe ha, ‘mmadụ enwewokwa ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’—EKlisiastis 8:9.
Olee Ihe Gahierenụ?
Chineke nyere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, mmalite zuru okè. Ha nwere ahụ na uche zuru okè nakwa ubi paradaịs ịbụ ebe obibi ha. Ọ bụrụkwa na ha doo onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke, ha gaara anọgide bụrụ ndị zuru okè ma na-enwe obi ụtọ. Ka oge na-aga, ha gaara abụ nne na nna nke ezinụlọ nile zuru okè, ndị na-enwe obi ụtọ, bụ́ ndị bi n’ụwa paradaịs. Nke ahụ bụ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ.—Jenesis 1:27-29; 2:15.
Otú ọ dị, nne na nna anyị mbụ ji nnwere onwe ha ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ha chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ha pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’adabereghị n’ebe Chineke nọ. Ha kpebiri n’onwe ha imebi iwu ya. (Jenesis, isi 3) N’ihi na ha jụrụ ịchịisi ya, ọ bụkwaghị ọrụ dịịrị ya ime ka ha nọgide bụrụ ndị zuru okè. ‘Ha bibiri onwe ha, ha anọgideghị na-abụ ụmụ ya, ọrụsị ahụ bụ nke ha.’—Deuterọnọmi 32:5.
Malite n’oge ha nupụụrụ Chineke isi, Adam na Iv malitere ịka nká n’anụ ahụ na n’uche. N’ebe Jehova nọ ka isi iyi ndụ dị. (Abụ Ọma 36:9) Ya mere, n’ihi ikewapụ onwe ha n’ebe Jehova nọ, mmadụ abụọ mbụ ahụ ghọrọ ndị na-ezughị okè ma mesịakwa nwụọ. (Jenesis 3:19) N’ikwekọ n’ụzọ nke ihe nketa mkpụrụ ndụ, ụmụ ha pụrụ iketa nanị ihe ndị mụrụ ha nwere n’onwe ha. Gịnịkwa ka nke ahụ bụ? Ọ bụ ezughị okè na ọnwụ. N’ihi ya Pọl onyeozi dere, sị: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.
Ihe Iseokwu Bụ́ Isi—Ọbụbụeze
Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, ha mara ọbụbụeze ya aka, ya bụ, ikike o nwere ịchị achị. Jehova pụrụ ibibiworị ha ma kee nwoke na nwanyị ọzọ, ma nke ahụ agaraghị edozi ihe iseokwu ahụ nke bụ́ onye ịchịisi ya ziri ezi ma dị mma karịsịa nye ndị mmadụ. N’ịbụ ndị e nyere oge iwulite ọha mmadụ ha dị ka echiche ha si dị, ụmụ mmadụ ga-egosipụta n’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya ma ịchịisi n’adabereghị n’ebe Chineke nọ ọ̀ dị mgbe ọ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma.
Gịnị ka ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme mmadụ na-egosi? N’ọtụtụ narị afọ ndị ahụ nile, ndị mmadụ anwalewo usoro dị iche iche nke ọha mmadụ, nke akụ̀ na ụba, nke ọchịchị, na nke okpukpe. Otú ọ dị, ajọ omume na nhụjuanya anọgidewo na-adị. N’eziokwu, ‘ndị ajọ mmadụ agawo n’ihu n’ịjọkarị njọ,’ karịsịa n’oge anyị.—2 Timoti 3:13.
A rụpụtara ihe kasịnụ na nkà mmụta sayensị nakwa n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na narị afọ nke 20. Ma e nwekwara nhụjuanya kasị njọ e nwetụrụla n’akụkọ ihe mere eme mmadụ n’oge a. N’agbanyeghịkwa ọganihu ndị e nwere ná nlekọta ahụ ike, iwu Chineke ka nọgidere na-abụ eziokwu: Ụmụ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke—isi iyi nke ndụ—nọ na-arịa ọrịa, na-aka nká, na-anwụkwa anwụ. Lee nnọọ otú o siworo gosi n’ụzọ doro anya na ụmụ mmadụ apụghị ‘ime ka nzọụkwụ ha guzozie’!
E Gosipụta Ọbụbụeze Chineke
N’ụzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha, nnwale a wetara ọdachi a nwalere adabereghị n’ebe Chineke nọ egosipụtawo na ịchịisi ụmụ mmadụ n’agụnyeghị ya agaghị aga nke ọma. Nanị ịchịisi Chineke pụrụ iweta obi ụtọ, ịdị n’otu, ahụ ike, na ndụ. Ọzọkwa, Okwu Jehova Chineke nke na-adịghị ada ada, bụ́ Bible Nsọ, na-egosi na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke ịchịisi ụmụ mmadụ n’adabereghị na Chineke. (2 Timoti 3:1-5) Nkwere Jehova kwere ka nke a, nakwa ajọ omume na nhụjuanya dịrị na-eru ọgwụgwụ ya.
Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ n’oge na-adịghị anya. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ịchịisi ụmụ mmadụ ndị dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie [n’eluigwe], nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ [ụmụ mmadụ agaghị achịkwa ụwa ọzọ]; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [ịchịisi ndị dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Iwepụ ọbụbụeze Jehova Chineke n’ụta site n’Alaeze eluigwe ya bụ isiokwu nke Bible. Jisọs mere ka nke a bụrụ ozizi ya bụ́ isi. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Mgbe ịchịisi Chineke ga-anọchi nke ụmụ mmadụ, olee ndị ga-alanarị, oleekwa ndị na-agaghị alanarị? N’Ilu 2:21, 22, e mesiri anyị obi ike, sị: “N’ihi na ndị ziri ezi [ndị na-akwado ịchịisi Chineke] ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu [ndị na-adịghị akwado ịchịisi Chineke] ka a ga-ebipụ n’ụwa.” Ọbụ abụ ahụ Chineke nyere ike mmụọ nsọ bụrụ, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:10, 11, 29.
Ụwa Ọhụrụ Magburu Onwe Ya
N’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke, a ga-eme ka ndị lanarịrị ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a baa n’ime ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha pụọ n’ajọ omume na nhụjuanya. A ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ ntụziaka sitere n’aka Chineke, ka oge na-agakwa, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Izi ihe a na-ewuli elu, nke bara uru, ga-eme ka e nwee ọha mmadụ nke dị n’udo, nke na-emekọ ihe ọnụ n’ezie. N’ihi ya, a gaghị enwekwa agha, igbu mmadụ, ime ihe ike, ndina n’ike, izu ohi, ma ọ bụ ụdị mpụ ọ bụla ọzọ.
Ụmụ mmadụ na-erube isi bụ́ ndị bi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke Chineke ga-enweta uru nkịtị ndị magburu onwe ha. A gaje iwepụ ihe ọjọọ nile si ná nnupụisi ahụ e nupụụrụ ịchịisi Chineke pụta. Ezughị okè, ọrịa, ịka nká, na ọnwụ ga-abụ ihe mgbe ochie. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ na-ekwe nkwa, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ: n’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.” (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6) Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ inwe ahụ ike bụ́ ịgba kwa ụbọchị—ruo mgbe ebighị ebi!
N’okpuru nduzi ịhụnanya Chineke, ndị bi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ga-eji ike na nkà ha dị iche iche mee ihe n’iwu paradaịs zuru ụwa ọnụ. Ịda ogbenye, agụụ, na enweghị ebe obibi agaghị adịkwa ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na amụma Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.” (Aịsaịa 65:21, 22) N’ezie, “ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.
Ụwa ga-azaghachi ná nlekọta ịhụnanya nke Chineke na nke ụmụ mmadụ na-erube isi. Anyị nwere mmesi obi ike ndị a sitere n’Akwụkwọ Nsọ: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe Aịsaịa 35:1, 6) “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16.
na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. . . . N’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.” (Gịnị maka ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụworo anwụ? A ga-eweghachi ndị nọ ná ncheta Chineke ná ndụ, n’ihi na “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Ee, a ga-eweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ. A ga-ezi ha eziokwu ndị dị ebube banyere ịchịisi Chineke, nyekwa ha ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs.—Jọn 5:28, 29.
Site n’ụzọ ndị a, Jehova Chineke gaje ịgbanwe kpam kpam, ọnọdụ ahụ jọgburu onwe ya nke nhụjuanya, ọrịa, na ọnwụ nke jichiworo ihe a kpọrọ mmadụ eri ọtụtụ puku afọ. Ọrịa agaghị adịkwa! Nkwarụ agaghị adịkwa! Ọnwụ agaghị adịkwa! Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile [ga-agabigawo].”—Mkpughe 21:3, 4.
Otú ahụ ka Chineke ga-esi mee ka nhụjuanya kwụsị. Ọ gaje ibibi ụwa nke a rụrụ arụ ma webata usoro ihe dị nnọọ ọhụrụ nke “ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Lee ozi ọma nke a bụ! Ụwa ọhụrụ ahụ dịsi anyị mkpa ike. Anyị agaghịkwa eche ruo ogologo oge tupu anyị ahụ ya. Site ná mmezu nke amụma Bible dị iche iche, anyị maara na ụwa ọhụrụ ahụ dị nnọọ ezi nso, nkwere Chineke kwekwara ka nhụjuanya dịrị na-eru ọgwụgwụ ya.—Matiu 24:3-14.
[Igbe dị na peeji nke 8]
Ọdịda nke Ịchịisi Mmadụ
Banyere ọchịchị ụmụ mmadụ, onye bụbu Onyeisi Ala Germany bụ́ Helmut Schmidt kwuru, sị: “Anyị bụ́ ụmụ mmadụ . . . anọwo mgbe nile na-achị ụwa n’ụzọ na-ezughị ezu, n’ihe kakwa ukwuu n’oge ahụ, n’ụzọ dị nnọọ njọ. . . . Ọ dịtụbeghị mgbe anyị chịrị ya n’udo n’ụzọ zuru ezu.” Akwụkwọ bụ́ Human Development Report 1999 kwuru, sị: “Mba nile na-akọ banyere ndakpọ nke njikọ ọha na eze nke ha, na-arụpụta ọgba aghara ọha na eze, mpụ na-abawanye ụba, ime ihe ike ka ukwuu n’ebe obibi. . . . Iyi egwu na-arịwanye elu n’ụwa nile, na-agafekwa ike mba dị iche iche nwere ịgbaso ha mgba, na-agafekwa ihe mba ụwa na-eme n’ihi ha.”
[Foto dị na peeji nke 8]
“Ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 5]
Nke atọ site n’elu, nne na nwa: FAO photo/B. Imevbore; n’ala ala, mgbawa: U.S. National Archives photo