Nsogbu nke Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ
Nsogbu nke Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ
“N’IHI GỊNỊ, CHINEKE N’IHI GỊNỊ?” Isiokwu ahụ gbara okpotokpo pụtara n’ihu otu akwụkwọ akụkọ e kesara nke ukwuu mgbe otu ala ọma jijiji nke bibiri ihe nke ukwuu mesịrị n’Asia Minor. Otu ihe osise ya na ya so gosiri ebe otu nna obi na-adịghị mma ku nwa ya nwanyị merụrụ ahụ na-apụta site n’ụlọ ha dara ada.
Agha, ụnwụ nri, ntiwapụ ọrịa, na ọdachi ndị na-emere onwe ha akpatawo oké ihe mgbu, anya mmiri dị ukwuu, gbuokwa ọtụtụ ndị. Gbakwụnye na nke a nhụsianya nke ndị e dinara n’ike, mmetọ ụmụaka, na mpụ ndị ọzọ. Cheedị banyere ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị na-emerụ ahụ na ndị na-anwụ n’ihe mberede. Ọtụtụ ijeri mmadụ na-atakwa oké ahụhụ n’ihi ọrịa, ime agadi, na ọnwụ nke ndị ha hụrụ n’anya.
Narị afọ nke 20 hụrụ ụdị nhụjuanya kasị njọ e nwetụrụla. Malite na 1914 ruo 1918, Agha Ụwa nke Mbụ gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị soja iri. Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-asị na o gburu ndị nkịtị harukwara otú ahụ. N’Agha Ụwa nke Abụọ, e gburu ihe dị ka ndị agha na ndị nkịtị dị nde 50, gụnyere ọtụtụ nde ụmụ nwanyị, ụmụaka, na ndị agadi nwoke. N’ime narị afọ gara aga nile, ọtụtụ nde ndị ọzọ bụ ndị mgbuchapụ agbụrụ, mgbanwe ọchịchị, ime ihe ike nke agbụrụ, agụụ na ịda ogbenye metụtara. Akwụkwọ bụ́ Historical Atlas of the Twentieth Century na-eme atụmatụ na ihe karịrị nde mmadụ 180 nwụrụ n’ihi “ọnọdụ ọjọọ” dị otú ahụ nke “metụtara ọha mmadụ.”
Oké ahụ ọkụ Spain bụ́ nke mere na 1918/1919 gburu nde mmadụ 20. N’ime iri afọ abụọ gara aga, ihe dị ka nde mmadụ 19 nwụrụ n’ihi ọrịa AIDS, ihe dịkwa ka nde mmadụ 35 bukwa nje na-akpata ya ugbu a. Ọtụtụ nde ụmụaka enwekwaghị nne ma ọ bụ nna—ha nwụrụ n’ihi ọrịa AIDS. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-anwụkwa n’ihi ọrịa AIDS, ndị ha butere mgbe ha ka nọ n’afọ.
A na-emekwa ka ụmụaka nwekwuo nhụjuanya n’ụzọ ndị ọzọ dị iche iche. N’ihota ihe Òtù Na-ahụ Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) kwuru, ná ngwụcha nke 1995, akwụkwọ akụkọ England bụ́ Manchester Guardian Weekly kwuru, sị: “N’agha ndị a lụrụ n’afọ iri gara aga, e gbuwo nde ụmụaka 2, mee ka nde 4-5 nwee nkwarụ, mee ka nde 12 ghara inwekwa ebe obibi, mee ka ihe karịrị 1 nde ghara inwe nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ bụrụ ndị e kewapụrụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ, kpatakwara nde 10 mkpasasị uche.”
Gbakwụnye na nke a nsikwopụ afọ ime nde 40 ruo 50 e mere atụmatụ na a na-enwe gburugburu ụwa—kwa afọ!Gịnị Maka Ọdịnihu?
Ọtụtụ na-atụ egwu maka ọdịnihu. Otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị kwuru, sị: “Ihe omume ụmụ mmadụ . . . nwere ike ịgbanwe ụwa e bi n’ime ya nke ukwuu nke na ọ gaghị enwe ike ịkwado ndụ otú anyị maara.” Ha gbakwụnyere, sị: “Ọbụna ugbu a, otu onye n’ime mmadụ ise ọ bụla dara ogbenye ọnụ ntụ n’enweghị ihe ga-ezuru ya iri, otu onye n’ime mmadụ iri ọ bụla adịghịkwa eri nri na-edozi ahụ.” Ndị ọkà mmụta sayensị ahụ ji ohere ahụ “dọọ ihe nile a kpọrọ mmadụ aka ná ntị banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu” ma kwuo, sị: “A chọrọ oké mgbanwe n’ụzọ anyị si elekọta ụwa na ihe ndị dị ndụ n’ime ya, ma ọ bụrụ na a ga-ezere oké nhụsianya nke ụmụ mmadụ, ma ọ bụrụkwa na a gaghị ebibi mbara ala a bụ́ ebe obibi anyị n’ụzọ a na-apụghị idozi edozi.”
N’ihi gịnị ka Chineke jiworo kwere ka oké nhụjuanya na ajọ omume dịrị? Olee otú ọ na-ezube isi dozie ọnọdụ ahụ? Olee mgbe?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
N’elu, oche nkwagharị: Foto UN/DPI 186410C nke P.S. Sudhakaran sere; n’etiti, ụmụaka agụụ na-agụgbu: WHO/OXFAM; n’ala ala, nwoke tara ahụ: FAO photo/B. Imevbore