‘Site n’Amamihe Ka Ụbọchị Anyị Ga-aba Ụba’
‘Site n’Amamihe Ka Ụbọchị Anyị Ga-aba Ụba’
OLEE onye na-agaghị ekweta na amamihe dị oké mkpa ma a bịa n’idozi nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ? Ezi amamihe bụ ikike nke itinye ihe ọmụma na nghọta n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ dị nnọọ iche n’ebe nzuzu, iberibe, na enweghị uche dị. N’ihi ya Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume inweta amamihe. (Ilu 4:7) N’ezie, e dere akwụkwọ Bible bụ́ Ilu n’ụzọ bụ́ isi iji nye amamihe na ịdọ aka ná ntị. Okwu o ji meghee na-agụ, sị: “Ilu dị iche iche nke Solomọn nwa Devid, bụ́ eze Israel: ịma amamihe na ịdọ aka ná ntị.”—Ilu 1:1, 2.
Tụlee nnọọ nkụzi rijuru afọ nke isiakwụkwọ ole na ole ndị mbụ nke Ilu. Dị ka nna na-ahụ n’anya nke na-agba nwa ya nwoke ume, Solomọn na-arịọ ndị na-agụ akwụkwọ ya ka ha nara ịdọ aka ná ntị ma tọọrọ amamihe ntị ha n’ala. (Isi nke 1 na nke 2) Ọ na-egosi anyị ụzọ anyị ga-esi soro Jehova na-akpachi anya na ụzọ anyị ga-esi echebe obi anyị. (Isi nke 3 na nke 4) A na-adụ anyị ọdụ ịnọgide na-adị ọcha n’omume. (Isi nke 5 na nke 6) Ee, otú o si kpughee ụzọ onye na-eme omume rụrụ arụ na-esi eme ihe baara anyị oké uru. (Isi nke 7) Leekwa otú arịrịọ nke amamihe a kọwara ka ọ̀ bụ mmadụ si adọrọ mmasị onye ọ bụla! (Isi nke 8) Tupu ọ na-agafe n’ilu ndị ahụ dị nkenke n’otu n’otu n’isiakwụkwọ ndị sochirinụ, Eze Solomọn chịkọtara ihe ọ tụleworo ruo ugbu a, n’ụzọ na-akpali akpali.—Isi nke 9.
‘Bịa, Rie Nri M, Ṅụọkwa Mmanya Vine M’
Okwu mmechi nke akụkụ mbụ nke Ilu abụghị okwu nchịkọta na-agwụ ike nke gosipụtara nanị ndụmọdụ a kpọtụrụ aha na mbụ. Kama nke ahụ, e dere ya dị ka ihe atụ na-akpali akpali ma na-adọrọ mmasị, na-akwali onye na-agụ ya ịchụso amamihe.
Isi nke 9 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu ji okwu ndị a meghee: “Amamihe ewuwo ụlọ ya, ọ wapụtawo ogidi asaa ya.” (Ilu 9:1) Okwu bụ́ “ogidi asaa,” ka otu ọkà mmụta na-atụ aro ya, bụ ihe “na-egosi nnukwu ụlọ e wuru gburugburu otu ogige, nke nwere ogidi atọ na nke ọ bụla n’ime akụkụ ya abụọ nakwa otu ogidi nke dị n’etiti akụkụ ya nke atọ nke chere ihu n’ebe e si abanye ya.” Otú o sina dị, ezi amamihe ewuwo ụlọ siri ike maka ịnabata ọtụtụ ndị ọbịa.
A kwadebewo ihe nile maka inwe oriri. Anụ dị n’ebe ahụ, dịkwa ka mmanya dị. Amamihe n’onwe ya ahụwo maka ịkwadebe nri ahụ na idozi tebụl. “O gbuwo anụ ogbugbu ya; ọ gwawo mmanya vine ya agwa; o dowokwa tebụl ya n’usoro.” (Ilu 9:2) O doro anya na e nwere nri na-enye nghọta n’ụzọ ime mmụọ n’elu tebụl ihe atụ a.—Aịsaịa 55:1, 2.
Olee ndị a kpọrọ ịbịa oriri a ezi amamihe kwadebere? “O zipụwo ụmụ agbọghọ ya, ọ na-akpọ òkù n’elu ebe nile dị elu nke obodo, sị, Onye ọ bụla na-enweghị uche, ya wezụga onwe ya bata n’ebe a: onye obi amamihe kọrọ, amamihe asịwo ya, Bịanụ, rienụ nri m ụfọdụ, ṅụọkwanụ mmanya vine ụfọdụ nke m gwaworo agwa. Hapụnụ amaghị ihe, unu ndị na-enweghị uche, wee dị ndụ; gaakwanụ n’ihu n’ụzọ nghọta.”—Ilu 9:3-6.
Amamihe ezipụwo ụmụ agbọghọ ya ije kpọọ òkù. Ha ejewo n’ebe ndị ọha na eze na-anọ bụ́ ebe ha pụrụ ịkpọ ọnụ ọgụgụ mmadụ kasị ukwuu òkù. A na-akpọ mmadụ nile òkù—ndị “obi amamihe kọrọ,” ma ọ bụ ndị na-enweghị nghọta, gụnyere ndị na-enweghị uche. (Ilu 9:4) A na-ekwekwa ha nkwa nke ndụ. Amamihe nke dị n’Okwu Chineke, gụnyere nke dị n’Akwụkwọ Ilu, dị n’ezie n’ebe aka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile ga-eru. Taa, dị ka ndị ozi nke ezi amamihe, Ndịàmà Jehova ji ọrụ n’aka n’ịkpọ ndị mmadụ òkù, n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ha, ịmụ Bible. N’ezie, inweta ihe ọmụma a pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.
Ndị Kraịst aghaghị iji obi umeala nara ịdọ aka ná ntị amamihe na-enye. Otú ahụ ka ọ dị karịsịa n’ebe ndị na-eto eto na ndị maliteworo ịmụ banyere Jehova na nso nso a nọ. N’ihi ahụmahụ dị nta ha nwere n’ụzọ Chineke, ha pụrụ ịbụ ndị “obi amamihe kọrọ.” Ọ pụtaghị na ebumnobi nile ha dị njọ, ma ọ na-ewe oge na mgbalị iji mee ka obi dịrị n’ọnọdụ nke na-atọ Jehova Chineke ụtọ n’ezie. Nke a na-achọ ịdị na-eme ka echiche, ọchịchọ, mmetụta, na ihe mgbaru ọsọ ha kwekọọ n’ihe Chineke nwapụtara. Lee ka o si dị oké mkpa ka ‘agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi ha ike.’—1 Pita 2:2.
N’eziokwu, ọ̀ bụ na anyị nile ekwesịghị ịgabiga “ozizi mmalite” ahụ? N’ezie ọ dị anyị mkpa ịzụlite mmasị ‘n’ihe nile dị omimi nke Chineke’ ma na-enweta ihe na-edozi ahụ site ná nri siri ike bụ́ nke dịịrị ndị tozuru okè. (Ndị Hibru 5:12–6:1, NW; 1 Ndị Kọrint 2:10) “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” bụ́ onye Jisọs Kraịst na-elekọta kpọmkwem, ji ịdị uchu na-enye mmadụ nile nri ime mmụọ na-abịa n’oge ya. (Matiu 24:45-47) Ka anyị na-eri nri na tebụl amamihe site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke nakwa akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị òtù ohu ahụ na-ewepụta.
“Abarala Onye Na-akwa Emo Mba”
Ihe amamihe na-akụzi gụnyekwara mgbazi na ịdọ aka ná ntị. Ọ bụghị mmadụ nile na-anabata akụkụ a nke amamihe. N’ihi ya, okwu mmechi nke akụkụ mbụ nke akwụkwọ Ilu nwere ịdọ aka ná ntị bụ́: “Onye na-adọ onye na-akwa emo aka ná ntị na-ewetara onwe ya nlelị: ọzọ, onye na-abara onye na-emebi iwu mba na-ewetara onwe ya ọrụ ya. Abarala onye na-akwa emo mba, ka o wee ghara ịkpọ gị asị.”—Ilu 9:7, 8a.
Onye na-akwa emo na-ebu iwe n’obi megide onye na-agbalị inye aka mee ka okporo ụzọ ya guzozie eguzozie, na-akpọkwa ya asị. Onye na-emebi iwu adịghị enwe ekele maka uru nke ịdọ aka ná ntị. Lee ka o si bụrụ ihe nzuzu ịgbalị ịkụziri onye kpọrọ eziokwu ahụ asị ma ọ bụ onye na-achọ nanị ịkwa ya emo ọmarịcha eziokwu nke Okwu Chineke! Mgbe Pọl onyeozi na-eme nkwusa n’Antiọk, o zutere otu ìgwè ndị Juu bụ́ ndị na-enweghị ịhụnanya maka eziokwu ahụ. Ha nwara ime ka o soro ha rụrịtawa ụka site n’iji okwu nkwulu na-ekwugide ya, ma Pọl kwuru n’ụzọ dị mfe, sị: “Ebe unu na-enupụ [okwu Chineke] n’ahụ unu, na-ekpekwa onwe unu ndị na-ekwesịghị ndụ ebighị ebi, lee, anyị gaje ichigharị gwa ndị mba ọzọ okwu.”—Ọrụ 13:45, 46.
Ná mgbalị anyị ikwusara ndị nwere obi eziokwu ozi ọma Alaeze ahụ, ka anyị kpachara anya ịghara iso ndị na-akwa emo na-arụrịta ụka. Kraịst Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Mgbe unu na-aba n’ụlọ ahụ, keleenụ ya. Ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị, ka udo unu bịakwasị ya: ma ọ bụrụ na o kwesịghị, ka udo unu laghachikwute unu ọzọ. Ma onye ọ bụla nke na-anaraghị unu nke ọma, nke na-anụghịkwa okwu nile unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụ ájá ụkwụ unu.”—Matiu 10:12-14.
Otú onye maara ihe si emeghachi omume Ilu 9:8b, 9a) Onye maara ihe maara na “ozizi nile site n’inye ahụhụ na-adị ka ihe na-adịghị eweta ọṅụ n’oge dị ugbu a, kama mwute: ma e mesịa ọ na-enyeghachi ndị ahụ e werewooro ya nwapụta ha mkpụrụ nke dị n’udo, bụ́ mkpụrụ nke ezi omume.” (Ndị Hibru 12:11) Ọ bụ ezie na ndụmọdụ pụrụ iyi ihe na-egbu mgbu, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji bawa mba ma ọ bụ gọchitewara onwe anyị ma ọ bụrụ na ịnara ya gaje ime ka anyị mara ihe karị?
n’ịdọ aka ná ntị na-adị iche na nke onye na-akwa emo. Solomọn na-ekwu, sị: “Baara onye maara ihe mba, ọ ga-ahụkwa gị n’anya. Nye onye maara ihe mmụta, ọ ga-amarakwa ihe karị.” (“Mee ka onye ezi omume mara ihe, ọ ga-atụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya,” ka eze ahụ maara ihe gara n’ihu ikwu. (Ilu 9:9b) Ọ dịghị onye maara ihe ma ọ bụ mee okenye ruo n’ókè nke na ịmụta ihe adịghị ya mkpa. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka ọbụna ndị meworo okenye na-anakwere eziokwu ahụ ma rara onwe ha nye Jehova! Ka anyị onwe anyị na-agbalịsikwa ike ijigide ọchịchọ ịmụta ihe na ime ka uche anyị nọgide na-arụ ọrụ.
‘A Ga-atụkwasịrị Gị Afọ Ndụ’
N’imesi isi ihe dị n’okwu ahụ a na-atụle ike, Solomọn gụnyere ihe dị mkpa iji nweta amamihe. Ọ na-ede, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ: ihe ọmụma nke Onye Nsọ bụkwa nghọta.” (Ilu 9:10) A pụghị inwe amamihe Chineke n’enweghị egwu nsọpụrụ miri emi n’ebe ezi Chineke ahụ nọ. Mmadụ pụrụ inwe ihe ọmụma hiri nne, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atụ egwu Jehova, ọ gaghị eji ihe ọmụma ahụ na-eme ihe n’ụzọ na-ewetara Onye Okike nsọpụrụ. Ọ pụrụ ọbụna ime mkpebi ndị na-ezighị ezi site n’ihe ndị a maara na ha bụ́ eziokwu, na-eme onwe ya ka o yie onye nzuzu. Ọzọkwa, ihe ọmụma banyere Jehova, bụ́ Onye Kasị Nsọ, dị oké mkpa maka inweta nghọta, nke bụ́ njimara pụtara ìhè nke amamihe.
Mkpụrụ dị aṅaa ka amamihe na-amịpụta? (Ilu 8:12-21, 35) Eze Israel ahụ na-ekwu, sị: “Site na mụ ka ụbọchị gị ga-aba ụba, a ga-atụkwasịkwara gị afọ ndụ.” (Ilu 9:11) Ụbọchị dị ogologo na ọtụtụ afọ nke ndụ bụ ihe ndị na-esi n’iso amamihe na-akpakọrịta apụta. Ee, “amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.
Itinye mgbalị siri ike iji nweta amamihe bụ ibu ọrụ dịịrị anyị onwe anyị. N’imesi eziokwu a ike, Solomọn na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị maara ihe, ị maworo onwe gị ihe: ọ bụrụkwa na ị kwaa emo, nanị gị ga-ebu ya.” (Ilu 9:12) Onye maara ihe maara ihe iji baara onwe ya uru, ọ bụkwa nanị onye na-akwa emo ka ụta dịịrị maka nhụjuanya nke ya. N’ezie, anyị na-aghọrọ ihe anyị na-akụ. N’ihi ya, ka anyị ‘tọọrọ amamihe ntị anyị n’ala.’—Ilu 2:2.
“Nwanyị Nzuzu Na-eme Mkpọtụ”
N’aka nke ọzọ, Solomọn kwukwara, sị: “Nwanyị nzuzu na-eme mkpọtụ; onye na-enweghị uche ka ọ bụ, ọ maghịkwa ihe ọ bụla. Ọ na-anọdụkwa n’ọnụ ụzọ ụlọ ya, n’elu oche n’ebe nile dị elu nke obodo, ịkpọ ndị na-agabiga n’ụzọ òkù, bụ́ ndị na-agazi agazi n’okporo ụzọ ha, Onye ọ bụla na-enweghị uche, ya wezụga onwe ya bata n’ebe a:”—Ilu 9:13-16a.
E gosiri nzuzu dị ka nwanyị na-eme mkpọtụ, nke na-enweghị ezi àgwà, nke na-amaghịkwa ihe. Ya onwe ya kwa ewuwo ụlọ. O jiriwokwa aka ya na-akpọ onye ọ bụla na-enweghị uche òkù. N’ihi ya ndị na-agafe agafe nwere nhọrọ. Hà ga-anakwere òkù amamihe na-akpọ ka ọ̀ bụ nke nzuzu na-akpọ?
“Mmiri E Zutere Ezute Na-atọ Ụtọ”
Ma amamihe ma nzuzu na-akpọ ndị na-ege ntị òkù ‘iwezụga onwe ha bata n’ebe a.’ Otú ọ dị, arịrịọ ahụ dị iche. Amamihe na-akpọ ndị mmadụ ịbịa n’oriri nke mmanya, anụ, na nri. Ihe nzuzu ji arata ndị mmadụ na-echetara anyị ụzọ nke nwanyị na-eme omume rụrụ arụ. Solomọn na-ekwu, sị: “Onye obi amamihe kọrọ, nwanyị ahụ asịwo ya, Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo dị ụtọ.”—Ilu 9:16b, 17.
Kama mmanya a gwara agwa, “nwanyị ahụ Ilu 9:13, New International Version) N’Akwụkwọ Nsọ, e ji iso nwunye a hụrụ n’anya nwee ihe ụtọ nke mmekọahụ tụnyere ịṅụ mmiri na-enye ume ọhụrụ. (Ilu 5:15-17) Ya mere, mmiri e zutere ezute na-anọchi anya mmekọahụ rụrụ arụ a na-enwe na nzuzo. A na-eme ka mmiri dị otú ahụ yie ihe na-atọ ụtọ—nke dị mma karịa mmanya—n’ihi na e zutere ha ezute ma na-enye echiche nke mmadụ iwere ihe n’enweghị onye ga-ahụ ya. A na-eme ka nri nzuzo ahụ yie nke dị ụtọ karịa nri na anụ nke amamihe na-enye kpọmkwem n’ihi na a na-enweta ya site n’ụzọ aghụghọ. Ile ihe a machibidoro iwu na ihe a na-eme na nzuzo anya dị ka ihe na-adọrọ mmasị na-egosi ịdị nzuzu.
bụ́ Nzuzu” na-enye mmiri e zutere ezute. (Ọ bụ ezie na òkù amamihe na-akpọ gụnyere nkwa nke ndụ, nwanyị nzuzu adịghị ekwu ihe ndị ga-esi n’iso ụzọ ya apụta. Ma Solomọn na-adọ aka ná ntị, sị: “Nwoke ahụ amaghị na ndị na-adịghị ndụ nọ n’ebe ahụ; na ọ bụ n’ebe nile miri emi nke [Sheol, NW] ka ndị ọ kpọrọ nọ.” (Ilu 9:18) “Ụlọ Nwanyị Nzuzu ahụ abụghị ebe obibi kama ọ bụ nnukwu ili,” ka otu ọkà mmụta na-ede. “Ọ bụrụ na ị banye na ya, ị gaghị adị ndụ wee pụta.” Ịgbaso ụzọ ndụ rụrụ arụ abụghị nke amamihe dị na ya; ọ na-akpata ọnwụ.
Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Ka anyị na-eri nri mgbe nile na tebụl amamihe ma soro ná ndị nọ n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ.
[Foto dị na peeji nke 31]
Onye maara ihe na-anakwere mgbazi
[Foto dị na peeji nke 31]
Inweta amamihe bụ ibu ọrụ onwe onye