Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Toonụ Jehova Maka Ihe Ukwu Dị Iche Iche Ọ Na-eme!

Toonụ Jehova Maka Ihe Ukwu Dị Iche Iche Ọ Na-eme!

Toonụ Jehova Maka Ihe Ukwu Dị Iche Iche Ọ Na-eme!

“Mkpụrụ obi m na-eme ka Onyenwe anyị dị ukwuu . . . n’ihi na Onye dị ike emewo[ro] m ihe ukwu dị iche iche.”—LUK 1:46-49.

1. Ihe ukwu ndị dị aṅaa ka anyị na-eto Jehova n’ụzọ ziri ezi maka ha?

JEHOVA kwesịrị otuto n’ihi ihe ukwu dị iche iche ọ na-eme. Mgbe onye amụma bụ́ Mosis kọghachiri akụkọ banyere mgbapụta a gbapụtara ụmụ Israel site n’Ijipt, o kwupụtara, sị: “Anya unu na-ahụ omume ukwu nile nke Jehova.” (Deuterọnọmi 11:1-7) N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe mmụọ ozi Gebriel kwupụtaara nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ Meri, banyere ọmụmụ ọ gaje ịmụ Jisọs, Meri kwuru, sị: “Mkpụrụ obi m na-eme ka Onyenwe anyị dị ukwuu . . . n’ihi na Onye dị ike emewo[ro] m ihe ukwu dị iche iche.” (Luk 1:46-49) Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị na-eto ya maka ihe ukwu dị iche iche o mere dị ka ntọhapụ ọ tọhapụrụ ụmụ Israel n’agbụ Ijipt na omume o ji ụzọ ọrụ ebube mee ka a tụrụ ime Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.

2. (a) Gịnị ka “nzube ebighị ebi” nke Chineke pụtara nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi? (b) Ahụmahụ dị aṅaa ka Jọn nwere n’àgwàetiti Patmọs?

2 E jikọtawo ọtụtụ n’ime ihe ukwu ndị Jehova na-eme na “nzube ebighị ebi” ya ịgọzi ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi site n’aka Mesaịa ahụ na ịchịisi Alaeze ya. (Ndị Efesọs 3:8-13, NW) Nzube ahụ ji nke nta nke nta na-apụta ìhè mgbe e kwere ka Jọn onyeozi ahụ meworo agadi nyoba anya n’ọnụ ụzọ e meghere emeghe n’eluigwe bụ́ nke ọ hụrụ n’ọhụụ. Ọ nụrụ ka olu ụda ya dị ka nke opì na-asị: “Rịgota n’ebe a, M ga-egosikwa gị ihe nile nke na-aghaghị ịpụta mgbe ihe ndị a gasịrị.” (Mkpughe 4:1) Mgbe ọchịchị Rom chụgara Jọn n’àgwàetiti Patmọs, “n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs,” e nyere ya “mkpughe nke Jisọs Kraịst.” Ihe onyeozi ahụ hụrụ ma nụ kpughere ihe dị ukwuu banyere nzube ebighị ebi nke Chineke, si otú ahụ na-enye ezi ndị Kraịst nile nghọta ime mmụọ na agbamume bịara n’oge ya.—Mkpughe 1:1, 9, 10.

3. Ole ndị ka ndị okenye 24 ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ na-anọchite anya ha?

3 Jọn si n’ọnụ ụzọ ahụ e meghere emeghe n’eluigwe hụ ndị okenye 24, bụ́ ndị e chiri eze ma kpukwasị okpueze. Ha dara n’ala n’ihu Chineke ma kwuo, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:11) Ndị okenye ahụ na-anọchite anya ndị Kraịst nile e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ dị elu nke Chineke kwere ha ná nkwa. A na-akpali ha ito Jehova n’ihi ihe ukwu ndị o mere bụ́ ndị e jikọtara ha na okike. Ihe àmà nke ‘ike ebighị ebi Jehova na ọbụbụ ọ bụ Chineke’ na-atụkwa anyị onwe anyị n’anya. (Ndị Rom 1:20) Ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụ ka anyị na-enwekwu ihe mere anyị ga-eji na-eto ya maka ihe ukwu ndị ọ na-eme.

Kpọsaanụ Ihe Ndị Kwesịrị Otuto Jehova Na-eme!

4, 5. Nye ihe atụ banyere otú Devid si too Jehova.

4 Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid toro Chineke maka ihe ukwu ndị Ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, Devid bụrụ n’abụ, sị: “Bụkuonụ Jehova abụ ọma, bụ́ Onye bi na Zaịọn: gosinụ omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche. Meere m amara, Jehova; hụ mweda n’ala m nke sitere n’aka ndị na-akpọ m asị, gị Onye na-ebuli m elu site n’ọnụ ụzọ ámá ọnwụ; ka m wee kọọ akụkọ otuto Gị nile: n’ọnụ ụzọ ámá nile nke ada Zaịọn.” (Abụ Ọma 9:11, 13, 14) Mgbe o nyesịrị nwa ya nwoke bụ́ Solomọn ụkpụrụ a ga-eji ewu ụlọ nsọ ahụ, Devid gọziri ma too Chineke, na-asị: “Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube . . . Jehova, Gị nwe alaeze, Gị bụkwa Onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onyeisi. . . . Ma ugbu a, Chineke anyị, anyị onwe anyị na-ekele Gị, na-etokwa aha Gị mara mma.”—1 Ihe E Mere 29:10-13.

5 Ugboro ugboro, Akwụkwọ Nsọ na-akpọ anyị òkù—ee, na-agba anyị ume—ito Chineke, dị ka Devid mere. Akwụkwọ Abụ Ọma nwere ọtụtụ okwu otuto a gwara Chineke, ihe dịkwa ka ọkara n’ime abụ ndị a ka a sịrị na ọ bụ Devid bụrụ ha. O toro ma kelee Jehova n’esepụghị aka. (Abụ Ọma 69:30) Ọzọkwa, kemgbe oge ochie, e jiwo ihe ndị Devid na ndị ọzọ dere n’ike mmụọ nsọ mee ihe n’ito Jehova.

6. Olee otú Abụ Ọma ndị e dere n’ike mmụọ nsọ si abara anyị uru?

6 Lee ka Abụ Ọma ndị ahụ si abara ndị na-efe Jehova ofufe uru! Mgbe anyị chọrọ ikele Chineke maka ihe ukwu ndị ọ na-eme maka abamuru anyị, uche anyị pụrụ nnọọ ịgbaga n’ọmarịcha okwu ndị a na-achọta n’Abụ Ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị tetara ụra n’ụbọchị ọhụrụ, a pụrụ ịkpali anyị ikwu okwu ndị yiri ndị a: “Ọ bụ ezi ihe ikele Jehova ekele, na ịbụku aha Gị abụ ọma, Gị Onye kachasị ihe nile elu: igosi ebere Gị n’ụtụtụ, igosikwa ikwesị ntụkwasị obi Gị kwa abalị, . . . n’ihi na I mewo ka m ṅụrịa site n’ọrụ Gị, Jehova: ọ bụ n’ọrụ nile nke aka Gị ka m ga-eti mkpu ọṅụ.” (Abụ Ọma 92:1-4) Mgbe anyị meriri ihe na-egbochi ọganihu ime mmụọ anyị, anyị pụrụ inwe ọchịchọ iji ekpere gosipụta ọṅụ na ekele, ọbụna dị ka ọbụ abụ ahụ mere mgbe ọ bụrụ abụ, sị: “Bịanụ, ka anyị tikuo Jehova mkpu ọṅụ: ka anyị tikusie oké nkume nke nzọpụta anyị mkpu ọṅụ ike. Ka anyị were ekele bịa n’ihu Ya, ka anyị were abụ ọma tikusie Ya mkpu ọṅụ ike.”—Abụ Ọma 95:1, 2.

7. (a) Gịnị dị ịrịba ama banyere ọtụtụ abụ ndị Kraịst na-abụ? (b) Gịnị bụ otu ihe mere anyị ga-eji na-abịarute nzukọ n’oge ma na-anọrọ ruo ná mmechi?

7 Anyị na-ewelikarị olu anyị n’ịbụ abụ otuto nye Jehova ná nzukọ ọgbakọ nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ọtụtụ n’ime abụ ndị a dabeere n’echiche ndị sitere n’ike mmụọ nsọ dị n’akwụkwọ Abụ Ọma. Lee ka obi si dị anyị ụtọ inwe nchịkọta nke abụ otuto ndị na-enye obi ụtọ anyị na-abụku Jehova, bụ́ ndị kwesịrị oge a! Ịbụku Chineke abụ otuto bụ otu n’ime ezi ihe ndị mere anyị ga-eji na-abịarute nzukọ anyị n’oge ma na-anọrọ ruo ná mmechi, si otú ahụ na-esonyere ndị ofufe ibe anyị n’iji abụ na ekpere na-eto Jehova.

“Toonụ Jaa”

8. Gịnị pụtara ìhè n’okwu bụ́ “Haleluya,” oleekwa otú a na-esikarị asụgharị ya?

8 Ito Jehova pụtara ìhè n’okwu bụ́ “Haleluya,” bụ́ ndegharị nke okwu Hibru nke ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-asụgharị ya mgbe nile ịbụ “Toonụ Jaa.” Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 135:1-3, anyị na-ahụ agbamume a na-ekpo ọkụ nke e ji imesi okwu ike nye: “Toonụ Jaa. Toonụ aha Jehova; toonụ Ya, ndị ohu Jehova: ndị na-eguzo n’ụlọ Jehova, n’ogige nile nke ụlọ Chineke anyị. Toonụ Jaa; n’ihi na Jehova dị mma: bụkuonụ aha Ya abụ ọma; n’ihi na ọ dị ụtọ.”

9. Gịnị na-akwali anyị ito Jehova?

9 Ka anyị na-atụgharị uche n’ọrụ okike dị ebube nke Chineke na ihe nile ọ na-eme maka ọdịmma anyị, ekele si n’obi na-akwali anyi inye ya otuto. Mgbe anyị na-atụgharị uche n’ihe ndị dị ebube Jehova meere ndị ya n’oge gara aga, obi anyị na-akwali anyị ito ya. Ka anyị na-atụgharịkwa uche ná nkwa banyere ihe ukwu ndị Jehova ka ga-eme, anyị na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi kwupụta otuto na ekele.

10, 11. Olee otú ịdị adị anyị kpọmkwem si enye anyị ihe mere anyị ga-eji na-eto Chineke?

10 Ịdị adị anyị na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji too Jaa. Devid bụrụ n’abụ, sị: “M ga-ekele Gị [Jehova]; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 139:14) Ee, ‘e mere ka anyị bụrụ oké ọrụ,’ anyị nwekwara onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa dị ka ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, na ikike iche echiche. Ya mere, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iduzi ndụ anyị n’ụzọ ga-eme ka anyị na-eto Onye Mere anyị? Pọl kwuru ihe yiri nke ahụ mgbe o dere, sị: “Ma ùnu na-eri ihe, ma ùnu na-aṅụ ihe, ma ùnu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 10:31.

11 Anyị ga-eme ihe nile ka e wee nye Jehova otuto ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ya n’anya n’ezie. Jisọs kwuru na ihe mbụ e nyere n’iwu bụ: “Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.” (Mak 12:30; Deuterọnọmi 6:5) N’ezie, anyị kwesịrị ịhụ Jehova n’anya ma na-eto ya dị ka Onye Mere anyị na Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17; Aịsaịa 51:13; Ọrụ 17:28) E kwuwerị, ọgụgụ isi anyị, ikike anyị nwere n’ụzọ ime mmụọ, na ike ọkpụkpụ aka anyị—àgwà na ikike anyị nile—si n’aka Jehova. Dị ka Onye Okike anyị, o kwesịrị inweta otuto na ịhụnanya anyị.

12. Olee mmetụta ị na-enwe banyere ihe ukwu dị iche iche Jehova na-eme na okwu ndị dị n’Abụ Ọma 40:5?

12 Ihe ukwu ndị Jehova na-eme, na-enye anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji too Ya! “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ,” ka Devid bụrụ n’abụ. “A pụghị idoro Gị ha n’usoro; a sị na aga m egosi kwuokwa okwu banyere ha, ha karịrị ịgụ ọnụ.” (Abụ Ọma 40:5) Devid apụghị ichetacha oké ọrụ nile nke Jehova, anyị apụghịkwa. Ma ka anyị na-eto Chineke mgbe ọ bụla e mere ka anyị mata ihe ukwu ọ bụla o mere.

Ọrụ Ndị E Jikọtara Ha na Nzube Ebighị Ebi Chineke

13. Olee otú olileanya anyị si dabere n’ihe ukwu dị iche iche Chineke na-eme?

13 Olileanya anyị maka ọdịnihu dabeere n’ihe ukwu ndị kwesịrị otuto bụ́ ndị e jikọtara ha na nzube ebighị ebi Chineke. Mgbe nnupụisi ahụ e nupụrụ n’Iden gasịrị, Jehova buru amụma mbụ ahụ jupụtara n’olileanya. Mgbe Chineke na-ama agwọ ahụ ikpe, o kwuru, sị: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Olileanya maka Mkpụrụ nke nwanyị ahụ bụ́ nke e kwere ná nkwa dịgidere n’obi nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe Jehova mesịrị ihe ukwu dị iche iche site n’ichebe Noa na ezinụlọ ya pụọ n’Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ nke kpochapụrụ ụwa na-eme ajọ omume. (2 Pita 2:5) Nkwa ndị e buru n’amụma nye ndị ikom nwere okwukwe, ndị dị ka Abraham na Devid, mekwuru ka a ghọta ihe Jehova ga-arụzu site ná Mkpụrụ ahụ.—Jenesis 22:15-18; 2 Samuel 7:12.

14. Olee ihe atụ kasị ukwuu nke ihe ukwu dị iche iche Jehova mere maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ?

14 Ngosipụta kasị ukwuu nke Jehova gosipụtara na ya bụ onye na-eme ihe ukwu dị iche iche maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ weere ọnọdụ mgbe o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya—Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Jisọs Kraịst—dị ka àjà mgbapụta. (Jọn 3:16; Ọrụ 2:29-36) Ihe mgbapụta ahụ nyere ihe mgbakwasị ụkwụ maka iso Chineke dịghachi ná mma. (Matiu 20:28; Ndị Rom 5:11) Jehova chịkọtara ndị mbụ ahụ e mere ka ha na ya dịghachi ná mma gaa n’ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ nke e guzobere na Pentikọst 33 O.A. Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ, ha kwusara ozi ọma ahụ n’ebe nile, na-egosi otú ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs si emeghere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ụzọ inweta ngọzi na-adịghị agwụ agwụ n’okpuru ịchịisi Alaeze eluigwe Chineke.

15. Olee otú Jehova siworo mee ihe n’ụzọ dị ebube n’oge anyị?

15 N’oge anyị, Jehova arụwo ọrụ n’ụzọ dị ebube iji chịkọta ndị Kraịst ikpeazụ e tere mmanụ. E jichiwo oké ifufe nke mbibi iji nye ohere maka ịka ihe fọdụrụnụ n’ime 144,000 ahụ akara, bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa achị n’eluigwe. (Mkpughe 7:1-4; 20:6) Chineke ejidewo n’aka na a gbapụtara ndị Kraịst e tere mmanụ pụọ n’agbụ ime mmụọ nke “Babilọn Ukwu Ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:1-5) Mgbapụta ahụ a gbapụtara ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na 1919 na nchebe Chineke nke ha nwetaworo kemgbe ahụ emewo ka ha na-eme gịnị? Ka ha na-enwupụ ìhè n’ịgba àmà ikpeazụ tupu Jehova eweta ajọ usoro ihe Setan ná njedebe ná “mkpagbu ukwu” ahụ ji ọsọ na-abịa.—Matiu 24:21; Daniel 12:3; Mkpughe 7:14.

16. Gịnị na-ewere ọnọdụ n’ihi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ a na-arụ n’oge a?

16 Ndịàmà Jehova e tere mmanụ ejiwo ịnụ ọkụ n’obi na-ebute ụzọ n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke “atụrụ ọzọ” na-aghọ ndị na-efe Jehova ugbu a. (Jọn 10:16) Anyị na-aṅụrị ọṅụ na a ka nwere ohere dịịrị ndị dị umeala n’obi nke ụwa iji sonyere anyị n’ito Jehova. Ndị na-aza òkù ahụ bụ́ “bịa” bụ ndị a gaje ichebe gabiga mkpagbu ukwu ahụ, na-enwe olileanya inye Jehova otuto ruo mgbe nile ebighị ebi.—Mkpughe 22:17.

Ọtụtụ Puku Na-enuga n’Ezi Ofufe

17. (a) Olee otú Jehova si eme ihe ukwu dị iche iche n’ihe banyere ọrụ nkwusa anyị? (b) Olee otú e si emezu Zekaraịa 8:23?

17 Jehova na-eme ihe ukwu ndị kwesịrị otuto ugbu a n’ihe banyere ọrụ nkwusa anyị. (Mak 13:10) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, o ‘meghewo ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-eji rụsie ọrụ ike.’ (1 Ndị Kọrint 16:9) Nke a emewo ka o kwe omume ịkpọsa ozi ọma ahụ ná nnukwu ókèala dum bụ́ ebe ndị iro nke eziokwu ahụ nọchiburu ụzọ. Ọtụtụ ndị nọbu n’ọchịchịrị ime mmụọ na-azazi òkù a na-akpọ ha ito Jehova. Ha na-emezu okwu amụma ndị a: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Ndị ahụ “ndị ikom iri” ahụ gwara okwu bụ ndị Juu ime mmụọ, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge a. Ebe ọ bụ na iri pụrụ ịnọchite anya izu ezu n’ihe banyere ụwa, “ndị ikom iri” ahụ na-anọchite anya “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị a kpọrọ isonyere “Israel nke Chineke,” bụ́ ndị ha na ha ghọrọ “otu ìgwè atụrụ.” (Mkpughe 7:9, 10; Ndị Galetia 6:16) Lee ihe ọṅụ ọ bụ ugbu a ịhụ nnọọ ọtụtụ ndị ka ha na-ejekọ ozi dị nsọ ọnụ dị ka ndị na-efe Jehova Chineke!

18, 19. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Jehova na-agọzi ọrụ nkwusa ahụ?

18 Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ iri puku—n’ezie, ọtụtụ narị puku ndị mmadụ—na-anakwere ezi ofufe n’ala ndị okpukpe ụgha mejupụtaburu ruo n’òkè nke na o yiri ka a ga-asị na ndị mmadụ agaghị anabata ozi ọma ahụ ma ọlị. Tụlee Yearbook of Jehovah’s Witnesses nke kasị ọhụrụ, ma rịba ama mba ndị akụkọ ozi ha na-enyezi bụ malite na 100,000 ndị nkwusa Alaeze ruo n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,000,000. Nke a bụ ihe àmà dị ike na-egosi na Jehova na-agọzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.—Ilu 10:22.

19 Dị ka ndị Jehova, anyị na-eto ma na-ekele Nna anyị nke eluigwe maka inye anyị ezi nzube ná ndụ, ọrụ na-akwụghachi ụgwọ n’ozi ya, nakwa olileanya dị mma maka ọdịnihu. Anyị na-ebi ndụ n’ịtụsi anya ike maka mmezu nke nkwa nile Chineke kwere, anyị kpebisikwara ike ‘idebe onwe anyị n’ịhụnanya Chineke, ruo ndụ ebighị ebi.’ (Jud 20, 21) Lee ka anyị si enwe obi ụtọ ịhụ na oké ìgwè mmadụ nke na-eto Chineke eruwo ihe dị ka 6,000,000 ugbu a! N’ịbụ ndị o doro anya na ha nwere ngọzi Jehova, a haziri ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ gaa n’ihe dị ka ọgbakọ 91,000 n’ala 235. A na-enyeju anyị nile afọ n’ụzọ ime mmụọ site ná mgbalị nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-eme n’enweghị ike ọgwụgwụ. (Matiu 24:45) Nzukọ ọchịchị Chineke nke na-enwe ọganihu, bụ́ nke na-enye nlekọta ịhụnanya, na-eduzi ọrụ Alaeze ahụ site n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị 110. Anyị nwere ekele na Jehova akpaliwo obi nke ndị ya ‘ịsọpụrụ ya site n’akụ̀ ha.’ (Ilu 3:9, 10) N’ihi ya, ọrụ nkwusa anyị zuru ụwa ọnụ nọgidere na-aga n’ihu, a na-ewu ebe obibi akwụkwọ, ụlọ obibi Betel na nke ndị ozi ala ọzọ, Ụlọ Nzukọ Alaeze, na Ụlọ Mgbakọ dị ka mkpa e nwere maka ha si dị.

20. Olee otú ịtụgharị uche n’ihe ukwu nile kwesịrị otuto Jehova mere kwesịrị isi metụta anyị?

20 Ọ pụghị ikwe anyị omume ịkpọtụsị ihe ukwu nile kwesịrị otuto ndị Nna anyị nke eluigwe meworo. Ma ọ̀ dị onye ọ bụla nwere obi ziri ezi nke pụrụ ịjụ isonye n’ìgwè ndị na-eto Jehova? Ọ dịghị ma ọlị! Ya mere, ka ndị nile hụrụ Chineke n’anya jiri ọṅụ tie mkpu, sị: “Toonụ Jaa. Toonụ Jehova site n’eluigwe: toonụ Ya n’ebe dị elu. Toonụ Ya, ndị mmụọ ozi Ya nile . . . , ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị: ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya: ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.” (Abụ Ọma 148:1, 2, 12, 13) Ee, ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị na-eto Jehova maka ihe ukwu dị iche iche ọ na-eme!

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ụfọdụ n’ime ihe ukwu ndị kwesịrị otuto Jehova mere?

• N’ihi gịnị ka ị na-eji enwe mkpali ito Jehova?

• Olee otú e si jikọta olileanya anyị na ihe ukwu dị iche iche nke Chineke na-eme?

• Olee otú Jehova si eme ihe ndị kwesịrị otuto n’ihe banyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ị̀ na-eji obi gị dum esonye n’abụ otuto nye Jehova?

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Anyị na-enwe ọṅụ na ohere ka dị maka ndị dị umeala n’obi isonyere anyị n’ito Jehova