Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịga N’ihu Ruo Mmeri Ikpeazụ!

Ịga N’ihu Ruo Mmeri Ikpeazụ!

Ịga N’ihu Ruo Mmeri Ikpeazụ!

“Lee, ịnyịnya ọcha, Onye na-anọkwasị ya nwekwara ụta; e wee nye Ya okpueze: O wee pụta na-emeri, ya na ka O wee merie.”—MKPUGHE 6:2.

1. Ihe ndị dị aṅaa ga-eme n’ọdịnihu ka Jọn hụrụ n’ọhụụ?

SITE n’ike mmụọ nsọ Chineke, Jọn onyeozi lepụrụ anya ruo ihe dị ka afọ 1,800 n’ọdịnihu ma kọwaa banyere nnọkwasị Kraịst nọkwasịrị n’ocheeze dị ka Eze. Okwukwe dị Jọn mkpa iji kwere ihe ọ hụrụ n’ọhụụ. Anyị onwe anyị taa nwere ihe àmà doro anya na nnọkwasị n’ocheeze a e buru n’amụma weere ọnọdụ na 1914. Anyị ji anya nke okwukwe na-ahụ Jisọs Kraịst ka ọ na-apụta “na-emeri, ya na ka O wee merie.”

2. Olee otú Ekwensu si meghachi omume ná nguzobe e guzobere Alaeze ahụ, gịnịkwa ka nke a bụ ihe àmà ya?

2 Mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ, a chụpụrụ Setan n’eluigwe, na-eme ka o jiri oké ọnụma na-alụsikwu ọgụ ike ma nke ahụ agatụghị eme ka o nwee ihe ịga nke ọma. (Mkpughe 12:7-12) Iwe ya emewo ka ọnọdụ ụwa dịkwuo nnọọ njọ. Ọha mmadụ yiri ka ha na-etisasị etisasị. Nke a bụụrụ Ndịàmà Jehova ihe àmà doro anya na Eze ha na-aga n’ihu ‘imeri, ya na ka O wee merie.’

E Guzowela Òtù Ụwa Ọhụrụ

3, 4. (a) Mgbanwe ndị dị aṅaa metụtara nhazi ka e meworo n’ọgbakọ ndị Kraịst kemgbe e guzobere Alaeze ahụ, gịnịkwa mere ha ji dị mkpa? (b) Uru dị aṅaa ka mgbanwe ndị a baworo, dị ka Aịsaịa buru n’amụma?

3 Ozugbo e guzobere Alaeze ahụ, oge ruru ka e mee ka ọgbakọ ndị Kraịst e weghachiri eweghachi—nke nwekwuru ibu ọrụ Alaeze ugbu a—yikwuo ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. N’ihi ya, ná mbipụta ya nke June 1 na 15, 1938, Ụlọ Nche (Bekee) tụlere otú nzukọ ndị Kraịst kwesịrị isi na-arụ ọrụ. Mgbe e mesịrị, mbipụta nke December 15, 1971 (Bekee), kọwara Òtù Na-achị Isi nke oge a n’ụzọ dokwuru anya n’isiokwu bụ́ “Òtù Na-achị Isi Dị Iche n’Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro.” Na 1972, a họpụtara òtù ndị okenye inyere ọgbakọ dị iche iche aka na iduzi ha.

4 Ịmaliteghachi ilekọta ọgbakọ ndị Kraịst n’ụzọ kwesịrị ekwesị mere ka ọ kwụsikwuo ike n’ụzọ dị ukwuu. Ihe ọzọ na-atụnye ụtụ na nke a bụ ndokwa Òtù Na-achị Isi mere inye ndị okenye ntụziaka n’ọrụ ha, gụnyere inye ha ọzụzụ n’okwu ikpe. E buru amụma banyere ọganihu ndị ahụ ji nke nta nke nta na-apụta ìhè n’ihe banyere nhazi nke nzukọ elu ala nke Chineke na ezi ihe ndị si na ha na-apụta n’Aịsaịa 60:17: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” Mgbanwe ọma ndị a gosipụtara ngọzi Chineke ma gbaa àmà nnakwere Chineke nakweere ndị pụtaworo iji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado Alaeze ya.

5. (a) Olee otú Setan si meghachi omume ná ngọzi Jehova gọziri ndị Ya? (b) N’ikwekọ ná Ndị Filipaị 1:7, olee otú ndị Jehova siworo meghachi omume n’iwe Setan?

5 Setan hụrụ nlekọta na nduzi ịhụnanya ahụ Chineke nyere ndị ya mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ. Dị ka ihe atụ, na 1931, obere ìgwè ndị Kraịst a mere ka ọha na eze mara na ha abụghị Ndị Mmụta Bible nkịtị. N’ikwekọ n’Aịsaịa 43:10, ha bụ Ndịàmà Jehova! Ma ò mere ná ndaba ma ọ bụ na o meghị, Ekwensu kpaliri mkpagbu a na-enwetụbeghị ụdị ya gburugburu ụwa. Ọbụna n’ala ndị e ji nnwere onwe okpukpe mara, dị ka United States, Canada, na Germany, a manyere Ndịàma ugboro ugboro ịlụ agha iwu iji mee ka nnwere onwe ife ofufe ha dịgide. Ka ọ na-erule 1988, Ụlọikpe Kasị Elu nke United States atụlewo okwu ikpe 71 metụtara Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ n’ime ha laara ha. Taa, n’ụwa nile, a ka na-alụ agha iwu ka, dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, e wee nwee ike ‘ịgọpụrụ ozi ọma na ime ka o guzosie ike n’ụzọ iwu.’—Ndị Filipaị 1:7.

6. Mmachibido iwu na ihe mgbochi hà gbochiri ndị Jehova ịga n’ihu? Nye ihe atụ.

6 N’afọ ndị 1930, n’oge bu Agha Ụwa nke Abụọ ụzọ, ndị ọchịchị aka ike machibidoro ma ọ bụ weta ihe mgbochi n’ebe ọrụ Ndịàmà Jehova na Germany, Spain, na Japan dị, n’ihota nanị mba atọ. Ma n’afọ 2000, mba atọ a nanị nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 500,000 bụ́ ndị nkwusa Alaeze Chineke rụsiri ọrụ ike. Nke ahụ fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu iri karịa ọnụ ọgụgụ Ndịàmà e nwere n’ụwa nile na 1936! N’ụzọ doro anya, mmachibido iwu na ihe mgbochi apụghị igbochi ndị Jehova ịga n’ihu n’okpuru Onye Ndú ha na-enwe mmeri, bụ́ Jisọs Kraịst.

7. Ihe omume dị aṅaa pụtara ìhè weere ọnọdụ na 1958, mgbanwe dịkwa aṅaa dị ịrịba ama ka e nweworo kemgbe ahụ?

7 Lee ngosipụta nke ịga n’ihu nke a bụ mgbe, na 1958, a nọ na New York City nwee mgbakọ kasịnụ Ndịàmà Jehova nwetụrụla, bụ́ Mgbakọ Mba Nile nke Ime Uche Chineke, nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara ya bụ 253,922. Ka ọ na-erule 1970, ọrụ ha amaliteghachiwo ná mba atọ ahụ a kpọtụrụ aha n’elu, ma e wezụga ebe a maara n’oge ahụ dị ka East Germany. Ma a ka machibidoro Ndịàmà iwu ná nnukwu mba Soviet Union na mba ndị ha na ya so ná Nkwekọrịta nke Warsaw. Taa, ná mba ndị a nọbu n’okpuru ọchịchị Kọmunist, e nwere ihe karịrị nnọọ ọkara nde Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike.

8. Gịnị siworo ná ngọzi Jehova na-agọzi ndị ya pụta, gịnịkwa ka Ụlọ Nche kwuru banyere nke a na 1950?

8 E jiriwo mmụba gọzie Ndịàmà Jehova n’ihi na ha anọgidewo ‘na-ebu ụzọ achọ alaeze Chineke, na ezi omume Ya.’ (Matiu 6:33) N’ụzọ nkịtị, e mezuworị amụma Aịsaịa bụ́: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:22) Mmụba ahụ akwụsịbeghịkwa. Nanị n’ime afọ iri gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị na-akwadosi ịchịisi Alaeze ike ji ihe karịrị mmadụ 1,750,000 mụbaa. Ndị a ejirila ọchịchọ obi ha sonye n’ìgwè nke otu Ụlọ Nche (Bekee) nke 1950 kwuru ihe a banyere ya: “Chineke na-akwadebe òtù ụwa ọhụrụ ugbu a. . . . Òtù a ga-agabiga Amagedọn, . . . [ha ga-abụ] ndị mbụ ga-amalite ọrụ n’ime ‘ụwa ọhụrụ’ . . . , ndị a haziri n’ụzọ ọchịchị Chineke, ndị maara ụkpụrụ nzukọ a ji eme ihe.” Isiokwu ahụ kwubiri, sị: “Ya mere, ka anyị nile gaa n’ihu n’akwụsịghị akwụsị, dị ka òtù ụwa ọhụrụ!”

9. Olee otú ihe Ndịàmà Jehova mụtaworo eri ọtụtụ afọ siworo baa uru?

9 Ka ọ dịgodị, òtù ụwa ọhụrụ a na-etowanye eto amụtawo ụzọ e si eme ka ihe gaa were were bụ́ nke baworo uru taa, bụ́kwa nke ma eleghịkwa anya ka ga-aba uru ọbụna n’ọrụ mweghachi a ga-arụ mgbe Amagedọn gasịrị. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà amụtawo ịhazi mgbakọ ukwu dị iche iche, ịgbata ọsọ enyemaka n’egbughị oge, na iwu ụlọ ngwa ngwa. Ọrụ a emewo ka ọtụtụ mmadụ jiri mmasị na nkwanye ùgwù na-ele Ndịàmà Jehova anya.

Ịgbazi Echiche Ndị Na-ezighị Ezi

10, 11. Nye ihe atụ nke otú e siworo gbazie echiche na-ezighị ezi ndị e nwere banyere Ndịàmà Jehova.

10 Ma, e nwere ndị na-ebo Ndịàmà Jehova ebubo na ha gbapụrụ iche n’ọha mmadụ. N’ụzọ bụ́ isi, nke a bụ n’ihi nguzo dabeere na Bible nke Ndịàmà weere n’okwu ndị dị ka mmịnye ọbara, nnọpụiche, ise siga, na omume ọma. Ma ọha na eze amalitewala ikweta n’ụzọ na-arị elu na echiche Ndịàmà kwesịrị ka e lebara ha anya. Dị ka ihe atụ, otu dọkịta nọ na Poland kpọrọ ụlọ ọrụ nlekọta nke Ndịàmà Jehova na fon ma kwuo na ya na ndị dọkịta ibe ya n’ụlọ ọgwụ ha anọwo na-arụrịta ụka ruo ọtụtụ awa n’okwu banyere mmịnye ọbara. Ihe kpaliri okwu ahụ bụ otu isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ Poland bụ́ Dziennik Zachodni, n’ụbọchị ahụ. “Ana m akwa ụta n’onwe m na a na-eji ọbara emebiga ihe ókè n’ụlọ ọgwụ,” ka dọkịta ahụ kwetara. “A ghaghị ịgbanwe nke a, obi dịkwa m ụtọ na ọ dịwo onye welitere okwu ahụ. Ọ ga-amasị m inwetakwu ihe ọmụma.”

11 N’otu nnọkọ nkwurịta okwu e nwere n’afọ gara aga, ndị ọrụ ụlọ ọgwụ si Canada, Europe, Israel, na United States kwurịtara ihe ndị e dere iji nyere ndị dọkịta aka ịgwọ ndị ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara. E mere ka ọ pụta ìhè ná nzukọ a e nwere na Switzerland na, n’ụzọ dị iche n’echiche zuru ebe nile, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’etiti ndị ọrịa a mịnyere ọbara karịrị n’ezie nke ndị na-anwụ n’etiti ndị ọrịa a na-amịnyeghị ọbara. N’ozuzu, ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà na-ahapụ ụlọ ọgwụ ngwa ngwa karịa ndị e ji ọbara na-agwọ, bụ́ nke, n’aka nke ya, na-ebelatakarị ihe a na-emefu n’ịgwọ ọrịa.

12. Nye otu ihe atụ nke otú ndị a ma ama siworo jaa nguzo Ndịàmà Jehova n’ihe metụtara ịnọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mma.

12 E kwuwokwa ọtụtụ okwu ọma banyere nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova tupu nakwa n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ mgbe ha nagidere mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ ndị Nazi wakporo ha. E kwuwo ọtụtụ okwu ọma banyere vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault, nke Ndịàmà Jehova wepụtara, bụ́kwa nke, n’ụzọ dabara adaba, a nọ n’ogige ịta ahụhụ Ravensbrück dị na Germany gosi na nke mbụ ya na November 6, 1996. Ná mmalite nke ihe ngosi yiri nke ahụ bụ́ nke a nọ n’ogige ịta ahụhụ ahụ a ma ama dị na Bergen-Belsen gosi n’April 18, 1998, onyeisi Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ọmụmụ Ọchịchị nke dị na Lower Saxony, bụ́ Dr. Wolfgang Scheel, kwetara, sị: “Otu n’ime eziokwu ndị na-emechu ihu n’akụkọ ihe mere eme bụ na Ndịàmà Jehova ji mkpebi siri nnọọ ike jụ Ọchịchị Ndị Nazi karịa ka chọọchị dị iche iche nke ndị Kraịst mere. . . . N’agbanyeghị otú anyị pụrụ isi na-ele ozizi na ịnụ ọkụ n’obi okpukpe Ndịàmà Jehova anya, nguzosi ike ha n’oge ọchịchị ndị Nazi kwesịrị nkwanyere ùgwù.”

13, 14. (a) Okwu dị aṅaa ezi uche dị na ya ka onye a na-atụghị anya na ọ ga-ekwu ya kwuru maka ọdịmma nke ndị Kraịst oge mbụ? (b) Nye ihe atụ nke okwu ọma ndị e kwuworo maka ọdịmma nke ndị Chineke taa.

13 Mgbe ndị a ma ama kwuru ihe ọma banyere Ndịàmà Jehova ma ọ bụ mgbe ikpe laara ha n’okwu ndị a na-arụrịta ụka na ha, ọ pụrụ ime ka ajọ mbunobi belata, meekwa ka e lewe Ndịàmà anya n’ụzọ ka mma. Nke a na-eme ka ha nwee ike ịgwa ndị na-adịbughị njikere ige ntị ma ọlị okwu. Ya mere, a na-anabata omume ndị dị otú ahụ, Ndịàmà Jehova na-enwekwa ekele maka ha n’ezie. Nke a na-echetara anyị ihe mere na narị afọ mbụ na Jerusalem. Mgbe Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe dị elu nke ndị Juu, chọrọ igbu ndị Kraịst n’ihi nkwusa ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme, Gameliel, bụ́ “onye na-ezi iwu Mosis, onye ndị Juu nile na-asọpụrụ,” dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị ikom nke Israel, na-ezenụ onwe unu n’ihe banyere mmadụ ndị a, ihe unu gaje ime. . . . Wepụnụ aka n’ahụ mmadụ ndị a, hapụkwanụ ha: n’ihi na ọ bụrụ na ìzù a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-akwatu ya n’ala: ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị apụ ịkwatu ha n’ala; ka a ghara ịhụ unu dị ka ndị na-alụkwa ọgụ megide Chineke ma eleghị anya.”—Ọrụ 5:33-39.

14 Dị ka Gameliel, ndị a ma ama agbachiteworo Ndịàmà Jehova n’oge na-adịbeghị anya n’okwu banyere nnwere onwe okpukpe. Dị ka ihe atụ, onye bụbu onyeisi oche nke Ụlọ Ọ̇rụ Mba Nile Maka Nnwere Onwe nke Okpukpe na Nkwenkwe kwuru, sị: “E kwesịghị ịnapụ okpukpe nnwere onwe okpukpe nanị n’ihi na ọha na eze lere nkwenkwe ya anya dị ka ihe a na-adịghị anakwere ma ọ bụ ihe gbapụrụ iche.” Otu prọfesọ nke ihe ọmụmụ metụtara okpukpe na mahadum Leipzig jụkwara otu ajụjụ dabara adaba banyere otu ụlọ ọrụ ọchịchị Germany bụ́ nke e guzobere iji nyochaa ihe a sị na ha bụ ịrọ òtù okpukpe, sị: “Gịnị mere o ji bụrụ nanị okpukpe ndị dị nta ka a ga-enyocha ma hapụ chọọchị ukwu abụọ ahụ [Chọọchị Roman Katọlik na Chọọchị Lutheran]?” Ọ dịghị anyị mkpa ịchọwa azịza ya n’ebe ọzọ karịa n’okwu nke otu onye bụbu onye ọrụ ọchịchị Germany, bụ́ onye dere, sị: “A pụghị inwe obi abụọ ọ bụla na ndị na-anụbigara chọọchị ọkụ n’obi ókè nọ ebe anya na-ahụghị kpebie usoro ọchịchị nke ụlọ ọrụ gọọmenti ahụ gbasoro.”

Ònye Ka Anyị Na-elegara Anya Maka Ahụ Efe?

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka ihe si n’ihe Gameliel mere pụta ji bụrụ nke a kpaara ókè? (b) Olee otú mmadụ atọ ọzọ a na-asọpụrụ si bụrụ ndị a kpaara ókè n’ihe ha pụrụ ime maka ọdịmma Jisọs?

15 Ihe Gameliel kwuru mere nanị ka eziokwu ahụ bụ́ na ọrụ nwere nkwado Chineke apụghị ịkụ afọ n’ala, pụta ìhè. Obi abụọ adịghị ya na ndị Kraịst oge mbụ ritere uru n’okwu ọ gwara Sanhedrin, ma ha echefughị na ihe Jisọs kwuru banyere ụmụazụ ya ịbụ ndị a ga-akpagbu bụkwa eziokwu. Ihe Gameliel mere mere ka ndị ndú okpukpe ahụ kwụsị atụmatụ ha na-eme igbu ha, ma nke ahụ emeghị ka mkpagbu kwụsị kpam kpam, n’ihi na anyị na-agụ, sị: “Ha wee kwenyere ya: mgbe ha kpọsịrị ndị ozi bịakwute ha, ha pịa ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n’aha Jisọs, ha wee hapụ ha ka ha laa.”—Ọrụ 5:40.

16 Mgbe a na-ekpe Jisọs ikpe, Pọntịọs Paịlet, mgbe ọ hụrụ na ikpe amaghị Jisọs, gbalịrị ịtọhapụ ya. Ma o nweghị ihe ịga nke ọma. (Jọn 18:38, 39; 19:4, 6, 12-16) Ọbụna ihe mmadụ abụọ so na Sanhedrin, bụ́ Nikọdimọs na Josef nke Arimatia, ndị ha na Jisọs dị ná mma, pụrụ ime iji gbochie ụlọikpe ahụ ime ihe megide Jisọs, bụ nke a kpaara ókè. (Luk 23:50-52; Jọn 7:45-52; 19:38-40) Ahụ efe nke ụmụ mmadụ na-eweta mgbe ha gbachiteere ndị Jehova—ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya—bụ nke a kpaara nnọọ ókè. Ụwa ga-anọgide na-akpọ ezi ụmụazụ Kraịst asị, ọbụna dị ka ha kpọrọ ya. Ahụ efe zuru ezu ga-esi nanị n’aka Jehova bịa.—Ọrụ 2:24.

17. Echiche dị aṅaa ziri ezi ka Ndịàmà Jehova nwere, gịnị mere na ha adịghị ada mbà ná mkpebi ha ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ?

17 N’ezie, Ndịàmà Jehova na-atụ anya na mkpagbu ga-anọgide na-aga n’ihu. Mmegide ga-akwụsị nanị mgbe e meriri usoro ihe Setan kpam kpam. Ma, mkpagbu a, ọ bụ ezie na ọ dịghị atọ ụtọ, adịghị eme ka Ndịàmà kwụsị ịrụzu ọrụ ha nke ikwusa Alaeze ahụ. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji mee otú ahụ, ebe ọ bụ na Chineke na-akwado ha? Ha na-elegara Onye Ndú ha nwere obi ike, bụ́ Jisọs Kraịst, anya dị ka onye nlereanya kwesịrị ekwesị.—Ọrụ 5:17-21, 27-32.

18. Ihe isi ike dị aṅaa ka ndị Jehova ka ga-enwe n’ọdịnihu, ma gịnị ka ha kwenyesiri ike na ọ ga-esi na ya pụta?

18 Site kpọmkwem ná mmalite ya, a kpagbuwo ezi okpukpe ahụ n’ụzọ siri ike. N’oge na-adịghị anya, Gọg, bụ́ Setan nke nọ n’ọnọdụ ọjọọ ya kemgbe e si n’eluigwe chụpụ ya, ga-awakpo ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma ezi okpukpe ga-alanarị. (Ezikiel 38:14-16) “Ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” n’okpuru nduzi Setan, “ga-ebu agha megide Nwa atụrụ ahụ, Nwa atụrụ ahụ ga-emerikwa ha, n’ihi na Ọ bụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile.” (Mkpughe 16:14; 17:14) Ee, Eze anyị na-aga n’ihu ruo mmeri ikpeazụ, ọ ‘ga-emerikwa’ n’oge na-adịghị anya. Lee ihe ùgwù ọ bụ iso ya na-aga n’ihu, na-amara na, n’oge na-adịghị anya, ọ dịtụghị onye ga-arụ ndị na-efe Jehova ofufe ụka ọzọ mgbe ha ga-asị: “Chineke dịịrị anyị”!—Ndị Rom 8:31; Ndị Filipaị 1:27, 28.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị ka Jehova meworo iji mee ka ọgbakọ ndị Kraịst sikwuo ike kemgbe e guzobere Alaeze ahụ?

• Gịnị ka Setan meworo iji nwaa igbochi Kraịst inwezu mmeri ya, oleekwa ihe ndị si na ya pụta?

• Echiche dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka anyị kwesịrị inwe banyere ezi ihe ndị na-abụghị Ndịàmà na-eme?

• Gịnị ka Setan ga-eme n’oge na-adịghị anya, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Mgbakọ dị iche iche bụ otu ihe na-egosi ịga n’ihu nke ndị Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Nnọpụiche nke Ndịàmà n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ka na-ewetara Jehova otuto