Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Bụrụ Na Chineke Dịịrị Anyị, Ònye Na-emegide Anyị?”

“Ọ Bụrụ Na Chineke Dịịrị Anyị, Ònye Na-emegide Anyị?”

“Ọ Bụrụ Na Chineke Dịịrị Anyị, Ònye Na-emegide Anyị?”

“Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu n’ile ihe ndị a anya? Ọ bụrụ na Chineke dịịrị anyị, ònye na-emegide anyị?”—NDỊ ROM 8:31.

1. Olee ndị sooro ụmụ Israel si n’Ijipt pụọ, gịnịkwa mere ha ji mee otú ahụ?

MGBE ụmụ Israel nọ na-aga inwere onwe ha mgbe ha nọsịrị afọ 215 n’Ijipt, na-anọ ihe ka ukwuu n’ime oge ahụ n’ịbụ ohu, “ọtụtụ ndị gwara ọgwa sooro ha rịgoo.” (Ọpụpụ 12:38) Ndị a na-abụghị ndị Israel ahụwo ihe otiti iri na-eyi egwu bụ́ ndị bibiri ihe dị ukwuu n’Ijipt ma mee ka chi ụgha ya dị iche iche bụrụ ihe ọchị. N’otu mgbe ahụ, ha ahụwo—karịsịa malite n’ihe otiti nke anọ gaa n’ihu—ikike Jehova nwere ichebe ndị ya. (Ọpụpụ 8:23, 24) Ọ bụ ezie na ha nwere ihe ọmụma a kpaara ókè banyere nzube Jehova, otu ihe doro ha anya: Chi dị iche iche nke Ijipt echebelighị ndị Ijipt, ebe Jehova gosiworo na ya dị ike n’ime ihe maka ọdịmma nke ụmụ Israel.

2. N’ihi gịnị ka Rehab ji kwado ndị nledo ahụ bụ́ ndị Israel, n’ihi gịnịkwa ka obi ike o nwere n’ebe Chineke ha nọ ji bụrụ nke na-ehieghị ụzọ?

2 Afọ 40 mgbe nke ahụ gasịrị, kpọmkwem tupu ụmụ Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, onye nọchiri Mosis, bụ́ Joshua, zipụrụ ndị ikom abụọ ịga ledoo ala ahụ. N’ebe ahụ, ha zutere Rehab, bụ́ onye bi na Jeriko. Site n’ihe ọ nụrụla banyere ike Jehova kpara iji chebe ụmụ Israel eri afọ 40 ha si n’Ijipt pụta, ọ maara na ọ bụrụ na ya chọrọ ngọzi Chineke, na ya aghaghị ịkwado ndị Ya. N’ihi mkpebi o ji amamihe mee, e bibighị ya na ezinụlọ ya mgbe ụmụ Israel mesịrị jichie obodo ahụ. Ụzọ ọrụ ebube e si zọpụta ha bụ n’onwe ya ihe àmà doro anya na Chineke nọnyeere ha. N’ihi ya, obi ike Rehab nwere n’ebe Chineke nke ụmụ Israel nọ ehieghị ụzọ.—Joshua 2:1, 9-13; 6:15-17, 25.

3. (a) Olee ọrụ ebube Jisọs rụrụ na nso obodo Jeriko ahụ e wughachiri ewughachi, oleekwa otú ndị ụkọchukwu ndị Juu si meghachi omume? (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị Juu, nakwa mgbe e mesịrị, ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu, bịara ghọta?

3 Narị afọ 15 mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs Kraịst gwọrọ otu onye arịrịọ kpuru ìsì na nso obodo Jeriko e wughachiri ewughachi. (Mak 10:46-52; Luk 18:35-43) Nwoke a rịọrọ Jisọs ka o meere ya ebere, na-egosi na ọ ghọtara na Jisọs nwere nkwado Chineke. N’aka nke ọzọ, ndị ndú okpukpe ndị Juu na ụmụazụ ha jụrụ n’ozuzu ha ịnakwere ọrụ ebube ndị ahụ Jisọs rụrụ dị ka ihe akaebe na-egosi na ọ nọ na-arụ ọrụ Chineke. Kama nke ahụ, ha katọrọ ya. (Mak 2:15, 16; 3:1-6; Luk 7:31-35) Ọbụna mgbe a gwara ha eziokwu ahụ bụ́ na e mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie mgbe ha gbusịrị ya, ha adịghị njikere ikweta na ọ bụ Chineke mere ya. Kama nke ahụ, ha butere ụzọ n’ịkpagbu ụmụazụ Jisọs, na-anwa igbochi ọrụ ha bụ́ ‘izisa ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.’ Ma ụfọdụ ndị Juu, nakwa mgbe e mesịrị, ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Juu, rịbara ihe omume ndị a ama ma nyochaa ha n’ụzọ ziri ezi. O doro ha anya na Chineke ajụla ndị ndú ndị Juu ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha ma na-akwado ụmụazụ Jisọs Kraịst dị umeala n’obi.—Ọrụ 11:19-21.

Olee Ndị Nwere Nkwado Chineke Taa?

4, 5. (a) Olee otú ụfọdụ mmadụ si ele ịhọrọ okpukpe anya? (b) Mgbe a na-eme ka a mata ezi okpukpe ahụ, gịnị bụ ajụjụ dị oké mkpa ịjụ?

4 A bịa n’ihe banyere ezi okpukpe, otu onye ụkọchukwu kwuru n’ajụjụ ọnụ a gbara ya na TV na nso nso a, sị: “Aga m ekwusi ike na okpukpe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka mmadụ bụrụ onye ka mma mgbe ọ na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ozizi okpukpe ahụ.” N’ezie, ezi okpukpe na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị ka mma. Ma eziokwu ahụ bụ́ na okpukpe na-eme ka e nwee mmadụ ndị ka mma ọ̀ na-egosi n’onwe ya na o nwere nkwado Chineke? Nke ahụ ọ̀ bụ nanị ụkpụrụ e ji ekpebi ma okpukpe ò ziri ezi?

5 Onye ọ bụla na-enwe mmasị ime nhọrọ onwe onye, gụnyere ịhọrọ okpukpe. Ma mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ adịghị eme ka e jide n’aka na ọ ga-eme nhọrọ ziri ezi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ mmadụ na-ahọrọ okpukpe dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị na-ekpe ya, akụ̀ na ụba ya, otú ememe ya si ekpo ọkụ, ma ọ bụ nkekọ ezinụlọ ha. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a bụtụ ụzọ ziri ezi isi kpebie ma okpukpe ọ̀ bụ nke ezigbo ya ka ọ bụ na ọ bụghị. Ajụjụ dị oké mkpa ịjụ n’okwu a bụ: Olee okpukpe na-agba ndị na-ekpe ya ume ime uche Chineke ma na-enye ihe àmà siri ike nke nkwado Chineke, nke na ndị na-ekpe ya pụrụ iji obi ike kwuo, sị, “Chineke dịịrị anyị”?

6. Olee okwu Jisọs nke na-eme ka okwu banyere ezi okpukpe na okpukpe ụgha doo anya?

6 Jisọs guzobere ụkpụrụ a ga-eji na-amata ọdịiche dị n’etiti ezi ofufe na ofufe ụgha mgbe o kwuru, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ. Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” (Matiu 7:15, 16; Malakaị 3:18, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime “mkpụrụ,” ma ọ bụ akara ndị ahụ e ji amata ezi okpukpe ka anyị wee nwee ike iji obi eziokwu kpebie ndị nwere nkwado Chineke taa.

Akara Ndị E Ji Amata Ndị Nwere Nkwado Chineke

7. Gịnị ka ịkụzi nanị ihe dabeere na Bible pụtara?

7 Ha na-eme ka ozizi ha dabere na Bible. Jisọs kwuru, sị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ime ihe Ọ na-achọ, ọ ga-amara ihe ozizi a bụ, ma ò sitere n’aka Chineke, ma ọ bụ na Mụ onwe m na-ekwu site n’Onwe m.” O kwukwara, sị: “Onye sitere na Chineke na-anụ okwu Chineke.” (Jọn 7:16, 17; 8:47) N’ụzọ ezi uche dị na ya, iji nweta nkwado Chineke, mmadụ aghaghị ịkụzi nanị ihe Chineke na-ekpughe n’Okwu ya ma jụ ozizi ndị dabeere n’amamihe ma ọ bụ ọdịnala mmadụ.—Aịsaịa 29:13; Matiu 15:3-9; Ndị Kọlọsi 2:8.

8. Gịnị mere o ji dị mkpa iji aha Chineke na-eme ihe n’ofufe?

8 Ha na-eji aha Chineke, bụ́ Jehova, eme ihe ma na-akpọsa ya. Aịsaịa buru amụma, sị: “Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya, meenụ ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, hotanụ na e mewo ka aha Ya dị elu. Bụkuonụ Jehova abụ ọma; n’ihi na ihe ọkaaka ka O meworo: e mewo ka a mara nke a n’ụwa nile.” (Aịsaịa 12:4, 5) Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ya mere, ma hà bụ ndị Juu ma ọ bụ na ha abụghị, ndị Kraịst ga-eje ozi dị ka ‘ndị e wepụtaara aha Chineke.’ (Ọrụ 15:14) O doro anya na obi na-adị Chineke ụtọ ịkwado ndị ọ na-atọ ụtọ ịbụ ‘ndị e wepụtaara aha ya.’

9. (a) Gịnị mere ọṅụ ji bụrụ ihe e ji amata ndị na-ekpe ezi okpukpe? (b) Olee otú Aịsaịa si gosi ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha?

9 Ha na-egosipụta àgwà inwe ọṅụ nke Chineke. Dị ka onye chepụtara “ozi ọma,” Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW) Ya mere, olee otú ndị na-efe ya ofufe pụrụ isi bụrụ ndị na-adịghị mgbe ha na-enwe obi ụtọ ma ọ bụ nchekwube? N’agbanyeghị ahụhụ a na-ata n’ụwa na nsogbu onwe onye, ezi ndị Kraịst na-anọgide na-enwe ọṅụ n’ihi na ha na-eri nri ime mmụọ n’ụba mgbe nile. Aịsaịa gosiri ọdịiche dị n’etiti ha na ndị na-ekpe okpukpe ụgha, sị: “Nke a ka Onyenwe anyị Jehova [kwuru], Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga-akpọ unu onwe unu nkụ: lee, ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga-eme unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma, ma unu onwe unu ga-eti mkpu site n’ihe mgbu nke obi, unu ga-esitekwa ná ntiwa nke mmụọ unu kwasie ákwá ike.”—Aịsaịa 65:13, 14.

10. Olee otú ndị na-ekpe ezi okpukpe ahụ si ezere ịbụ ndị na-amụta ihe site n’ime ọtụtụ nnwale?

10 Ha na-eme ka omume ha na mkpebi ha dabere n’ụkpụrụ Bible. “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị,” ka onye dere Ilu na-adụ anyị n’ọdụ, “n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Chineke na-akwado ndị na-elegara ya anya maka nduzi kama ilega anya ná nchepụta echiche ndị na-emegide onwe ha bụ́ ndị si n’aka mmadụ ndị na-eleghara amamihe Chineke anya. Ruo ókè mmadụ dị njikere ime ka ndụ ya kwekọọ n’Okwu Chineke, ọ ga-ezere ịbụ onye na-amụta ihe site n’ime ọtụtụ nnwale.—Abụ Ọma 119:33; 1 Ndị Kọrint 1:19-21.

11. (a) Gịnị mere na a pụghị ikewa ndị na-ekpe ezi okpukpe gaa n’òtù ndị ụkọchukwu na nke ndị aghasa? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị na-edu ndú n’etiti ndị Chineke ga-esetịpụrụ ìgwè atụrụ ahụ?

11 A haziri ha n’otu ụzọ ahụ e si hazie ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Jisọs setịpụrụ ụkpụrụ bụ́: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu, Rabaị: n’ihi na otu Onye bụ Onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu Onye bụ Nna unu, Ya bụ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ndị ndú, n’ihi na otu Onye bụ Onye ndú unu, Ya bụ Kraịst ahụ. Ma onye dịkarịrị ukwuu n’etiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.” (Matiu 23:8-11) Ọgbakọ nke ndị bụ́ ụmụnna adịghị enwe òtù ndị ụkọchukwu dị mpako bụ́ nke na-akpọkwasị onwe ya utu aha ndị dị elu ma na-ebuli onwe ya elu karịa ndị aghasa. (Job 32:21, 22) A na-agwa ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke ka ha mee otú ahụ ‘ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa ha, kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na ha dị ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa dị ka a ga-asị na ha na-eme ndị bụ́ ihe nketa dị ka ha bụ ndị nwe ha, kama na-eme onwe ha ihe atụ ìgwè atụrụ ahụ ga-eṅomi.’ (1 Pita 5:2, 3) Ezi ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-ezere ịnwa ime onwe ha ndị nwe okwukwe ndị ọzọ. Dị ka ndị ọrụ ibe ha n’ozi Chineke, ha na-agbalịsi nnọọ ike isetịpụ ezi ihe nlereanya.—2 Ndị Kọrint 1:24.

12. Echiche dị aṅaa guzoziri eguzozi banyere ọchịchị ụmụ mmadụ ka Chineke na-achọ n’aka ndị na-achọ inweta nkwado ya?

12 Ha na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị mmadụ ma nọgidekwa na-anọpụ iche. Onye na-adịghị ‘edo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi’ apụghị ịtụ anya inweta nkwado Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na “ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo. Ya mere onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere.” (Ndị Rom 13:1, 2) Otú ọ dị, Jisọs ghọtara na a pụrụ inwe ihe abụọ ga-emegiderịta onwe ha mgbe o kwuru, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:17) Ndị na-achọ inweta nkwado Chineke aghaghị ‘ibu ụzọ chọọ alaeze Chineke, na ezi omume Ya,’ n’otu mgbe ahụkwa, na-erube isi n’iwu nke mba ha nọ na ya bụ́ ndị na-emegideghị ibu ọrụ ka elu ha nwere n’ebe Chineke nọ. (Matiu 6:33; Ọrụ 5:29) Jisọs mesiri nnọpụiche ike mgbe o kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” O mesịrị gbakwụnye, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.”—Jọn 17:16; 18:36.

13. Òkè dị aṅaa ka ịhụnanya na-ekere n’ime ka a mata ndị Chineke?

13 Ha adịghị ele mmadụ anya n’ihu n’ịrụ “ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Ịhụnanya ndị Kraịst adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ na-anabata mmadụ nile n’agbanyeghị ụcha akpụkpọ ahụ, ọnọdụ akụ̀ na ụba ma ọ bụ nke mmụta, mba, ma ọ bụ asụsụ ha. Ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe ha nọ na-enye aka eme ka a mata ndị nwere nkwado Chineke. Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:35; Ọrụ 10:34, 35.

14. Ndị nwere nkwado Chineke hà bụ ndị ọha mmadụ na-aghaghị ịnabata? Kọwaa.

14 Ha dị njikere inweta mkpagbu n’ihi ime uche Chineke. Jisọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị tupu oge eruo, sị: “Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu; ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.” (Jọn 15:20; Matiu 5:11, 12; 2 Timoti 3:12) Ndị nwere nkwado Chineke abụwo ndị a na-adịghị ele anya ọma kemgbe ụwa, otú ahụ ka ọ dị n’ebe Noa nọ, bụ́ onye mara ụwa ikpe site n’okwukwe ya. (Ndị Hibru 11:7) Taa, ndị na-achọ inweta nkwado Chineke adịghị anwa anwa ebelata ịdị irè nke okwu Chineke ma ọ bụ mebie ụkpụrụ Chineke iji zere mkpagbu. Ha maara na ọ bụrụhaala na ha ejiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi, ọ ‘ga-eju ndị mmadụ anya, ha ga-agakwa n’ihu na-ekwulu’ ha.—1 Pita 2:12; 3:16; 4:4.

Oge Ịtụle Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu

15, 16. (a) Ajụjụ ndị dị aṅaa ga-enyere anyị aka ịmata òtù okpukpe nke nwere nkwado Chineke? (b) Gịnị ka ọtụtụ nde mmadụ kwubiworo, n’ihi gịnịkwa?

15 Jụọ onwe gị, sị ‘Olee òtù okpukpe a maara maka ịgbasochi Okwu Chineke anya, ọbụna mgbe ozizi ya dị iche n’ihe ndị ka ọtụtụ kweere? Olee ndị na-emesi ịdị mkpa nke aha aka Chineke ike, ọbụna jiri ya na-eme ka a mara ha? Olee ndị na-eji nchekwube ezo aka n’ebe Alaeze Chineke nọ dị ka nanị ihe ngwọta dịịrị nsogbu nile nke mmadụ? Olee ndị na-akwalite ụkpụrụ omume Bible, n’agbanyeghị na a na-ewere ha dị ka ndị na-eme ihe mgbe ochie? Olee òtù a maara dị ka nke na-enweghị ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ, nke ndị nile so na ya bụ ndị nkwusa? Olee ndị a na-aja mma maka ịbụ ụmụ amaala na-erube isi n’iwu, n’agbanyeghị na ha na-ajụ ikere òkè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Olee ndị na-eji ịhụnanya etinye oge na ego n’inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke na nzube ya? Oleekwa ndị a na-eleda anya, na-akwa emo, na-akpagbukwa n’agbanyeghị na ha na-eme ihe a nile kwesịrị ịja mma?’

16 Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile atụlewo ihe ndị bụ́ eziokwu ma kwenyesie ike na ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova na-ekpe ezi okpukpe ahụ. Ha eruwo ná nkwubi okwu a dabere n’ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi na otú ha si akpa àgwà, nakwa dabere n’uru ndị okpukpe ha wetaworo. (Aịsaịa 48:17) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọtụtụ nde mmadụ na-ekwu, dị ka e buru n’amụma na Zekaraịa 8:23, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”

17. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ime ka ọ pụta ìhè na ha na-ekpe ezi okpukpe ahụ na-ejighị bụrụ ịdị mpako?

17 Ndịàmà Jehova ime ka ọ pụta ìhè na ọ bụ nanị ha nwere nkwado Chineke ọ̀ bụ ịdị mpako? Ọ bụghị, dị nnọọ ka ọ na-abụghị mgbe ụmụ Israel nọ n’Ijipt zọọrọ na ha nwere nkwado Chineke n’agbanyeghị ihe ndị Ijipt kweere, ma ọ bụ mgbe ndị Kraịst narị afọ mbụ zọọrọ na ha nwere nkwado Chineke n’agụnyeghị ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu. Ihe ndị mere eme na-agba akaebe nke a. N’ala 235, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ahụ Jisọs buru n’amụma na ezi ụmụazụ ya ga na-arụ na mgbe ọgwụgwụ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.

18, 19. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị nwee ihe mere Ndịàmà Jehova ga-eji kwụsị ịrụ ọrụ nkwusa ha, n’agbanyeghị na a na-emegide ha? (b) Olee otú Abụ Ọma 41:11 si akwado eziokwu ahụ bụ́ na Ndịàmà nwere nkwado Chineke?

18 Ndịàmà Jehova ga-anọgide na-arụ ọrụ a, n’ekweghị mgbe ọ bụla ka mkpagbu ma ọ bụ mmegide gbochie ọrụ ha. A ga-arụrịrị ọrụ Jehova. Mgbalị nile ndị ọzọ meworo n’ime narị afọ gara aga iji gbochie Ndịàmà ịrụzu ọrụ Chineke mesịrị kụọ afọ n’ala, n’ihi na Jehova kwere nkwa, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha na-esite na m: ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Aịsaịa 54:17.

19 Eziokwu ahụ bụ́ na Ndịàmà Jehova dị ike ma na-arụsi ọrụ ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ—n’agbanyeghịkwa mmegide zuru ụwa ọnụ—bụ ihe na-agba akaebe na ihe ha na-eme na-atọ Jehova ụtọ. Eze Devid kwuru, sị: “Nke a ka m ji mara na ihe m na-atọ Gị ụtọ, n’ihi na onye iro m adịghị eti mkpu mmeri n’ahụ m.” (Abụ Ọma 41:11; 56:9, 11) Ndị iro Chineke agaghị eti mkpu mmeri ma ọlị n’ahụ ndị Jehova, n’ihi na Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs Kraịst, na-aga n’ihu inwe mmeri ikpeazụ!

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Olee ihe atụ ụfọdụ e nwere n’oge ochie banyere ndị nwere nkwado Chineke?

• Olee akara ụfọdụ e ji amata ezi okpukpe ahụ?

• N’ihi gịnị ka i ji kwenyesie ike n’onwe gị na Ndịàmà Jehova nwere nkwado Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị na-achọ inweta nkwado Chineke aghaghị ime ka ozizi ha dabere kpam kpam n’Okwu ya

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-abụrụ ìgwè atụrụ ahụ ndị nlereanya