Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọmụmụ Bible—Ọ̀ Dị Uru Ọ Baara Gị?

Ọmụmụ Bible—Ọ̀ Dị Uru Ọ Baara Gị?

Ọmụmụ Bible—Ọ̀ Dị Uru Ọ Baara Gị?

“A GAGHỊ agụ ya ma onye ụkọchukwu anọghị ya.” A na-ahụ ịdọ aka ná ntị a ná mbido Bible ụfọdụ nke ndị Katọlik. “Dị ka ndị Katọlik, ọ bụghị mgbe nile ka e kwere ka Bible ruo anyị aka,” ka Kay Murdy nke Ụlọ Akwụkwọ Bible Ndị Katọlik dị na Los Angeles na-ekwu, “ma nke ahụ agbanwewala.” Ozugbo ndị Katọlik matara otú Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi metụta ndụ ha, ka ọ na-ekwu, “ha zụlitewere agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ n’onwe ha maka Bible.”

Banyere mgbanwe a, magazin bụ́ U.S. Catholic hotara otu onye nduzi nke ihe ọmụmụ okpukpe bụ́ onye sịrị na ndị Katọlik bụ́ ndị sonyere n’ìgwè ọmụmụ Bible dị iche iche chere na “a napụrụ ha ihe ruuru ha dị ka ndị Katọlik, nakwa na e nwere akụ̀ dị ukwuu n’ime Bible. Ha chọrọ inweta ụfọdụ n’ime akụ̀ ahụ ha chere na ọ na-efunahụ ha.”

Otú o sina dị, olee “akụ̀” onye na-amụ Bible ga-achọpụta? Tụleedị: Ọ̀ ga-amasị gị ịmara otú ị ga-esi anagide nchegbu ndị ị na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị? Ị̀ pụrụ isi aṅaa mee ka udo dịgide n’ime ezinụlọ? N’ihi gịnị ka e ji enwe nnọọ àgwà ọjọọ na akparamàgwà na-emebi mmekọrịta mmadụ na ibe ya? Olee ihe na-akpata ime ihe ike n’etiti ndị ntorobịa nke oge a? A pụrụ ịchọta azịza ndị a pụrụ ịdabere na ha nye ajụjụ ndị a na ndị ọzọ dị mgbagwoju anya n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, ha ga-abụkwa “akụ̀,” n’ezie, ọ bụghị nye nanị ndị Katọlik ma ọ bụ Protestant kamakwa nye ndị Buddha, ndị Hindu, ndị Alakụba, ndị Shinto, ọbụna ndị na-ekweghị na Chineke dị na ndị kweere na a pụghị ịmata Chineke. Dị ka ọbụ abụ ahụ si kwuo ya, ‘okwu Chineke bụ oriọna dịịrị ụkwụ ya, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ ya.’ Ọ pụrụ ịbụrụ gị otu ihe ahụ.—Abụ Ọma 119:105.