Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụkpụrụ Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Ụkpụrụ Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

Ụkpụrụ Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?

A kpaliri mmasị otu onye gara Africa na nke mbụ ya mgbe ọ hụrụ otu nwoke ka ọ kwụ chịm n’akụkụ ụzọ. Ọ rịbara ama na kwa minit ole na ole, nwoke ahụ na-echichiri ụkwụ ya n’ala gatụ nwantịị n’otu akụkụ ka ọ ka kwụkwa chịm. Ọ bụ nanị mgbe e mesịrị ka onye ọbịa ahụ ghọtara ihe mere nwoke ahụ ji aga otú ahụ o si na-aga. N’ezie, ọ nọ na-agbalị ịnọrọ na ndò nke otu poolu telegraph. Onyinyo ahụ ji nke nta nke nta na-aga ka anwụ ehihie ahụ nọ na-aga.

DỊ KA onyinyo anyanwụ ahụ, ihe omume na ụkpụrụ ụmụ mmadụ na-agbanwe mgbe nile. N’ụzọ dị iche, Jehova Chineke, “Nna nke ìhè,” adịghị agbanwe agbanwe. “Onye,” ka Jemes onyeozi na-ede, “ọghụgha ọ bụla na-apụghị ịdị n’ebe Ọ nọ, ma ọ bụ onyinyo nke nchigharị na-eweta.” (Jemes 1:17) Onye amụma Hibru bụ́ Malakaị deturu ihe Chineke n’onwe ya kwupụtara, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Chineke gwara mba Israel n’oge Aịsaịa, sị: “Ọzọ, ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka: Mụ onwe m emewo.” (Aịsaịa 46:4) N’ihi ya, ngafe nke oge adịghị ebibi obi ike anyị pụrụ inwe ná nkwa Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.

Ihe Mmụta Sitere n’Iwu Ahụ

Dị nnọọ ka nkwa Jehova bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha na ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, otú ahụ ka ụkpụrụ ya banyere ezi ihe na ihe ọjọọ dị. Ị̀ ga-atụkwasị onye ahịa obi bụ́ onye na-eji ụzọ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ eme ihe, nke ọ bụ nanị otu ziri ezi? Ọ dịghị ma ọlị. N’otu aka ahụ, “ihe osìsì aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova: ma nkume isì ihe zuru ezu bụ ihe na-atọ Ya ụtọ.” (Ilu 11:1; 20:10) N’Iwu ahụ o nyere ụmụ Israel, Jehova nyere iwu a: “Unu emela ajọ omume n’ikpe, ma ọ bụ n’ịtụ ihe, ma ọ bụ n’isì ihe, ma ọ bụ n’ịtụ ihe dị mmiri mmiri. Ihe osìsì ziri ezi, na nkume isì ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu ga-enwe: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu, Nke mere ka unu si n’ala Ijipt pụta.”—Levitikọs 19:35, 36.

Irube isi n’iwu ahụ wetaara ụmụ Israel ihu ọma Chineke nakwa ọtụtụ abamuru n’ụzọ ihe onwunwe. N’otu aka ahụ, ịgbaso ụkpụrụ Jehova ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ bụghị nanị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kama n’akụkụ nile nke ndụ, na-ewetara onye na-efe ya ma na-atụkwasị ya obi, ngọzi. Chineke na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.

Gịnị Mere Ụkpụrụ Ji Ada Ada Taa?

Bible na-ekwu ihe mere ụkpụrụ ji ada ada taa. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, na-akọwa otu agha a lụrụ n’eluigwe, bụ́ nke ihe si na ya pụta metụtaworo mmadụ nile rute n’oge a. Jọn onyeozi dere, sị: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.”—Mkpughe 12:7-9.

Mmetụta dị aṅaa ka agha ahụ nwere ozugbo? Jọn gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:12.

‘Ahụhụ ụwa’ bịara mgbe Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914 ma weta oge e nwere ụkpụrụ ndị dị nnọọ iche n’ebe ndị nke oge a dị, ná njedebe. “Agha Ukwu nke 1914-1918 dị ka ókè nke na-ekewa oge ahụ na nke anyị,” ka ọkọ akụkụ ihe mere eme bụ́ Barbara Tuchman na-ekwu. “Site n’igbu ọtụtụ mmadụ bụ́ ndị gaara aba uru ma rụpụta ihe n’afọ ndị sochirinụ, n’ibibi nkwenkwe, ịgbanwe echiche, na n’iweta nsogbu nke enweghị afọ ojuju bụ́ ndị na-adịghị akwụsị akwụsị, o mere ka e nwee oghere sara mbara n’ụzọ nkịtị na n’ụzọ iche echiche n’etiti oge abụọ ahụ.” Ọkọ akụkọ ihe mere eme ibe ya bụ́ Eric Hobsbawm na-ekwenye, sị: “Kemgbe 1914, e nwewo ndalata dị ukwuu n’ụkpụrụ ndị e weere n’oge ahụ ná mba ndị mepere emepe dị ka ndị dị otú ha kwesịrị . . . Ọ dịghị mfe ịghọta ókè a laghachiruru, ọ dị mwute na ọ na-aga ngwa ngwa, n’ihe nna nna anyị ha nke narị afọ nke iri na itoolu gaara akpọwo ụkpụrụ ndị ime ọhịa.”

N’akwụkwọ ya bụ́ Humanity—A Moral History of the Twentieth Century, onye edemede bụ́ Jonathan Glover na-ekwu, sị: “Otu ihe e ji mara oge anyị bụ ọpụpụ iwu ndị metụtara omume na-apụ n’anya.” Ọ bụ ezie na o nwere obi abụọ banyere iwu omume sitere n’èzí n’ihi ndakpọ nke okpukpe n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa, ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ekwenyeghị n’iwu omume okpukpe n’etiti anyị ka ga na-echegbu onwe ha banyere ọpụpụ ọ na-apụ n’anya.”

Ekwesịghị ntụkwasị obi a na-enwe n’oge a—ma ọ bụ n’azụmahịa, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ n’okpukpe ma ọ bụ ọbụna ná mmekọrịta onwe onye na nke ezinụlọ—na ihe ndị dị egwu na-esi na ya apụta bụ akụkụ nke ajọ atụmatụ Setan na-eme iji wetara ndị bi n’ụwa ahụhụ. Setan ekpebisiwo ike ịlụru ọgụ ya n’isi nakwa ime ka e bibikọta ya na ndị ahụ na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke.—Mkpughe 12:17.

È nwere ihe a ga-eme maka ya, ihe ngwọta maka ndị mmadụ ime dị ka nkịta na-ata ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu bụ́ nke jupụtara ebe nile? Pita onyeozi na-aza, sị: “Ma dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Anyị pụrụ ịtụkwasị obi ná nkwa ahụ n’ihi na ọ bụghị nanị na Chineke nwere ikike imezu nzube ya kamakwa ọ na-ahụ na e mezuru ya. Jehova na-ekwu banyere ‘okwu nke na-esi n’ọnụ ya pụta,’ sị: “Ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.” Ọ bụ nkwa a pụrụ ịtụkwasị obi n’ezie!—Aịsaịa 55:11; Mkpughe 21:4, 5.

Ịdị Ndụ n’Ụzọ Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Chineke

N’ụwa nke e nwere ụkpụrụ ndị na-ada ada ma na-agbanwe agbanwe, Ndịàmà Jehova na-agbalị ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị Bible na-esetịpụ. N’ihi ya, ha na-anọpụ iche n’ebe ndị ka n’ọnụ ogụgụ nọ, mgbe mgbe, nke a adọtawokwa mmasị—na nlelị—nke ndị ọzọ.

N’otu mgbakọ nke Ndịàmà Jehova e nwere na London, otu onye nta akụkọ TV jụrụ ọnụ kwuchiteere Ndịàmà Jehova ma Ndịàmà Jehova hà bụ n’ezie ndị Kraịst. Ọ zara, sị: “Ee, ha bụ nnọọ n’ihi na Jisọs bụ onye nlereanya anyị. E nwere oké ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’ụwa, anyị na-elekwasịkwa Jisọs Kraịst anya dị ka ụzọ, eziokwu, na ndụ. Anyị kweere na ọ bụ Ọkpara Chineke, ọ bụghị akụkụ nke Atọ n’Ime Otu, ya mere ụzọ anyị si aghọta Bible dị iche n’ụzọ okpukpe ndị a ma ama si aghọta ya.”

Mgbe e gosiri ajụjụ ọnụ ahụ na telivishọn BBC, onye nta akụkọ ahụ mechiri ihe omume ahụ site n’ikwu, sị: “Amụtakwuola m ihe banyere ihe mere Ndịàmà Jehova ji abịa akụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. Echeghịkwa m na ahụtụwo m mmadụ 25,000 jichara nnọọ ejiji nke ọma ma na-akpacha nnọọ àgwà ọma n’otu ebe nakwa n’otu oge.” Lee akaebe ọma nke a bụ nke onye na-abụghị Onyeàmà Jehova nke na-ekiri ihe na-emenụ gbara nye amamihe dị n’ịgbaso ụkpụrụ Chineke ndị na-adịghi agbanwe agbanwe!

Ọ bụ ezie na echiche nke ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ọ na-abụghị ha setịpụrụ pụrụ ịbụ ihe a na-asọ oyi nye ụfọdụ ndị, anyị na-agba gị ume ileba anya na Bible gị ma mụta ihe ndị ụkpụrụ Chineke bụ. Ma ka nnyocha elu elu ghara iju gị afọ. Gbasoo ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Jee n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè gị, ma mata Ndịàmà nọ n’ebe ahụ. Ị ga-achọpụta na ha bụ mmadụ nkịtị bụ́ ndị na-atụkwasị obi ná nkwa dị iche iche nke Bible ma na-egosipụta obi ike ha nwere n’ebe Chineke nọ site n’ịgbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya.

Ịgbaso ụkpụrụ Chineke ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị a pụrụ ịtụkwasị obi ná ndụ gị, ga-ewetara gị ngọzi n’ezie. Ṅaa ntị n’agbamume Chineke na-enye n’onwe ya: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:18.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Taa, ndị mmadụ na-eme dị ka nkịta na-ata ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu n’azụmahịa, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n’okpukpe, nakwa ná mmekọrịta ezinụlọ