A Gbanwee Ụkpụrụ, Nkịta Ataa Ọkpụkpụ A Nyawara Ya N’olu
A Gbanwee Ụkpụrụ, Nkịta Ataa Ọkpụkpụ A Nyawara Ya N’olu
N’oge Eze Henry nke Mbụ nke England (1100-1135), e weere ya na “site n’imi Eze ahụ ruo ná ngwụsị nke mkpịsị aka ukwu ya ọ rụtịrị arụtị” dị otu yaadị. Ruo ókè ha aṅaa ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị Eze Henry na-achị ji eme ihe, ziri ezi? Ịga hụ eze ahụ yiri ka ọ̀ bụ nanị ụzọ a pụrụ isi jide n’aka.
A NA-AKỌWAKARỊ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị e nwere taa dị ka ụkpụrụ ndị e nwere si dị. N’ihi ya, a na-akọwa mita dị ka ebe ìhè ji otu sekọnd garuo n’oghere, nke e kere ụzọ 299,792,458. N’ikwu ya ná nkenke, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke ìhè a adịghị agbanwe agbanwe, ọ bụkwa nke ụdị ígwè laser pụrụ iche na-enwupụta. Ọ bụrụ na ha nwere ígwè na-emepụtaghachi ụkpụrụ ahụ, ndị mmadụ n’ebe ọ bụla pụrụ ịchọpụta na otú ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ha hà n’ogologo na otú nke onye ọ bụla ọzọ hà bụ otu ihe ahụ.
Otú ọ bụla ọ sọrọ mgbanwe ndị e nwere n’usoro ịtụ ihe ya dịruo ntakịrị, ọ pụrụ ịkpata inwe obi abụọ, a na-etinyekwa mgbalị dị ukwuu iji chekwaa ụkpụrụ ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, na Britain, ụkpụrụ e ji atụ ibu ibu nke ihe ndị e kere eke bụ ígwè ogologo e ji platinum na iridium mee bụ́ nke ịdị arọ ya bụ otu kilogram. E debere ígwè a n’Ụlọ Ime Nnyocha Ihe Ndị Metụtara Physics nke Mba Britain. Mmetọ ikuku ndị na-esite n’ụgbọala na ụgbọelu na-agafe agafe na-eme ka ígwè a e ji atụ ihe na kilogram na-etinyekwu ihe n’ịdị arọ kwa ụbọchị. Otú ọ dị, ígwè a, ma ọ bụ cylinder a, bụ mmepụtaghachi nke ụkpụrụ ịtụ ihe nke ụwa nakweere bụ́ nke e debere n’okpuru ite atọ nwere ọdịdị mgbịrịgba n’otu ọnụ ụlọ ndebe ihe dị n’okpuru ala n’Ụlọ Ọrụ Mba Nile Maka Itụ Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀ nke dị na Sèvres, France. Ma ọbụna ịdị arọ nke ihe a na-agbanwe agbanwe n’ihi ụmụ irighiri ihe ndị na-emetọ ya. Ka ọ dịgodị, ndị ọkà n’ịtụ ihe n’ụwa emepụtabeghị usoro ka guzozie eguzozie.
Ọ bụ ezie na mgbanwe dị nnọọ nta na-eyi ihe na-adịghị ihe ọ pụtara nye mmadụ nkịtị, mgbanwe nke ụkpụrụ n’ozuzu ya pụrụ ịkpata mgbagwoju anya. Na Britain, a tụkwasịkarịghị mgbanwe site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ nke imperial (pound na ounce) gaa na nke metric (kilogram na gram) kpatara, obi—e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Ụfọdụ ndị na-ere ahịa bụ́ ndị na-enweghị ụkpụrụ ji eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ mmadụ amaghị usoro ọhụrụ a nke ọma mee ihe n’ịghọgbu ndị ahịa ha.
Ụkpụrụ Ezinụlọ na nke Omume
Gịnị banyere mgbanwe ndị e nwere n’ụkpụrụ ezinụlọ na nke omume? Mmetụta nke mgbanwe ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị na-ebibi nnọọ ihe. Akụkọ a na-anụ n’oge a banyere ndakpọ ezinụlọ, inwe mmekọahụ aghara aghara, na mmetọ a na-emetọ ụmụaka n’ebe nile, na-awụ ọtụtụ ndị akpata oyi n’ahụ ma na-egosi na anyị bi n’oge ụkpụrụ na-ada ada. Ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna na ya, ụmụaka ndị “nne na nna” bụ́ nwoke nwoke ma ọ bụ nwanyị nwanyị zụlitere, na ajọ mmetọ a na-emetọ ụmụaka ndị nọ n’okpuru nlekọta ndị ọchịchị obodo n’ụzọ mmekọahụ, bụcha ihe na-esi ná ndị mmadụ ịjụ ụkpụrụ ndị a nabataworo, apụta. 2 Timoti 3:1-4.
Ndị mmadụ na-aghọkwu “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya,. . . ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, . . . ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, . . . ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya,” dị ka Bible buru n’amụma ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga.—Ndalata nke ụkpụrụ omume na mmadụ ịbụ nkịta ji obi ịta mmiri ata ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, na-aga ụkwụ na ụkwụ. Na nso nso a, e kpughere ngahie ndị pụtara nnọọ ìhè a gahieworo n’ụkpụrụ dị elu nke ọgwụgwọ ọrịa na Hyde, bụ́ obodo dị n’ebe ugwu England, bụ́ ebe ndị bi na ya gbanyeere ndị dọkịta ezinụlọ ha ha “na-akwanyere ùgwù ma tụkwasị obi” izù nzuzo. Ma, n’ụzọ dị mwute, ndị dọkịta ahụ ghọrọ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ha n’olu. N’ụzọ dị aṅaa? Akụkọ e nwetara n’oge a na-ekpe ikpe kpughere na otu dọkịta kpatara n’ezie ọnwụ nke ma ọ dịkarịa ala ndị inyom 15 n’ime ndị ọrịa ya. N’ezie, ndị uwe ojii nyochagharịrị ihe karịrị ọnwụ mmadụ 130 ndị ọzọ metụtara dọkịta ahụ. E mere ka ókè dọkịta ahụ meruru ihe dị ka nkịta na-ata ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu pụta ìhè mgbe a mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ. E nyere ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ abụọ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na dọkịta ahụ gbukwara nne ha ọrụ ndị ọzọ ka ọ ghara ịbụ ha ga na-elekọta onye mkpọrọ a nwere aha ọjọọ. Ka a sịkwa ihe mere na akụkọ banyere ikpe ahụ nke gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph kọwara onye dọkịta ahụ ikpe mara dị ka “‘Ekwensu’ dọkịta.”
N’ihi ụkpụrụ na-agbanwe agbanwe ma na-adakpọ adakpọ n’ọtụtụ akụkụ nke ndụ, ònye ka ị pụrụ iji obi ike tụkwasị obi? Olee ebe ị pụrụ ịhụ ụkpụrụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, nke nwere onye nwere ikike ịkwado ha? Isiokwu na-esonụ na-aza ajụjụ ndị a.