Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Ọṅụ na Ekele n’Agbanyeghị Mfu Na-agbawa Obi

Inwe Ọṅụ na Ekele n’Agbanyeghị Mfu Na-agbawa Obi

Akụkọ Ndụ

Inwe Ọṅụ na Ekele n’Agbanyeghị Mfu Na-agbawa Obi

DỊ KA NANCY E. PORTER SI KỌỌ

Ọ bụ na June 5, 1947, n’uhuruchi na-ekpo ọkụ na Bahamas, bụ́ àgwàetiti ndị dị ná mpụga ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke ụsọ oké osimiri United States. Otu ọfịsa na-ahụ maka ndị si ná mba ọzọ kwabata bịaara mụ na di m, bụ́ George, nleta anyị na-atụghị anya ya. O nyere anyị otu akwụkwọ ozi nke kwuru na a chọghịzi ka anyị nọrọ n’àgwàetiti ahụ nakwa na anyị “ga-esi n’ógbè ahụ pụọ ozugbo!”

MỤ NA George bụ ndị ozi ala ọzọ mbụ nke Ndịàmà Jehova bịatụworo Nassau, bụ́ obodo kasị ukwuu n’ógbè Bahamas. Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na klas nke asatọ nke Gilead, bụ́ ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ dị n’ebe ugwu New York, e nyere anyị ọrụ n’ebe a. Gịnị ka anyị meworo iji nweta mmeghachi omume siri ike otú ahụ mgbe anyị ka nọsịrị nanị ọnwa atọ? Oleekwa otú o si bụrụ na ihe karịrị nnọọ afọ 50 mgbe nke ahụ gasịrị, m ka nọ n’ebe a?

Ọzụzụ Maka Ozi

Nna m, bụ́ Harry Kilner, nwere mmetụta siri ike n’ụzọ m siworo bie ndụ m. O setịpụụrụ m ihe nlereanya magburu onwe ya, chụọ ọtụtụ àjà iji ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị na o nweghị ezi ahụ ike, ọ na-aga eme nkwusa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ngwụsị izu ọ bụla, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ebute ọdịmma Alaeze ụzọ. (Matiu 6:33) Anyị enwechaghị nnọọ ego, ma ebe ọ na-arụzi akpụkpọ ụkwụ bụ ebe bụ́ isi a na-eme ihe ime mmụọ na Lethbridge, Alberta, Canada, n’afọ ndị 1930. Ihe ndị mbụ m na-echeta banyere oge m bụ nwata bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ, ka ha na-abịa n’ụlọ anyị ma na-akọrọ anyị ahụmahụ dị iche iche.

Na 1943, amalitere m ozi ịsụ ụzọ m na nso Fort Macleod na Claresholm, Alberta. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu na Canada n’ihi nkọtọ nke ndị mmegide kọtọrọ anyị n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ókèala anyị gbasapụrụ ruo kilomita 50 site n’otu akụkụ gaa n’akụkụ ọzọ, ma ebe ọ bụ na anyị ka na-eto eto ma nwee ume, ịgbara ịnyịnya ígwè ma ọ bụ iji ụkwụ ruo ógbè nta na ugbo ndị dị n’ebe ahụ adịghị anyị ka ihe. N’oge a, enwere m ohere ileta ụfọdụ ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead, ahụmahụ ha kpalikwara ọchịchọ ịghọ onye ozi ala ọzọ n’ime m.

Na 1945, George Porter, bụ́ onye si Saskatchewan, Canada, lụrụ m. Nne na nna ya abụwo Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi kemgbe 1916, ya onwe ya kwa họọrọ ozi oge nile dị ka ụzọ ndụ ya. Ebe mbụ e nyere anyị ọrụ bụ n’ọmarịcha Lynn Valley dị na North Vancouver, Canada. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a kpọrọ anyị ịbịa Gilead.

Eri ọtụtụ afọ, esorowo m ndị gụsịrị akwụkwọ na seminarị okpukpe dịgasị iche iche kwurịta okwu ma bịa hụ otú ọzụzụ okpukpe ha nwetaworo siworo bibie okwukwe ha nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe Okwu ya, bụ́ Bible dị. N’ụzọ dị iche, ihe anyị mụtara na Gilead mere ka ikike iche echiche anyị dịkwuo nkọ, nke kasịkwa mkpa, o mere ka okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ na n’ebe Okwu ya dị sikwuo ike. E nyere ndị klas anyị ọrụ na China, Singapore, India, mba ndị dị n’Africa, n’Ebe Ndịda America, na n’ebe ndị ọzọ. M ka pụrụ icheta mkpali anyị nwere mgbe anyị matara na ọ bụ n’àgwàetiti Bahamas na-ekpo ọkụ ka e nyere anyị ọrụ.

Otú Anyị Si Nwee Ike Ịnọrọ

Njem anyị mere gaa Bahamas dị nkenke ma e were ya tụnyere njem ndị klas anyị mere. N’oge na-adịghị anya, anyị nọ na-anụ ụtọ ọnọdụ okpomọkụ, mbara igwe na-acha anụnụ anụnụ, mmiri na-acha anụnụ anụnụ, ụlọ ndị tụrụ àgwà dị iche iche, na ịnyịnya ígwè ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ. Otú ọ dị, mkpali mbụ kasị mie emi m nwere bụ banyere obere ìgwè ahụ nke Ndịàmà ise mejupụtara bụ́ ndị nọ na-eche anyị mgbe ụgbọ epeepe anyị bịarutere. Anyị mụtara n’oge na-adịghị anya na ọdịbendị ndị ebe a dị nnọọ iche n’ihe ndị mawooro anyị ahụ. Dị ka ihe atụ, a gwara di m ka ọ hapụ ịkpọ m iko di ya n’ihu ọha, ebe ọ bụ na ọ bụ di ma ọ bụ nwunye so onye ọzọ enwe mmekọahụ na-ejikarị okwu ahụ eme ihe.

N’oge na-adịghị anya, ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị ihe àmà gosiri na njekwuru anyị na-ejekwuru ndị mmadụ n’enweghị ihe mgbochi yiri egwu, boro anyị ebubo ụgha nke ịbụ ndị òtù ọchịchị Kọmunist. N’ihi ya, e nyere anyị iwu isi ná mba ahụ pụọ. Ma Ndịàmà—ndị na-erughị 20 n’àgwàetiti ahụ n’oge ahụ—mere ka ọtụtụ puku mmadụ bịanye aka n’akwụkwọ ozi rịọrọ ka a hapụ anyị ka anyị nọrọ. N’ihi ya, a kagburu iwu nchụpụ ahụ.

Anyị Agaa n’Ókèala Ọhụrụ

Eziokwu Bible pulitere ngwa ngwa n’obi ndị hụrụ Chineke n’anya, ya mere e zitekwuru ndị ozi ala ọzọ jesịrị ụlọ akwụkwọ Gilead na Bahamas. E mesịa, na 1950, e guzobere alaka ụlọ ọrụ. Afọ iri mgbe e mesịrị, Milton Henschel, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, New York, bịara Bahamas ma jụọ ndị ozi ala ọzọ ma ọ̀ dị onye nwere ọchịchọ ịga ma malite ọrụ nkwusa n’àgwàetiti ọzọ nke Bahamas. Mụ na George wepụtara onwe anyị, otú ahụ ka ihe mesịrị bụrụ ọnụnọ anyị nọrọ afọ 11 na Long Island si malite.

Àgwàetiti a, bụ́ otu n’ime ọtụtụ ndị mejupụtara Bahamas, dị kilomita 140 n’ogologo na kilomita 6 n’obosara, n’oge ahụkwa, e nweghị obodo ndị mepere ezi mmepe na ya. Isi obodo ya, bụ́ Clarence Town, nwere ihe dị ka ebe obibi 50. A na-ebi ndụ ndị na-emepechabeghị nnọọ anya na ya—e nweghị ọkụ eletrik, pọmpụ, kichin dị n’ime ụlọ, na ebe ịsa ahụ na mposi dị n’ime ụlọ. Ya mere anyị aghaghị ime mgbanwe gaa n’ihe a sị na ọ bụ ndụ ime ime àgwàetiti. N’ebe a, ahụ ike ụmụ mmadụ bụ isiokwu dị mma maka nkwurịta okwu. Anyị mụtara izere itinye ajụjụ bụ́, “Olee otú i mere taa?” n’ekele anyị, ebe ọ bụ na azịza ya na-abụkarị ogologo okwu banyere akụkọ ahụ ike onye ahụ dum.

Ihe ka ukwuu n’ịgba àmà anyị na-abụ site n’usekwu ruo n’usekwu, ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-anọkarị n’usekwu ha ndị dị n’èzí bụ́ ndị na-abụ ụlọ akịrịka ma nwee ekwú nkụ. Ọ bụ ndị ọrụ ugbo ma ọ bụ ndị ọkụ azụ̀ dara ogbenye ma dị obiọma mejupụtara ógbè ahụ n’ụzọ bụ́ isi. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị nanị ndị ji okpukpe kpọrọ ihe kamakwa ha nwere nkwenkwe ndị na-enweghị isi. Ha na-akọwakarị ihe ndị na-adịghị emekebe dị ka ihe àmà.

Ọ dịghị enyetụ ndị ụkọchukwu nsogbu n’obi ịbanye n’ebe obibi ndị mmadụ n’abụghị ndị a kpọrọ akpọ ma na-adọkasị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị anyị nyefeworo ha. Ha na-esi otú ahụ emenye ndị na-enweghị obi ike egwu, ma ọ bụghị mmadụ nile na-atụ ha ụjọ. Dị ka ihe atụ, otu garagara nwanyị dị afọ 70 jụrụ ịbụ onye ha menyere ụjọ. Ọ chọrọ ịghọta Bible, ya onwe ya na ọtụtụ ndị ọzọ mesịkwara ghọọ Ndịàmà. Ka anyị na-ahụkwu mmasị n’ebe ndị ahụ nọ, George na-akwọ ụgbọala ihe dị ka kilomita 300 na Sunday ụfọdụ, na-enyere ndị dị otú ahụ aka ịbịa nzukọ anyị.

N’ọnwa ndị mbụ ahụ a na-enweghị Ndịàmà ndị ọzọ, mụ na George nọgidere na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe site n’inwe nzukọ nile nke ndị Kraịst na-enwechi anya. Tụkwasị na nke ahụ, anyị ji ịdị uchu na-agbaso usoro ihe omume nke ịmụ ihe sitere na magazin Ụlọ Nche na ịgụ Bible anyị n’abalị Monday ọ bụla. Anyị na-agụkwa mbipụta nile nke Ụlọ Nche na Teta! ozugbo anyị nwetara ha.

Nna m nwụrụ mgbe anyị nọ na Long Island. N’oge okpomọkụ sochirinụ, na 1963, anyị mere atụmatụ ka nne m bịa bidewe anyị. N’agbanyeghị na ọ katala ahụ, o mere nnọọ mgbanwe nke ọma ma bigide na Long Island ruo mgbe ọ nwụrụ na 1971. Taa, Long Island nwere ọgbakọ nke nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ.

Ihe Ịma Aka Na-agbawa Obi

Na 1980, George chọpụtara na ahụ ike ya amalitela ịdị njọ. Otú ahụ ka otu n’ime ahụmahụ ndị kasị gbuo m mgbu ná ndụ si malite—ịhụ ka di m, onye ọrụ ibe m, na enyi m m hụrụ n’anya malitere ịrịa ọrịa Alzheimer. Ọdịdị ya nile gbanwere. Akụkụ ikpeazụ, bụ́kwa nke kasị bibie ihe were afọ anọ tupu ọ nwụọ na 1987. O sonyeere m n’ozi na ná nzukọ ruo ókè o nwere ike, ọ bụ ezie na ọtụtụ mgbe, ndọlị ndị ahụ mere ka m bee ákwá. Ịhụnanya dị ukwuu ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst na-egosi m abụwo ezi ihe nkasi obi, ma agụụ George ka na-agụsi m ike.

Otu n’ime ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa nye m n’ọlụlụ m lụrụ George bụ nkwurịta okwu dị ụtọ anyị nọ na-enwe mgbe mgbe. Ugbu a George na-anọghịzi ya, enwekwuru m ekele karịa mgbe ọ bụla ọzọ na Jehova na-akpọ ndị ohu ya òkù ‘ikpe ekpere n’ewepụghị aka,’ ‘ịnọgidesi ike n’ekpere,’ na ‘ikpe ụdị ekpere nile.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; Ndị Rom 12:12; Ndị Efesọs 6:18) Ọ bụ ihe na-akasi nnọọ obi ịmara na Jehova na-echebara ọdịmma anyị echiche. Ana m enwe mmetụta n’ezie dị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu.” (Abụ Ọma 68:19) Iche nanị banyere ụbọchị nke ọ bụla, ịnakwere erughị eru m, na inwe ekele maka ngọzi ndị ụbọchị ọ bụla na-eweta, dị nnọọ ka Jisọs dụrụ n’ọdụ, bụ n’ezie ụzọ kasị mma isi bie ndụ.—Matiu 6:34.

Ụgwọ Ọrụ Na-enye Ọṅụ nke Ozi Ahụ

Iji ọrụ n’aka n’ozi ndị Kraịst enyeworo m aka ịghara ịdị na-echegbubiga onwe m ókè banyere ihe ndị gara aga. N’ihi ya, abịara m nwee ike imeri ụdị mmetụta uche ndị pụrụ iduga n’ịda mbà n’obi. Izi ndị ọzọ eziokwu Bible abụworo m ihe pụrụ iche na-enye ọṅụ. Ọ na-eme ka m nwee ihe ime mmụọ dị n’usoro ndị m na-eme mgbe dum bụ́ ndị meworo ka ndụ m dị n’usoro ma bụrụ nke kwụsiri ike.—Ndị Filipaị 3:16.

N’otu oge, otu nwanyị m ziri ozi Alaeze ahụ ihe dị ka afọ 47 tupu mgbe ahụ kpọrọ m na fon. Ọ bụ nwa nwanyị nke otu n’ime ndị anyị mụụrụ Bible mgbe anyị rutere Bahamas na 1947. Nne, nna, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị ghọrọ Ndịàmà Jehova dịkwa ka ihe ka ọtụtụ n’ụmụ na ụmụ ụmụ ha mere. N’ezie, ihe karịrị mmadụ 60 sitere n’ezinụlọ nwanyị a bụ Ndịàmà. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ nabatara eziokwu Bible n’onwe ya. Otú ọ dị, ugbu a, ọ dị njikere n’ikpeazụ ịghọ ohu Jehova Chineke. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ka Ndịàmà ole na ole nọ na Bahamas mgbe mụ na George bịarutere na-amụba karịa 1,400!

Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ajụ m ma ọ̀ na-ewute m na mụ enweghị ụmụ nke aka m. N’ezie, inwe ụmụ pụrụ ịbụ ngọzi. Ma, ịhụnanya nke ụmụ, ụmụ ụmụ, na ụmụ ụmụ ụmụ ime mmụọ m na-egosi n’ebe m nọ n’esepụghị aka bụ ihe, ma eleghị anya, ọ na-abụghị ndị nile mụrụ ụmụ na-enweta. N’ezie, ndị “na-eme ezi ihe” ma “bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile,” na-akasị enwe obi ụtọ. (1 Timoti 6:18) Ọ bụ ya mere m ji na-arụsi ọrụ ike n’ozi ruo ókè ahụ ike m kwere m.

Otu ụbọchị ka m nọ n’ọfịs dọkịta ezé, otu nwa agbọghọ bịakwutere m ma kwuo, sị, “Ị maghị m, ma ama m gị, achọrọ m nnọọ ime ka ị mata na m hụrụ gị n’anya.” Ọ gaziri n’ihu ịkọ otú o si bịa mara eziokwu ahụ site na Bible na otú o si nwee ekele na anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ bịara Bahamas.

N’oge ọzọ, mgbe m si ezumike lọta, ahụrụ m otu okooko rose n’ọnụ ụzọ ebe m bi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nassau. Ihe e dere ná mpempe akwụkwọ ya na ya so bụ, “Obi dị anyị ụtọ na ị lọtala.” Ekele na-ejupụta m obi, ọ na-emekwa ka m hụ Jehova n’anya nke ukwuu mgbe m na-ahụ ụdị ndị Okwu, nzukọ, na mmụọ ya meworo ka e nwee! N’ezie, a na-egosipụta aka nkwado Jehova mgbe mgbe site n’aka ndị gbara anyị gburugburu.

Ijupụta n’Ekele

Ndụ adịbeghịrị m mfe mgbe nile, akụkụ ya ụfọdụ adịghịkwara m mfe ugbu a. Ma enwere m ọtụtụ ihe ndị m kwesịrị iji nwee ekele—ọṅụ ozi ahụ na-eweta, ịhụnanya na mmetụta na-ekpo ọkụ nke ọtụtụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst, nlekọta ịhụnanya nke nzukọ Jehova, ọmarịcha eziokwu ndị sitere na Bible, olileanya nke ịnọnyere ndị m hụrụ n’anya mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, na ihe ndị m na-echeta banyere afọ 42 m lụrụ ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. Tupu anyị alụọ, ekpere m ekpere ka m nwee ike ịbụrụ di m onye inyeaka mgbe nile ka o wee nọgide n’ozi oge nile, bụ́ nke o nwere mmasị na ya hie nne. Jehova ji amara zaa ekpere ahụ. Ya mere achọrọ m igosipụta ekele m n’ebe Jehova nọ site n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya.

Bahamas bụ ebe ndị na-eme njem nleta na-agakarị, bụ́ ndị na-emefu ọtụtụ puku dollar iji bịa nụrụ ụtọ ógbè ahụ na-ekpo ọkụ. Ebe m họrọwooro ijere Jehova ozi n’ebe ọ bụla nzukọ ya dugara m, enwewo m ahụmahụ na-enye ọṅụ nke ime njem site n’otu akụkụ nke àgwàetiti ndị ahụ gaa n’ọzọ, na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ma nke kasị mkpa, abịawo m mara ma jiri ịhụnanya nke ndị kasị mma ná ndị Bahamas ahụ nwere omume enyi kpọrọ ihe.

Enwere m nnọọ ekele n’ebe ndị ahụ wetaara nne na nna m eziokwu ahụ nọ, nne na nna m kụnyekwara ọchịchọ siri ike nke ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke n’obi m mgbe m bụ nwata. Ndị na-eto eto bụ́ ndị ohu Jehova taa pụkwara inweta ọtụtụ ngọzi ma ọ bụrụ na ha esi ‘n’ọnụ ụzọ ahụ dị ukwuu’ nke na-eduga n’ohere dị ukwuu nke ịmụba ozi, banye. (1 Ndị Kọrint 16:9) Gị onwe gị kwa ga-ejupụta n’ekele ma ọ bụrụ na i jiri ndụ gị mee ihe n’ịsọpụrụ “Chineke kachasị chi nile,” bụ́ Jehova.—Deuterọnọmi 10:17; Daniel 2:47.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ka m nọ n’ọrụ okporo ámá na Victoria, B.C., na 1944

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na George gara Ụlọ Akwụkwọ Gilead na 1946

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na George, ka anyị nọ n’ihu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Nassau, Bahamas, na 1955

[Foto dị na peeji nke 26]

Ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Deadman’s Cay, bụ́ ebe anyị jere ozi site na 1961 ruo 1972