Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Ntụkwasị Obi Gị n’Ebe JEHOVA Nọ Sikwuo Ike

Mee Ka Ntụkwasị Obi Gị n’Ebe JEHOVA Nọ Sikwuo Ike

Mee Ka Ntụkwasị Obi Gị n’Ebe JEHOVA Nọ Sikwuo Ike

Nkata igbu ọchụ na-aga n’ihu. Ndị isi nile nke ala ahụ agbawo izu ma tụpụta aro maka ime iwu ọhụrụ. Ha chọrọ ime ka ọ bụrụ ihe na-akpata ọnwụ bụ́ onye ọ bụla ife ofufe nke Ọchịchị na-akwadoghị.

NKE a ọ̀ na-ada ka ihe ị nụtụrụla? E nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị ji ụkpụrụ na-akpụzi mmegbu n’akụkọ ihe mere eme. Ihe atụ ahụ dị n’elu weere ọnọdụ n’Alaeze Ukwu Peasia n’oge Daniel onye amụma. Iwu ahụ, bụ́ nke Eze Daraịọs bịanyere aka na ya, kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke ga-arịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla arịrịọ ruo [ụbọchị iri atọ], ma ọ́ bụghị nanị [eze,] a ga-atụba ya n’olulu ọdụm.”—Daniel 6:7-9.

Gịnị ka Daniel ga-eme ugbu a a na-eyi ya egwu ọnwụ? Ọ̀ ga-anọgide na-atụkwasị Chineke ya, bụ́ Jehova obi, ka ọ̀ ga-ekwenye ma mee dị ka eze tụziri? Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Daniel, mgbe ọ maara na a kanyewo aha n’ihe ahụ e dere n’akwụkwọ, o wee bata n’ụlọ ya: (ma o nwere windo ụfọdụ ghere oghe n’ime ụlọ elu ya chere ihu na Jerusalem;) ọ bụkwa ugbo atọ n’ụbọchị ka ya onwe ya na-egbu ikpere ya n’ala na-ekpe ekpere na-ekele ekele n’ihu Chineke ya, n’ihi na otú a ka ọ na-emerị site na mgbe gara aga.” (Daniel 6:10) A maara ihe fọdụrụ n’akụkọ ahụ nke ọma. A tụbara Daniel n’olulu ọdụm n’ihi okwukwe ya, ma Jehova ‘kpuchitere ọnụ ọdụm’ ma napụta ohu ya na-eguzosi ike n’ihe.—Ndị Hibru 11:33; Daniel 6:16-22.

Oge Maka Nnyocha Onwe Onye

Taa, ndị ohu Jehova bi n’ụwa na-enweghị omume enyi, na-eche ọtụtụ ihe ndị na-eyi ọdịmma anụ ahụ na nke ime mmụọ ha egwu ihu. Dị ka ihe atụ, e gbuwo ọtụtụ Ndịàmà ná ntiwapụ dị egwu nke ịkpọasị agbụrụ ná mba ụfọdụ. N’ebe ndị ọzọ, ndị ohu Jehova echewo ụkọ nri, ihe isi ike akụ̀ na ụba, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọrịa siri ike, na ọnọdụ ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu, ihu. Tụkwasị na nke a, ha atachiwo obi ná mkpagbu, nrụgide ndị a na-enweta n’ebe ọrụ, na ọnwụnwa dịgasị iche iche a na-anwa ha ime ihe na-ezighị ezi, bụ́ ndị pụrụ iyi ọnọdụ ime mmụọ ha egwu. N’ezie, Onye Iro ukwu ahụ, bụ́ Setan, ekpebisiwo ike iji ụzọ ọ bụla ga-ekwe mee bibie ndị ohu Jehova.—1 Pita 5:8.

Ọ bụrụ na ọnọdụ ndị dị otú ahụ echee anyị ihu, gịnị ka anyị pụrụ ime? Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịtụ ụjọ mgbe a na-eyi ndụ mmadụ egwu, anyị pụrụ iburu okwu Pọl na-emesi obi ike n’uche, bụ́: “[Jehova] ekwuwo, sị, M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị. Ya mere anyị weere obi ike sị, Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka; m gaghị atụ egwu: gịnị ka mmadụ ga-eme m?” (Ndị Hibru 13:5, 6) Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova na-enwe otu mmetụta ahụ n’ebe ndị ohu ya nọ taa. Otú ọ dị, ọ bụ otu ihe ịmara nkwa Jehova ma ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ikwenyesi ike na ọ ga-eme ihe maka ọdịmma anyị. Ya mere, ọ dị nnọọ mkpa ka anyị nyochaa ebe ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ hiwere isi ma mee ihe nile anyị pụrụ ime iji mee ka ntụkwasị obi ahụ sikwuo ike ma nọgide na-enwe ya. Ọ bụrụ na anyị emee nke ahụ, “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi [anyị] na echiche uche [anyị] nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:7) Mgbe ule bịaziri, anyị ga-enwe ike iche echiche nke ọma ma mee ihe maka ha n’ụzọ amamihe.

Ihe Ndabere Maka Ịtụkwasị Jehova Obi

N’ezie anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji atụkwasị Onye Okike anyị, bụ́ Jehova, obi. Nke mbụ n’ime ha bụ eziokwu ahụ bụ́ na Jehova bụ Chineke ịhụnanya nke na-elekọta ndị ohu ya nke ọma. E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị e dekọrọ n’ime Bible bụ́ ndị na-ekwu banyere nlekọta ịhụnanya Jehova na-elekọta ndị ohu ya. N’ịkọwa ụzọ Jehova si mesoo ndị ya a họpụtara ahọpụta, bụ́ Israel, ihe, Mosis dere, sị: “Ọ chọtara ya n’ala ọzara, na n’ihe tọgbọrọ nkịtị, bụ́ ala tọgbọrọ n’efu nke na-agbọ ụja. Ọ na-agba ya gburugburu, Ọ na-eme ka ọ ghọta ihe, Ọ na-echezi ya dị ka nwantanta anya Ya.” (Deuterọnọmi 32:10) N’oge ndị a, Jehova nọgidere na-elekọta ndị ohu ya anya nke ọma, ma dị ka otu ìgwè ma n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, mgbe Ndịàmà ụfọdụ nwere oké ụkọ nri n’oge a na-alụ agha obodo na Bosnia, Jehova hụrụ na ha nwetara ihe ndị dị ha nnọọ mkpa site ná mgbalị ụmụnna ha si Croatia na Austria ji obi ike mee, bụ́ ndị tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ime njem gabiga ókèala ndị dị nnọọ oké ize ndụ iji wetara ụmụnna ha ihe enyemaka. *

Ebe ọ bụ na Jehova Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, n’ezie o nwere ikike nke ichebe ndị ohu ya n’ọnọdụ ọ bụla. (Aịsaịa 33:22; Mkpughe 4:8) Ma ọbụna mgbe Jehova kwere ka ụfọdụ n’ime ndị ohu ya gosipụta ikwesị ntụkwasị obi ruo n’ọnwụ, ọ ka na-akwado ha ma na-enyere ha aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, na-eme ka ha nwee ike ịnọgide na-akwụsi ike, na-enwe ọṅụ, nakwa ahụ iru ala ruo ọgwụgwụ. Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike yiri nke ọbụ abụ ahụ: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu na mkpagbu nile. N’ihi nke a anyị agaghị atụ egwu mgbe ụwa na-agbanwe, ma ọ bụ mgbe a na-ewezụga ugwu nile n’ọnọdụ ha gaa n’etiti oké osimiri.”—Abụ Ọma 46:1, 2.

Bible na-ekpughekwa na Jehova bụ Chineke nke eziokwu. Nke a pụtara na ọ na-emezu nkwa ya mgbe nile. N’ezie, Bible na-akọwa ya dị ka Chineke “Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha.” (Taịtọs 1:2) Ebe ọ bụ na Jehova kwupụtara ugboro ugboro nzube ya ichebe na ịzọpụta ndị ohu ya, anyị pụrụ ijide nnọọ n’aka na ọ bụghị nanị na o nwere ikike nke imezu nkwa ya kamakwa na ọ dị njikere ime otú ahụ.—Job 42:2.

Ụzọ Isi Mee Ka Ntụkwasị Obi Anyị Sikwuo Ike

Ọ bụ ezie na anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji atụkwasị Jehova obi, anyị ekwesịghị iwere ya na e nweghị ihe ga-eme ka anyị ghara ịnọgide na-atụkwasị ya obi. Nke a bụ n’ihi na ụwa n’ozuzu ya nwere okwukwe dị nta n’ebe Chineke nọ, omume dịkwa otú ahụ pụrụ ime, n’ụzọ dị mfe, ka ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ gharazie isi ike. Ya mere, anyị aghaghị itinye mgbalị siri ike iji mee ka ntụkwasị obi ahụ anyị nwere sikwuo ike nakwa ịnọgide na-enwe ya. Jehova maara nke a nke ọma, o wepụtawokwa ụzọ anyị pụrụ isi mee otú ahụ.

Nke mbụ, o nyewo Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible, bụ́ nke na-akọ ọtụtụ ihe ukwu ndị o mewooro ndị ohu ya. Chegodị echiche, obi ike hà aṅaa ka ị pụrụ inwe n’ebe mmadụ nọ ma ọ bụrụ na ihe nile ị maara banyere ya bụ aha ya? Ma eleghị anya ọ ga-adị nnọọ nta, ma ọ bụrụdị na ị ga-enwe enwe. Ọ dị gị mkpa ịmara ụzọ o si eme ihe na ihe ndị o meworo iji nwee obi ike n’ebe ọ nọ, ọ̀ bụ na ọ dịghị gị? Ka anyị na-agụ ma na-atụgharị uche n’ihe ndekọ Bible ndị dị otú ahụ, ihe ọmụma anyị nwere banyere Jehova na ụzọ ya ndị dị ebube na-emiwanye emi, anyị na-abịakwa ghọtakwuo nnọọ otú ọ bụruru onye a pụrụ ịtụkwasị obi. N’ụzọ dị otú a, a na-eme ka obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike. Ọbụ abụ ahụ setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya mgbe o kwuru n’ekpere o kpegaara Chineke, sị: “M ga-ehota omume nile nke Jaa; n’ihi na m ga-echeta oké ọrụ Gị nile site na mgbe ochie. M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.”—Abụ Ọma 77:11, 12.

Tinyere Bible, anyị nwere nri ime mmụọ n’ụba n’ime mbipụta ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị nzukọ Jehova na-ewepụta. Tinyere ihe ndị ọzọ, mbipụta ndị a na-ebukarị akụkọ ndị na-akpali akpali banyere ndị ohu Chineke n’oge a, na-egosi otú Jehova si nwee ike inye aka na iweta ahụ efe mgbe ha dabara n’ọnọdụ olileanya na-adịghị na ya. Dị ka ihe atụ, Martin Poetzinger, bụ́ onye mechara ghọọ otu n’ime ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, dara oké ọrịa mgbe ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ n’ógbè Europe nke dịpụrụ adịpụ site n’ala nna ya. O nweghị ego, ọ dịghịkwa dọkịta dị njikere ịhụ ya. Ma Jehova agbahapụghị ya. N’ikpeazụ, a kpọtụụrụ onye ọkachamara nọ n’ụlọ ọgwụ dị n’ógbè ahụ. N’ịbụ onye kwenyesiri ike na Bible, nwoke obiọma a lekọtara Nwanna Poetzinger dị ka ọ ga-esi elekọta nwa ya nwoke, na-eme otú ahụ n’anaghị ego. Ịgụ akụkọ mmadụ ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ntụkwasị obi anyị n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ sikwuo ike.

Enyemaka ọzọ bara oké uru nke Jehova na-enye iji mee ka ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ekpere. Pọl onyeozi ji ịhụnanya na-agwa anyị, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.” (Ndị Filipaị 4:6) ‘Ihe nile’ pụrụ ịgụnye mmetụta, mkpa, egwu, na nchegbu anyị. Ka anyị na-ekpekwu ekpere sitere n’obi ugboro ugboro, otú ahụ ka ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ ga-esikwu ike.

Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’ụwa, ọ gara nanị ya n’ebe ndị mmadụ na-anọghị mgbe ụfọdụ iji kpee ekpere n’enweghị ihe ndọpụ uche. (Matiu 14:23; Mak 1:35) Tupu o mee mkpebi ndị dị oké mkpa, o ji ọbụna otu abalị nile kpegara Nna ya ekpere. (Luk 6:12, 13) Ọ bụghị ihe ijuanya na ntụkwasị obi Jisọs nwere n’ebe Jehova nọ siri nnọọ ike nke na ọ tachiri obi n’ule kasị awụ akpata oyi onye ọ bụla nwetụrụla. Okwu ikpeazụ o kwuru n’elu osisi ịta ahụhụ bụ: “Nna, n’aka Gị ka M na-enye mmụọ m idebe.” Okwu ahụ na-egosi obi ike gosiri na ruo ọgwụgwụ, ntụkwasị obi o nwere n’ebe Nna ya nọ ebelataghị, n’agbanyeghị na Jehova emeghị ihe iji zọpụta ya.—Luk 23:46.

Ma ụzọ ọzọ isi wulite ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ bụ iso ndị ji obi dum atụkwasị ya obi na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya. Jehova nyere ndị ya iwu ịgbakọta mgbe nile iji mụtakwuo ihe banyere ya nakwa iji gbarịta ibe ha ume. (Deuterọnọmi 31:12; Ndị Hibru 10:24, 25) Mkpakọrịta dị otú ahụ mere ka ntụkwasị obi ha nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike, na-eme ka ha nwee ike idi ule nke okwukwe ndị dị mkpa. N’otu mba Africa bụ́ ebe a machibidoro ọrụ nkwusa iwu, a jụrụ inye Ndịàmà Jehova nchebe ndị uwe ojii, akwụkwọ ime njem, satifiketi alụmdi na nwunye, ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ, na ọrụ. Mgbe agha obodo tiwapụrụ n’otu ógbè, mmadụ 39, gụnyere ụmụaka, bụ́ ndị si n’otu ọgbakọ dị nso jere biri n’okpuru otu àkwà mmiri dị ala nke dị n’ọzara iji gbanahụ bọmbụ a na-atụ n’obodo ha. N’okpuru oké ihe isi ike dị otú ahụ, ntụle ha na-atụle otu akụkụ Bible kwa ụbọchị nakwa nzukọ ndị ọzọ nyere ha ume dị ukwuu. N’ihi ya, ha tachiri obi n’ule ahụ tara akpụ ma ka nọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Ahụmahụ a na-egosi n’ụzọ doro anya uru iso ndị Jehova na-ezukọchi anya bara.

N’ikpeazụ, iji mee ka ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ sikwuo ike, anyị aghaghị ịdị na-arụsi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ike, na-adị njikere mgbe nile iso ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. E gosipụtara nke a site n’ahụmahụ na-akpali akpali nke otu onye nkwusa na-eto eto nọ na Canada bụ́ onye na-arịa ọrịa na-egbu egbu bụ́ leukemia. N’agbanyeghị ajọ ọrịa ya, ọ chọrọ ịghọ onye ọsụ ụzọ oge nile, ya bụ, onye ozi oge nile. N’oge ọrịa ya belatatụrụ ruo mkpirikpi oge, o nwetụrụ ahụ ike ije ozi otu ọnwa dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka. Mgbe e mesịrị, ọnọdụ ya kara njọ, ọ nwụkwara mgbe ọnwa ole ole gasịrị. Ma, ọ nọgidere na-esi ike n’ụzọ ime mmụọ ruo ná ngwụsị, ntụkwasị obi o nwere n’ebe Jehova nọ adaghị mgbe ọ bụla. Nne ya kwuru, sị: “Ruo ná ngwụsị, o chegburu onwe ya banyere ndị ọzọ karịa ka o mere banyere onwe ya. Ọ na-agba ha ume ka ha mụọ Bible, na-agwa ha, sị, ‘Anyị ga-anọkọ na Paradaịs.’”

Igosipụta Ntụkwasị Obi Anyị n’Ebe Jehova Nọ

“Dị ka ahụ bụ ihe nwụrụ anwụ ma mmụọ adịghị ya, ọbụna otú a okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.” (Jemes 2:26) A pụkwara ikwu ihe ahụ Jemes kwuru banyere inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ ma a bịa n’ihe banyere ntụkwasị obi anyị n’ebe Ọ nọ. N’agbanyeghị ókè anyị na-asị na anyị tụkwasịruru Chineke obi, ọ bụ ihe na-abaghị uru ọ gwụla ma anyị na-egosipụta ntụkwasị obi ahụ site n’omume anyị. Abraham tụkwasịrị Jehova obi nke ukwuu ma gosipụta ntụkwasị obi ahụ site n’irube isi n’ihe ndị o nyere n’iwu n’enweghị obi abụọ, ọbụna ruo n’ókè nke ịdị njikere ịchụ nwa ya nwoke, bụ́ Aịsak, n’àjà. N’ihi ntụkwasị obi na nrubeisi dị otú ahụ pụtara ìhè, a bịara mara Abraham dị ka enyi Jehova.—Ndị Hibru 11:8-10, 17-19; Jemes 2:23.

Ọ dịghị anyị mkpa ichere ka ule siri ike bịakwasị anyị tupu anyị egosipụta ntụkwasị obi anyị n’ebe Jehova nọ. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe: onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) Anyị kwesịrị ịmụta ịtụkwasị Jehova obi n’ihe nile anyị na-eme kwa ụbọchị, na-erubere ya isi ọbụna n’ihe ndị pụrụ iyi ka ọ dịghị ihe ha pụtara. Mgbe anyị na-ahụ abamuru ndị na-esite ná nrubeisi dị otú ahụ abịa, a na-eme ka ntụkwasị obi anyị n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ sikwuo ike, na-eme ka anyị nwee ike iche ule ndị ka ukwuu ma ọ bụ ka sie ike ihu.

Ka ụwa na-eru nso n’ọgwụgwụ ya ga-eweta ọdachi, o yikarịrị ka ndị Jehova hà ga-enweta ule na ihe ize ndụ ka ukwuu. (Ọrụ 14:22; 2 Timoti 3:12) Site n’iwulite ntụkwasị obi siri ike nke obi abụọ na-adịghị ya n’ebe Jehova nọ ugbu a, anyị pụrụ ịtụ anya ịlanarị baa n’ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa—site n’ịdị ndụ gabiga mkpagbu ukwu ahụ ma ọ bụ site n’inweta mbilite n’ọnwụ. (2 Pita 3:13) Ka anyị ghara ma ọlị ikwe ka enweghị ntụkwasị obi ọ bụla n’akụkụ nke anyị mebie mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Jehova. Mgbe ahụ, a pụrụ ikwu banyere anyị otu ihe ahụ e kwuru banyere Daniel mgbe a napụtasịrị ya n’olulu ọdụm, sị: “Ọ dịghịkwa imerụ ahụ ọ bụla a hụrụ n’ahụ ya, n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.”—Daniel 6:23.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Iji gụọ akụkọ a n’ozuzu ya, lee Ụlọ Nche, November 1, 1994, peeji nke 23-27.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ịgụ akụkọ banyere ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Martin Poetzinger, na-eme ka okwukwe sikwuo ike