Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Isi Aṅaa Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Ego?

Ị̀ Pụrụ Isi Aṅaa Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Ego?

Ị̀ Pụrụ Isi Aṅaa Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Ego?

Ịhụ ego n’anya na ọchịchọ maka ihe onwunwe abụghị ihe ọhụrụ; Bible agbachighịkwa nkịtị banyere ha, dị ka a ga-asị na ha malitere na nso nso a. Ọ dịla nnọọ anya ha malitere. N’Iwu ahụ, Chineke nyere ụmụ Israel ntụziaka, sị: “Gị enwela anyaukwu n’ebe ụlọ mmadụ ibe gị dị . . . ma ọ bụ n’ebe ihe ọ bụla dị nke mmadụ ibe gị nwere.”—Ọpụpụ 20:17.

ỊHỤ ego na ihe onwunwe n’anya bụ ihe zuru ebe nile n’oge Jisọs. Tụlee akụkọ banyere mkparịta ụka a Jisọs na nwa okorobịa bụ́ “oké ọgaranya” nwere. “[Jisọs] sị ya, Otu ihe fọdụkwaara gị ime: ree ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke i nwere, kenye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe: bịakwa, soo m. Ma mgbe ọ nụrụ ihe ndị a, o wutere ya nke ukwuu; n’ihi na ọ bụ oké ọgaranya.”—Luk 18:18-23.

Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Ego

Otú ọ dị, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ikwubi na Bible na-akatọ ego n’onwe ya ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ihe ndị bụ́ isi e ji ya eme. Bible na-egosi na ego na-enye nchebe dị irè pụọ n’ịda ogbenye na nsogbu ndị ya na ya kwụ aga, na-eme ka ndị mmadụ nwee ike inweta ihe ndị na-akpa ha. Eze Solomọn dere, sị: “Amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò.” O dekwara, sị: “N’ihi ịchị ọchị ka a na-esi nri, mmanya vine na-eme ka ndụ ṅụrịa: ego na-azakwa ihe nile.”—Eklisiastis 7:12; 10:19.

Chineke na-akwado iji ego eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru, sị: “Meenụ ndị enyi nye onwe unu site n’akụ̀ nke ajọ omume.” (Luk 16:9) Nke a na-agụnye inye onyinye iji hụ na ezi ofufe nke Chineke na-aga n’ihu, n’ihi na n’ezie anyị ga-achọ ka Chineke bụrụ Enyi anyị. Solomọn n’onwe ya, n’ịgbaso ihe nlereanya nke nna ya, bụ́ Devid, nyere ego na ihe onwunwe hiri nne maka iwu ụlọ nsọ Jehova. Iwu ọzọ e nyere ndị Kraịst bụ inyere ndị nọ ná mkpa aka n’ụzọ ihe onwunwe. “N’akụkụ ihe na-akpa ndị nsọ, na-enwekọnụ ihe,” ka Pọl onyeozi kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Na-agbasonụ ọrụ ile ọbịa anya nke ọma.” (Ndị Rom 12:13) Nke a na-agụnyekarị imefu ego. Otú ọ dị, gịnị banyere ịhụ ego n’anya?

“Inwe Oké Mmasị n’Ọlaọcha”

Pọl tụlere “ịhụ ego n’anya”—ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị, “inwe oké mmasị n’ọlaọcha”—n’ụzọ sara mbara mgbe ọ na-edegara onye Kraịst ibe ya ọ tọrọ bụ́ Timoti akwụkwọ. A pụrụ ịhụ agbamume Pọl na 1 Timoti 6:6-19. “Ịhụ ego n’anya” so n’ihe ndị bụ́ isi o kwuru okwu na ha ná ntụle o mere banyere ihe onwunwe. Anyị ga-eme nke ọma iji nlezianya nyochaa okwu Pọl sitere n’ike mmụọ nsọ n’ihi otú ọha mmadụ si jiri ego kpọrọ ihe n’oge a. Ntụle dị otú ahụ ga-aba uru n’ezie n’ihi na ọ na-ekpughe ihe omimi nke ụzọ e si ‘ejide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’

Pọl na-adọ aka ná ntị, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.” (1 Timoti 6:10) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a adịghị ekwu na ego n’onwe ya dị njọ—ọ dịghịkwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ kwuru otú ahụ. Onyeozi ahụ adịghịkwa ekwu na ego bụ isi ihe na-akpata “ihe ọjọọ dị iche iche” ma ọ bụ na ego bụ mkpọrọgwụ nke nsogbu nile. Kama nke ahụ, ịhụ ego n’anya pụrụ ịbụ ihe na-akpata—ọ bụrụgodị na ọ bụghị nanị ya na-akpata—ụdị “ihe ọjọọ” nile.

Nọrọ na Nche Megide Anyaukwu

Eziokwu ahụ bụ́ na Akwụkwọ Nsọ akatọghị ego n’onwe ya adịghị ebelata ịdọ aka ná ntị Pọl. A na-ekpughepụ ndị Kraịst bụ́ ndị malitere ịhụ ego n’anya nye ụdị nsogbu nile, ndị nke kasị njọ n’ime ha bụ isi n’okwukwe kpapụ. Ihe Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi na-eme ka eziokwu a sikwuo ike: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; . . . agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Olee otú ọchịchọ ọjọọ, anyaukwu, ma ọ bụ “ịhụ ego n’anya” pụrụ isi bụrụ ikpere arụsị? Nke a ọ̀ pụtara na ọ dị njọ ịchọ inweta ụlọ buru ibu karị, ụgbọala dị ọhụrụ karị, ọrụ a na-akwụ ego hiri nne na ya karị? Ee e, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a dị njọ n’onwe ya. Ajụjụ dị na ya bụ: Olee ọnọdụ obi nke na-akpali mmadụ ịchọ nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, nakwa hà dị onye ahụ mkpa n’ezie?

A pụrụ iji ọdịiche dị n’etiti ọchịchọ dị otú kwesịrị na anyaukwu tụnyere ọdịiche dị n’etiti obere ọkụ usekwu bụ́ nke e ji esi nri na oké ọkụ nke na-agba oké ọhịa. Ọchịchọ kwesịrị ekwesị na nke e debere n’ọnọdụ dị mma pụrụ ịba uru. Ọ na-akwali anyị ịrụ ọrụ na ịrụpụta ihe. Ilu 16:26 na-ekwu, sị: “Ọchịchọ mkpụrụ obi nke onye na-adọgbu onwe ya n’ọrụ adọgbuworo ya onwe ya n’ọrụ; n’ihi na ọnụ ya arụgidewo ya.” Ma anyaukwu dị ize ndụ ma na-ebibi ihe. Ọ bụ ọchịchọ a na-achịkwaghị achịkwa.

Ihe bụ́ nsogbu karịsịa bụ nchịkwa. Ego anyị na-akpakọba ma ọ bụ ihe onwunwe anyị na-achọ hà ga-abụ ohu nye ihe ndị na-akpa anyị, ka ihe ndị na-akpa anyị hà ga-abụ ohu nye ego? Ọ bụ ya mere Pọl ji sị na “onye anyaukwu . . . bụ onye na-ekpere arụsị.” (Ndị Efesọs 5:5) Ịdị anyaukwu n’ihe pụtara n’ezie na anyị na-edo ọchịchọ anyị n’okpuru ya—dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị na-eme ka ọ bụrụ nna anyị ukwu, chi anyị, ihe anyị na-agbara ohu. N’ụzọ dị iche, Chineke na-ekwu hoo haa, sị: “Gị enwela Chi ọzọ tinyere m.”—Ọpụpụ 20:3.

Anyị ịdị anyaukwu na-egosikwa na anyị adịghị enwe ntụkwasị obi na Chineke ga-emezu nkwa ya nke inye anyị ihe na-akpa anyị. (Matiu 6:33) N’ihi ya, anyaukwu pụtara ịgbakụta Chineke azụ. N’echiche a kwa, ọ bụ “ikpere arụsị.” Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji dọọ aka ná ntị banyere ya n’ụzọ doro anya!

Jisọs dọkwara aka ná ntị kpọmkwem banyere anyaukwu. O nyere anyị iwu ịnọ na nche megide inwe oké ọchịchọ maka ihe anyị na-enweghị: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla: n’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Dị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na ilu Jisọs mesịrị tụọ si dị, anyaukwu na-adabere na nkwenkwe iberibe bụ na ihe dị mkpa ná ndụ bụ otú ihe mmadụ nwere haruru. Ọ pụrụ ịbụ ego, ọkwá, ike, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha. O kwere omume ịdị anyaukwu n’ihe ọ bụla a pụrụ inweta. Anyị pụrụ iche na inwe ihe ahụ ga-eme ka anyị nwee afọ ojuju. Ma dị ka Bible na ahụmahụ ụmụ mmadụ si egosi, ọ bụ nanị Chineke pụrụ inye anyị ihe ndị na-akpa anyị n’ezie—ọ ga-emekwa otú ahụ—dị ka Jisọs gwara ụmụazụ ya.—Luk 12:22-31.

Ọdịbendị nke oge a nke ọha mmadụ ịzụ ihe riri isi kasị akpali anyaukwu. N’ịbụ ndị e metụtara n’ụzọ dị aghụghọ ma dị ike, ọtụtụ mmadụ na-ekwere na ihe ọ bụla ha nwere ezubeghị. Ha na-achọ ihe ndị ka ukwuu, ihe ndị ka buo ibu, na ihe ndị ka mma. Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịtụ anya ịgbanwe ụwa nke gbara anyị gburugburu, olee otú anyị pụrụ isi guzogide àgwà a n’onwe anyị?

Afọ Ojuju Megide Anyaukwu

Pọl na-ekwu ihe e kwesịrị ịhọrọ n’ọnọdụ anyaukwu, ya bụ, afọ ojuju. Ọ na-ekwu, sị: “Ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:8) Otú a e si kọwaa ihe nile dị anyị mkpa n’ezie—“ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ”—pụrụ ịda nnọọ ka ihe dịbigara mfe ókè ma ọ bụ ka okwu onye na-amaghị nke a na-akọ. Ọtụtụ mmadụ na-enwe mmasị n’ihe omume telivishọn ndị na-egosi ndị a ma ama bụ́ ndị bi n’ụlọ ndị oké ozu. Nke ahụ abụghị ụzọ e si enweta afọ ojuju.

N’ezie, a chọghị ka ndị ohu Chineke jiri aka ha tinye onwe ha n’ịda ogbenye. (Ilu 30:8, 9) Otú ọ dị, Pọl na-echetara anyị ihe ịda ogbenye bụ n’ezie: enweghị ihe oriri, uwe, na ebe obibi zuru ezu ime ka mmadụ nwee ike ịdị ndụ n’ebe o bi. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị nwere ihe ndị ahụ, anyị nwere ihe ndabere maka inwe afọ ojuju.

Ọ̀ pụrụ ịbụ na Pọl ji egwuregwu nye nkọwa dị otú ahụ banyere afọ ojuju? Ò kwere omume n’ezie inwe afọ ojuju nanị n’ihe ndị a bụ́ isi—ihe oriri, uwe, na ebe obibi? Pọl kwesịrị ịma. Ya onwe ya nwere akụ̀ na ụba na ihe ùgwù nke ọkwá dị elu n’ógbè ndị Juu nakwa nke nwa amaala Rom. (Ọrụ 22:28; 23:6; Ndị Filipaị 3:5) Pọl nwetakwara oké ihe isi ike n’ọrụ ozi ala ọzọ ya. (2 Ndị Kọrint 11:23-28) N’ime ha nile, ọ mụtara ihe omimi nke nyeere ya aka ịnọgide na-enwe afọ ojuju. Gịnị ka ọ bụ?

“E Ziwo Mụ Ihe Omimi A”

Pọl kọwara n’otu n’ime akwụkwọ ozi ya, sị: “Amatara m ụzọ iweda onwe m, amatakwara m ụzọ ịbabiga ókè: n’ihe ọ bụla na n’ihe nile e ziwo mụ ihe omimi a, bụ́ ịnọ n’afọ ojuju na ịnọkwa n’agụụ, ịbabiga ókè na ịnọkwa ná mkpa.” (Ndị Filipaị 4:12) Pọl na-ekwu ka onye obi siri nnọọ ike, onye nwere nnọọ nchekwube! Ọ dị mfe iche na ọ na-atụ ndụ mmanụ mgbe o dere okwu ndị a ma ọ dịghị otú ahụ. Ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom!—Ndị Filipaị 1:12-14.

N’iburu eziokwu ahụ na-akpali iche echiche n’uche, ebe a na-ekwusi okwu ike banyere inwe afọ ojuju, ọ bụghị nanị n’ihe onwunwe kamakwa n’ọnọdụ. Inwebiga akụ̀ na ụba ma ọ bụ ihe isi ike ókè pụrụ ime ka a mara ihe ndị anyị na-ebute ụzọ. Pọl kwuru banyere ihe ime mmụọ ndị mere ka o nwee ike inwe afọ ojuju n’agbanyeghị ọnọdụ ya n’ụzọ ihe onwunwe, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime [Chineke] Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Kama ilega anya n’ihe onwunwe ya, ma ò hiri nne ma ọ̀ dị ole na ole, ma ọ bụ n’ọnọdụ ya, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, Pọl legara anya n’ebe Chineke nọ maka igbo mkpa ya. Ihe si na ya pụta bụ afọ ojuju.

Ihe nlereanya Pọl dị Timoti mkpa karịsịa. Onyeozi ahụ gbara nwa okorobịa ahụ ume ịgbaso ụzọ ndụ nke ga-eme ka nsọpụrụ Chineke na iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya butere akụ̀ na ụba ụzọ. Pọl kwuru, sị: “Ma gị onwe gị, onye nke Chineke, na-agbanahụ ihe ndị a; ma na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ.” (1 Timoti 6:11) Ọ pụrụ ịbụwo Timoti ka a gwara okwu ndị ahụ, ma ha metụtara onye ọ bụla nke chọrọ ịsọpụrụ Chineke na inwe ndụ obi ụtọ n’ezie.

Ọ dị Timoti mkpa ịnọ na nche megide anyaukwu dị nnọọ ka ọ dị onye Kraịst ọ bụla ọzọ. Ihe àmà na-egosi na e nwere ndị kwere ekwe bara ọgaranya n’ọgbakọ Efesọs, bụ́ ebe ọ nọ mgbe Pọl degaara ya akwụkwọ. (1 Timoti 1:3) Pọl ejiriwo ozi ọma nke Kraịst banye n’ógbè azụmahịa a bara ọgaranya, na-atọghata ọtụtụ mmadụ. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha bụ ọgaranya, dị ka ọ dị ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst taa.

Ya mere, ajụjụ e kwesịrị ịjụ, karịsịa n’iburu ozizi dị na 1 Timoti 6:6-10 n’uche, bụ: Gịnị ka ndị bụ́ aka ji akụ̀ kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịsọpụrụ Chineke? Pọl na-ekwu na ha kwesịrị ibu ụzọ nyochaa àgwà ha. Ego nwere ikike nke ịkpali mmetụta nke mmadụ ịbụ onye onwe ya juru afọ. Pọl na-ekwu, sị: “Na-enye ndị bụ́ ọgaranya n’oge dị ugbu a iwu, ka ha ghara ịtụkwasị uche ha n’ihe dị elu, gharakwa ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, Onye na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.” (1 Timoti 6:17) Ndị ọgaranya aghaghị ịmụta ile anya gabiga ego ha; ọ dị ha mkpa ilega anya n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye akụ̀ na ụba ọ bụla si n’aka ya kpọmkwem.

Ma ọ bụghị nanị n’àgwà ka okwu gwụrụ. E mesịa, ọ dị ndị Kraịst bara ọgaranya mkpa iji akụ̀ na ụba ha mee ihe n’ụzọ dị mma. Pọl na-adụ ọdụ, sị: ‘Na-emenụ ezi ihe, bụrụnụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, bụrụnụ ndị kwadebeworo ime ka ndị ọzọ keta ihe unu nwere, bụrụnụ ndị kwere ka ndị ọzọ soo unu nwekọọ ihe.”—1 Timoti 6:18.

“Ndụ ahụ Nke Bụ́ Ndụ n’Ezie”

Isi ihe dị na ndụmọdụ Pọl bụ na ọ dị anyị mkpa ichetara onwe anyị uru dị ala nke ihe onwunwe bara. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Akụ̀ ọgaranya bụ obodo ya siri ike, ọ dịkwa ka mgbidi dị elu n’ime ntụgharị obi ya nile.” (Ilu 18:11) Ee, nchebe akụ̀ pụrụ iweta na-emesị bụrụ nanị ihe e chepụtara echepụta, ọ na-eduhiekwa eduhie n’ezie. Ọ bụ ihe na-ezighị ezi ime ka ndụ anyị hiwe isi na ha kama ịbụ n’inweta nnwapụta Chineke.

Akụ̀ na ụba ịbụ ihe a na-ejighị n’aka na-eme ka ọ bụrụ nnọọ ihe dị ize ndụ ịtụkwasị olileanya anyị. Ezi olileanya aghaghị ịdabere n’ihe siri ike, nwee nzube, ma na-adịgide adịgide. Olileanya ndị Kraịst na-adabere n’ebe Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, nọ nakwa ná nkwa ya nke ndụ ebighị ebi. Ebe ọ bụ eziokwu na ego apụghị ịzụta obi ụtọ, ọ bụkwa eziokwu ọbụna karị na ego apụghị ịzụta nzọpụta. Ọ bụ nanị okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ pụrụ ime ka anyị nwee olileanya dị otú ahụ.

Ya mere, ma ànyị bara ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye, ka anyị na-agbaso ụzọ ndụ ga-eme ka anyị bụrụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:21) Ọ dịghị ihe dị oké ọnụ ahịa karịa iso Onye Okike dị ná mma. Mgbalị nile e mere iji nọgide na ya socha n’anyị ‘ịkpadoro onwe anyị ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka anyị wee jide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’—1 Timoti 6:19.

[Foto dị na peeji nke 7]

Pọl mụtara ihe omimi nke inwe afọ ojuju

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Anyị pụrụ inwe obi ụtọ na afọ ojuju n’ihe anyị nwere