Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Nwụrụ n’Ihi Otu Ụkpụrụ

Ọ Nwụrụ n’Ihi Otu Ụkpụrụ

Ọ Nwụrụ n’Ihi Otu Ụkpụrụ

“ANYỊ na-echeta August Dickmann (onye a mụrụ na 1910), bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” Otú a ka e si malite ihe e dere n’otu ihe ncheta (nke e gosiri n’ebe a), bụ́ nke e kpughere n’oge na-adịbeghị anya n’ebe bụbu ogige ịta ahụhụ nke Sachsenhausen. N’ihi gịnị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova ga-eji ruo eruo ịbụ onye e meere ihe ncheta dị otú ahụ? Ihe ndị ọzọ e dere na ya na-akọ ihe kpatara ya: “Ndị SS gbagburu [ya] n’ihu ọha na September 15, 1939, n’ihi ọjụjụ ọ jụrụ iso n’òtù ndị agba n’ihi akọ n’uche ya.”

A kpọchiri August Dickmann n’ogige ịta ahụhụ nke Sachsenhausen na 1937. Ụbọchị atọ Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụsịrị, e nyere ya iwu ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ na-egosi na o sozi n’òtù ndị agha. Mgbe ọ jụrụ, onye na-elekọta ogige ahụ kpọtụụrụ Heinrich Himmler, bụ́ onyeisi ndị SS (Schutzstaffel, òtù ndị nche kasị ike nke Hitler), ma rịọ ya ka o nye ya ikike igbu Dickmann n’ihu ndị ọzọ nile a kpọchiri n’ogige ahụ. Na September 17, 1939, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kọrọ site na Germany, sị: ‘Ndị agha mgbagbu agbagbuwo August Dickmann dị afọ 29 n’ebe a.’ Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na ọ bụ onye Germany mbụ jụrụ ije agha ahụ n’ihi akọ na uche ya.

Afọ 60 mgbe e mesịrị, na September 18, 1999, ndị òtù Brandenburg Memorial Foundation mere ememe ncheta ọnwụ Dickmann, ihe ncheta ahụ e mere iji na-echeta ọnwụ ya na-echetakwara ndị ọbịa obi ike na okwukwe ya siri ike. Ihe ncheta ọzọ nke dị ná mgbidi dị n’ihu ebe ogige ịta ahụhụ ahụ dịbu na-echetara ndị ọbịa na Dickmann bụ nanị otu n’ime ihe dị ka Ndịàmà Jehova 900 tara ahụhụ na Sachsenhausen n’ihi nkwenkwe ha. Ọtụtụ ndị ọzọ tara ahụhụ n’ogige ndị ọzọ. Ee, ọbụna n’ọnọdụ ndị dị egwu nke ogige ịta ahụhụ ndị ahụ, ọtụtụ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe ụkpụrụ Chineke dị.

Nye Ndịàmà Jehova, ọ bụ ọrụ dịịrị ndị Kraịst ‘ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ha.’ (Ndị Rom 13:1) Otú ọ dị, mgbe ndị ọchịchị nwara ịmanye ha imebi iwu Chineke, ha na-agbaso ihe nlereanya nke ndị ozi Kraịst, bụ́ ndị kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ihi ya, n’ụwa ebe ibu iro na ịkpọasị agbụrụ kpataworo arụrụala ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ, Ndịàmà Jehova nọ n’ebe nile, dị ka August Dickmann, na-agbaso udo. Ha na-agbaso ndụmọdụ Bible, bụ́: “Ekwela ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:21.