Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Hasmon na Ihe Ha Hapụrụ

Ndị Hasmon na Ihe Ha Hapụrụ

Ndị Hasmon na Ihe Ha Hapụrụ

MGBE Jisọs nọ n’ụwa, okpukpe ndị Juu kewasịrị gaa n’òtù dị iche iche, ha nile na-azọrịta nke ga-enwe ikike n’ebe ndị mmadụ nọ. Nke ahụ bụ ọnọdụ a kọwara n’ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ nakwa n’ihe odide nke onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere na narị afọ mbụ bụ́ Josephus.

Ndị Farisii na Sadusii pụtara n’ihe omume a dị ka ndị a na-akwanyere ùgwù, ndị nwere ikike ichigharị echiche ọha mmadụ ọbụna ruo n’ókè nke ịjụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. (Matiu 15:1, 2; 16:1; Jọn 11:47, 48; 12:42, 43) Otú ọ dị, ọ dịghị ebe ọ bụla a kpọtụrụ òtù abụọ a a na-akwanyere ùgwù aha n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.

Josephus kpọtụrụ ndị Sadusii na ndị Farisii aha na nke mbụ ya mgbe ọ na-akọ ihe mere na narị afọ nke abụọ T.O.A. N’oge a, ụzọ ndụ ndị Gris, ya bụ, ọdịbendị na nkà ihe ọmụma nke Gris, nọ na-adọrọ mmasị ọtụtụ ndị Juu. Esemokwu nke dị n’etiti ndị na-akwado ụzọ ndụ ndị Gris na ndị okpukpe ndị Juu ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe ndị ọchịchị Seleucid merụrụ ụlọ nsọ dị na Jerusalem, na-arara ya nye Zeus. Otu onye ndú dị ike bụ́ onye Juu, bụ́ Judah Maccabee, onye sitere n’ezinụlọ a maara dị ka ndị Hasmon, duziri usuu ndị agha nnupụisi bụ́ ndị napụtara ụlọ nsọ ahụ n’aka ndị Gris. *

Ihe e ji mara afọ ndị sochirinụ ozugbo nnupụisi na mmeri nke ndị Maccabee gasịrị bụ ọchịchọ ihiwe òtù ndị dabeere n’echiche ndị na-emegiderịta onwe ha, nke ọ bụla n’ime òtù ndị a na ibe ya na-azọrịta nke ga-enweta ógbè ndị Juu buru ibu karị. Ma n’ihi gịnị ka e ji malite inwe ọchịchọ a? N’ihi gịnị ka okpukpe ndị Juu ji kewasịa nnọọ ekewasịa? Iji zaa ha, ka anyị nyochaa akụkọ ihe mere eme nke ndị Hasmon.

Mmụba nke Nnwere Onwe na Adịghị n’Otu

Mgbe Judah Maccabee rusịrị ihe mgbaru ọsọ ya metụtara okpukpe, bụ́ ime ka a maliteghachi ife ofufe n’ụlọ nsọ Jehova, o tinyere isi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu kwụsịrị iso ya. Ma, ọ nọgidere na-alụso ndị ọchịchị Seleucid ọgụ, soro Rom nwee nkwekọrịta, ma chọọ iguzobe Ọchịchị kwụụrụ onwe ya nke ndị Juu. Mgbe Judah nwụsịrị n’agha, ụmụnne ya bụ́ Jonathan na Simon lụụrụ ọgụ ahụ gaa n’ihu. Na mbụ, ndị ọchịchị Seleucid guzogidesiri ndị Maccabee ike. Ma ka oge na-aga, ndị ọchịchị ahụ kwetara iso ha dozie nsogbu ndị metụtara ọchịchị, na-eme ka ụmụnne ahụ bụ́ ndị Hasmon nweretụ onwe ha.

Ọ bụ ezie na ndị Hasmon sitere n’usoro ọmụmụ nke ndị nchụàjà, ọ dịbeghị onye ọ bụla n’ime ha jere ozi dị ka onyeisi nchụàjà. Ọtụtụ ndị Juu chere na ọ bụ ndị nchụàjà sitere n’usoro ọmụmụ Zedọk, bụ́ onye Solomọn họpụtara dị ka onyeisi nchụàjà, kwesịrị ịnọ n’ọkwá a. (1 Ndị Eze 2:35; Ezikiel 43:19) Jonathan ji ibu agha na akọ mee ka ndị Seleucid kweta ịhọpụta ya dị ka onyeisi nchụàjà. Ma mgbe Jonathan nwụsịrị, nwanne ya nwoke bụ́ Simon rụzuru ọbụna ihe ka ukwuu. Na September 140 T.O.A., e nyere otu iwu dị mkpa na Jerusalem, bụ́ nke e ji otú ndị Gris si ede ihe dee n’ihe dị mbadamba e ji ọla nchara mee iji chebe ya: “Eze Demetrius [onye ọchịchị Seleucid nke Gris] nwapụtara ya [Simon] ịbụ onyeisi nchụàjà, mee ka ọ bụrụ otu n’ime Ndị Enyi ya, ma nye ya ùgwù dị ukwuu. . . . Ndị Juu na ndị nchụàjà ha ekpebiwo na Simon ga-abụ onye ndú na onyeisi nchụàjà ha ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe onye amụma a pụrụ ịtụkwasị obi ga-ebilite.”—1 Ndị Maccabee 14:38-41 (akwụkwọ akụkọ ihe mere eme nke dị n’Apocrypha).

N’ụzọ dị otú a, ọ bụghị nanị ọchịchị mba ọzọ nke Seleucid kwetara ka Simon bụrụ onye ọchịchị na onyeisi nchụàjà—ya na ụmụ ya—kamakwa “Mgbakọ Ukwu” nke ndị ya kwetara. Nke a kara oge oké mgbanwe dị mkpa akara. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere bụ́ Emil Schürer si kwuo ya, ozugbo ndị Hasmon guzobere usoro ndị ọchịchị, “nchegbu ha bụ́ isi abụghịzi idebe iwu e nyere na Torah [Iwu ndị Juu] kama ọ bụzi ichebe na ịmụba ike ọchịchị ha.” Otú ọ dị, n’ilezi anya iji ghara ịkpasu ndị Juu iwe, Simon ji utu aha bụ́ “ethnarch,” ma ọ bụ “onye ndú nke ọha na eze,” mee ihe kama iji “eze.”

Ọ bụghị mmadụ nile ka obi dị mma ná njichi ndị Hasmon jichiri ma ike okpukpe ma nke ọchịchị. Dị ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta si kwuo, ọ bụ n’oge a ka e guzobere ógbè Qumran. Otu onye nchụàjà nke sitere n’usoro ọmụmụ Zedọk, bụ́ onye e kweere na ọ bụ ya ka a kpọrọ “Onye Ozizi nke Ezi Omume” n’ihe odide ndị e si Qumran nweta, si na Jerusalem pụọ ma duru òtù ndị mmegide banye n’Ọzara Juda nke dịdebere Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Otu n’ime Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ nkọwa nke akwụkwọ Habakuk, katọrọ “Ajọ Onye Nchụàjà ahụ nke a kpọkwasịrị aha eziokwu na mbụ, ma ọ ghọrọ onye mpako mgbe ọ chịrị Israel.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ma ọ́ bụghị Jonathan ya abụrụ Simon pụrụ ịbụ onye kwesịrị nkọwa òtù ahụ nyere banyere “Ajọ Onye Nchụàjà.”

Simon nọgidere na-ebu agha iji mụbaa ókèala ọ na-achị. Otú ọ dị, ọchịchị ya bịara ná njedebe n’ike mgbe ọgọ ya nwoke bụ́ Ptolemy gburu ya na ụmụ ya abụọ mgbe ha nọ n’oriri na nso Jeriko. Mgbalị a e mere iweghara ọchịchị kụrụ afọ n’ala. A dọrọ nwa Simon nke fọdụrụ ndụ, bụ́ John Hyrcanus, aka ná ntị banyere mgbalị a na-eme igbu ya. O jidere ndị o yiri ka ọ̀ bụ ha na-achọ igbu ya ma ghọọ onye ndú na onyeisi nchụàjà n’ọnọdụ nna ya.

Mgbasawanye na Mmegbu Ndị Ọzọ E Nwere

Na mbụ, usuu ndị agha Siria yiri John Hyrcanus egwu nke ukwuu, ma mgbe e mesịrị na 129 T.O.A., e meriri usoro ndị eze Seleucid n’agha siri ike ha na ndị Parthia lụrụ. Banyere mmetụta agha ahụ nwere n’ebe ndị Seleucid nọ, ọkà mmụta bụ́ onye Juu bụ́ Menahem Stern dere, sị: “Usoro ọchịchị dum nke alaeze ahụ fọrọ nke nta ka ha dakpọọ.” N’ihi ya, Hyrcanus “mere ka Judia nwerechaa onwe ya n’ụzọ ọchịchị ma malite ịgbasawanye n’akụkụ dịgasị iche iche.” Ọ gbasawanyekwara n’ezie.

Ugbu a, n’ịbụ onye ndị Siria na-adịghịzi eyi egwu, Hyrcanus malitere ịwakpo ókèala ndị na-adịghị na Judia, ma na-achị ha. Ndị bi n’ókèala ndị a aghaghị ịmalite kpewe okpukpe ndị Juu, ma ọ́ bụghị ya, e bibie obodo ha kpam kpam. E mere otu n’ime mwakpo dị otú ahụ megide ndị Idum (ndị Edọm). Banyere nke a, Stern kwuru, sị: “Ntọghata ahụ a tọghatara ndị Idum bụ nke mbụ n’ụdị ntọghata ahụ, ebe ọ bụ agbụrụ ahụ dum ka a tọghatara kama ịbụ mmadụ ole na ole.” Otu n’ime ógbè ndị ọzọ e meriri bụ Sameria, bụ́ ebe Hyrcanus bibiri ụlọ nsọ ndị Sameria nke dị n’Ugwu Geraịzim kpam kpam. N’igosipụta otú ụkpụrụ a nke iji ike eme ntọghata bụ́ nke usoro ndị eze Hasmon ji mee ihe si bụrụ ihe na-emegide ihe a tụrụ anya ya, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Solomon Grayzel dere, sị: “Leenụ nwa nwa Mattathias [nna Judah Maccabee] ka ọ na-emebi kpọmkwem ụkpụrụ—nnwere onwe okpukpe—nke ọgbọ gara aga chebeworo n’ụzọ dị nnọọ mma.”

Ndị Farisii na Ndị Sadusii Apụta

Mgbe mbụ Josephus kọrọ banyere mmetụta na-arịwanye elu nke ndị Farisii na ndị Sadusii bụ mgbe ọ na-ede banyere ọchịchị Hyrcanus. (Josephus akpọtụbuwo ndị Farisii biri ndụ n’oge ọchịchị Jonathan aha.) Ọ dịghị akọ banyere mmalite ha. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-ewere ha dị ka òtù sitere ná ndị Hasid, bụ́ òtù na-eme nsọ nsọ bụ́ ndị kwadoro Judah Maccabee n’ihe mgbaru ọsọ ya ndị metụtara okpukpe ma hapụ ya mgbe o nwewaziri oké ọchịchọ maka ọkwá ọchịchị.

Aha ahụ bụ́ Farisii n’ozuzu ya nwere ihe jikọrọ ya na okwu Hibru pụtara n’ụzọ bụ́ isi “ndị nọpụrụ iche,” ọ bụ ezie na ụfọdụ weere ya dị ka nke nwere ihe jikọrọ ya na okwu bụ́ “ndị nkọwa.” Ndị Farisii bụ ndị ọkà mmụta sitere n’etiti ụmụ mmadụ nkịtị, usoro ọmụmụ ha apụghị iche. Ha ji nkà ihe ọmụma nke ime nsọ nsọ n’ụzọ pụrụ iche kewapụ onwe ha n’ebe ememe okpukpe ndị na-emerụ emerụ dị, na-eji iwu ụlọ nsọ nke ịdị nsọ nke ndị nchụàjà eme ihe n’ọnọdụ nkịtị ndị a na-enwe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ndị Farisii wepụtara usoro ọhụrụ e ji akọwa Akwụkwọ Nsọ na echiche nke e mesịrị mara dị ka iwu e nyere n’ọnụ. Ha nwetara ikike ka ukwuu n’oge ọchịchị Simon mgbe a họpụtara ụfọdụ n’ime ha isonye n’òtù Gerousia (nzukọ ndị okenye), bụ́ nke e mesịrị mara dị ka Sanhedrin.

Josephus na-akọ na na mbụ, John Hyrcanus bụ nwa akwụkwọ nke ndị Farisii na onye na-akwado ha. Otú ọ dị, n’otu oge, ndị Farisii baara ya mba n’ihi ahapụghị ọkwá onyeisi nchụàjà. Nke a kpatara nkewa dị ịrịba ama. Hyrcanus kagburu iwu okpukpe nke ndị Farisii. Dị ka ụzọ isi nyekwuo ha ntaramahụhụ, ọ dụnyeere ndị Sadusii úkwù, bụ́ ndị okpukpe na-emegide ndị Farisii.

Aha ahụ bụ́ ndị Sadusii yiri ka o nwere ihe jikọrọ ya na Onyeisi Nchụàjà bụ́ Zedọk, bụ́ onye ụmụ ya jigideworo ọkwá ndị nchụàjà kemgbe oge Solomọn. Otú ọ dị, ọ bụghị ndị Sadusii nile sitere n’usoro ọmụmụ a. Dị ka Josephus si kwuo, ndị Sadusii bụ ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndị ọgaranya e nwere ná mba ahụ, ha enweghịkwa nkwado nke ọha mmadụ. Prọfesọ Schiffman na-ekwu, sị: ‘O doro anya na ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nchụàjà ma ọ bụ ndị ha na ezinụlọ ndị isi nchụàjà gbarịtara ọgọ.’ N’ụzọ dị otú a, ọ dịwo anya ha na ndị nọ n’isi kpachiwere anya. N’ihi ya, e weere òkè na-ebuwanye ibu ndị Farisii na-ekere n’ihe omume ọha mmadụ na echiche ha nke ime ka mmadụ nile dị nsọ dị ka ndị nchụàjà, dị ka ihe na-eyi ikike ndị Sadusii ji aka ha nye onwe ha egwu. Ugbu a, n’afọ ndị ikpeazụ nke ọchịchị Hyrcanus, ndị Sadusii nwetaghachiri ikike.

Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Na-amụba, Iji Okpukpe Kpọrọ Ihe Ana-adalata

Nwa Hyrcanus nke kasị okenye, bụ́ Aristobulus, chịrị nanị otu afọ tupu ya anwụọ. Ya na ndị Iturea ji ụkpụrụ iji aka ike eme ntọghata gaa n’ihu ma webata ebe ugwu Galili n’okpuru ọchịchị Hasmon. Ma, ọ bụ n’oge ọchịchị nke nwanne ya nwoke bụ́ Alexander Jannaeus, bụ́ onye chịrị site na 103-76 T.O.A., ka usoro ndị eze Hasmon kpara ike kasịnụ.

Alexander Jannaeus jụrụ ụkpụrụ mbụ ahụ ma kwupụta n’ezoghị ọnụ na ya bụ ma onyeisi nchụàjà ma eze. Esemokwu nke dị n’etiti ndị Hasmon na ndị Farisii kawanyere njọ, ọbụna na-akpata agha obodo nke gburu ndị Juu 50,000. Mgbe nnupụisi ahụ kwụsịchara, Jannaeus, n’ime ihe yiri ihe ndị eze na-ekpere arụsị na-eme, mere ka a kpọgbuo mmadụ 800 n’ime ndị nnupụisi ahụ. Mgbe ha na-anwụ, e gburu nwunye ha na ụmụ ha n’ihu ha, ebe Jannaeus sooro ndị iko ya nwanyị mee oriri n’ihu ọha. *

N’agbanyeghị ibu iro nke dị n’etiti ya na ndị Farisii, Jannaeus bụ onye ọchịchị dị irè. Ọ hụrụ na ọha mmadụ na-akwado ndị Farisii n’ụzọ na-arịwanye elu. Ntụziaka o nyere nwunye ya, bụ́ Salome Alexandra, n’elu àkwà ndina ya mgbe ọ na-anwụ bụ ka ya na ha jikọọ aka n’ọchịchị. Jannaeus ahọrọwo nwunye ya ịbụ onye ga-anọchi anya ya n’alaeze ya kama ịhọrọ ụmụ ya. Nwunye ya gosipụtara onwe ya ịbụ ezi onye ọchịchị, na-eme ka mba ahụ nwee otu n’ime oge ndị udo dị na ha karị n’okpuru ọchịchị Hasmon (76-67 T.O.A.). E mere ka ndị Farisii nọrọghachi n’ọnọdụ ịbụisi ha, a kagbukwara iwu ndị ahụ megidere iwu okpukpe ha.

Mgbe Salome nwụrụ, ụmụ ya abụọ bụ́ Hyrcanus nke Abụọ, onye jere ozi dị ka onyeisi nchụàjà, na Aristobulus nke Abụọ malitere ịzọrịta ọchịchị. Ha abụọ adịghị nke nwere ụdị nghọta nke ndị nna nna ha nwere n’ihe banyere ọchịchị na ibu agha, o yikwara ka ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ghọtara nke ọma ihe mbata ndị Rom na-abatawanye n’ógbè ahụ mgbe alaeze Seleucid dasịrị kpam kpam, pụtara. Na 63 T.O.A., ụmụnne abụọ ahụ jekwuuru onye ọchịchị Rom bụ́ Pompey mgbe ọ nọ na Damaskọs ma rịọ ya ka ọ bịa kpeziere ha. Kpọmkwem n’afọ ahụ, Pompey na usuu ndị agha ya banyere na Jerusalem ma weghara ọchịchị. Ebe a ka alaeze Hasmon nọ malite ịda. Na 37 T.O.A., onye Idum bụ́ Eze Herọd Onye Ukwu, bụ́ onye Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom nakweere ịbụ “Eze Judia,” “onye ya na ndị Rom jikọrọ aka na enyi ha,” weghaara Jerusalem. Alaeze Hasmon adịghịkwa ọzọ.

Ihe Ndị Hasmon Hapụrụ

Oge ndị Hasmon, site n’oge Judah Maccabee ruo nke Aristobulus nke Abụọ, tọrọ ntọala maka ọnọdụ okpukpe kewasịrị ekewasị bụ́ nke dịnụ mgbe Jisọs nọ n’ụwa. Ndị Hasmon ji ịnụ ọkụ n’obi maka ofufe Chineke malite, ma nke ahụ jụgidere oyi ghọọ ịchọ ọdịmma onwe onye n’ụzọ na-ezighị ezi. Ndị nchụàjà ha, bụ́ ndị nwere ohere nke ime ka ndị ahụ dị n’otu n’ịgbaso Iwu Chineke, dubara mba ahụ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya nke esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ọnọdụ a, echiche okpukpe ndị na-akpata nkewa mụbara. Ndị Hasmon adịghịzi, ma ọgụ ndị Sadusii, ndị Farisii, na ndị ọzọ na-alụ maka ịbụ ndị okpukpe ga-adị n’aka ha ka a ga-eji mara mba ahụ bụ́ nke nọzi n’okpuru Herọd na Rom.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee isiokwu bụ́ “Olee Ndị Bụ́ Ndị Maccabee?” n’Ụlọ Nche nke November 15, 1998.

^ par. 22 Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ bụ́ “Nkọwa nke Akwụkwọ Nehum” kpọtụrụ “Ọdụm nke Iwe” aha bụ́ onye “kwụgburu ndị mmadụ ná ndụ,” nke pụrụ ịdị na-ezo aka n’ihe omume ahụ e kwuru n’elu.

[Chaatị dị na peeji nke 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Usoro Ndị Eze Hasmon

Judah Maccabee Jonathan Maccabee Simon Maccabee

John Hyrcanus

↓ ↓

Salome Alexandra — lụrụ — Alexander Jannaeus Aristobulus

↓ ↓

Hyrcanus nke Abụọ Aristobulus nke Abụọ

[Foto dị na peeji nke 27]

Judah Maccabee chọrọ nnwere onwe nke ndị Juu

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ndị Hasmon lụrụ agha iji gbasawanye ikike ha ịchị obodo ndị ọzọ na-abụghị nke ndị Juu

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.