Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Unu Aghọla Ndị Na-anụ Ma Na-echezọ

Unu Aghọla Ndị Na-anụ Ma Na-echezọ

Unu Aghọla Ndị Na-anụ Ma Na-echezọ

“Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị, ndị na-arafu onwe unu.”—JEMES 1:22.

1. Ọrụ ebube ndị dị aṅaa ka ndị Israel oge ochie nwere ihe ùgwù ịhụ?

“IHE a na-apụghị ichezọ echezọ” ga-abụ okwu dị mma iji kọwaa ọrụ ebube ndị Jehova rụrụ n’Ijipt oge ochie. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke ọ bụla n’ime Ihe Otiti Iri ahụ bụ ihe na-emenye ụjọ. Ihe sochiri ihe otiti ndị ahụ bụ nnapụta dị ịtụnanya a napụtara ndị Israel site n’Oké Osimiri Uhie e kewara ekewa. (Deuterọnọmi 34:10-12) Ọ bụrụ na ị hụrụ ihe omume ndị ahụ n’onwe gị, e nwere olileanya na ị gatụghị echezọwo Onye mere ha. Ma, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ha [ụmụ Israel] chezọrọ Chineke, bụ́ Onye nzọpụta ha, Onye na-emerị ihe ukwu dị iche iche n’Ijipt; oké ọrụ dị iche iche n’ala Ham, na ihe dị egwu dị iche iche n’akụkụ Oké Osimiri Uhie.”—Abụ Ọma 106:21, 22.

2. Gịnị na-egosi na ekele ụmụ Israel nwere maka oké ọrụ Chineke rụrụ adịteghị aka?

2 Mgbe ụmụ Israel gafesịrị Oké Osimiri Uhie, ha ‘tụrụ egwu Jehova, kwere na Jehova.’ (Ọpụpụ 14:31) Ụmụ Israel sonyeere Mosis n’ịbụku Jehova abụ mmeri, Miriam na ndị inyom ndị ọzọ meghachikwara omume site n’iti egwú otiti na ịgba egwú. (Ọpụpụ 15:1, 20) Ee, oké ọrụ Jehova rụrụ masịrị ndị Chineke. Ma ekele ha nwere n’ebe Onye rụrụ ọrụ ndị ahụ nọ adịteghị aka. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọtụtụ n’ime ha kpara àgwà dị ka a ga-asị na ha nwere oké nsogbu nke ichezọ ihe. Ha ghọrọ ndị ntamu na ndị mkpesa megide Jehova. Ụfọdụ n’ime ha tinyere aka n’ikpere arụsị nakwa ná mmekọahụ rụrụ arụ.—Ọnụ Ọgụgụ 14:27; 25:1-9.

Gịnị Pụrụ Ime Ka Anyị Chezọọ?

3. N’ihi ọdịdị ezughị okè anyị, gịnị ka anyị pụrụ ichezọ?

3 Enweghị ekele nke ụmụ Israel bụ ihe dị mgbagwoju anya n’ezie. Ma, otu ihe ahụ pụrụ ime anyị. N’ezie, anyị ahụtụbeghị ọrụ ebube ndị dị otú ahụ Chineke rụrụ. Otú ọ dị, ná mmekọrịta anyị na Chineke, e nwere n’ezie ihe omume ndị anyị na-apụghị ichezọ echezọ. Ụfọdụ n’ime anyị pụrụ icheta mgbe anyị nakweere eziokwu ahụ sitere na Bible. Oge ndị ọzọ na-enye ọṅụ pụrụ ịgụnye oge anyị ji ekpere rara onwe anyị nye Jehova na oge e mere anyị baptism ime mmiri dị ka ezi ndị Kraịst. Ọtụtụ n’ime anyị enwetawo enyemaka Jehova n’oge ndị ọzọ ná ndụ anyị. (Abụ Ọma 118:15) Karịsịa, site n’ọnwụ ịchụàjà nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, anyị enwetawo olileanya nzọpụta. (Jọn 3:16) Otú o sina dị, n’ihi ọdịdị ezughị okè anyị, mgbe ọchịchọ ọjọọ na nchegbu nke ndụ chere anyị ihu, anyị pụrụ nnọọ, n’ụzọ dị mfe, ichezọ ezi ihe Jehova mewooro anyị.

4, 5. (a) Olee otú Jemes si dọọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịbụ ndị na-anụ ma na-echezọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe atụ Jemes banyere nwoke na enyo mee ihe?

4 N’akwụkwọ ozi onye otu nne ji ya na Jisọs bụ́ Jemes degaara ndị Kraịst ibe ya, ọ dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ịbụ ndị na-anụ ma na-echezọ. O dere, sị: “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị, ndị na-arafu onwe unu. N’ihi na a sị na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma ọ bụghị onye na-eme ya, onye ahụ yiri nwoke nke na-ekiri ihu ya n’enyo, bụ́ ihu o nwere mgbe a mụpụtara ya: n’ihi na o kiriri onwe ya, ọ pụwokwa, ngwa ngwa o wee chezọọ aha mmadụ ọ bụ.” (Jemes 1:22-24) Gịnị ka Jemes bu n’uche n’okwu ndị ahụ?

5 Mgbe anyị tetara ụra n’ụtụtụ, anyị na-elekarị anya n’enyo iji hụ ebe ndị dị anyị mkpa idozi n’ọdịdị anyị. Ka anyị na-arụ ọrụ dị iche iche ma tinye uche n’ihe ndị ọzọ, anyị na-akwụsị iche banyere ihe anyị hụrụ n’enyo. Nke a pụkwara ime n’ụzọ ime mmụọ. Ka anyị na-eleba anya n’Okwu Chineke, anyị pụrụ iji ihe anyị bụ tụnyere ihe Jehova na-atụ anya ka anyị bụrụ. N’ụzọ dị otú a, anyị na-ahụ nnọọ ebe ndị anyị na-adịghị ike. Ihe ọmụma a kwesịrị ịkwali anyị idozi àgwà anyị. Ma, ka anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, anyị na nsogbu anyị ana-alụkwa, anyị pụrụ n’ụzọ dị mfe ịkwụsị iche banyere ihe ime mmụọ. (Matiu 5:3; Luk 21:34) Ọ na-adị ka a ga-asị na anyị chezọrọ ọrụ ịhụnanya Chineke na-arụrụ anyị. Ọ bụrụ na nke a emee, anyị na-aghọ ndị e kpughepụrụ nye ọchịchọ mmehie.

6. Ntụle dị aṅaa sitere n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere anyị aka ịghara ichezọ okwu Jehova?

6 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ degara ndị Kọrint, o zoro aka n’ebe ụmụ Israel ahụ chezọrọ ihe n’ọzara nọ. Dị nnọọ ka ndị Kraịst narị afọ mbụ ritere uru site n’okwu Pọl, ịtụle ihe o dere pụrụ inyere anyị aka ịghara ichezọ okwu Jehova. Ya mere, ka anyị tụlee 1 Ndị Kọrint 10:1-12.

Jụ Ọchịchọ nke Ụwa

7. Ihe àmà dị aṅaa a na-apụghị ịgbagha agbagha nke ịhụnanya Jehova ka ụmụ Israel nwetara?

7 Ihe Pọl kwuru banyere ụmụ Israel bụụrụ ndị Kraịst ihe ịdọ aka ná ntị. Ná mgbubiri, Pọl na-ede, sị: “Achọghị m, ụmụnna m, ka unu ghara ịmara, na nna anyị hà nile nọrị n’okpuru igwe ojii ahụ, ha nile gabigakwara oké osimiri ahụ; e mekwara ha nile baptism ịba n’ime Mosis n’ime igwe ojii ahụ na n’ime oké osimiri ahụ.” (1 Ndị Kọrint 10:1-4) Ndị Israel n’oge Mosis hụrụ oké ngosipụta nke ike Chineke, gụnyere ogidi igwe ojii nke Chineke ji ọrụ ebube weta bụ́ nke duru ha n’ehihie, nke nyekwaara ha aka isi n’Oké Osimiri Uhie gbapụ. (Ọpụpụ 13:21; 14:21, 22) Ee, ụmụ Israel ahụ nwetara ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha nke ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ha nọ.

8. Ihe ndị dị aṅaa ka nchezọ ụmụ Israel chezọrọ ihe n’ụzọ ime mmụọ rụpụtara?

8 “Ma,” ka Pọl gara n’ihu ikwu, “ihe ndị [ka ọtụtụ] n’etiti ha adịghị Chineke ezi mma: n’ihi na a kwaturu ha n’ọhịa.” (1 Ndị Kọrint 10:5) Lee ihe mwute ọ bụ! Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ Israel ahụ si n’Ijipt pụọ ji aka ha mee ka ha ghara iru eru ịba n’Ala Nkwa ahụ. N’ịbụ ndị Chineke jụrụ n’ihi enweghị okwukwe ha, ha nwụrụ n’ọhịa. (Ndị Hibru 3:16-19) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? Pọl na-ekwu, sị: “Ihe ndị a ghọrọ ihe atụ nye anyị, ka anyị wee ghara ịbụ ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ, dị ka agụụ ihe ọjọọ gụkwara ndị ahụ.”—1 Ndị Kọrint 10:6.

9. Olee otú Jehova siworo nye ndị ya ihe, oleekwa otú ụmụ Israel si meghachi omume?

9 Ụmụ Israel nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka ha nọgide na-elekwasị anya n’ihe ime mmụọ n’oge ha nọ n’ọzara. Ha so Jehova gbaa ndụ ma ghọọ mba a raara nye ya. Ọzọkwa, e nyere ha usoro ndị nchụàjà, ụlọikwuu ịbụ ebe ofufe ga-ehiwe isi, na ndokwa maka ịchụrụ Jehova àjà. Otú ọ dị, kama ịṅụrị ọṅụ n’ihi onyinye ime mmụọ ndị a, ha kwere ka ha ghara inwe afọ ojuju n’ihe Chineke nyeworo ha.—Ọnụ Ọgụgụ 11:4-6.

10. Gịnị mere anyị ji kwesị iburu Chineke n’uche mgbe nile?

10 N’adịghị ka ụmụ Israel ahụ nọ n’ọzara, ndị Jehova taa na-enweta ihu ọma Chineke. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka anyị nile n’otu n’otu na-ebu Chineke n’uche. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịjụ oké ọchịchọ ndị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpata bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị na-ahụ inyoghị inyoghị n’ụzọ ime mmụọ. Anyị aghaghị ikpebisi ike ‘ịjụ asọpụrụghị Chineke na agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa, wee dị ndụ uche zuru okè na nke ezi omume na nke ịsọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a.’ (Taịtọs 2:12) Ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị nọworo na-eso ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọ kemgbe a mụrụ ha ekwesịghị iche ma ọlị na ọ dị ezi ihe na-efunahụ anyị. Ọ bụrụ na ihe dị otú ahụ agbabatatụdị anyị n’uche, anyị ga-eme nke ọma icheta Jehova na ngọzi ndị dị ebube ọ kwadebewooro anyị.—Ndị Hibru 12:2, 3.

Irubere Jehova Isi n’Ụzọ Zuru Ezu

11, 12. Olee otú ikpe ikpere arụsị pụrụ isi ma mmadụ mgbe ọ na-adịghị efe ihe oyiyi?

11 Pọl na-agwa anyị okwu ịdọ aka ná ntị ọzọ mgbe o dere, sị: “Unu aghọkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha ghọrọ; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị Israel nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwú.” (1 Ndị Kọrint 10:7) Pọl na-ezo aka n’oge ụmụ Israel mere ka Erọn kwenye ime nwa ehi ọlaedo. (Ọpụpụ 32:1-4) Ọ bụ ezie na o yighị ka anyị ga-echigharị ịga fewe arụsị kpọmkwem, anyị pụrụ ịghọ ndị na-ekpere arụsị site n’ikwe ka ọchịchọ anyị ndị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpali mee ka anyị ghara iji mkpụrụ obi anyị dum na-efe Jehova.—Ndị Kọlọsi 3:5.

12 N’oge ọzọ, Pọl dere banyere ụfọdụ ndị tinyere uche karịsịa n’ihe onwunwe kama ịbụ n’ihe ime mmụọ. Banyere ‘ndị na-ejegharị dị ka ndị iro osisi ịta ahụhụ nke Kraịst,’ o dere, sị: “Ọgwụgwụ ha bụ ịla n’iyi, ndị chi ha bụ afọ ha.” (Ndị Filipaị 3:18, 19) Arụsị ha kpeere abụghị ihe a kpụrụ akpụ. Ọ bụ ọchịchọ ha maka ihe anụ ahụ. N’ezie, ọ bụghị ọchịchọ nile dị njọ. Jehova kere anyị inwe mkpa dị ka ụmụ mmadụ na ikike nke ịnụ ụtọ ihe dịgasị iche iche. Ma, ndị na-eme ka nchụso ha na-achụso ihe ụtọ butere mmekọrịta ha na Chineke ụzọ na-aghọ ndị na-ekpere arụsị n’ezie.—2 Timoti 3:1-5.

13. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ banyere nwa ehi ọlaedo ahụ?

13 Mgbe ha hapụsịrị Ijipt, ụmụ Israel mere nwa ehi ọlaedo ife ya ofufe. E wezụga ịdọ aka ná ntị megide ikpere arụsị, e nwere ihe ọzọ anyị na-amụta site n’ihe ndekọ a. Ụmụ Israel nupụrụ isi ná ntụziaka doro anya Jehova nyere. (Ọpụpụ 20:4-6) Ma, ha ebughị n’obi ịjụ Jehova dị ka Chineke ha. Ha chụọrọ nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ àjà ma kpọọ ihe omume ahụ ‘ememe a na-emere Jehova.’ N’ụzọ ụfọdụ, ha rafuru onwe ha gaa n’iche na Chineke ga-eleghara nnupụisi ha anya. Nke a bụ mkparị nye Jehova, o wutekwara ya n’ụzọ dị ukwuu.—Ọpụpụ 32:5, 7-10; Abụ Ọma 106:19, 20.

14, 15. (a) N’ihi gịnị ka ụmụ Israel na-ejighị nwee ihe ngọpụ ọ bụla maka ịghọ ndị na-anụ ma na-echezọ? (b) Ọ bụrụ na anyị kpebisiri ike ịghara ịbụ ndị na-anụ ma na-echezọ, gịnị ka anyị ga-eme banyere ihe ndị Jehova nyere n’iwu?

14 Ọ ga-ara nnọọ ahụ otu n’ime Ndịàmà Jehova isonyere okpukpe ụgha. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ụfọdụ nọ n’ọgbakọ, ha pụrụ ịjụ ntụziaka Jehova n’ụzọ ndị ọzọ. Ndị Israel enweghị ihe ngọpụ maka ịghọ ndị na-anụ ma na-echezọ. Ha nụrụ Iwu Iri ahụ ma nọrọ ya mgbe Mosis nyere ha iwu Chineke bụ́: “Unu emela chi ọzọ tinyere m; chi ọlaọcha ma ọ bụ chi ọlaedo, unu emerela onwe unu ha.” (Ọpụpụ 20:18, 19, 22, 23) N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ Israel fere nwa ehi ọlaedo ahụ ofufe.

15 Anyị onwe anyị kwa agaghị enwe ezi ihe ngọpụ ma ọ bụrụ na anyị aghọọ ndị na-anụ ma na-echezọ. N’Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ntụziaka sitere n’aka Chineke banyere ọtụtụ akụkụ nke ndụ. Dị ka ihe atụ, Okwu Jehova na-akatọ, n’ụzọ a kapịrị ọnụ, omume nke ịgbaziri ihe ma ghara ịkwụghachi ya. (Abụ Ọma 37:21) E nyere ụmụaka iwu irubere ndị mụrụ ha isi, a na-atụkwa anya n’aka ndị bụ́ nna ịzụpụta ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:1-4) E nyere ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ntụziaka ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị,” a gwakwara ndị ohu Chineke lụrụ di ma ọ bụ nwunye, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (1 Ndị Kọrint 7:39; Ndị Hibru 13:4) Ọ bụrụ na anyị kpebisiri ike ịghara ịbụ ndị na-anụ ma na-echezọ, anyị ga-eji ntụziaka ndị a na ndị ọzọ sitere n’aka Chineke kpọrọ ihe nke ukwuu ma rube isi na ha.

16. Olee ihe ndị si n’ife nwa ehi ọlaedo ahụ ofufe pụta?

16 Jehova anabataghị mgbalị ụmụ Israel mere ife ya otú ha si chọọ. Kama nke ahụ, e bibiri mmadụ 3,000, ikekwe n’ihi òkè pụtara ìhè ha keere n’omume nnupụisi nke ife nwa ehi ọlaedo ahụ ofufe. Jehova tiri ndị ọzọ mebiri iwu ihe otiti. (Ọpụpụ 32:28, 35) Lee ihe mmụta nke a bụụrụ ndị ọ bụla na-agụ Okwu Chineke ma jiri aka ha na-ahọrọ ihe ha chọrọ irube isi na ya!

“Gbanahụnụ Ịkwa Iko”

17. Ihe omume dị aṅaa ka 1 Ndị Kọrint 10:8 na-ezo aka na ya?

17 Pọl mere ka a mara otu akụkụ ebe ọchịchọ anụ ahụ pụrụ ime ka e chezọọ ihe n’ụzọ ime mmụọ mgbe ọ na-ekwu, sị: “Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [mmadụ puku iri abụọ na atọ].” (1 Ndị Kọrint 10:8) N’ebe a, Pọl na-ezo aka n’ihe mere n’Ọzara Moab ná ngwụsị nke njem ụmụ Israel mere n’ọzara ruo afọ 40. Ụmụ Israel nwetara enyemaka Jehova n’oge na-adịbeghị anya n’ibibi ala ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan, ma ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị na-echezọ ihe na ndị na-enweghị ekele. N’ókèala Ala Nkwa ahụ, a rabara ha ná mmekọahụ rụrụ arụ na n’ofufe na-adịghị ọcha nke Beal nke Peoa. E bibiri ihe dị ka mmadụ 24,000, 1,000 n’ime ha bụ ndị isi ha.—Ọnụ Ọgụgụ 25:9.

18. Ụdị omume dị aṅaa pụrụ iduga ná mmekọahụ rụrụ arụ?

18 A maara ndị Jehova taa nke ọma maka ụkpụrụ omume ha dị elu. Ma mgbe e ji mmekọahụ rụrụ arụ nwaa ụfọdụ ndị Kraịst ọnwụnwa, ha akwụsịwo iche banyere Chineke na ụkpụrụ ya. Ha aghọwo ndị na-anụ ma na-echezọ. Na mbụ, ọnwụnwa ahụ nwere ike ọ gaghị abụ ịkwa iko. Ọ pụrụ ịbụ ọchịchọ inyoba anya n’ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ikwu okwu na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ime mfegharị, ma ọ bụ iso ndị na-adịghị ike n’omume na-enwe mkpakọrịta chiri anya. Ihe a nile edubawo ndị Kraịst ná mmehie.—1 Ndị Kọrint 15:33; Jemes 4:4.

19. Ndụmọdụ dị aṅaa sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ‘ịgbanahụ ịkwa iko’?

19 Ọ bụrụ na a nwaa anyị itinye aka n’omume rụrụ arụ, anyị agaghị anwa anwa kwụsị iche banyere Jehova. Kama nke ahụ, anyị aghaghị idebe ihe ncheta ndị dị n’Okwu ya. (Abụ Ọma 119:1, 2) Dị ka ndị Kraịst, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-eme ike anyị iji nọgide na-adị ọcha n’omume, ma ime ihe ziri ezi n’anya Chineke na-achọ ịnọgide na-eme mgbalị. (1 Ndị Kọrint 9:27) Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, sị: “Ịṅa ntị unu eruzuwo ná ntị mmadụ nile. Ya mere ana m aṅụrị ọṅụ n’isi unu: ma ana m achọ ka unu bụrụ ndị amamihe n’ebe ezi ihe dị, ma ndị arụghị arụ n’ebe ihe ọjọọ dị.” (Ndị Rom 16:19) Dị nnọọ ka e gburu ụmụ Israel 24,000 n’ihi mmehie ha, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ama ndị na-akwa iko na ndị ọzọ na-eme mmehie ikpe. (Ndị Efesọs 5:3-6) Ya mere, kama ịghọ ndị na-anụ ma na-echezọ, anyị aghaghị ịnọgide ‘na-agbanahụ ịkwa iko.’—1 Ndị Kọrint 6:18.

Na-enwe Ekele Mgbe Nile Maka Ihe Jehova Na-enye

20. Olee otú ụmụ Israel si nwaa Jehova, gịnịkwa si na ya pụta?

20 Ihe ka nnọọ ọtụtụ n’etiti ndị Kraịst adabatụbeghị ná mmekọahụ rụrụ arụ. Ma, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya ịhụ na anyị adịghị agbaso ụzọ nke na-eduga n’omume ịtamu ntamu bụ́ nke pụrụ ime ka anyị ghara inweta ihu ọma Chineke. Pọl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka anyị gharakwa ịnwa Onyenwe anyị, dị ka ụfọdụ n’etiti [ụmụ Israel] nwara, agwọ wee laa ha n’iyi. Unu atamukwala, dị ka ụfọdụ n’etiti ha tamuru, onye mbibi ahụ wee laa ha n’iyi.” (1 Ndị Kọrint 10:9, 10) Ụmụ Israel tamuru ntamu megide Mosis na Erọn—ee, ọbụna megide Chineke n’onwe ya—na-eme mkpesa banyere mana ahụ e nyere ha n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọnụ Ọgụgụ 16:41; 21:5) Ntamu ha ò wutere Jehova n’ụzọ dị ala karịa ịkwa iko ha? Ihe ndekọ Bible ahụ na-egosi na agwọ tagburu ọtụtụ ndị tamuru ntamu. (Ọnụ Ọgụgụ 21:6) Tupu mgbe ahụ, e bibiri ihe karịrị mmadụ 14,700 bụ́ ndị ji nnupụisi tamuo ntamu. (Ọnụ Ọgụgụ 16:49) Ya mere, ka anyị ghara ịnwa ndidi Jehova site n’igosi enweghị nkwanye ùgwù maka ihe ndị ọ na-enye.

21. (a) Agbamume dị aṅaa ka e nyere Pọl ike mmụọ nsọ ide? (b) Dị ka Jemes 1:25 si kwuo, olee otú anyị pụrụ isi na-enwe obi ụtọ n’ezie?

21 Mgbe Pọl na-edegara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, o ji agbamume a mechie ịdọ aka ná ntị ya: “Ma ihe ndị a na-emerị ndị ahụ n’ụzọ ihe atụ; e wee dee ha n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo. Ya mere, onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:11, 12) Dị ka ụmụ Israel, anyị enwetawo ọtụtụ ngọzi n’aka Jehova. Otú ọ dị, n’adịghị ka ha, ka anyị ghara ma ọlị ichezọ ma ghara inwe ekele maka ezi ihe Chineke na-emere anyị. Mgbe nchegbu nke ndụ na-akpa anyị aka ọjọọ, ka anyị tụgharịa uche ná nkwa ndị dị ebube dị n’Okwu ya. Ka anyị na-echeta mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Jehova ma nọgide na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ e nyefeworo anyị. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ụzọ ndụ dị otú ahụ bụ nke e ji n’aka na ọ ga-ewetara anyị ezi obi ụtọ, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-ekwe nkwa, sị: “Onye nyochaworo n’ime iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe ya, nke na-anọgidekwa otú a, ghara ịghọ onye na-anụ anụ nke na-echezọ, kama ọ bụ onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ, onye a ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.”—Jemes 1:25.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị na-anụ ma na-echezọ?

• Gịnị mere irubere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu ji dị oké mkpa?

• Olee otú anyị pụrụ isi ‘gbanahụ ịkwa iko’?

• Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ihe Jehova na-enye anyị dị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ụmụ Israel chezọrọ oké ọrụ Jehova rụrụ maka ọdịmma ha

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndị Jehova na-ekpebisi ike ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu