Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Inweta Ihe Ọmụma Banyere Jehova

Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Inweta Ihe Ọmụma Banyere Jehova

Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Inweta Ihe Ọmụma Banyere Jehova

“Ngọzi na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya.”—LUK 11:28.

1. Olee mgbe Jehova malitere inye ụmụ mmadụ ihe ọmụma?

JEHOVA hụrụ ụmụ mmadụ n’anya ma nwee mmasị miri emi n’ọdịmma ha. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ na-enye ha ihe ọmụma. Ọ malitere inye ha ihe ọmụma a n’ogige Iden. Dị ka Jenesis 3:8 si kwuo, n’otu oge, “mgbe ifufe na-efe n’ụbọchị,” Adam na Iv ‘nụrụ olu Jehova, bụ́ Chineke.’ Ụfọdụ ndị na-atụ aro na nke a na-apụta na Jehova na-enyekarị Adam ihe ọmụma n’oge a, ma eleghị anya, kwa ụbọchị. Ihe ọ sọrọ ya ya bụrụ, Bible na-eme ka o doo anya na Chineke wepụtara oge, ọ bụghị nanị iji nye nwoke mbụ ahụ ntụziaka kamakwa iji kụziere ya ihe ọ dị ya mkpa ịmara iji rụzuo ọrụ ya.—Jenesis 1:28-30.

2. Olee otú di na nwunye mbụ ahụ si kewapụ onwe ha ná nduzi nke Jehova, gịnịkwa si na ya pụta?

2 Jehova nyere Adam na Iv ndụ na ikike n’ahụ ụmụ anụmanụ nakwa elu ụwa dum. Ọ dị nanị otu ihe ha na-agaghị eme—ha agaghị eri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. N’ịbụ ndị Setan kpaliri, Adam na Iv nupụrụ isi n’iwu Chineke. (Jenesis 2:16, 17; 3:1-6) Ha họọrọ ime ihe masịrị ha, na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ. N’ime otú ahụ, ha ji nzuzu kewapụ onwe ha ná nduzi nke Onye Okike ha na-ahụ n’anya. Ihe ndị si n’ime ya pụta wetaara ha na ụmụ ndị ha na-amụbeghị amụ ọdachi. Adam na Iv mere agadi ma mesịa nwụọ n’enweghị olileanya nke mbilite n’ọnwụ. Ụmụ ha ketara mmehie na ihe ọ na-akpata, bụ́ ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

3. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye Ken ihe ọmụma, oleekwa otú Ken si meghachi omume?

3 N’agbanyeghị nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden, Jehova nọgidere na-enye ihe o kere eke bụ́ mmadụ ihe ọmụma. Ken, bụ́ nwa mbụ nke Adam na Iv, nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye mere mmehie. Jehova dọrọ ya aka ná ntị na ọ na-aga ịdaba ná nsogbu ma dụọ ya ọdụ ka ‘o mee nke ọma.’ Ken jụrụ ndụmọdụ ịhụnanya a ma gbuo nwanne ya. (Jenesis 4:3-8) N’ụzọ dị otú a, mmadụ atọ mbụ biri n’ụwa jụwachara isi ịnara nduzi doro anya sitere n’aka onye ahụ nyere ha ndụ, bụ́ Chineke nke na-enye ndị ya ntụziaka ka ha wee nwee ike ime ihe ga-abara ha uru. (Aịsaịa 48:17) Lee ihe mmechuihu nke a na-aghaghị ịbụworo Jehova!

Jehova Ekpugheere Ndị Oge Ochie Onwe Ya

4. Gịnị ka Jehova nwere obi ike na ya banyere ụmụ Adam, n’iburu nke ahụ n’uche, ozi dịkwa aṅaa na-enye olileanya ka ọ kpọsara?

4 Ọ bụ ezie na Jehova nwere nnọọ ikike ịkwụsị inye ụmụ mmadụ ihe ọmụma, o meghị otú ahụ. O nwere obi ike na ụfọdụ n’ime ụmụ Adam ga-eji amamihe gee ntị ná nduzi Ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova na-ama Adam na Iv ikpe, o buru amụma banyere ọbịbịa nke otu “mkpụrụ” nke ga-eguzogide Agwọ ahụ, Setan bụ́ Ekwensu. Ka oge na-aga, a ga-echifịa Setan n’isi n’ụzọ na-eweta ọnwụ. (Jenesis 3:15) Amụma a bụ ozi ọṅụ nke na-enye “ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya,” olileanya.—Luk 11:28.

5, 6. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si nye ndị ya ihe ọmụma tupu narị afọ mbụ O.A., oleekwa otú nke a si baara ha uru?

5 Jehova mere ka ndị nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, dị ka Noa, Abraham, Aịsak, Jekọb, na Job, mara uche ya. (Jenesis 6:13; Ọpụpụ 33:1; Job 38:1-3) Mgbe e mesịrị, o si n’aka Mosis depụtara mba Israel ụkpụrụ iwu zuru ezu. Iwu Mosis ahụ baara ha uru n’ọtụtụ ụzọ. Site n’idebe ya, e kewapụrụ Israel iche pụọ n’ebe mba ndị ọzọ nile nọ dị ka ndị pụrụ iche nye Chineke. Chineke mesiri ndị Israel obi ike na ọ bụrụ na ha erube isi n’Iwu ahụ, na ya ga-agọzi ha, ọ bụghị nanị n’ụzọ ihe onwunwe kamakwa n’ụzọ ime mmụọ, na-eme ka ha ghọọ alaeze ndị nchụàjà, mba dị nsọ. Ọbụna Iwu ahụ nyere nduzi banyere ihe oriri na ịdị ọcha bụ́ ndị kwalitere ezi ahụ ike. Otú ọ dị, Jehova dọkwara ha aka ná ntị banyere ọdachi ndị pụrụ isi n’inupụ isi pụta.—Ọpụpụ 19:5, 6; Deuterọnọmi 28:1-68.

6 Ka oge na-aga, a gbakwụnyere akwụkwọ ndị ọzọ e dere n’ike mmụọ nsọ n’akwụkwọ Bible. Ihe ndekọ dị iche iche nke akụkọ ihe mere eme kọrọ otú Jehova si mesoo mba dị iche iche na ndị mmadụ ihe. Akwụkwọ uri dị iche iche kọwara àgwà ya dị iche iche n’ụzọ magburu onwe ya. Akwụkwọ amụma dị iche iche buru amụma banyere otú uche Jehova ga-esi emezu n’ọdịnihu. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie ji nlezianya mụọ ihe odide ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ ma tinye ha n’ọrụ. Otu n’ime ha dere, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Jehova kụziiri ndị dị njikere ige ntị ihe, nyekwa ha ihe ọmụma.

Ìhè ahụ Egbukepụkwuo

7. Ọ bụ ezie na Jisọs rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, olee ihe bụ́ isi e ji mara ya, n’ihi gịnịkwa?

7 Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ, òtù okpukpe dị iche iche nke ndị Juu atụkwasịwo ọdịnala nke mmadụ n’Iwu ahụ. A kọwahiere Iwu ahụ, kamakwa ịbụ ebe e si enweta ihe ọmụma, ọ ghọrọ ibu arọ n’ihi ọdịnala ndị ahụ. (Matiu 23:2-4) Otú ọ dị, na 29 O.A., Jisọs pụtara dị ka Mesaịa ahụ. Ihe ọ bịara abụghị nanị inye ndụ ya n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ kamakwa ọ bịara ka ọ “gbaara eziokwu àmà.” Ọ bụ ezie na ọ rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, a maara ya n’ụzọ bụ́ isi dị ka “Onye Ozizi.” Ozizi ya dị ka ìhè nke na-enwubanye n’ọchịchịrị ime mmụọ nke kpuchiri uche ndị mmadụ. Jisọs n’onwe ya kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mụ onwe m bụ Ìhè nke ụwa.”—Jọn 8:12; 11:28; 18:37.

8. Akwụkwọ ndị dị aṅaa sitere n’ike mmụọ nsọ ka e dere na narị afọ mbụ O.A., oleekwa otú ha si baara ndị Kraịst oge mbụ uru?

8 Mgbe e mesịrị, a gbakwụnyere Oziọma ndị ahụ, bụ́ ihe ndekọ anọ kọrọ banyere ndụ Jisọs, nakwa akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, bụ́ akụkọ banyere mgbasawanye nke Iso Ụzọ Kraịst mgbe Jisọs nwụsịrị. E nwekwara akwụkwọ ozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị ndị na-eso ụzọ Jisọs dere, nakwa akwụkwọ amụma bụ́ Mkpughe. Ihe odide ndị a na Akwụkwọ Nsọ Hibru, mejupụtara akwụkwọ Bible. Site n’enyemaka nke akwụkwọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ, ndị Kraịst pụrụ “ịghọta, [ha] na ndị nsọ nile, ihe bụ́ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi” nke eziokwu ahụ. (Ndị Efesọs 3:14-18) Ha pụrụ inwe “uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Otú o sina dị, ndị Kraịst oge mbụ ahụ aghọtachaghị akụkụ nile nke nzube Jehova. Pọl onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ, sị: “Ugbu a anyị ji enyo hụ ihe, n’ime ilu.” (1 Ndị Kọrint 13:12) Enyo dị otú ahụ ga-egosi otú ihe dịtụ ma ọ bụghị otú ihe ahụ dịcha. A ka ga-aghọta Okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu karị.

9. Ihe ọmụma dị aṅaa ka e nweworo na “mgbe ikpeazụ”?

9 Taa, anyị na-ebi n’oge a kpọrọ “mgbe ikpeazụ,” oge e ji “oge dị oké egwu” mara. (2 Timoti 3:1) Daniel onye amụma buru amụma na n’oge a, ‘ezi ihe ọmụma ga-aba ụba.’ (Daniel 12:4) N’ihi ya, Jehova, bụ́ Onye Ukwu Na-enye Ihe Ọmụma, enyeworo ndị nwere obi eziokwu aka ịghọta ihe Okwu ya pụtara. Ugbu a, ọtụtụ ìgwè mmadụ na-aghọta na e chiri Kraịst Jisọs eze n’eluigwe a na-adịghị ahụ anya na 1914. Ha makwaara na ọ ga-eweta ajọ omume nile ná ngwụsị n’isi nso ma gbanwee elu ala ịghọ paradaịs zuru ụwa ọnụ. A na-ekwusa akụkụ a dị mkpa nke ozi ọma Alaeze ahụ ugbu a n’ụwa nile.—Matiu 24:14.

10. Ruo ọtụtụ narị afọ, olee otú ndị mmadụ siworo meghachi omume na ndụmọdụ Jehova?

10 Ee, n’akụkọ ihe mere eme nile, Jehova emewo ka ndị nọ n’ụwa mara uche na nzube ya. Ihe ndekọ Bible na-enye nkọwa banyere ọtụtụ ndị bụ́ ndị gere ntị, tinye amamihe Chineke n’ọrụ, a gọziekwa ha n’ihi ya. Ọ na-ekwu banyere ndị ọzọ bụ́ ndị jụrụ ndụmọdụ ịhụnanya nke Chineke, na-agbaso ụzọ ndụ ịla n’iyi nke Adam na Iv gbasoro. Jisọs kọwara ọnọdụ a mgbe o kwuru banyere ụzọ abụọ bụ́ ihe atụ. Otu na-eduba n’ịla n’iyi. N’ịbụ nke dị obosara dịkwa mbara, ọtụtụ ndị na-ajụ Okwu Chineke na-esi na ya aga. Ụzọ nke ọzọ na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ezie na ọ dị mkpagide, ọ bụ ụzọ nke mmadụ ole na ole bụ́ ndị nakweere Bible dị ka Okwu Chineke, ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya.—Matiu 7:13, 14.

Inwe Ekele Maka Ihe Anyị Nwere

11. Gịnị ka ihe ọmụma anyị nwere banyere Bible na nkwere anyị kweere na ya bụ ihe àmà ya?

11 Ì so ná ndị ahụ họrọwooro ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ? Ọ bụrụ otú ahụ, obi abụọ adịghị ya na ị ga-achọ ịnọgide na ya. Olee otú ị pụrụ isi mee otú ahụ? Jiri obi ekele na-atụgharị uche mgbe nile ná ngọzi ndị ịmara eziokwu Bible wetaworo ná ndụ gị. Kpọmkwem eziokwu ahụ bụ́ na ị nakwerewo ozi ọma ahụ bụ ihe àmà nke ngọzi Chineke. Jisọs gosipụtara nke a mgbe o ji okwu ndị a kpegara Nna ya ekpere, sị: “Ekelee m Gị, Nna, Onye nwe eluigwe na ụwa, na I zonahụrụ ndị amamihe na ndị nwere nghọta ihe ndị a, I werekwa ha kpugheere ụmụ ọhụrụ.” (Matiu 11:25) Ndị ọkụ azụ̀ na ndị ọna ụtụ ghọtara isi ihe dị n’ozizi Jisọs, ebe ndị ndú okpukpe gụrụ oké akwụkwọ na-aghọtaghị ya. Jisọs kwukwara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” (Jọn 6:44) Ọ bụrụ na ị marawo Bible, kwerekwa ma na-agbaso ozizi ya, nke a bụ ihe àmà na Jehova adọwo gị. Ọ bụ ihe mere ị ga-eji ṅụrịa ọṅụ.

12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Bible si enye ihe ọmụma?

12 Okwu Chineke nwere eziokwu ndị na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ọ na-enyekwa ihe ọmụma. A na-eme ka ndị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọmụma Bible nwere onwe ha pụọ na nkwenkwe ụgha, ozizi ụgha, na amaghị nke a na-akọ bụ́ ihe ndị na-achịkwa ndụ ọtụtụ nde mmadụ. Dị ka ihe atụ, ịmara ihe bụ́ eziokwu banyere mkpụrụ obi na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ịtụ ụjọ ọ bụla na ndị nwụrụ anwụ pụrụ imerụ anyị ahụ ma ọ bụ na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ na-ata ahụhụ. (Ezikiel 18:4) Ịmara ihe bụ́ eziokwu banyere ndị mmụọ ọjọọ na-enyere anyị aka izere ihe ize ndụ dị iche iche nke mgbaasị. Ozizi nke mbilite n’ọnwụ na-akasi ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo obi. (Jọn 11:25) Amụma ndị dị na Bible na-egosi anyị ebe anyị nọ ná ngafe nke oge, na-emekwa ka anyị nwee obi ike ná nkwa ndị Chineke kwere maka ọdịnihu. Ha na-emekwa ka olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi sikwuo ike.

13. Olee otú ịṅa ntị n’Okwu Chineke si abara anyị uru n’ụzọ anụ ahụ?

13 Ụkpụrụ Chineke ndị dị na Bible na-akụziri anyị ibi ndụ n’ụzọ na-eweta abamuru n’ụzọ anụ ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị na-amụta izere omume ndị na-emerụ ahụ anyị, dị ka iji ụtaba na ọgwụ ndị ọzọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Anyị adịghị eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị. (2 Ndị Kọrint 7:1) Ịṅa ntị n’Iwu Chineke banyere omume bụ ihe nchebe pụọ n’ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. (1 Ndị Kọrint 6:18) Site n’ịgbaso ndụmọdụ Chineke nyere ka e zere ịhụ ego n’anya, anyị adịghị emebi udo nke uche anyị, dị ka ọtụtụ ndị meworo, n’ịchụso akụ̀ na ụba. (1 Timoti 6:10) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka i siworo rite uru n’ụzọ anụ ahụ n’ihi itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ gị?

14. Mmetụta dị aṅaa ka mmụọ nsọ na-enwe ná ndụ anyị?

14 Ọ bụrụ na anyị ebie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke, anyị na-enweta mmụọ nsọ Jehova. Anyị na-azụlite àgwà yiri nke Kraịst, bụ́ nke e ji àgwà ndị na-adọrọ adọrọ dị ka ebere na ọmịiko mara. (Ndị Efesọs 4:24, 32) Mmụọ Chineke na-amịpụtakwa mkpụrụ ya n’ime anyị—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè. (Ndị Galetia 5:22, 23) Àgwà ndị a na-eme ka anyị soro ndị ọzọ, gụnyere ndị òtù ezinụlọ anyị, na-enwe mmekọrịta obi ụtọ na nke kwesịrị ekwesị. Anyị na-enweta ume nke obi bụ́ nke na-enyere anyị aka iji obi ike na-eche ihe isi ike ihu. Ị̀ na-aghọta otú mmụọ nsọ siworo mee ka ndụ gị ka mma?

15. Olee otú anyị si erite uru ka anyị na-eme ka ndụ anyị kwekọọ n’uche Chineke?

15 Ka anyị na-eme ka ndụ anyị na-ekwekọ n’uche Chineke, anyị na-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike. Anyị na-ekwenyesikwu ike na ọ na-aghọta anyị ma hụ anyị n’anya. Anyị na-amụta site n’ahụmahụ na ọ na-akwado anyị n’oge ihe isi ike. (Abụ Ọma 18:18) Anyị na-aghọta na ọ na-ege ntị n’ekpere anyị n’ezie. (Abụ Ọma 65:2) Anyị na-abịa dabere ná nduzi ya, na-enwe obi ike na ọ ga-abara anyị uru. Anyị nwekwara olileanya dị ebube na mgbe oge ruru, Chineke ga-eme ka ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi zuo okè ma nye ha onyinye ya nke bụ́ ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 6:23) “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka Jemes onye na-eso ụzọ dere. (Jemes 4:8) Ì nwewo mmetụta na e mewo ka mmekọrịta gị na Jehova sikwuo ike ka ị bịaruworo ya nso?

Akụ̀ Na-enweghị Atụ

16. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ mere?

16 Pọl chetaara ndị Kraịst nke narị afọ mbụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na ụfọdụ n’ime ha nwere mgbe ha bụ ndị na-akwa iko, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-edina ụdị onwe ha, ndị ohi, ndị anyaukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ndị nkwutọ, na ndị na-apụnara mmadụ ihe. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Eziokwu Bible mere ka ha mee oké mgbanwe; a ‘sachara ha.’ Gbalịa ichetụ n’echiche ihe ndụ gị gaara adị ka ya ma e wezụga eziokwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ya nke ị mụtaworo na Bible. N’ezie, eziokwu ahụ bụ akụ̀ na-enwetụghị atụ. Lee obi ụtọ anyị na-enwe na Jehova na-enye anyị ihe ọmụma!

17. Olee otú e siworo zụọ Ndịàmà Jehova n’ụzọ ime mmụọ ná nzukọ ndị Kraịst?

17 Ọzọ, chee echiche banyere ngọzi ndị anyị nwere n’òtù ụmụnna anyị nke ọtụtụ agbụrụ mejupụtara! “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye anyị nri ime mmụọ n’oge ya, gụnyere Bible, magazin, na mbipụta ndị ọzọ n’ọtụtụ asụsụ. (Matiu 24:45-47) Ná nzukọ ndị e nwere n’ọgbakọ n’afọ 2000, Ndịàmà Jehova nọ n’ọtụtụ ala tụlere isi ihe ndị sitere n’akwụkwọ asatọ bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ha tụgharịrị uche ná ndụ nke mmadụ 40 a kọrọ akụkọ ha na Bible bụ́ ndị a tụlere n’Insight on the Scriptures. Ha tụlere ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ nakwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! Ha tụlere isiokwu 36 ndị ọzọ site na magazin Ụlọ Nche tụkwasị n’isiokwu 52 ndị dịịrị ọmụmụ. Ọzọkwa, e ji mbipụta Ozi Alaeze Anyị 12 na okwu ihu ọha a na-ekwu kwa izu bụ́ ndị dabeere n’isiokwu dịgasị iche iche dị na Bible, zụọ ndị Jehova. Lee ka e siworo nye anyị ihe ọmụma ime mmụọ n’ụba!

18. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si enyere anyị aka n’ọgbakọ ndị Kraịst?

18 N’ụwa nile, ihe karịrị ọgbakọ 91,000 na-enye nkwado na agbamume site ná nzukọ na mkpakọrịta. Anyị na-eritekwa uru site ná nkwado nke ndị Kraịst ibe anyị tozuru okè bụ́ ndị dị njikere inyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Efesọs 4:11-13) Ee, anyị eritewo uru dị ukwuu site n’ịnara ihe ọmụma nke eziokwu ahụ. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ịmara Jehova na ijere ya ozi. Lee otú okwu ọbụ abụ ahụ si bụrụ eziokwu, bụ́ onye dere, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”—Abụ Ọma 144:15.

Ị̀ Na-echeta?

• Ole ndị ka Jehova nyere ihe ọmụma tupu oge ndị Kraịst?

• Olee otú ìhè ime mmụọ siri gbukepụkwuo na narị afọ mbụ? n’oge a?

• Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịa site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ọmụma Jehova?

• N’ihi gịnị ka anyị ji na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ọmụma anyị nwere banyere Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Jehova mere ka Mosis, Noa, na Abraham mara uche ya

[Foto dị na peeji nke 9]

N’oge anyị, Jehova amụkwasịwo ìhè n’Okwu ya

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Chee echiche banyere ngọzi nke anyị nwere n’òtù ụmụnna anyị nke ndị sitere n’ọtụtụ agbụrụ!