Anyị Nwara Jehova
Akụkọ Ndụ
Anyị Nwara Jehova
DỊ KA PAUL SCRIBNER SI KỌỌ
“Ị̀ bọọla chi, Odozi Akụ Stackhouse? Ana m ebugharị achịcha ememe Ista n’ụtụtụ a, ejikwa m n’aka na ọ ga-amasị gị ịzụtara ezinụlọ gị otu.” Ọ bụ ná mmalite oge opupu ihe ubi nke 1938, anọkwa m n’Atco, New Jersey, U.S.A., na-agwa otu n’ime ndị kasị agba m aka ahịa n’ebe ndị m na-erere ụlọ ọrụ General Baking Company ahịa, okwu. N’ụzọ juru m anya, Odozi Akụ Stackhouse ekweghị.
“ECHEGHỊ m na ọ ga-amasị m,” ka o kwuru. “Anyị adịghị eme ememe Ista.”
Ugbu a, amaghị m ihe m ga-eche eche. Na ha adịghị eme ememe Ista? N’ezie, ụkpụrụ mbụ dị n’ire ahịa bụ na ọ dịghị mgbe ikpe na-ama onye na-azụ ihe. Ya mere, gịnị ka m ga-emezi? Ekwuru m, sị, “Achịcha a dị nnọọ mma, amakwaara m na achịcha anyị na-amasị gị. Í cheghị na ọ ga-amasị ezinụlọ gị ọbụna ma a sị na unu adịghị, eem, eme ememe Ista?”
“Echeghị m otú ahụ,” ka o kwughachiri, “ma, Maazị Scribner, ọ dị ihe m nọworo na-achọ ịgwa gị, nke a pụkwara ịbụ oge dị mma iji gwa gị ya.” Mkparịta ụka ahụ gaje ịgbanwe ndụ m kpam kpam! Odozi Akụ Stackhouse, bụ́ onye so na Kọmpịnị (ma ọ bụ, ọgbakọ) Berlin, New Jersey, nke Ndịàmà Jehova, kọwara ebe ememe Ista si malite ma nye m akwụkwọ nta atọ. Aha ha bụ Safety, Uncovered, na Protection. Eji m akwụkwọ nta ndị ahụ laa n’ebe obibi m, na-enwe ọchịchọ ịmata ihe dị na ha ma na-atụtụ ụjọ. Ọ dị ihe m maara banyere ihe Odozi Akụ Stackhouse kwuru, ihe m maara site n’oge m bụ nwata.
Nzute Mbụ M Zutere Ndị Mmụta Bible
A mụrụ m na January 31, 1907, na 1915 kwa, mgbe m dị afọ asatọ, ọrịa cancer gburu nna m. N’ihi ya, mụ na mama m jere soro ndị mụrụ
mama m biri n’otu nnukwu ụlọ dị na Malden, Massachusetts. Benjamin Ransom, bụ́ nwanne mama m nke nwoke, na nwunye ya bikwa ebe ahụ, n’okpukpu nke atọ. Tupu a banye na narị afọ nke 20, Deede Ben anọwo na-eso Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, na-akpakọrịta. Enwere m nnọọ mmasị n’ebe Deede Ben nọ, ma ndị ọzọ so n’ezinụlọ mama m, bụ́ ndị Metọdist, chere na ọ gbapụrụ iche. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, nwunye ya nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka e debe ya ruo nwa oge n’ebe a na-agwọ ndị isi mgbaka n’ihi nkwenkwe okpukpe ya, tupu nwunye ya emesịa gbaa ya alụkwaghịm! Ebe ọ bụ na ndị dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ chọpụtara ozugbo na isi dị Deede Ben mma, ha rịọrọ ya mgbaghara ma tọhapụ ya.Deede Ben na-akpọrọ m gaa nzukọ Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile dị na Boston, karịsịa mgbe e nwere ndị ọkà okwu si esi bịa ma ọ bụ ihe omume pụrụ iche. N’otu oge, onye ọkà okwu si esi bịa bụ Charles Taze Russell ahụ a ma ama, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa n’oge ahụ. N’oge ọzọ, ihe omume pụrụ iche e mere bụ igosi “Photo-Drama of Creation.” Ọ bụ ezie na nke ahụ mere na 1915, ruo taa, ana m echeta nke ọma ihe ngosi nke Abraham ka ọ kpọ Aịsak na-arịgo n’ugwu iji chụọ ya n’àjà. (Jenesis, isi 22) Aka m pụrụ ịhụ Abraham na Aịsak ka ha bu ùkwù nkụ na-arị ugwu ahụ, ka Abraham tụkwasịrị Jehova obi kpam kpam. Ebe ọ bụ na abụ m nwa na-enweghị nna, nke ahụ masịrị m nke ukwuu.
Mgbe e mesịrị, Deede Ben na nwunye ya kwagara Maine, mama m lụkwara di ọzọ ma kpọrọ anyị kwaga New Jersey. N’ihi ya, ahụghị m Deede Ben ruo ogologo oge. Mgbe m dị afọ iri na ụma na New Jersey, ezutere m Marion Neff, bụ́ otu n’ime ụmụaka asatọ a mụrụ n’otu ezinụlọ na-ekpe Presbyterian bụ́ ndị m na-enwe mmasị ileta. Ana m eji ọtụtụ uhuruchi Sunday anọnyere ezinụlọ ahụ na òtù ndị ntorobịa chọọchị ha nke na n’ikpeazụ, mụ onwe m ghọrọ onye Presbyterian. Ma, echefughị m ụfọdụ n’ime ihe ndị m mụtara ná nzukọ nke Ndị Mmụta Bible. Mụ na Marion lụrụ na 1928, a mụkwara ụmụ anyị nwanyị, bụ́ Doris na Louise, na 1935 nakwa na 1938. Ebe ọ bụ na anyị nwere obere nwa ma jirikwa nwa ọhụrụ, anyị abụọ hụrụ mkpa nduzi ime mmụọ dị n’ịzụlite ezinụlọ anyị.
Ịchọta Eziokwu n’Akwụkwọ Nta Ndị Ahụ
Mụ na Marion na-achọ chọọchị anyị ga na-aga, anyị chepụtakwara otu atụmatụ. Anyị bịara na-eme kwa Sunday, onye o ruuru n’ime anyị ya agaa chọọchị anyị na-atụ anya ịgawa, ebe onye nke ọzọ ga-eso ụmụ anyị nọrọ n’ụlọ. N’otu Sunday, ọ bụ Marion ka o ruuru ịnọ n’ụlọ, ma agwara m ya ka m nọrọ lekọta ụmụaka ka m wee nwee ike ịgụ akwụkwọ nta bụ́ Safety, bụ́ nke mbụ n’ime akwụkwọ nta atọ ahụ Odozi Akụ Stackhouse nyere m. Ozugbo m malitere ịgụ ya, apụghị m idoru ya ala! Abịara m kwenyesikwuo ike na achọtala m ihe ọ na-adịghị chọọchị pụrụ inye m ya. N’izu na-esonụ, otu ihe ahụ mekwara, ejikwa m aka m họrọ ịnọ lekọtawa ụmụaka ka m na-agụ akwụkwọ nta nke abụọ, bụ́ Uncovered. Ihe m na-agụ yitụrụ ihe m maara. Ọ̀ bụ ihe a ka Deede Ben kweere? Ezinụlọ anyị chere na okpukpe ya bụ nke iberibe. Gịnị ka Marion ga-eche? Ọ dịghị m mkpa ichegbuwe onwe m. Mgbe m
lọtara ọrụ ụbọchị ole na ole m gụsịrị Uncovered, Marion mere ihe tụrụ m n’anya site n’ịsị, “Agụrụ m akwụkwọ nta ndị ahụ i welatara. Ha dị mma n’ezie.” Nke ahụ nyere m ahụ efe!N’azụ akwụkwọ nta ndị ahụ, e nyere ihe ọmụma banyere akwụkwọ ahụ e wepụtara ọhụrụ bụ́ Enemies, bụ́ nke e ji kpughee okpukpe ụgha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Anyị kpebiri inweta ya. Otú ọ dị, tupu anyị esi na post ọfịs zipụ ozi ka e wetara anyị ya, otu Onyeàmà kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị ma nyefee anyị kpọmkwem akwụkwọ ahụ. Ebe ahụ ka okwu nọ bie! Anyị kwụsịrị ịdị na-aga chọọchị dị iche iche ma malite ịga nzukọ nke Kọmpịnị Camden, New Jersey, nke Ndịàmà Jehova. Nanị ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị, na Sunday, July 31, 1938, ìgwè nke ihe dị ka mmadụ 50 n’ime anyị zukọtara n’ala ahịhịa dị n’ụlọ Nwanna Nwanyị Stackhouse—n’ụlọ ahụ m nọbu na-anwa ire achịcha Ista—ma gee okwu baptism e kwunyere na teepu nke Judge Rutherford kwuru. Mgbe ahụ, anyị gbanwere uwe anyị n’ime ụlọ, e meekwa anyị mmadụ 19 baptism n’ọwa mmiri dị nso.
Ekpebisie M Ike Ịbụ Ọsụ Ụzọ
N’oge na-adịghị anya e mesịrị m baptism, otu n’ime ụmụnna nwanyị nọ na kọmpịnị ahụ gwara
m banyere ndị a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị ji ozi a na-eje maka ọha mere ọrụ ha bụ́ isi. Enwere m ọchịchọ ịmatakwu banyere ha ozugbo, n’oge na-adịghịkwa anya, abịara m mata otu ezinụlọ bụcha ndị ọsụ ụzọ. Otu agadi nwoke, bụ́ Nwanna Konig, nwunye ya, na nwa ha nwanyị toro eto bụcha ndị ọsụ ụzọ n’otu ọgbakọ dị nso. Dị ka nna nwere obere ụmụaka, ọṅụ dị ukwuu ezinụlọ Konig na-enwe n’ozi ahụ masịrị m. Ana m akwụsịkarị na nke ha, dọzie nnukwu ụgbọala m ji ere achịcha, ma soro ha jee ozi ụlọ n’ụlọ. N’oge na-adịghị anya, achọrọ m ịbụ ọsụ ụzọ n’onwe m. Ma olee otú m ga-esi abụ ya? Mụ na Marion nwere ụmụntakịrị abụọ, ọrụ m na-erikwa m oge dị ukwuu. N’ezie, ka Agha Ụwa nke Abụọ malitere na Europe, imerime ụmụ okorobịa abaakwa n’òtù ndị agha na United States, ọrụ bịara hie nne nke ukwuu nye anyị bụ́ ndị fọdụrụ n’ọrụ ndị nkịtị. A gbara m ume ịmụba ebe ndị m ga na-ebuga ngwa ahịa, amakwaara m na usoro ihe omume dị otú ahụ agatụghị ekwe m rụọ ọrụ ọsụ ụzọ.Mgbe m gwara Nwanna Konig banyere ọchịchọ m nwere ịsụ ụzọ, o kwuru, sị: “Nọgide nnọọ na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova, ma na-agwa ya ihe mgbaru ọsọ gị n’ekpere. Ọ ga-enyere gị aka iru ya.” Ruo ihe karịrị otu afọ, anọgidere m na-eme nnọọ nke ahụ. Ana m atụgharịkarị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Matiu 6:8, bụ́ nke na-emesi anyị obi ike na Jehova maara ihe ndị na-akpa anyị ọbụna tupu anyị arịọ ya ha. Anọgidekwara m na-agbalị ịgbaso ndụmọdụ dị na Matiu 6:33, ịnọgide na-ebu ụzọ achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. Nwanna Melvin Winchester, bụ́ ohu zoonu (nke a na-akpọzi onye nlekọta sekit), gbakwara m ume.
Agwara m Marion nzube m. Anyị kwurịtara banyere okwu ndị dị na Malakaị 3:10, bụ́ nke na-agba anyị ume ịnwa Jehova ma hụ ma ọ́ gaghị awụkwasị anyị ngọzi. Ihe ọ zaghachiri gbara m ume: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịsụ ụzọ, alala azụ n’ihi m. Apụrụ m ilekọta ụmụ anyị ka ị na-asụ ụzọ. E kwuwerị, ọtụtụ ihe onwunwe adịghị anyị mkpa.” Ka anyị bụworo di na nwunye ruo afọ 12, amarawo m rịị na Marion bụ odozi akụ̀ maara ka e si echekwa ihe ma na-akpachapụ anya. N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, ọ bụwo onye pụrụ iche mụ na ya sụkọrọ ụzọ, otu n’ime isi ihe ndị mere ka anyị nwee ihe ịga nke ọma n’ihe dị ka afọ 60 anyị jeworo ozi oge nile bụ afọ ojuju Marion na-enwe n’ihe ndị dị nta ma na-eme ka ha yie oké ihe.
Ka ọ na-erule oge okpomọkụ nke 1941, mgbe ọtụtụ ọnwa nke iji ekpere mee atụmatụ gasịrị, mụ na Marion echekwatatụla ego, anyị zụtakwara ụlọ ụgbọala na-adọkpụ nke dị mita 5.5, bụ́ nke ezinụlọ anyị pụrụ ibi n’ime ya. Akwụsịrị m ọrụ ego m ma ghọọ ọsụ ụzọ oge nile na July 1941, anọwokwa m n’ozi oge nile kemgbe ahụ. A na-agba bọs ugboro iri iji ruo ebe e kenyere m ọrụ na Route 50 nke dị n’agbata New Jersey na St. Louis, Missouri, bụ́ ebe anyị gaje inwe mgbakọ ná mmalite August. E ziteere m aha na adres ụmụnna bi n’ụzọ ahụ, ebukwa m ụzọ degara ha akwụkwọ, na-agwa ha mgbe ha ga-atụwa anya m. Anyị ruo n’ala mgbakọ ahụ, aga m achọta ngalaba na-ahụ maka ọrụ ịsụ ụzọ ka e kenye m ọrụ n’ebe ọzọ.
‘Agaje M Ịnwa Jehova’
Anyị kwajuru akwụkwọ n’ime ụlọ nta anyị ụgbọala na-adọkpụ ma gaa nzukọ nke ikpeazụ anyị gara na Camden iji sị ụmụnna nọrọ nke ọma. N’ịbụ ndị nwere ụmụntakịrị nwanyị abụọ anyị na-elekọta, n’amaghịkwa ebe anyị na-aga ma e wezụga mgbakọ ahụ, atụmatụ anyị aghaghị iyiwo ihe ezi uche na-adịghị na ya nye ụfọdụ n’ime ụmụnna ahụ, ọtụtụ n’ime ha kwukwara, sị: “Unu ga-alọghachi n’oge na-adịghị anya.” Ana m echeta na m kwuru, sị: “Adịghị m ekwu na m gaghị alọghachi. Jehova kwuru na ya ga-elekọta m, agajekwa m ịnwa Jehova.”
Ka anyị sụsịworo ụzọ ruo afọ 60 n’obodo 20 dị site na Massachusetts ruo Mississippi, anyị pụrụ ikwu na Jehova emezuwo nnọọ nkwa ya. Ngọzi ọ wụkwasịworo Marion, mụ onwe m, na ụmụ anyị nwanyị abụọ karịrị ihe ọ bụla m pụrụ ịtụwo anya ya laa azụ na 1941. Ha gụnyere ụmụ anyị ịbụ ndị na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọgbakọ ndị dị nso, na (n’ikpeazụ) inwe ihe dị ka otu narị ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom ime mmụọ n’ebe nile n’Ụsọ Oké Osimiri nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ United States. Eduziworo m mmadụ 52 bụ́ ndị rarawooro ndụ ha
nye Jehova Chineke ọmụmụ ihe, Marion eduziwokwara mmadụ 48.N’August 1941, anyị ruru St. Louis, n’ebe ahụkwa, ezutere m Nwanna T. J. Sullivan nke si Betel. O ji akwụkwọ ozi e ji họpụta m dị ka onye ozi, bụ́ nke dị mkpa n’ihi agha na-achọ ịda na mmanye a gaje ịmanye ndị mmadụ ịga agha. Agwara m Nwanna Sullivan na nwunye m na-etinye oge haruru ka nke m n’ozi nakwa na ọ ga-enwe mmasị iso m na-asụ ụzọ. Ọ bụ ezie na a ka-eguzobeghị ngalaba na-ahụ maka ọrụ ịsụ ụzọ ná mgbakọ ahụ, Nwanna Sullivan debara aha Marion n’akwụkwọ ozugbo dị ka onye ọsụ ụzọ ma jụọ anyị, sị: “Ebee ka unu na-aga ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ma e mechie mgbakọ a?” Anyị amaghị. “Ọ dị mma, unu enyela onwe unu nsogbu,” ka o kwuru: “Ná mgbakọ a, unu ga-ahụ onye si n’ógbè e nwere mkpa maka ndị ọsụ ụzọ, ihe ga-agazikwa. Nanị detaranụ anyị akwụkwọ ma gwa anyị ebe unu nọ, anyị ga-ekenyekwa unu ọrụ.” Otú ahụ ka o mere. Ọ bịara daba na Nwanna Jack DeWitt, onye bụ́bu ohu zoonu, maara ụfọdụ ndị nọ na New Market, Virginia, bụ́ ndị nwere ebe obibi ndị ọsụ ụzọ bụ́ ebe a chọkwuru ndị ọsụ ụzọ ole na ole. Ya mere, mgbe e mechiri mgbakọ ahụ, anyị jere New Market.
Na New Market, anyị hụrụ ihe anyị na-atụghị anya ya na-enye ọṅụ. Ònye ga-esi Philadelphia gbadata iji sonyere anyị n’ọrụ ịsụ ụzọ ma ọ́ bụghị Benjamin Ransom! Ee, Deede Ben. Lee ihe ọṅụ ọ bụ iso ya rụkọọ ọrụ n’ozi ụlọ n’ụlọ mgbe ihe karịrị afọ 25 gasịrị kemgbe ọ kụnyesịrị mkpụrụ nke eziokwu n’obi m mgbe m nọ na Boston! N’agbanyeghị na Deede Ben chere enweghị mmasị, ịkwa emo, na ọbụna mkpagbu ihu site n’aka ndị ezinụlọ ya ruo ọtụtụ afọ, ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe ozi ahụ dị akwụsịghị ma ọlị.
Anyị nọrọ ọnwa asatọ n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ ahụ dị na New Market. N’oge ahụ, tinyere ihe ndị ọzọ, anyị mụtara otú e si eji akwụkwọ agbanwere ọkụkọ na àkwá. Mgbe ahụ, e kenyere Deede Ben, Marion, na mụ onwe m, tinyere mmadụ atọ ọzọ, ọrụ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Hanover, Pennsylvania—nke mbụ n’ime ebe isii a ga-ekenye anyị ọrụ na Pennsylvania site na 1942 ruo 1945.
Ndị Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche n’Oge Agha Ụwa nke Abụọ
N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e nwere mgbe e busoro anyị iro n’ihi nnọpụiche anyị, ma ọ dịtụbeghị mgbe Jehova hapụrụ ịkwado anyị. N’otu oge na Provincetown, Massachusetts, ụgbọala Buick ochie anyị mebiri, ejikwa m ụkwụ si n’ógbè ndị Katọlik dị obi ọjọọ bi gaa ije ruo ọtụtụ kilomita iji mee nletaghachi. Agafere m ìgwè ndị agamevu na-eto eto bụ́ ndị matara m ma malite iti mkpu. Eji m ọsọ na-aga ka m na-anụ ụda nkume a na-atụ m, na-enwe olileanya na ndị ntorobịa ahụ adịghị achụ m. Erutere m n’ụlọ onye ahụ nwere mmasị n’emerụghị ahụ. Ma onye ahụ nwe ụlọ, bụ́ onye a ma ama n’Usuu Ndị Agha America, rịọrọ m mgbaghara, na-asị: “Mụ na gị apụghị ịnọkọrịta n’abalị a n’ihi na echefuru m na anyị na-aga ikiri sịnịma n’ebe ndịda.” Obi mapụrụ m ka m chetara ìgwè ndị ahụ na-atụ m nkume bụ́ ndị nọ n’akụkụ ụzọ na-eche ka m lọghachi. Otú ọ dị, obi tọrọ m ụtọ mgbe nwa amadị ahụ gbakwụnyere, sị: “Gịnị ma anyị na gị soro na-aga? Anyị pụrụ ikwurịta okwu n’ụzọ.” N’ihi ya, agbaara m ya àmà, agafekwara m n’ebe ahụ nsogbu dị.
Ime Ka Ezinụlọ na Ozi M Nọrọ n’Ọnọdụ Kwesịrị Ekwesị
Mgbe agha biri, e kenyere anyị ọtụtụ ọrụ na Virginia, gụnyere ịnọ afọ asatọ dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị nke oge nile na Charlottesville. Ka ọ na-erule 1956, ụmụ anyị etoola ma lụọ di, mụ na Marion gakwara n’ihu ọzọ, na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ na Harrisonburg, Virginia, nakwa dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Lincolnton, North Carolina.
Na 1966, e kenyere m ọrụ sekit, esi m n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ, na-agbakwa ụmụnna ume, dị nnọọ ka Nwanna Winchester gbara m ume mgbe m nọ na New Jersey n’afọ ndị 1930. Ruo afọ abụọ, ejere m ozi na sekit nke ọgbakọ ndị dị na Tennessee. E mesịa, a gwara mụ na Marion ka anyị laghachi n’ọrụ kasị amasị anyị, nke bụ́ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Site na 1968 ruo 1977, anyị jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ndịda United States, site na Georgia ruo Mississippi.
Na Eastman, Georgia, e kenyere m ọrụ dị ka Ilu 3:5, 6 gbatara m n’uche: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” Site n’ịrụsi ọrụ ike iji mee ka a na-enwe nkwurịta okwu, anyị mere ka ọgbakọ ahụ dị n’otu, mmadụ nile ritekwara uru na ya.
onye nlekọta ọgbakọ (nke a na-akpọzi onyeisi oche ndị nlekọta) ịnọchi anya Powell Kirkland, bụ́ nwanna nwoke anyị hụrụ n’anya meworo agadi, bụ́ onye jere ozi ruo ọtụtụ afọ dị ka onye nlekọta sekit ma bụrụ onye ahụ na-esichaghị ike. N’ụzọ magburu onwe ya, ọ na-enwe ekele ma na-enye nkwado. Nkwado ya dị oké mkpa n’ihi na e nwetụrụ esemokwu n’ọgbakọ ahụ, o metụtakwara mmadụ ole na ole a ma ama. Esemokwu ahụ bịara dị oké njọ, ejikwa m oge dị ukwuu kpekuo Jehova ekpere. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị kaKa ọ na-erule 1977, anyị akatatụwala ahụ, e kenyeghachikwara anyị ọrụ n’ógbè Charlottesville, bụ́ ebe ụmụ anyị nwanyị na ezinụlọ ha bi. N’ime afọ 23 gara aga, ọ bụworo anyị ihe ọṅụ ịrụ ọrụ n’ógbè a, inye aka guzobe ọgbakọ dị na Ruckersville, Virginia na ịhụ ụmụ na ụmụ ụmụ nke ndị mbụ anyị mụụrụ Bible ka ha tolitere ghọọ ndị okenye ọgbakọ, ndị ọsụ ụzọ, na ndị Betel. Mụ na Marion ka nọgidere na-ekere òkè dị mma n’ozi ubi, enwekwara m ihe ùgwù nke ịbụ onye na-arụsi ọrụ ike dị ka okenye n’Ọgbakọ East nke
dị na Charlottesville, na-eduzi ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ, na-ekwukwa okwu ihu ọha.Anyị enwewo nsogbu dị iche iche n’afọ ndị gafeworonụ dị ka onye ọ bụla na-enwe. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị mgbalị ndị anyị mere, Doris dara mbà n’ụzọ ime mmụọ ruo oge ụfọdụ n’oge ọ nọ ná ngwụsị afọ ndị iri na ụma ya ma lụọ nwoke na-abụghị Onyeàmà. Ma ọ dịbeghị mgbe ọ kwụsịrị ịhụ Jehova n’anya kpam kpam, nwa ya nwoke bụ́ Bill anọwokwa na-eje ozi ruo afọ 15 na Betel dị na Wallkill, New York. Doris na Louise bụzi ndị inyom di ha nwụrụ, ma ha ji ọṅụ na-eje ozi n’ebe dị nso dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile.
Ihe Ndị M Mụtara n’Afọ Ndị Gafeworonụ
Amụtawo m itinye ụkpụrụ ole na ole dị mfe n’ọrụ bụ́ ndị na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma n’ijere Jehova ozi: Mee ka ndụ gị dị mfe. Bụrụ onye nlereanya n’ihe nile ị na-eme, gụnyere n’ihe ndị ị na-eme nanị gị. Tinye ntụziaka nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’ọrụ n’ihe nile.—Matiu 24:45.
Marion atụpụtawo aro ndị dị mkpirikpi ma dị irè bụ́ ndị na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma n’ịsụ ụzọ ka a na-azụlite ụmụ: Nwee usoro ihe omume dị irè ma gbasoo ya. Mee ka ozi ịsụ ụzọ gị bụrụ ọrụ i ji kpọrọ ihe. Nọgide na-eri nri na-edozi ahụ. Na-ezu ike nke ọma. Enwebigala ntụrụndụ ókè. Mee ka eziokwu ahụ, gụnyere akụkụ nile nke ozi ahụ, bụrụ ihe na-atọ ụmụ gị ụtọ ná ndụ. Mee ka ozi ahụ bụrụ ihe na-amasị ha mgbe nile.
Ugbu a, anyị nọ n’afọ ndị 90 anyị. Afọ 62 agafeela kemgbe anyị nụrụ okwu baptism anyị n’ala ahịhịa dị n’ebe obibi Stackhouse, anyị ejiwokwa afọ 60 jee ozi oge nile. Mụ na Marion pụrụ iji obi eziokwu kwuo na ọnọdụ anyị ná ndụ na-enye anyị afọ ojuju n’ụzọ zuru ezu ma mie emie. Enwere m ekele dị ukwuu maka agbamume m nwetara mgbe m bụ nna nwere obere ụmụaka bụ́ ibute ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ụzọ na ịnọgide na-arụ ọrụ iji ruo ha, enwekwara m ekele n’ebe nwunye m hụrụ n’anya, bụ́ Marion, na ụmụ anyị nwanyị nọ maka nkwado ha nyere m n’afọ ndị gafeworonụ. Ọ bụ ezie na anyị abaghị ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe, ana m ejikarị Eklisiastis 2:25 eme ihe banyere onwe m: “Ònye na-eri ihe, ma ọ bụ ònye [na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, NW] karịa m?”
N’ezie, n’ọnọdụ anyị, Jehova emezuwo nkwa ya dị na Malakaị 3:10 n’ụzọ bara nnọọ ụba. N’ezie, ọ ‘wụsawo anyị ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ na-ezughị ịnagide ya’!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]
IHE ANYỊ CHETARA MERE N’AFỌ NDỊ AHỤ A LỤRỤ AGHA
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 agha biri, ezinụlọ anyị dum chetara nke ọma ihe ndị mere n’afọ ndị ahụ.
“Pennsylvania na-ajụbiga oyi ókè,” ka Doris na-echeta. “N’otu abalị, ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ya ji 35 degree Celsius dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ mkpụkọta.” Louise na-agbakwụnye, sị, “Mụ na Doris na-anọdụ ala n’ụkwụ ibe anyị n’azụ ụgbọala Buick ochie anyị iji mee ka oyi ghara ịtụ anyị n’ụkwụ.”
“Ma, ọ dịghị mgbe anyị nwere mmetụta ịbụ ndị ogbenye ma ọ bụ ndị a napụrụ ihe,” ka Doris na-ekwu. “Anyị maara na anyị na-agagharị agagharị karịa ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ, ma anyị na-eriju afọ mgbe nile, anyị nwekwara uwe ndị mara mma ma dịtụ ọhụrụ bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ndị enyi anyị nọ n’Ohio, bụ́ ndị nwere ụmụ nwanyị ndị tọtụrụ anyị, na-achịnye anyị.”
“Mama m na papa m na-eme mgbe nile ka anyị nwee mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ndị e ji kpọrọ ihe,” ka Louise na-ekwu, “anyị na-etinyekwa oge dị ukwuu n’iso ha gaa ozi. O mere ka ọ dị anyị ka anyị pụrụ iche, anyị na ha kpachikwara anya.”
“Enwere m ụgbọala Buick Special nke 1936,” ka Paul na-echeta, “axle ụdị ụgbọala ndị ahụ na-emebikarịkwa ngwa ngwa. Echere m na injin ya dị nnọọ ike karịa akụkụ ndị ọzọ nke ụgbọala ahụ. O yiri ka ọ na-emebikarị n’abalị ndị oyi kasị atụ n’ọnwa, mgbe ahụkwa, ana m aga n’ebe a na-agbahapụ ụgbọala iji nweta axle ọzọ. Abịara m ghọọ aka ochie n’ịgbanwe ha.”
“Echefula kaadị ndị ahụ e ji eke òkè,” ka Marion na-ekwu. “E kere ihe nile n’òkè n’òkè—anụ, mmanụ ụgbọala, taya ụgbọala, ihe nile. Oge ọ bụla anyị garuru n’ebe e kenyere anyị ọrụ ọhụrụ, anyị aghaghị ịga n’ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo ma tinye akwụkwọ maka kaadị e ji eke ihe. Ọ pụrụ iwe ọtụtụ ọnwa iji nweta otu, ọ na-eyikwa ka ọ bụ mgbe ọ bụla anyị mesịrị nweta kaadị anyị ka a ga-ekenye anyị ọrụ n’ebe ọzọ, anyị aghaghị ịmalitekwa n’isi. Ma Jehova lekọtara anyị mgbe nile.”
[Foto]
Mụ na Marion nakwa Doris (n’aka ekpe) na Louise, 2000
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na nne m na 1918, mgbe m dị afọ 11
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na Louise, Marion, na Doris na 1948 mgbe e mere ụmụ anyị baptism
[Foto dị na peeji nke 26]
Foto agbamakwụkwọ anyị, October 1928
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na ụmụ m (n’isi isi aka ekpe na n’isi isi aka nri) n’Ámá Egwuregwu Yankee, 1955