Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwela Ka Inwe Obi Abụọ Bibie Okwukwe Gị

Ekwela Ka Inwe Obi Abụọ Bibie Okwukwe Gị

Ekwela Ka Inwe Obi Abụọ Bibie Okwukwe Gị

Otu ụbọchị, i chee na ahụ gbasiri gị ike. N’echi ya, ị malite ịrịa ọrịa. Na mberede, i nweghịzi ike ma ọ bụ ume. Isi na-awa gị, ahụ na-egbukwa gị mgbu. Gịnị meworo? Ụmụ nje dị ize ndụ abanyewo n’ahụ gị ma mee ka usoro ahụ gị ji alụso ọrịa ọgụ ghara ịdị ike, ọ wakpowokwa akụkụ ahụ gị ndị dị oké mkpa. Ọ bụrụ na a hapụ ya n’agwọghị ya agwọ, ụmụ nje ndị a na-awakpo ahụ pụrụ ibibi ahụ ike gị n’ụzọ na-adịgide adịgide—ọbụna gbuo gị.

N’EZIE, ọ bụrụ na i nweghị ezi ahụ ike tupu i bute ọrịa, ị nọ n’ihe ize ndụ ọbụna karị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ahụ adịghị gị ike n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ, ikike ahụ gị nwere ịlụso ọrịa ọgụ “na-adị nnọọ ala nke na ọrịa kasị ntakịrị pụrụ igbu gị,” ka onye na-ede banyere ahụ ike bụ́ Peter Wingate, na-ekwu.

Ọ bụrụ otú ahụ, ònye ga-ahọrọ ịkwụwa onwe ya agụụ? O yikarịrị ka ị ga-eme ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji na-eri nri nke ọma ma nọgide na-enwe ezi ahụ ike. Eleghịkwa anya ị na-eme ihe nile ị pụrụ ime iji zere ibute ọrịa nke nje virus ma ọ bụ nje bacteria na-akpata. Otú ọ dị, ị̀ na-akpachara anya otú ahụ mgbe a bịara n’ịnọgide ‘na-enwe ezi ndụ n’ime okwukwe’? (Taịtọs 2:2) Dị ka ihe atụ, ị̀ nọ na nche megide ihe ize ndụ dị n’obi abụọ na-eji nwayọọ nwayọọ amalite? Ọ pụrụ ịwakpo uche na obi gị n’ụzọ dị nnọọ mfe, na-emebi okwukwe gị na mmekọrịta gị na Jehova. O yiri ka ụfọdụ ndị amaghị banyere ihe ize ndụ a. Ha na-ekpughepụ onwe ha nye obi abụọ site n’ịkwụwa onwe ha agụụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ̀ pụrụ ikwe omume na ị pụrụ ịdị na-eme otú ahụ?

Inwe Obi Abụọ—Ọ̀ Dị Njọ Mgbe Nile?

N’ezie, ọ bụghị obi abụọ nile dị njọ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ịgharagodị ikwere ihe ụfọdụ ruo mgbe i jidere ihe ndị bụ́ eziokwu n’aka. Agbamume okpukpe na-enye nke na-enye echiche na i kwesịrị nnọọ ikwere ma ghara inwe obi abụọ n’ihe ọ bụla, bụ ihe dị ize ndụ ma na-eduhie eduhie. N’eziokwu, Bible na-ekwu na ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) N’ezie, onye Kraịst na-ahụ n’anya na-adị njikere ikwere ihe ndị gosipụtaworo onwe ha n’oge gara aga dị ka ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, kwuru. Ma, Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị megide ‘ikwere okwu nile ọ bụla.’ (Ilu 14:15) Mgbe ụfọdụ, ihe mmadụ mere n’oge gara aga na-enye ezi ihe mere a ga-eji nwee obi abụọ n’ebe ọ nọ. “Mgbe olu [onye na-ekwu okwu nduhie] na-ekwu okwu amara,” ka Bible na-adọ aka ná ntị, “ekwela ya.”—Ilu 26:24, 25.

Jọn onyeozi dọkwara ndị Kraịst aka ná ntị megide ikwere ihe n’ajụghị ase. “Unu ekwela okwu mmụọ nile,” ka ọ na-ede. Kama nke ahụ, “nwapụtanụ [okwu] ndị mmụọ ahụ, ma hà bụ ndị siri na Chineke pụta.” (1 Jọn 4:1) “Okwu,” bụ́ ozizi ma ọ bụ echiche, pụrụ iyi ka o si na Chineke. Ma, ò si n’ebe ọ nọ n’ezie? Inwetụ obi abụọ ma ọ bụ ịgharagodị ikwere pụrụ ịbụ ezi ihe nchebe n’ihi na, dị ka Jọn onyeozi na-ekwu, “ọtụtụ ndị nduhie apụwo baa n’ime ụwa.”—2 Jọn 7.

Obi Abụọ Na-enweghị Isi

Ee, iji ezi obi na obi umeala enyocha ihe ndị a nụrụ iji mata nke bụ́ eziokwu na-adịkarị mkpa. Otú ọ dị, ya na ikwe ka obi abụọ na-enweghị isi na nke na-ebibi ihe bilite n’uche na n’obi anyị abụghị otu ihe—obi abụọ nke pụrụ ibibi nkwenkwe na mmekọrịta ndị siri ike anyị nwere. A kọwara obi abụọ a dị ka “inwe mgbagwoju anya banyere ihe e kweere ma ọ bụ echiche e nwere, bụ́ nke na-emetụtakarị ime mkpebi.” Ì chetara otú Setan si jiri inwe obi abụọ banyere Jehova merụọ uche Iv? “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” ka ọ jụrụ. (Jenesis 3:1) Mgbagwoju anya ajụjụ ahụ mere ka Iv nwee, bụ́ ajụjụ dara ka a ga-asị na o nweghị ihe ọjọọ onye jụrụ ya bu n’obi, metụtara mkpebi o mere. Nke ahụ bụ ihe e ji amakarị ụzọ Setan si eme ihe. Dị ka onye na-ede akwụkwọ ozi iji kwutọọ mmadụ, ọ bụ ọkà n’iji aghụghọ, okwu na-abụchaghị eziokwu, na ụgha eme ihe. Setan ejiriwo obi abụọ ji nwayọọ nwayọọ amalite bụ́ nke a kụnyere n’ụzọ dị otú ahụ bibie imerime ezi mmekọrịta ndị a pụrụ ịtụkwasị obi.—Ndị Galetia 5:7-9.

Jemes onye na-eso ụzọ ghọtara n’ụzọ doro anya mmetụta na-ebibi ihe nke ụdị obi abụọ a pụrụ inwe. O dere banyere ihe ùgwù magburu onwe ya anyị nwere nke ijekwuru Chineke maka enyemaka n’oge ule n’enweghị ihe mgbochi. Ma, ka Jemes na-adọ aka ná ntị, mgbe ị na-ekpeku Chineke ekpere, “rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ.” Inwe obi abụọ ná mmekọrịta anyị na Chineke na-eme ka anyị ‘yie ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, na-atụlikwa ya elu.’ Anyị na-adị ka “nwoke nwere uche abụọ, onye na-adịghị eguzo n’otu ebe n’ụzọ ya nile.” (Jemes 1:6, 8) Anyị na-amalite inwe mgbagwoju anya banyere ihe e kweere, nke na-egbochi anyị ime mkpebi. Mgbe ahụ, dị ka o mere Iv, anyị na-aghọ ndị e kpughepụrụ nye ụdị nile nke ozizi na nkà ihe ọmụma ndị mmụọ ọjọọ.

Ịnọgide Na-enwe Ezi Ahụ Ike Ime Mmụọ

Oleezi otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị pụọ n’obi abụọ ndị pụrụ ibibi ihe? Azịza ya dị nnọọ mfe: site n’iguzogidesi okwu nduhie nke Setan ike na iji ndokwa nile Chineke mere iji mee ka anyị “dị ike n’okwukwe” na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu.—1 Pita 5:8-10.

Nke kasị mkpa bụ inyeju onwe anyị nri ime mmụọ afọ. Onye edemede ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite, bụ́ Wingate, na-akọwa, sị: “Ọbụna mgbe ahụ mmadụ na-ezu ike, ọ chọrọ ịnọgide na-enweta ume ọrụ maka usoro ịrụ ọrụ nke mmiri ọgwụ nakwa maka ọrụ nke akụkụ ya ndị dị oké mkpa na-arụ; ihe ndị mejupụtara ọtụtụ uru ahụ na-achọkwa ịbụ ndị a na-agbanwe mgbe nile.” Otú ahụ ka ọ dị ahụ ike ime mmụọ anyị. Ọ bụrụ na anyị adịghị erichi nri ime mmụọ anya, okwukwe anyị, dị ka ahụ nke a na-adịghị enye nri, ga anọgide na-ajụ oyi ma mesịakwa nwụọ. Jisọs Kraịst mesiri nke a ike mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.”—Matiu 4:4.

Chee echiche banyere nke ahụ. Oleedị otú anyị si wulite okwukwe siri ike ná mmalite? “Okwukwe si n’ọnụnụ pụta,” ka Pọl onyeozi na-ede. (Ndị Rom 10:17) O bu n’uche na na mbụ, anyị wulitere okwukwe na obi ike anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe nkwa ya na nzukọ ya dị site n’iji Okwu Chineke na-azụ onwe anyị. N’ezie, anyị ekwereghị nnọọ ihe nile anyị nụrụ n’ajụghị ase. Anyị mere ihe ndị bi n’obodo Beria mere. Anyị ‘ji nlezianya nyochaa akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị iji hụ ma ihe ndị a ha dị otú ahụ.’ (Ọrụ 17:11) Anyị ‘nwapụtaara onwe anyị ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè’ ma jide n’aka na ihe anyị nụrụ bụ eziokwu. (Ndị Rom 12:2; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Kemgbe ahụ, o yiri ka anyị emewo ka okwukwe anyị sikwuo ike ka anyị bịaworo hụ n’ụzọ doro anya karị na Okwu Chineke na nkwa ya adịghị ada ada ma ọlị.—Joshua 23:14; Aịsaịa 55:10, 11.

Zere Ịnọ Agụụ n’Ụzọ Ime Mmụọ

Ugbu a, ihe ịma aka dịnụ bụ ịnọgide na-enwe okwukwe na izere inwe mgbagwoju anya banyere ihe anyị kweere bụ́ nke pụrụ ibelata obi ike anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe nzukọ ya dị. Iji mee nke a, anyị aghaghị ịnọgide na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị. Pọl onyeozi na-adọ aka ná ntị na “n’oge ikpeazụ ụfọdụ [bụ́ ndị pụrụ iyi na mbụ ka ha nwere okwukwe siri ike] ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị [okwu] ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Okwu na ozizi ndị a na-eduhie eduhie na-akụnye obi abụọ n’obi ụfọdụ ndị ma na-adọpụ ha n’ebe Chineke nọ. Gịnị ga-echebe anyị? Ọ bụ ịnọgide bụrụ ndị ‘e ji okwu nile nke okwukwe, na nke ozizi ọma ahụ nke anyị sooro n’ụkwụ n’ụkwụ, na-azụpụta.’—1 Timoti 4:6.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị taa ahọrọwo ịghara ịbụ ndị ‘e ji okwu nile nke okwukwe na-azụpụta’—ọbụna mgbe ọzụzụ dị otú ahụ bụ n’efu. Dị ka otu n’ime ndị dere akwụkwọ Ilu na-egosi, o kwere omume mmadụ ịbụ onye ezigbo ihe oriri ime mmụọ gbara gburugburu, oké oriri ime mmụọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma onye ahụ aghara iri na ịgbari ihe oriri ahụ n’ezie.—Ilu 19:24; 26:15.

Nke a dị ize ndụ. Onye edemede bụ́ Wingate na-ekwu, sị: “Ozugbo ahụ mmadụ malitere iri protein ya, ahụ ike onye ahụ ga-amalite ịdị njọ.” Mgbe ị nọrọ agụụ, ahụ gị ga-amalite iji nri ndị o chekwara n’akụkụ ahụ nile na-eme ihe. Mgbe nri ndị a gwụrụ, ahụ gị ga-amalite iri protein ya bụ́ nke dị oké mkpa maka ịnọgide na-eto ma na-agbanwe uru ahụ. Ike ga-amalite ịgwụ akụkụ ahụ ndị dị oké mkpa. Mgbe ahụ, ahụ ike gị ga-adị njọ ngwa ngwa.

Nke ahụ bụ ihe mere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ n’ụzọ ime mmụọ. Ha gbalịrị iri ihe ime mmụọ ndị ha chekwara echekwa. Ma eleghị anya, ha leghaara ọmụmụ ihe onwe onye anya, ha ghọkwara ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Hibru 5:12) Pọl onyeozi kọwara ihe ize ndụ dị n’ime nke a mgbe o degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ, sị: “Anyị aghaghị ịṅabiga ntị ókè karị n’ihe a nụrụ, ka a ghara ibupụ anyị n’ebe ha dị ma eleghị anya, dị ka mmiri na-ebupụ ụgbọ.” Ọ maara otú ọ ga-esi dị mfe ịdaba n’àgwà ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị ‘elefuru oké nzọpụta dị otú a anya.’—Ndị Hibru 2:1, 3.

Ọ dị mma ịmara na onye na-adịghị eri nri na-edozi ahụ adịghị eyikebe onye na-arịa ọrịa ma ọ bụ onye tara ahụ. N’otu aka ahụ, ọ pụghị ịpụta ìhè ozugbo na mmadụ nọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ. Ị pụrụ iyi onye ahụ dị n’ụzọ ime mmụọ ọbụna mgbe ị na-adịghị eri nri n’ụzọ kwesịrị ekwesị—ma, ọ bụ nanị ruo nwa oge! Ị ga-aghọrịrị onye na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ, onye na-enwekarị obi abụọ na-enweghị isi, gharakwa inwe ike ịgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ. (Jud 3) Ị maara—ọ bụrụgodị na ọ dịghị onye ọzọ maaranụ—kpọmkwem otú i si eri nri n’ụzọ ime mmụọ.

N’ihi ya, nọgide na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye gị. Lụsosie obi abụọ ọgụ ike. Ileghara ihe yiri obere ọrịa anya, ịghara ime ihe banyere obi abụọ nke na-enye gị nsogbu, pụrụ ịkpata ọdachi. (2 Ndị Kọrint 11:3) ‘Ànyị na-ebi na mgbe ikpeazụ n’ezie? Ị̀ pụrụ ikwere ihe nile Bible na-ekwu? Nke a ọ̀ bụ nzukọ Jehova n’ezie?’ Ọ ga-amasị Setan ịkụnye obi abụọ dị ka ndị a n’uche gị. Ekwela ka àgwà ejighị ihe kpọrọ ihe n’ihe banyere iri nri ime mmụọ mee ka ị bụrụ onye ozizi ya na-eduhie eduhie ga-enweta n’ụzọ dị mfe. (Ndị Kọlọsi 2:4-7) Gbasoo ndụmọdụ e nyere Timoti. Bụrụ onye na-amụ “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ” nke ọma, ka i wee nwee ike ‘ịnọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha.’—2 Timoti 3:13-15.

Enyemaka pụrụ ịdị gị mkpa iji mee nke a. Onye edemede ahụ a kpọtụrụ aha n’elu gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe ị nọrọ agụụ nke ukwuu, akụkụ ahụ gị ndị na-agbari nri ga-enwe mmerụ ahụ n’ụzọ dị ukwuu n’ihi enweghị vitamin na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa nke na ha apụghịzi ịnabata nri ndị a na-erikarị. Ruo oge ụfọdụ, ndị nọ n’ọnọdụ a pụrụ ịchọ nri ndị na-agbari ngwa ngwa.” A chọrọ nlekọta pụrụ iche iji gwọta nsogbu nke ịnọ agụụ na-akpata n’ahụ. N’otu aka ahụ, onye leghaara ọmụmụ Bible onwe onye ya anya n’ụzọ dị ukwuu pụrụ ịbụ onye enyemaka na agbamume dị ukwuu dị mkpa iji mee ka agụụ nri ime mmụọ maliteghachi ịgụ ya. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ, chọọ enyemaka ma jiri obi ụtọ nakwere enyemaka ọ bụla e nyere gị iji wuliteghachi ahụ ike na ume ime mmụọ gị.—Jemes 5:14, 15.

Ejila ‘Ekweghị Ekwe Enwe Obi Abụọ’

N’ịtụle ọnọdụ nke nna ochie bụ́ Abraham, ụfọdụ pụrụ iche na Abraham nwere ezi ihe mere ọ ga-eji nwee obi abụọ. Ọ pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ‘ọ gafewo oge ọ ga-enwewe olileanya nke ịghọ nna nke ọtụtụ mba’—n’agbanyeghị nkwa Chineke. N’ihi gịnị? A bịa kpọmkwem n’otú mmadụ si ele ihe anya, ọ dịghị ka o nwere ezi ihe ga-emenụ. ‘Ọ tụgharịrị uche n’ahụ nke onwe ya nke nwụwororị anwụ, nakwa n’akpa nwa Sera bụ́ nke nwụrụ anwụ,’ ka ihe ndekọ Bible na-ekwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ jụwara isi ikwe ka inwe obi abụọ banyere Chineke na nkwa ya gbanye mkpọrọgwụ n’uche na n’obi ya. Pọl onyeozi na-ede, sị: “E meghị ya ka ọ ghara ịdị ike n’okwukwe ya,” ma ọ bụ ‘ka o jiri ekweghị ekwe nwee obi abụọ.’ Abraham nọgidere “na-ekwezukwa na ihe [Chineke] kwererịị ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.” (Ndị Rom 4:18-21) O sorowo Jehova nwee mmekọrịta onwe onye chiri anya na nke a pụrụ ịtụkwasị obi kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ jụrụ inwe obi abụọ ọ bụla nke pụrụ ime ka mmekọrịta ahụ gharakwa ichi anya.

Ị pụrụ ime otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na i “jide ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ”—ọ bụrụ na ị na-enyeju onwe gị afọ n’ụzọ ime mmụọ. (2 Timoti 1:13) Eledala ihe ize ndụ nke inwe obi abụọ anya. N’ụzọ ime mmụọ, Setan na-alụ agha a pụrụ ịkpọ agha nje bacteria. Ọ bụrụ na i leghara iri ezigbo nri ime mmụọ anya site n’inwe ọmụmụ Bible onwe onye na ịga nzukọ ndị Kraịst, ị nọ nnọọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a ga-awakpo mwakpo dị otú ahụ. Jiri nri ime mmụọ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye n’ụba bụ́ ndị na-abịa n’oge ha, mee ihe nke ọma. (Matiu 24:45) Nọgide ‘na-ekwenye n’okwu na-enye ezi ndụ’ ma nọgidekwa ‘na-enwe ezi ndụ n’ime okwukwe.’ (1 Timoti 6:3; Taịtọs 2:2) Ekwela ka inwe obi abụọ bibie okwukwe gị.

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ruo ókè ha aṅaa ka ị na-enyeju onwe gị afọ n’ụzọ ime mmụọ?