Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka Iji Ghọta Bible

Enyemaka Iji Ghọta Bible

Enyemaka Iji Ghọta Bible

BIBLE bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ndị dere ya na-ekwu na ha ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ya, ihe ndị e dekwara n’ime ya na-enye ihe àmà dị ukwuu na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu. (2 Timoti 3:16) Tinyere ihe ndị ọzọ, Bible na-egosi ebe anyị si bịa, ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a, na ebe anyị na-aga. N’ezie, ọ bụ akwụkwọ kwesịrị ka anyị tụlee ya!

Ikekwe ị gbalịwo ịgụ Bible ma ya ana-esiri gị ike nghọta. Ikekwe ị maghị ebe ị ga-agụ iji chọta azịza nye ajụjụ gị dị iche iche. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị ka ọ na-eme. Ọnọdụ gị yiri nke otu nwoke biri ndụ na narị afọ mbụ. O ji ụgbọ ịnyịnya si Jerusalem na-aga obodo ya, bụ́ Etiopia. Onye ọrụ ọchịchị Etiopia a ji olu dara ụda na-agụ akwụkwọ amụma Bible bụ́ Aịsaịa, bụ́ nke e dere ihe karịrị narị afọ asaa tupu mgbe ahụ.

Na mberede, otu nwoke nke gbatara n’akụkụ ụgbọ ịnyịnya ya kelere ya. Nwoke ahụ bụ Filip, onye na-eso ụzọ Jisọs, ọ jụkwara onye Etiopia ahụ, sị: “Ị̀ na-amata ihe ị na-agụ?” Onye Etiopia ahụ zaghachiri, sị: “Ee e, n’ihi na m̀ ga-esi aṅaa pụ ịmata, ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-edu m?” Mgbe ahụ, ọ kpọbatara Filip n’ụgbọ ịnyịnya ahụ. Filip kọwaara nwoke ahụ ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ọ nọ na-agụ pụtara ma gaa n’ihu ikwusara ya “ozi ọma [banyere] Jisọs.”—Ọrụ 8:30-35.

Dị nnọọ ka Filip nyeere onye Etiopia ahụ aka ịghọta Okwu Chineke ogologo oge gara aga, Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta Bible taa. Ha ga-enwe obi ụtọ inyekwara gị onwe gị aka. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ kasị mma ịmụ Bible n’ụzọ dị n’usoro, na-amalite n’ozizi ndị bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Hibru 6:1) Ka ị na-aga n’ihu, ị ga-enwe ike ịghọta ihe Pọl onyeozi kpọrọ “nri siri ike”—ya bụ, eziokwu ndị miri emi karị. (Ndị Hibru 5:14) Ọ bụ ezie na ọ bụ Bible ka ị na-amụ, mbipụta ndị ọzọ—ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible—pụrụ inyere gị aka ịchọta na ịghọta akụkụ Bible ndị kwuru okwu n’isiokwu dịgasị iche iche.

A pụrụ idokwa ọmụmụ ihe n’oge nakwa n’ebe ga-adị gị mma. Ọbụna ụfọdụ na-eji telifon amụ ihe. A dịghị enwe ọmụmụ ihe ahụ dị ka a ga-asị na a nọ n’ọnụ ụlọ klas; ọ bụ ndokwa gị na onye ga-amụrụ gị ihe ga-eme bụ́ nke a ga-eme ka o kwekọọ n’ọnọdụ gị, gụnyere nzụlite na ikike mmụta gị. Ọ dịghị gị mkpa ịkwụ ụgwọ maka ọmụmụ Bible dị otú ahụ. (Matiu 10:8) A dịghị ele ule na ya, a gaghịkwa emenye gị ihere. A ga-aza ajụjụ gị dị iche iche, ị ga-amụtakwa otú e si abịaru Chineke nso. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka i ji kwesị ịmụ Bible? Tụlee ihe ụfọdụ mere ịmụ Bible pụrụ iji mee ka i nwekwuo ọṅụ ná ndụ gị.