Kere Òkè N’ọṅụ Nke Inye Ihe!
Kere Òkè N’ọṅụ Nke Inye Ihe!
“A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35, NW.
1. Olee otú Jehova si egosipụta ọṅụ nke inye ihe?
ỌṄỤ nke ịmara eziokwu ahụ na ngọzi ndị na-esi na ya apụta bụ onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke. Ndị marawooro Jehova nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ. Ma, ọ bụ ezie na ọṅụ dị n’ịnara onyinye, ọṅụ dịkwa n’inye onyinye. Jehova bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè,” ọ bụkwa “Chineke onye obi ụtọ.” (Jemes 1:17; 1 Timoti 1:11, NW) Ọ na-ezi ndị nile na-ege ntị ozizi na-enye ezi ndụ, ọ na-enwekwa obi ụtọ ná nrubeisi nke ndị ọ na-ezi ihe, dị nnọọ ka ndị mụrụ ụmụ si aṅụrị ọṅụ mgbe ụmụ ha meghachiri omume ná ntụziaka ịhụnanya ha.—Ilu 27:11.
2. (a) Gịnị ka Jisọs kwuru banyere inye ihe? (b) Obi ụtọ dị aṅaa ka anyị na-enwe mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ eziokwu Bible?
2 N’otu aka ahụ, mgbe Jisọs nọ n’ụwa, o nwere obi ụtọ ịhụ ka ndị mmadụ na-anabata ozizi ya. Pọl onyeozi kwuru na Jisọs sịrị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35, NW) Obi ụtọ anyị na-enwe mgbe anyị na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible abụghị nanị n’ihi afọ ojuju anyị na-enweta na anyị mere ka mmadụ nakwere nkwenkwe okpukpe anyị. Karịa nnọọ nke ahụ, ọ bụ n’ihi ọṅụ nke ịmara na anyị na-enye ihe bara ezigbo uru ma na-adịgide adịgide. Site n’inye ihe n’ụzọ ime mmụọ, anyị pụrụ inyere ndị mmadụ aka ime ihe ga-abara ha uru ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi.—1 Timoti 4:8.
Inye Ihe Na-eweta Ọṅụ
3. (a) Olee otú ndị ozi bụ́ Pọl na Jọn si gosipụta ọṅụ ha nwere n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ? (b) N’ihi gịnị ka izi ụmụ anyị eziokwu Bible ji bụrụ ngosipụta nke ịhụnanya?
3 Ee, dị nnọọ ka Jehova na Jisọs si aṅụrị ọṅụ n’inye onyinye ime mmụọ, ndị Kraịst na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ime otú ahụ. Pọl onyeozi nwere ọṅụ n’ịmara na ya enyeworo ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu nke Okwu Chineke. O degaara 1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, 20) N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe Jọn onyeozi na-ezo aka n’ebe ụmụ ime mmụọ ya nọ, o dere, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Cheekwa echiche banyere ọṅụ dị n’inyere ụmụ anyị aka ịghọ ụmụ ime mmụọ anyị! Ịzụlite ụmụaka “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” bụ ngosipụta nke ịhụnanya n’akụkụ nke ndị mụrụ ụmụ. (Ndị Efesọs 6:4) Ndị mụrụ ụmụ si otú a egosipụta na ha nwere nchegbu banyere ọdịmma ebighị ebi nke ụmụ ha. Mgbe ụmụaka a nabatara ya, ndị mụrụ ha na-enwe ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu.
ọgbakọ dị na Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Gịnị bụ olileanya anyị, ma ọ bụ ọṅụ anyị, ma ọ bụ okpueze nke ịnya isi anyị? Ọ́ bụghịkwa unu onwe unu, n’ihu Onyenwe anyị Jisọs n’ọbịbịa Ya? N’ihi na unu onwe unu bụ otuto anyị na ọṅụ anyị.” (4. Ahụmahụ dị aṅaa na-egosipụta ọṅụ nke inye ihe n’ụzọ ime mmụọ?
4 Dell bụ onye ozi ọsụ ụzọ oge nile na nne nke ụmụ ise. Ọ na-ekwu, sị: “M pụrụ ịghọta mmetụta dị n’okwu Jọn onyeozi nke ọma n’ihi na enwere m ekele dị ukwuu na mmadụ anọ n’ime ụmụ m ‘na-ejegharị n’eziokwu.’ Amaara m na ọ na-ewetara Jehova nsọpụrụ na otuto mgbe ezinụlọ dị iche iche na-efekọ ezi ofufe ọnụ, n’ihi ya, ana m enwe afọ ojuju dị ukwuu n’ịhụ ngọzi ya ná mgbalị ndị m mere ịkụnye eziokwu ahụ n’ime ụmụ m. Atụmanya mara mma nke mụ na ezinụlọ m ịdị ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’ime Paradaịs na-eme ka m nwee olileanya dị ukwuu ma na-akwali m ịtachi obi n’agbanyeghị ihe isi ike na ihe mgbochi dị iche iche.” N’ụzọ dị mwute, a chụpụrụ otu n’ime ụmụ ndị inyom Dell n’ọgbakọ n’ihi ịgbaso ụzọ ndụ nke na-ekwesịghị ndị Kraịst. N’agbanyeghị nke ahụ, Dell na-arụsi ọrụ ike iji nọgide na-enwe àgwà ziri ezi. “Enwere m olileanya na otu ụbọchị, nwa m nwanyị ga-eji obi umeala na ezi obi laghachikwute Jehova,” ka ọ na-ekwu. “Ma, m na-ekele Chineke na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ m nọgidere jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. Nehemaịa 8:10.
Ọṅụ m nwere abụworo m isi iyi nke ike n’ezie.”—Imeta Ndị Enyi Na-adịru Ebighị Ebi
5. Ka anyị na-etinye onwe anyị n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, ịmara gịnị na-enye anyị afọ ojuju?
5 Jisọs nyere ụmụazụ ya ntụziaka ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na izi ha ihe banyere Jehova na ihe ndị ọ chọrọ n’aka ha. (Matiu 28:19, 20) Ma Jehova ma Jisọs ejiriwo achọghị ọdịmma onwe onye nanị nyere ndị mmadụ aka ịmụta ụzọ nke eziokwu. N’ihi ya, ka anyị na-etinye onwe anyị n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, anyị na-enwe afọ ojuju nke ịmara na anyị na-eṅomi ihe nlereanya nke Jehova na Jisọs, dị ka ndị Kraịst oge mbụ mere. (1 Ndị Kọrint 11:1) Mgbe anyị si otú a na-eso Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-arụkọ ọrụ, ndụ anyị na-enwe ezi nzube. Lee ngọzi ọ bụ ịbụ ndị a gụrụ ná “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ”! (1 Ndị Kọrint 3:9) Ọ́ bụghịkwa ihe na-akpali akpali na ọbụna ndị mmụọ ozi nwere òkè n’ọrụ a nke ikwusa ozi ọma?—Mkpughe 14:6, 7.
6. Ka anyị na-ekere òkè n’inye ihe n’ụzọ ime mmụọ, olee ndị na-aghọ ndị enyi anyị?
6 N’ezie, site n’ikere òkè n’ọrụ inye ihe n’ụzọ ime mmụọ a, anyị pụrụ ịbụ ihe karịrị ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ—anyị pụrụ isoro ya bụrụ enyi ruo mgbe ebighị ebi. A kpọrọ Abraham enyi Jehova n’ihi okwukwe ya. (Jemes 2:23) Ka anyị na-agbalịsi ike ime uche Chineke, anyị onwe anyị pụkwara ịbụ ndị enyi Chineke. Ọ bụrụ na anyị emee nke ahụ, anyị na-aghọkwa ndị enyi Jisọs. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nke M nụrụ site n’ọnụ Nna m ka M mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Ọtụtụ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ịbụ ndị a gụrụ dị ka ndị enyi nke ndị a maara aha ha ma ọ bụ ndị isi, ma a pụrụ ịgụ anyị dị ka ndị enyi nke ndị abụọ kachasịnụ n’eluigwe na ala!
7. (a) Olee otú otu nwanyị si meta ezigbo enyi? (b) Ì nwewo ahụmahụ yiri nke ahụ?
7 Ọzọ, mgbe anyị nyeere ndị mmadụ aka ịmara Chineke, ha na-aghọkwa ndị enyi anyị, na-ewetara anyị obi ụtọ pụrụ iche. Joan, bụ́ onye bi na United States, malitere ịmụrụ otu nwanyị aha ya bụ Thelma, Bible. Ọ bụ ezie na ezinụlọ Thelma megidere ọmụmụ ihe ya, ọ nọgidesiri ike, e meekwa ya baptism mgbe otu afọ gasịrị. Joan dere, sị: “Mkpakọrịta anyị akwụsịghị n’ebe ahụ; kama nke ahụ, ọ ghọrọ ọbụbụenyi nke dịgideworo ruo ihe dị ka afọ 35 ugbu a. Anyị agakọwo ozi na mgbakọ ọnụ ọtụtụ mgbe. N’ikpeazụ, akwagara m n’ebe obibi ọhụrụ nke dị kilomita 800 site n’ebe o bi. Ma Thelma nọgidere na-edetara m akwụkwọ ozi ndị kasị egosipụta ịhụnanya ma na-enye obi ụtọ, na-agwa m na obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla o chetara m, na-ekelekwa m maka ịbụ enyi na onye nlereanya ya nakwa maka ịkụziri ya eziokwu sitere na Bible. Inwe ezigbo enyi dị otú ahụ mụ na ya na-akpachi anya bụ ụgwọ ọrụ magburu onwe ya m nwetara maka mgbalị m mere iji nyere ya aka ịmụta ihe banyere Jehova.”
8. Àgwà dị aṅaa ziri ezi ga-enyere anyị aka n’ozi?
8 Atụmanya nke ịchọta onye chọrọ ịmụta eziokwu pụrụ inyere anyị aka ịtachi obi ọbụna ma a sị na ọtụtụ n’ime ndị anyị na-ezute egosi na ha enwechaghị mmasị ma ọ bụ bụrụ ndị na-enwetụghị mmasị n’Okwu Jehova. Ụdị enweghị mmasị ahụ pụrụ ịbụrụ okwukwe na ntachi obi anyị ihe ịma aka. Ma, àgwà ziri ezi ga-enyere anyị aka. Fausto, bụ́ onye si Guatemala, kwuru, sị: “Mgbe m na-agbara ndị ọzọ àmà, m na-eche echiche banyere otú ọ ga-esi bụrụ ihe magburu onwe ya ma ọ bụrụ na onye ahụ m na-agwa okwu ga-aghọ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ime mmụọ. M na-eche n’echiche na ọ dịkarịa ala, otu onye n’ime ndị m ga-ezute ga-emesị nakwere eziokwu nke Okwu Chineke. Echiche ahụ mere ka m nọgide na-agba àmà, ọ na-ewetakwara m ezi ọṅụ.”
Ịkpado Akụ̀ n’Eluigwe
9. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere akụ̀ n’eluigwe, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
9 Ọ naghị adị mfe mgbe nile ime ka ụmụ anyị ma ọ bụ ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ. Ọ pụrụ iwe oge, ndidi, na nnọgidesi ike. Otú ọ dị, cheta na ọtụtụ ndị dị njikere ịrụsi ọrụ ike iji kwakọba ihe onwunwe bara ụba, bụ́ ihe ndị na-adịghị ewetakarịrị ha ọṅụ nakwa ndị na-adịghị adịru Matiu 6:19, 20) Site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ—ndị gụnyere ikere òkè n’ọrụ dị mkpa nke ime ndị na-eso ụzọ—anyị pụrụ inwe afọ ojuju nke ịmara na anyị na-eme uche Chineke nakwa na ọ ga-akwụghachi anyị ụgwọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.”—Ndị Hibru 6:10.
mgbe ebighị ebi. Jisọs gwara ndị na-ege ya ntị na ọ ka mma ịrụ ọrụ maka ihe ime mmụọ. O kwuru, sị: “Unu akpadola akụ̀ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi: kama kpadoonụ akụ̀ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi.” (10. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee akụ̀ ime mmụọ? (b) Olee otú Jisọs si nye onwe ya, nnukwu uru dịkwa aṅaa ka ọ baara ndị ọzọ?
10 Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu rụọ ọrụ iji mee ndị na-eso ụzọ, anyị na-akpadoro onwe anyị “akụ̀ n’eluigwe,” n’ikwekọ n’ihe Jisọs kwuru. Nke a na-ewetara anyị ọṅụ nke ịnara ihe. Ọ bụrụ na anyị ejiri achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enye ihe, anyị na-emesị bụrụ ndị e mere ka ha baa ọgaranya. Jisọs n’onwe ya ejiwo ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ ijeri afọ. Chee echiche banyere akụ̀ ndị ọ kwakọbaworo n’eluigwe! Otú o sina dị, Jisọs achọghị ọdịmma onwe ya. Pọl onyeozi dere, sị: “[Jisọs] nyere Onwe ya n’ihi mmehie nile anyị, ka O wee wepụta anyị n’ajọ oge nke dị ugbu a, dị ka ọchịchọ nke Chineke, bụ́ Nna anyị, si dị.” (Ndị Galetia 1:4, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ bụghị nanị na Jisọs ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị tinye onwe ya n’ozi ya, kama o nyere ndụ ya kpọmkwem dị ka ihe mgbapụta ka ndị ọzọ wee nwee ike inwe ohere nke ịkpado akụ̀ n’eluigwe.
11. N’ihi gịnị ka onyinye ime mmụọ ji dị mma karịa nke ihe onwunwe?
11 Site n’ịkụziri ndị mmadụ banyere Chineke, anyị na-enyere ha aka ịhụ otú ha onwe ha pụrụ isi kpadoo akụ̀ ime mmụọ ndị na-adịghị emebi emebi. Onyinye dị aṅaa ka ukwuu ka ị pụrụ inye? Ọ bụrụ na i nye enyi gị elekere mgbanaka dị oké ọnụ ahịa, ụgbọala, ma ọ bụ ọbụna ụlọ, o yiri ka enyi gị ahụ ọ̀ ga-enwe ekele na obi ụtọ, ị ga-enwekwa ọṅụ nke inye ihe. Ma olee otú onyinye ahụ ga-adị afọ 20 n’ihu? Afọ 200? Afọ 2,000? N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na i wepụta onwe gị iji nyere mmadụ aka ijere Jehova ozi, ọ pụrụ irite uru site n’onyinye ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ịchọpụta Ndị Chọrọ Eziokwu Ahụ
12. Olee otú ọtụtụ ndị siworo wepụta onwe ha iji nyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ?
12 Ndị Jehova eruwo n’ebe ụwa sọtụrụ iji kere òkè n’ọṅụ nke inye ihe n’ụzọ ime mmụọ. Ọtụtụ puku mmadụ ahapụwo ụlọ na ezinụlọ ha iji jee ozi ala ọzọ n’ala ebe ndị ha na-aghaghị ime mgbanwe gaa n’asụsụ na ọdịbendị ọhụrụ. Ndị ọzọ akwagawo n’ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị mkpọsa Alaeze ná mba ha. Ma ndị ọzọ amụtawo asụsụ mba ọzọ, na-emepe ohere ọhụrụ nke ikwusara ndị si mba ọzọ kwabata n’ógbè ha ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe otu di na nwunye bi na New Jersey, U.S.A. zụlitesịrị ụmụ abụọ na-arụ ọrụ ugbu a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, ha malitere ịsụ ụzọ ma mụọ asụsụ Chinese. N’ihe karịrị afọ atọ, ha duziiri mmadụ 74 na-asụ Chinese ọmụmụ Bible, bụ́ ndị na-aga akwụkwọ na mahadum dị nso n’ebe ha bi. Ì nwere ike ịmụba ozi gị n’ụzọ ụfọdụ iji nwetakwuo ọṅụ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ?
13. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ka ozi gị na-amịpụtakwu mkpụrụ?
Eklisiastis 11:6) Ka ọ dịgodị, cheta ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Noa na Jeremaịa. Ọ bụ ezie na ọ bụ mmadụ ole na ole nabatara nkwusa ha, ozi ha gara nke ọma. Karịsịa, o mere ka obi tọọ Jehova ụtọ.
13 Ikekwe ọ na-agụsi gị agụụ ike iduzi ọmụmụ Bible ma i nwebeghị ike ime otú ahụ. N’ala ụfọdụ, ọ na-esi ike ịchọta ndị nwere mmasị. Eleghị anya ndị ị na-ezute adịghị egosi mmasị n’ebe Bible dị. Ọ bụrụ otú ahụ, ikekwe ị pụrụ itinyekwu ọchịchọ gị n’ekpere ọtụtụ mgbe, na-amara na ma Jehova ma Jisọs Kraịst nwere mmasị miri emi n’ọrụ ahụ, ha pụkwara iduzi gị ijekwuru onye yiri atụrụ. Chọọ aro dị iche iche site n’aka ndị nọ n’ọgbakọ gị bụ́ ndị nwere ahụmahụ karị ma ọ bụ ndị ozi ha na-amịpụta mkpụrụ karị. Jiri ọzụzụ na aro ndị a na-enye ná nzukọ ndị Kraịst mee ihe. Rite uru site na ndụmọdụ nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha. Karịsịa, ike agwụla gị. Nwoke ahụ maara ihe dere, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi.” (Ime Ihe Kasị Mma Ị Pụrụ Ime
14. Olee otú Jehova si ele ndị meworo agadi n’ozi ya anya?
14 Ọ pụrụ ịbụ na ọnọdụ gị adịghị ekwe ka i mee ihe dị ukwuu n’ozi dị ka ị ga-achọ ime. Dị ka ihe atụ, ime agadi pụrụ ibelata ihe ị pụrụ ime n’ozi Jehova. Ma, cheta ihe nwoke ahụ maara ihe dere: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Nye Jehova, oge e tinyere n’ozi ya mara mma. Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Ọzọ, ruo agadi Mụ onwe m [Jehova] bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka: Mụ onwe m emewo, Mụ onwe m ga-ebukwa; ee, Mụ onwe m ga-eku n’aka meekwa ka unu wepụga onwe unu.” (Aịsaịa 46:4) Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-ekwe nkwa ịkwagide na ịkwado ndị ya na-eguzosi ike n’ihe.
15. Ì kweere na Jehova na-aghọta ọnọdụ gị? N’ihi gịnị?
15 Ikekwe gị na ọrịa, mmegide sitere n’aka di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe, nnukwu ibu ọrụ ezinụlọ, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ siri ike, na-alụ. Jehova na-aghọta erughị eru na ọnọdụ anyị dị iche iche, ọ hụkwara anyị n’anya n’ihi ezi mgbalị ndị anyị na-eme iji na-ejere ya ozi. Nke ahụ bụ eziokwu n’agbanyeghị na ihe anyị na-eme pụrụ ịdị ala karịa ihe ndị ọzọ na-eme. (Ndị Galetia 6:4) Jehova maara na anyị ezughị okè, ihe ọ na-atụkwa anya ya n’aka anyị bụ ihe anyị ga-emeli. (Abụ Ọma 147:11) Ọ bụrụ na anyị emee ihe anyị nwere ike ime, anyị pụrụ ijide n’aka na anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke nakwa na ọ gaghị echefu ihe ndị anyị ji okwukwe mee.—Luk 21:1-4.
16. N’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ nile nọ n’ọgbakọ si ekere òkè n’ime ka mmadụ bụrụ onye na-eso ụzọ?
1 Ndị Kọrint 14:24, 25) Ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma na-aza ajụjụ ndị na-akpali akpali, na-egosi onye ọhụrụ ahụ na ụmụaka anyị dị iche ná ndị ntorobịa ụwa. Ndị ọrịa, ndị ahụ na-adịghị ike, na ndị agadi nọ n’ọgbakọ na-akụziri ndị ọhụrụ ihe inwe ntachi obi na-agụnye. N’agbanyeghị afọ ndụ ma ọ bụ erughị eru anyị, anyị nile na-ekere òkè dị mkpa n’inyere ndị ọhụrụ aka ka ịhụnanya ha nwere n’ebe eziokwu Bible dị na-emiwanye emi, ha ana-enwekwa ọganihu iji ruo eruo ịbụ ndị e mere baptism. Awa ọ bụla anyị tinyere n’ozi, nletaghachi ọ bụla anyị mere, mkparịta ụka ọ bụla anyị sooro onye nwere mmasị nwee n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, pụrụ iyi ihe dị nta n’onwe ya, ma o so n’oké ọrụ Jehova na-arụzu.
16 Chetakwa na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ bụ nke a na-agbakọ aka arụ. Ọ dịghị otu onye nanị ya na-eme ka mmadụ bụrụ onye na-eso ụzọ, dị nnọọ ka otu ntapụ mmiri na-adịghị eme ka ihe ọkụkụ mee nke ọma. N’eziokwu, otu Onyeàmà pụrụ ịchọta onye nwere mmasị ma na-eduziri ya ọmụmụ Bible. Ma ozugbo onye ọhụrụ ahụ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị nile nọ n’ọgbakọ na-enyere ya aka ịmata eziokwu ahụ. Mmetụta na-ekpo ọkụ nke òtù ụmụnna na-egosipụta mmetụta nke mmụọ Chineke na-enwe. (17, 18. (a) Tụkwasị n’ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, olee otú anyị pụrụ isi kere òkè n’ọṅụ nke inye ihe? (b) Site n’ikere òkè n’ọṅụ nke inye ihe, ònye ka anyị na-eṅomi?
17 N’ezie, e wezụga ikere òkè n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ime ndị na-eso ụzọ, anyị bụ́ ndị Kraịst na-ekerekwa òkè n’ọṅụ nke inye ihe n’ụzọ ndị ọzọ. Anyị pụrụ iwepụta ego iche iji nye onyinye iji kwado ofufe dị ọcha na iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. (Luk 16:9; 1 Ndị Kọrint 16:1, 2) Anyị pụrụ ịchọ ohere dị iche iche iji na-ele ndị ọzọ ọbịa. (Ndị Rom 12:13) Anyị pụrụ ịgbalịsi ike ịrụ ‘ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.’ (Ndị Galetia 6:10) N’ụzọ ndị dịkwa mfe ma dị mkpa, anyị pụrụ inye ndị ọzọ ihe—idegara ha akwụkwọ ozi, ịkpọ ha na fon, inye ha onyinye, inyere ha aka, ịgwa ha okwu na-agba ume.
18 Site n’inye ihe, anyị na-egosi na anyị na-eṅomi Nna anyị nke eluigwe. Anyị na-egosipụtakwa ịhụnanya ụmụnna anyị, bụ́ akara e ji amata ezi ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Icheta ihe ndị a pụrụ inyere anyị aka ikere òkè n’ọṅụ nke inye ihe.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Olee otú Jehova na Jisọs siworo setịpụ ihe nlereanya n’inye ihe n’ụzọ ime mmụọ?
• Olee otú anyị pụrụ isi meta ndị enyi na-adịru mgbe ebighị ebi?
• Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iwere iji mee ka ozi anyị nwekwuo ihe ịga nke ọma?
• Olee otú mmadụ nile nọ n’ọgbakọ pụrụ isi kere òkè n’ọṅụ nke inye ihe?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Mgbe ụmụaka meghachiri omume n’ọzụzụ e nyere ha, ndị mụrụ ha na-enwe ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu
[Foto dị na peeji nke 15]
Anyị pụrụ imeta ezigbo ndị enyi site n’ime ndị na-eso ụzọ
[Foto dị na peeji nke 16]
Jehova na-ekuru anyị n’aka ya mgbe anyị mere agadi
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Anyị na-enweta ọṅụ n’inye ihe n’ụzọ ndị dị mfe ma dị mkpa